Guzogide “Mmụọ nke Ụwa”
Guzogide “Mmụọ nke Ụwa”
“Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke si na Chineke.”—1 KỌR. 2:12.
1, 2. (a) N’oge gboo, gịnị mere e ji edowe obere ụmụ nnụnụ n’ime ala ebe a na-egwu kool na Britain? (b) Olee ihe ize ndụ na-eche Ndị Kraịst ihu taa?
N’AFỌ 1911, ndị ọchịchị Britain tiri iwu ga-echebe ndị ọrụ ha bụ igwu kool. Ha kwuru ka a na-edowe obere nnụnụ abụọ n’ime ebe ahụ a na-egwu kool. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na ọkụ amalite ịgba n’ime ebe ahụ a na-egwu kool, ndị bịara ịzọpụta ndị na-egwu kool ga-enwe ike iwere nnụnụ ndị ahụ banye n’ime ala ebe ahụ a na-egwu kool. Obere nnụnụ ndị a na-anụ ísì ihe ndị nwere ike igbu mmadụ ngwa ngwa, dị ka ísì anwụrụ ọkụ ọjọọ. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-esi, ahụ́ ga na-agbakasị nnụnụ ndị ahụ, nke na ha na-esi n’ebe ha bekwasịrị dapụ. Ihe a nnụnụ ndị a bidoro n’oge mewe dị oké mkpa. Anwụrụ ọjọọ a na-akpọ carbon monoxide adịghị enwe ụcha, ọ naghị esikwa ísì, ma ọ na-egbu mmadụ site n’igbochi mkpụrụ ndụ ndị dị n’ọbara ka ọ ghara inye ahụ́ ikuku oxygen. Ọ bụrụ na ndị ahụ bịara ịzọpụta ndị nọ ná nsogbu amaghị ihe na-achọ ime, ha nwere ike ịtụbọ ma nwụọ n’amaghị na ikuku ọjọọ ahụ abanyela ha n’ahụ́.
2 Ndị Kraịst nọkwa n’ọnọdụ yiri nke ahụ ndị na-egwu kool nọ na ya. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Mgbe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma n’ụwa niile, ọ maara na ọ na-ezipụ ha n’ebe dị ize ndụ, nke Setan na-achị nakwa nke jupụtara na mmụọ nke ụwa. (Mat. 10:16; 1 Jọn 5:19) Jizọs nwere nnọọ nchegbu banyere ndị na-eso ụzọ ya nke mere o ji kpegara Nna ya ekpere banyere ha n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, sị: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ.”—Jọn 17:15.
3, 4. Olee ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịṅa ntị na ya?
3 Jizọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị banyere otú ihi ụra n’ụzọ ime mmụọ nwere ike isi kpatara ha ọnwụ. Ihe ahụ ọ gwara ha baara anyị bụ́ ndị bi n’ọgwụgwụ usoro ihe a uru karịa. Ọ gwara ndị na-eso Luk 21:34-36) Ma otu ihe na-enye obi ụtọ bụ na Jizọs kwere nkwa na Nna ya ga-enye mmụọ nsọ ya ka ọ na-echetara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ha maara, nyere ha aka ịmụrụ anya na ịnọsikwu ike n’okwukwe.—Jọn 14:26.
ụzọ ya, sị: “Mụrụnụ anya . . . ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (4 Oleekwanụ maka anyị onwe anyị taa? Mmụọ nsọ ahụ ọ̀ ka nwere ike inyere anyị aka taa? Ọ bụrụ na o nwere ike, gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nweta enyemaka ya? Gịnị bụ mmụọ nke ụwa, oleekwa otú o si akpa ike? Oleekwa otú anyị ga-esị nwee ike iguzogide mmụọ nke ụwa a?—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:12.
Mmụọ Nsọ Ka Ọ̀ Bụ Mmụọ nke Ụwa?
5, 6. Gịnị ka mmụọ nsọ nwere ike imere anyị, ma gịnị ka anyị ga-eme iji nweta ya?
5 Ọ bụghị naanị na narị afọ mbụ ka e nyere ndị mmadụ mmụọ nsọ. A ka na-enyekwa ya onye ọ bụla chọrọ ya taa, mmụọ nsọ Chineke nwekwara ike inye anyị ike ime ihe ziri ezi ma nyekwa anyị ume ije ozi Chineke. (Rom 12:11; Fil. 4:13) O nwere ike ime ka anyị nwee àgwà ndị mara mma dị ka ịhụnanya, obiọma, na ịdị mma, ihe ndị bụ́cha akụkụ nke “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Ma, Jehova Chineke adịghị amanye onye ọ bụla inweta mmụọ nsọ ya.
6 Ọ dị mma ma anyị jụọ, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme iji nweta mmụọ nsọ?’ Baịbụl gosiri na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime. Otu n’ime ihe ndị dị ezigbo mkpa dị nnọọ mfe omume—rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ. (Gụọ Luk 11:13.) Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ ịmụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee ma na-eme ihe e kwuru na ya. (2 Tim. 3:16) N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla gụrụ nnọọ Baịbụl na-enweta mmụọ Chineke. Ma mgbe Onye Kraịst ji ezi obi na-amụ Okwu Chineke, ọ ga-enwe ike ịghọta ụdị mmetụta ndị mmadụ e kwuru okwu ha n’ime Okwu ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee nwere. Ọ dịkwa oké mkpa na anyị ga-aghọta na Jehova ahọpụtala Jizọs ka ọ bụrụ Onye Nnọchianya Ya nakwa onye Chineke si n’aka ya na-enye anyị mmụọ ya. (Kọl. 2:6) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya Jizọs ma na-eme ihe ọ kụziri. (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ịdị ka Kraịst, anyị ga na-enwetakwu mmụọ nsọ Chineke.
7. Olee otú mmụọ nke ụwa na-esi akpa ike n’ahụ́ ndị mmadụ?
7 Ma mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà yiri nke Setan. (Gụọ Ndị Efesọs 2:1-3.) E nwere ụzọ dị iche iche mmụọ nke ụwa si akpa ike. Ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-egosi na ọ na-akpali ndị mmadụ inupụrụ iwu Chineke isi. Ọ na-akpali ndị mmadụ inwe “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16) Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà e ji mara ọrụ nke anụ ahụ́ ndị dị ka ịkwa iko, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ekworo, iwe ọkụ, na ịṅụ oké mmanya. (Gal. 5:19-21) Ọ na-akwalite nkụzi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ nke na-emerụ ihe dị nsọ. (2 Tim. 2:14-18) O doro anya na mgbe mmadụ kwere ka mmụọ nke ụwa na-achị ya, ọ ga na-akpakwu àgwà ka Setan.
8. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-ahọrọ?
8 Anyị agaghị enwe ike ibi ndụ n’enweghị mmụọ na-achị anyị. Fil. 3:18, 19) Ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi gụzogide mmụọ nke ụwa.
Onye ọ bụla ga-ahọrọrịrị mmụọ nke ọ ga-ekwe ka ọ na-achị ya—mmụọ nsọ ma ọ bụ mmụọ nke ụwa. Ndị mmụọ nke ụwa na-achị ugbu a nwere ike ịtọhapụ onwe ha na ya ma kwe ka mmụọ nsọ na-eduzi ha. Ma nke ọzọ nwekwara ike ime. Ndị mmụọ nsọ na-eduzi nwekwara ike ịghọzi ndị mmụọ nke ụwa na-achị. (Mata n’Oge Ihe Ndị Na-agbara Gị Ama
9-11. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịgbara anyị àmà na mmụọ nke ụwa enwetawala anyị?
9 Ndị ahụ na-egwu kool na Britain anyị kwuru okwu ha ná mmalite na-eji obere nnụnụ amata n’oge mgbe e nwere ikuku ọjọọ nwere ike igbu mmadụ. Ọ bụrụ na onye na-egwu kool ahụ́ ka nnụnụ si n’ebe o bekwasịrị dapụ, ọ na-amara na ọ ga-eme ihe ngwa ngwa iji zọrọ isi ya. Olee ihe ụfọdụ ndị na-agbara anyị bụ́ Ndị Kraịst àmà n’oge na mmụọ nke ụwa enwetawala anyị?
10 Mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke ma rara ndụ anyị nye Jehova, eleghị anya ịgụ Baịbụl na-adị anyị ọkụ n’obi. O nwekwara ike ịbụ na anyị na-eji obi anyị niile na-ekpe ekpere mgbe ahụ ma na-ekpechi ya anya. Ịga ọmụmụ ihe na-atọkwa anyị ụtọ, anyị ana-ewere ọmụmụ ihe nke ọ bụla dị ka ihe na-enye anyị ume ọhụrụ, dị ka ebe onye akpịrị na-akpọ nkụ hụrụ mmiri n’ọzara. Ime ihe ndị a nyeere anyị aka ịtọhapụ onwe anyị ná mmụọ nke ụwa ma ghara ikwe ka ọ na-achị anyị.
11 Ànyị ka na-agbalị ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị? (Ọma 1:2) Ànyị ka na-eji obi anyị niile na-ekpe ekpere ma na-ekpechi ya anya? Ànyị ka na-enwe mmasị ịga ọmụmụ ihe, na-agazu ha niile a na-enwe n’izu? (Ọma 84:10) Ka ànyị akwụsịla ụfọdụ n’ime àgwà ọma ndị a anyị na-akpabu? N’eziokwu, anyị nwere ike inwe ọtụtụ ibu ọrụ ndị na-ewekọrọ oge na ume anyị, o nwekwara ike isiri anyị ike ịnọgide na-eme ihe ndị a metụtara ofufe anyị na-efe Chineke. Ma ọ bụrụ na anyị akwụsịla ime ihe ụfọdụ ndị ahụ dị mma anyị na-emebu, ọ̀ nwere ike ịbụ na mmụọ nke ụwa enwetawala anyị? Ànyị ga-agbalịsi ike ịmaliteghachi ime ihe ndị ahụ dị mma anyị na-emebu?
‘Ka A Ghara Inwe Ihe Ga-anyịgbu Obi Unu’
12. Olee onye Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘lezie anya,’ n’ihi gịnịkwa?
12 Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji gụzogide mmụọ nke ụwa? Tupu Jizọs enye ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ka ha ‘mụrụ anya,’ o bula ụzọ dọọ ha aka ná ntị banyere kpọmkwem ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịmata ha n’ọnyà. O kwuru, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka onyà.”—Luk 21:34, 35.
13, 14. Olee ajụjụ ndị ọ ga-adị mma ma anyị jụọ onwe anyị banyere iri ihe na ịṅụ ihe?
13 Chebagodịrị ịdọ aka ná ntị ahụ echiche. Jizọs ọ̀ na-ekwu na iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ dị njọ? Mba! Ọ maara ihe Sọlọmọn kwuru, sị: “Amatawo m na ọ dịghị ihe dịịrị [ụmụ mmadụ] mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha; nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.” (Ekli. 3:12, 13) Ma, Jizọs maara na mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe njide onwe onye mgbe a bịara n’iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ.
14 Olee ihe anyị ga-eme iji hụ na mmụọ nke ụwa arabanyeghị anyị ịmalite iribiga ihe ókè na ịṅụbiga ihe ókè? Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m na-eme ma m gụta ebe a dọrọ aka ná ntị banyere iribiga nri ókè na Baịbụl ma ọ bụ n’akwụkwọ anyị? M̀ na-eleghara ịdọ aka ná ntị ahụ anya ma ọ bụ were na a na-ekwu oké okwu n’ihe na-enweghị ihe ọ bụ, ikekwe na-achọ ihe m ga-akụdo aka na-eme ihe m na-eme? * Olee ihe m na-eche banyere ịdọ aka ná ntị a na-enye banyere mmanya na-aba n’anya? Ọ bụrụdị na m ga-aṅụ aṅụ, m̀ na-aṅụ ya ruo n’ókè kwesịrị ekwesị ma zere “ịṅụ oké mmanya”? Àna m eleghara ndụmọdụ ahụ anya, na-ewere na ọ gbasaghị m? Ọ bụrụ na ndị ọzọ ekwuo okwu banyere otú m si aṅụ mmanya, m̀ na-amalite ịgbachitere onwe m ma ọ bụ wewa iwe? Àna m agba ndị ọzọ ume ka ha leghara ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ sitere na Baịbụl anya?’ N’ezie, otú mmadụ si eme omume na-egosi ma onye ahụ ọ̀ na-ekwe ka mmụọ nke ụwa na-achị ya.—Tụlee Ndị Rom 13:11-14.
Ekwela Ka Nchegbu Kpagbuo Okwukwe Gị
15. Olee otu ihe ụmụ mmadụ na-emekarị Jizọs dọrọ aka ná ntị banyere ya?
15 Ihe ọzọ dị oké mkpa ga-enyere anyị aka iguzogide mmụọ nke ụwa bụ ịgbalị ịghara ịdị na-echegbu onwe anyị. Jizọs maara na ọ na-adịrị anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ichegbu onwe anyị banyere ihe ndị e ji enyere ndụ aka kwa ụbọchị. O ji ịhụnanya gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Mat. 6:25) Ọ dịghị njọ iche banyere ihe ndị dị mkpa, dị ka ime ihe ndị na-amasị Chineke, ịrụ ọrụ ndị anyị nwere dị ka Ndị Kraịst, na ịkpata ihe ndị dị ndị ezinụlọ anyị mkpa. (1 Kọr. 7:32-34) Gịnịzi ka anyị nwere ike isi n’ịdọ aka ná ntị a Jizọs nyere mụta?
16. Olee ihe mmụọ nke ụwa na-eme ndị mmadụ ka ha na-eme?
16 Mmụọ nke ụwa, bụ́ nke na-akpatakarị oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ, na-eme ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha n’ihi ihe na-enweghị isi. Mmụọ nke ụwa na-eme ka anyị chee na ego bụ ihe niile nakwa na ihe e ji ama onye ruru eru bụ ihe ndị onye ahụ nwere, ọ bụghị n’otú onye ahụ jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ndị e ji ụdị echiche a ghọgbuo na-anọgide na-achụ akụnụba ma nọgide na-echegbu onwe ha banyere inweta ihe ndị kacha ọhụrụ, ndị kacha ibu na ndị kacha bụrụ ọkpọka. (Ilu 18:11) Echiche a na-ezighị ezi ụfọdụ nwere banyere ihe onwunwe na-eme ka ha na-echegbu onwe ha ma kwụsị inwe ọganihu n’ihe ndị metụtara ofufe Chineke.—Gụọ Matiu 13:18, 22.
17. Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị nchegbu kpagburu?
17 Anyị nwere ike izere ịbụ ndị nchegbu Mat. 6:33) Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kweere ná nkwa a? Otu ụzọ bụ site n’ibu ụzọ achọ ezi omume Chineke—nke bụ́ ile ego anya n’ụzọ ziri ezi dị ka Chineke si ele ya. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị aghọ aghụghọ iji zere ịkwụ ụtụ isi anyị kwesịrị ịkwụ ma ọ bụ ghatụ “obere” ụgha n’ihe ọ bụla anyị ji achụta ego. Anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji hụ na anyị mezuru ihe anyị na ndị ọzọ kwekọrịtara n’azụmahịa, na-eme ka ‘Ee anyị bụrụ Ee’ mgbe a bịara n’ịkwụ ụgwọ ndị anyị ji. (Mat. 5:37; Ọma 37:21) Onye na-akwụwa aka ya ọtọ otú a nwere ike ọ gaghị aba ọgaranya, ma ya na Chineke na-adị ná mma, nke a ga-emekwa ka o nwee akọnuche dị ọcha ma belatara ya nchegbu.
ga-akpagbu okwukwe ha ma ọ bụrụ na anyị erube isi n’iwu Jizọs nke na-asị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.” Jizọs mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị emee nke a, a ga-atụkwasịrị anyị ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa n’ezie. (18. Olee ezi ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị, oleekwa otú anyị ga-esi rite uru na ya ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ya?
18 Ibu ụzọ achọ Alaeze ahụ chọrọ anyị ịma ihe ndị ka mkpa ná ndụ anyị. Tụlee otú Jizọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eyi uwe ndị bụ́ ọkpọka. (Jọn 19:23) O sooro ezigbo ndị enyi ya rie ma ṅụọ. (Mat. 11:18, 19) Ma o jighị inwe ihe onwunwe na ịtụrụ ndụ mere ihe bụ́ isi ná ndụ ya, ha bụ naanị ihe ndị e ji enyere ndụ aka. Nri Jizọs bụ ime uche Jehova. (Jọn 4:34-36) Ndụ anyị ga na-atọ anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị eṅomie Jizọs! Anyị na-enwe ọṅụ nke na-abịa site n’iji Akwụkwọ Nso akasi ndị a na-emegbu emegbu obi. Ọgbakọ na-ahụ anyị n’anya ma na-akwado anyị. Anyị ga-emekwa ka obi Jehova ṅụrịa. Mgbe anyị butere ihe ndị dị mkpa ụzọ ná ndụ anyị, ihe onwunwe na ihe ntụrụndụ agaghị abụ nna anyị ukwu. Kama nke ahụ, ha ga-abụ odibo ma ọ bụ ngwá ọrụ ndị na-enyere anyị aka ife Jehova. Ọ bụrụ na anyị na-agbakwu mbọ n’ọrụ a e ji na-akwado Alaeze Chineke, o yikarịrị ka mmụọ nke ụwa agaghị enweta anyị.
Nọgide ‘Na-atụkwasị Uche Na Mmụọ Nsọ’
19-21. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide ‘na-atụkwasị uche na mmụọ nsọ,’ gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịdị na-eme nke a?
19 Mmadụ na-ebu ụzọ eche ihe eche tupu ya emewe ya. Ọ bụ iche echiche dị ka onye anụ ahụ́ na-achị na-eme ka ụfọdụ ndị mee ihe ọtụtụ ndị na-ewere ka ihe a na-echeghị eche mee. N’ihi ya, Pọl onyeozi chetaara anyị mkpa ọ dị ilezi anya banyere ihe anyị na-eche. O dere, sị: “N’ihi na ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́, ma ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.”—Rom 8:5.
20 Olee otú anyị ga-esi zere ịbụ ndị mmụọ nke ụwa na-achịkwa echiche nakwa omume ha? Anyị kwesịrị ịyọcha ihe ndị na-abanye n’uche anyị, na-agbalị ókè anyị nwere ike igbochi echiche nke ụwa ịbata n’obi anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ahọrọ ihe anyị ji atụrụ ndụ, anyị adịghị ekwe ka ihe ndị na-akwalite omume rụrụ arụ ma ọ bụ ime ihe ike mebie uche anyị. Anyị maara na mmụọ nsọ Chineke, nke dịkwa ọcha, adịghị anọ n’obi ruru unyí. (Ọma 11:5; 2 Kọr. 6:15-18) Anyị na-emekwa ka mmụọ Chineke dịrị n’ime anyị site n’ịgụchi Baịbụl anya, ikpechi ekpere anya, ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụ, nakwa site n’ịgachi ọmụmụ ihe anya. Anyị na-esokwa mmụọ ahụ na-arụkọ ọrụ mgbe anyị na-agachi ozi ọma anya.
21 N’ezie, anyị aghaghị iguzogide mmụọ nke ụwa na ọchịchọ anụ ahụ́ nke ọ na-akwalite. Ma ime nke a ga-abara anyị ezigbo uru n’ihi na, dị ka Pọl kwuru, “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ, ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.”—Rom 8:6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Iri oké nri bụ àgwà na-eri mmadụ isi, na-eme ka onye ahụ jiri anyaukwu na-eri ihe ma ọ bụ na-eribiga ya ókè. N’ihi ya, anaghị esi n’otú mmadụ ha ama na onye ahụ na-eribiga nri ókè, kama a na-esi n’otú onye ahụ si eme mgbe ọ hụrụ nri. Mmadụ nwere ike o bughị ibu, ma ọ bụdị dị kịrịkịrị, ma ya abụrụ onye na-eribiga nri ókè. N’aka nke ọzọ, ihe ndị nwere ike ịkpatara mmadụ ibu oké ibu bụ ọrịa ma ọ bụ ya abụrụ na o si ya n’agbụrụ. N’agbanyeghị otú mmadụ há, ihe bụ́ isi bụ ma onye ahụ ọ̀ dị anyaukwu gabiga ókè mgbe a bịara n’iri nri.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke November 1, 2004.
Ì Chetara?
• Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji nweta mmụọ nsọ?
• Olee ụzọ ụfọdụ mmụọ nke ụwa nwere ike isi enweta anyị?
• Olee otú anyị pụrụ isi guzogide mmụọ nke ụwa?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 21]
Tupu ị gawa ọrụ ma ọ bụ akwụkwọ, rịọ Chineke n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Anyị kwesịrị ịhụ na obi anyị dị ọcha, hụ na anyị adịghị aghọ aghụghọ n’azụmahịa anyị, ma hụ na anyị na-emeru ihe n’ókè