Jehova Na-eji Obiọma Elekọta Ndị Ohu Ya Merela Agadi
Jehova Na-eji Obiọma Elekọta Ndị Ohu Ya Merela Agadi
“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—HIB. 6:10.
1, 2. (a) Gịnị ka onye nwere ntutu isi ọcha na-echetara gị? (b) Olee otú Jehova si ele Ndị Kraịst merela agadi anya?
MGBE ị hụrụ ndị merela agadi nọ n’ọgbakọ gị, bụ́ ndị isi ha charala awọ, hà na-echetara gị otu akụkọ dị n’akwụkwọ Daniel? N’ọhụụ Jehova Chineke gosiri Daniel, ọ kọwara onwe ya dị ka onye ntutu isi ya na-acha ọcha. Daniel dere, sị: “Anọ m na-ele anya ruo mgbe e debegasịrị ocheeze, Onye Ochie ahụ wee nọdụ ọdụ. Uwe ya na-acha ezigbo ọcha, ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.”—Dan. 7:9.
2 Ezigbo owú na-achakarị ọcha. N’ihi ya, ntutu na-acha ọcha na utu aha ahụ bụ́ “Onye Ochie ahụ” na-egosi na afọ ndụ Chineke na amamihe ya karịrị akarị, bụ́cha ihe ndị mere anyị ji kwesị ịkwanyere ya ùgwù. Oleezi otú Onye Ochie ahụ, bụ́ Jehova, si ele ndị nwoke na ndị nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi merela agadi anya? Okwu Chineke kwuru na “isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” (Ilu 16:31) N’ezie, ọ bụrụ na Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi enwee isi awọ ma ọ bụ ntutu isi ọcha, isi awọ ya ahụ mara mma n’anya Chineke. Ị̀ na-ele ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị merela agadi anya otú Jehova si ele ha?
Gịnị Mere Ha Ji Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa?
3. Olee ihe mere ndị kwere ekwe ibe anyị merela agadi ji dị oké ọnụ ahịa nye anyị?
3 Ndị so ná ndị ohu Chineke ndị a anyị hụrụ n’anya merela agadi bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị bụ́bu ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi, ndị nkwusa Alaeze katarala ahụ́—ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi n’ọgbakọ anyị. I nwere ike ịma ụfọdụ ndị jirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ruo ọtụtụ afọ, bụ́kwa ndị ezi ihe nlereanya ha nyerela aka kpalie ndị na-eto eto ịkpa àgwà dị mma. Ụfọdụ ndị kwere ekwe ibe anyị merela agadi arụọla ọtụtụ ọrụ, ha ediekwala mkpagbu n’ihi ozi ọma. Jehova na “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ji mgbalị niile ha tinyere n’ọrụ Alaeze ahụ n’oge ndị gara aga na ndị nke ha na-etinye ugbu a kpọrọ ihe.—Mat. 24:45.
4. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwanyere Ndị Kraịst merela agadi ùgwù ma na-ekpe ekpere maka ha?
4 Ndị agadi ndị a kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị ka ndị ọzọ na-ejere Jehova Chineke ozi na-ekele ha ma na-akwanyere ha ùgwù. N’ezie, Iwu Chineke si n’aka Mozis nye kwuru na ilekọta ndị agadi na ịkwanyere ha ùgwù so n’ihe ndị na-egosi na mmadụ na-atụ egwu Jehova. (Lev. 19:32) Anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere mgbe niile maka ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma na-ekele Chineke maka ọrụ ha ji ịhụnanya na-arụ. Pọl onyeozi kpere ekpere maka ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ, ma ndị nke na-akatabeghị ahụ́ ma ndị nke merela agadi.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 1:2, 3.
5. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’iso ndị ohu Jehova merela agadi na-akpa?
5 Tụkwasị na nke ahụ, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike irite uru site n’iso Ndị Kraịst merela agadi na-akpa. Ndị ohu Jehova merela agadi amụtala ọtụtụ ihe bara uru site n’ịmụ ihe, ịhụ ihe ndị na-emenụ, na Ọma 71:18) Ndị na-eto eto, gosinụ na unu maara ihe site n’ịgbalị ịmụta ihe n’aka ndị a, dị nnọọ ka mmadụ si esi n’olulu miri emi esere mmiri.—Ilu 20:5.
site n’ahụmahụ ndị ha nwere. Ha amụtala inwe ndidi na ọmịiko, ịkụzikwara ndị ha tọrọ ihe ndị ha mụtarala na-eme ka ha nwee ọṅụ na afọ ojuju. (6. Olee otú i nwere ike isi gosi ndị merela agadi na i ji ha kpọrọ ihe n’ezie?
6 Ị̀ na-eme ka ndị agadi mara na i ji ha kpọrọ ihe otú Jehova si jiri ha kpọrọ ihe? Otu ụzọ i nwere ike isi mee nke a bụ ịgwa ha na ị hụrụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi otú ha si na-ekwesị ntụkwasị obi nakwa na i ji ihe ha kwuru kpọrọ ihe. Ọ bụrụkwa na ị na-eme ihe ị mụtara n’aka ha, ị na-egosi na ị na-akwanyere ha ùgwù n’eziokwu. Ọtụtụ Ndị Kraịst merela agadi nwere ike icheta ezigbo ndụmọdụ ha onwe ha nwetara n’aka ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi nakwa otú iji ndụmọdụ ahụ eme ihe sirila baara ha uru ná ndụ. *
Mee Ihe Iji Gosi na Ị Hụrụ Ha n’Anya
7. Olee ndị bụ́ isi Jehova nyere ọrụ ilekọta ndị agadi?
7 Ọ bụ ndị ezinụlọ ndị agadi bụ ndị bụ́ isi Chineke nyere ọrụ ilekọta ndị agadi. (Gụọ 1 Timoti 5:4, 8.) Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe ndị ezinụlọ nwere ndị agadi na-elekọta ndị ikwu ha merela agadi ma si otú a na-egosi na ha ji ndị agadi kpọrọ ihe dị ka Jehova n’onwe ya ji ha kpọrọ. Chineke na-enyere ezinụlọ ndị a aka ma na-agọzi ha maka mgbalị ha na-eme nakwa maka ihe ndị ha chụrụ n’àjà. *
8. Gịnị mere ndị nọ n’ọgbakọ ji kwesị ilekọta Ndị Kraịst merela agadi?
8 N’otu aka ahụ, obi na-adị Jehova ụtọ mgbe ọgbakọ na-elekọta ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi nọ ná mkpa ma ya abụrụ na ha enweghị ndị ikwu kwere ekwe ma ọ bụ ndị dị njikere ilekọta ha. (1 Tim. 5:3, 5, 9, 10) Ndị nọ n’ọgbakọ si otú a egosi na ‘ihe banyere ndị agadi na-emetụ ha n’obi nakwa na ha nwere ịhụnanya ụmụnna na ọmịiko’ n’ebe ndị agadi nọ. (1 Pita 3:8) Pọl ji ihe atụ kọwaa ihe banyere nlekọta a a na-elekọta ndị agadi nọ n’ọgbakọ mgbe o kwuru na ọ bụrụ na otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, “akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ.” (1 Kọr. 12:26) Imere ndị agadi ihe iji gosi ha ọmịiko na-egosi na anyị na-eme ihe Pọl dụrụ n’ọdụ: “Na-eburịtanụ ibu arọ nke ibe unu, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst.”—Gal. 6:2.
9. Olee nsogbu ndị ime agadi pụrụ ịkpata?
9 Olee nsogbu ndị agadi na-enwe? Ike na-agwụkarị ọtụtụ n’ime ha ngwa ngwa. O nwere ike ịdị ha ka ime ihe ụfọdụ ndị a na-eme kwa ụbọchị—ịga hụ dọkịta, ide akwụkwọ ozi, ịzacha ụlọ, isi nri—karịrị ike ha. Ebe ọ bụ na agụụ na ihe ọṅụṅụ adịchaghị agụ ndị merela agadi, ha nwere ike iche na ọ dịghị mkpa ka ha na-eri nri ma ọ bụ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ókè ha kwesịrị. O nwekwara ike ịdị otú ahụ mgbe a bịara ná nri ime mmụọ. O nwere ike isiri ndị agadi ike ịgụ ihe na ige ntị mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu n’ihi na anya ha na ntị ha enwewela nsogbu, ijikerekwa gawa ọmụmụ ihe nwere ike ịdị na-agwụ ha ike. Gịnị ka ndị ọzọ nwere ike imere ndị agadi dị otú a?
Otú I Nwere Ike Isi Nye Aka
10. Olee ihe ndị okenye nwere ike ime iji hụ na e nyeere ndị agadi aka?
10 N’ọtụtụ ọgbakọ, a na-elekọta ndị agadi nke ọma. Ụmụnna ndị nwere obiọma na-enyere ha aka ịzụta ihe ndị dị ha mkpa, isi nri, na idebe ụlọ ha ọcha. Ha na-enyere ndị agadi aka ịmụ ihe, ijikere maka ọmụmụ ihe, na ịdị na-agachi ozi ọma anya. Ndịàmà na-akatabeghị ahụ́ na-anọnyere ha ma na-akwọga ha ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ndị agadi anaghị apụli apụ, a na-eme ndokwa ka ha si na fon gere ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ e tinyere ha ya na teepu. Mgbe ọ bụla o kwere omume, ndị okenye na-ahụ na e mezuru ndokwa ndị e mere iji gboo mkpa ndị agadi nọ n’ọgbakọ. *
11. Kọọ otú otu ezinụlọ si nyere otu nwanna merela agadi aka.
11 Ndị Kraịst n’otu n’otu nwekwara ike ilekọta ndị agadi na inye ha ihe ndị na-akpa ha. Mgbe nwunye otu nwanna nwoke merela agadi nwụrụ, o nweghịzi ike ịkwụ ụgwọ ụlọ n’ihi na a dịghịzi enye nwunye ya ego ezumike nká. O nwere otu ezinụlọ—nna, nne, na ụmụ agbọghọ abụọ—ya na nwunye ya mụụrụ Baịbụl, bụ́ ndị nwere nnukwu ụlọ. Ha nyere ya ọnụ ụlọ abụọ ka o biri. Ruo afọ iri na ise, ha na ya na-erikọ nri, na-enwekọ obi ụtọ, ma na-egosirịta ibe ha ịhụnanya. Ụmụ di na nwunye ahụ mụtara ihe dị ukwuu site n’okwukwe na ahụmahụ nke nwanna ahụ, nnọkọ ha na ya nke na-enye ọṅụ bakwaara nwanna ahụ merela agadi uru. Ya na ezinụlọ ahụ bigidere ruo mgbe ọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri asatọ na itoolu. Ezinụlọ ahụ ka na-ekele Chineke maka ọtụtụ ngọzi ha nwetara site ná mkpakọrịta nke ha na nwanna nwoke ahụ. Ha ‘natara ụgwọ ọrụ’ n’ihi inyere Onye Kraịst ibe ha aka.—Mat. 10:42. *
12. Olee ihe i nwere ike ime iji gosi na ị na-akwanyere ụmụnna anyị merela agadi ùgwù?
12 O nwere ike ị gaghị enweli ike inyere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị merela agadi aka otú ezinụlọ a a kọrọ banyere ha si mee, ma i nwere ike inyere ha aka ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. I nwekwara ike ịkpọ ha ka ha bịa n’ụlọ gị ma ọ bụkwanụ kpọrọ ha mgbe ị na-eme mkpapụ. I nwere ike ịga leta ha mgbe ahụ́ na-adịghị ha ma ọ bụ mgbe ha na-adịghịzi apụta èzí. Ọzọkwa, i kwesịrị ịdị na-emeso ha ihe dị ka ndị katarala ahụ́. Ọ bụrụhaala na ha ka nwere ike ikwu ihe bara uru, e kwesịrị ikwe ka ha tinye ọnụ mgbe a na-eme mkpebi niile metụtara ha. Ọbụna ndị nke isi na-akpakọchaghị ọnụ na-ama ma à na-akwanyere ha ùgwù ma ọ bụ na a dịghị eme otú ahụ.
Jehova Agaghị Echefu Ọrụ Unu
13. Gịnị mere o ji dị oké mkpa ichebara ndị agadi echiche?
13 Ọ dị oké mkpa ka anyị na-echebara ndị agadi echiche. Ndị agadi na-enwekarị mwute
dị ukwuu n’ihi na ha enweghịzi ike ime ihe niile ha na-emebu mgbe ha na-akabeghị nká, bụ́kwanụ mgbe ahụ́ gbasiri ha ike. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị jiri ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi ruo ihe dị ka afọ iri ise, onye rụwarala ọrụ ọsụ ụzọ kemgbe, malitere ịrịa ọrịa na-eme ka ezigbo ike na-agwụ ya nke mere ka ọ na-esiri ya nnọọ ike ịga ọmụmụ ihe. Mgbe o chetara ihe ọ na-emebu, bụ́ nke ọ na-adịghịzi emeli, ọ na-amalite ibe ákwá. Ọ na-eji anya mmiri ekwu sị, “O nweghịzi ihe m dị mma ya.”14. Olee agbamume ndị ohu Jehova merela agadi nwere ike inweta n’Abụ Ọma?
14 Ọ bụrụ na ị bụ onye agadi, ọ̀ dịtụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? Ka è nweela mgbe ọ dị gị ka Jehova ọ̀ hapụla gị? E nwere ike ọ dị ọbụ abụ ahụ otú a mgbe o mere agadi nke mere o ji rịọ Jehova, sị: “Ajụla m mgbe m mere agadi; mgbe ike na-adịkwaghị m, ahapụla m. . . . Ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́.” (Ọma 71:9, 18) N’ezie, Jehova achọghị ịhapụ ọbụ abụ ahụ mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ọ gaghịkwa ahapụ gị. N’abụ ọzọ, Devid kwupụtara obi ike o nwere na Chineke ga-enyere ya aka. (Gụọ Abụ Ọma 68:19.) Obi sie gị ike na ọ bụrụ na ị bụ onye agadi ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, Jehova nọnyeere gị, ọ ga-anọgidekwa na-enyere gị aka kwa ụbọchị.
15. Gịnị nwere ike inyere ndị agadi aka inwe echiche ziri ezi?
15 Chineke adịghị echefu ihe unu bụ́ Ndịàmà Jehova mere agadi merela na ndị unu ka na-eme iji wetara aha ya otuto. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma ka na-eje ozi.” (Hib. 6:10) N’ihi ya, zere ịdị na-eche na n’ihi na i meela agadi ị baghịziri Jehova uru. Gbalịa jiri echiche ndị ziri ezi dochie ndị nke na-akụda mmụọ. Ṅụrịa ọṅụ n’ihi ngọzi ndị i nwere na olileanya i nwere maka ọdịnihu! Anyị nwere “ọdịnihu na olileanya”—ndị nke kacha mma—Onye Okike anyị mesikwara anyị obi ike na ha ga-emezu. (Jere. 29:11, 12; Ọrụ 17:31; 1 Tim. 6:19) Buru olileanya gị n’uche, adịla na-eche na nká agaghị ekwe gị ichepụta ihe bara uru, ya adịkwala mgbe ị ga-eche na ị baghị uru n’ọgbakọ! *
16. Gịnị mere otu nwanna nwoke ji chee na ya kwesịrị ịkwụsị ije ozi dị ka okenye, oleekwanụ otú ndị okenye ibe ya si gbaa ya ume?
16 Tụlee ihe banyere Johan, bụ́ onye dị afọ iri asatọ ma na-elekọta Sannie bụ́ nwunye ya kwesịrị ntụkwasị obi nke na-adịghịzi ihe ọ na-emeli. * Ụmụnna anyị ndị nwaanyị na-aga anọnyere Sannie, onye gachaa ibe ya agaa, ka Johan wee nwee ike ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Otú ọ dị, ọ bịara dị Johan ka ihe ndị a akarịala ike ya nke na ọ malitere iche na ya ekwesịghịzi ịbụ okenye ọgbakọ. O ji anya mmiri jụọ, sị: “Olee uru ọ baara m ịbụ okenye? Ọ dịghịzi ọrụ bara uru m na-arụrụ ọgbakọ.” Ndị okenye ibe ya gwara ya na ahụmahụ na amamihe ya dị ezigbo mkpa. Ha gbara ya ume ka ọ nọgide na-eje ozi dị ka okenye, a sịgodị na ihe ọ na-emeli ebughị ibu. Nke a gbara Johan ume nke ukwuu, ọ gara n’ihu ije ozi dị ka okenye, bụ́kwa nke wetaara ọgbakọ ngọzi.
Jehova Na-eche Banyere Anyị n’Ezie
17. Olee otú Baịbụl si na-emesi Ndị Kraịst merela agadi obi ike?
17 Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ndị agadi nwere ike ịnọgide na-eme nke ọma n’ọgbakọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-enwe n’ihi nká. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ndị Ọma 92:13, 14) Pọl onyeozi, bụ́ onye o nwere ike ịbụ na e nwere ihe ndị na-enye ya nsogbu, ‘adaghị mbà, ọ bụrụgodị na mmadụ ọ bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi.’—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18.
a kụrụ n’ụlọ Jehova . . . ga na-eme nke ọma n’isi awọ́ ha, ha ka ga-agba agba, na-amakwa pokopoko.” (18. N’ihi gịnị ka enyemaka nke ndị ọzọ ji dị ndị agadi na ndị na-elekọta ha mkpa?
18 Ọtụtụ ihe atụ ndị e nwere n’oge a na-egosi na ndị agadi nwere ike ịnọgide “na-eme nke ọma.” Ma ọrịa na nká nwere ike ịdị na-agwụ ha ike, ọ dịghịdịrị ndị nke nwere ezinụlọ ji ịhụnanya na-enyere ha aka mfe. Ike nwekwara ike ịgwụ ndị na-elekọta ha. Ọgbakọ nwere ihe ùgwù nke igosi na ha hụrụ ndị agadi n’anya site n’inyere ha na ndị na-elekọta ha aka. (Gal. 6:10) Enyemaka dị otú a na-egosi na anyị adịghị agwa ndị dị otú a ka ha gaa “nyaa ọkụ, rijuokwa afọ” n’enyereghị ha aka.— Jems 2:15-17.
19. Gịnị mere Ndị Kraịst merela agadi agaghị na-atụ ọdịnihu egwu?
19 Nká nwere ike ime ka Onye Kraịst gharazie imeli ihe ndị ọ na-emebu, ma nká adịghị eme ka Jehova kwụsịtụ ịhụ ndị ohu ya merela agadi kwesịrị ntụkwasị obi n’anya. Kama nke ahụ, ndị a niile kwesịrị ntụkwasị obi dị oké ọnụ ahịa n’anya ya, ọ gaghịkwa ahapụ ha ma ọlị. (Ọma 37:28; Aịza. 46:4) Jehova ga-anọgide na-elekọta ha ma na-eduzi ha ná ndụ ha niile.—Ọma 48:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Agadi—Ndị E Ji Gọzie Ndị Na-eto Eto,” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 1, 2007.
^ par. 7 Gụọ Teta! May 8, 1994 peeji nke 3-10.
^ par. 10 Ná mba ụfọdụ, nke a nwere ike ịgụnye inyere ha aka inweta enyemaka site n’aka ndị ọchịchị. Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Na-eche Banyere Ndị Agadi,” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 1, 2006.
^ par. 11 Gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Na-eche Banyere Anyị Mgbe Niile,” n’Ụlọ Nche nke September 1, 2003.
^ par. 15 Gụọ isiokwu bụ́ “Ịma Mma Nke Isi Awọ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke March 15, 1993.
^ par. 16 A gbanwere aha ndị ahụ.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Gịnị mere i ji ewere Ndị Kraịst merela agadi dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa?
• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-akwanyere ndị kwere ekwe ibe anyị merela agadi ùgwù?
• Gịnị pụrụ inyere ndị ohu Jehova merela agadi aka inwe echiche ziri ezi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ndị nọ n’ọgbakọ ji ndị agadi kpọrọ ihe nke ukwuu