“N’ezie, Ihe A Bụ Aha Kacha Nsọ ma Dị Ukwuu Chineke Nwere”
“N’ezie, Ihe A Bụ Aha Kacha Nsọ ma Dị Ukwuu Chineke Nwere”
Nicholas Cusa kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu ya n’afọ 1430. * Ọ bụ nwoke nwere mmasị n’ọtụtụ ihe, onye tinyere uche n’ịmụ asụsụ Grik, Hibru, nkà ihe ọmụma, nkà mmụta okpukpe, mgbakọ na mwepụ, na ihe ọmụmụ banyere mbara igwe. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ, o nwere akara mmụta dọktọret n’ihe ọmụmụ banyere iwu ndị Roman Katọlik. N’afọ 1448, a họpụtara ya ịbụ kadinal.
Ihe dị ka narị afọ isi na iri afọ ise gara aga, Nicholas Cusa rụrụ ebe a na-elekọta ndị agadi na Kues, nke a na-akpọ Bernkastel-Kues ugbu a, bụ́ obodo dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri kilomita atọ site ná ndịda obodo Bonn, nke dị na Germany. E jizi ebe ahụ mere ọ́bá akwụkwọ Cusa nke nwere ihe karịrị narị ihe odide atọ na iri. Otu n’ime ha bụ Codex Cusanus 220, bụ́ ebe okwuchukwu ahụ Cusa kwuru n’afọ 1430 dị. N’okwuchukwu ahụ bụ́ In principio erat verbum (Na Mbụ Ka Okwu ahụ Dị), Nicholas Cusa ji okwu bụ́ Iehoua sụgharịa aha Jehova, nke bụ́ otú e si akpọ ya na Latin. * Na peeji nke 56, e dere ihe na-esonụ banyere aha Chineke: “Ọ bụ aha si n’aka Chineke. Ọ bụ Tetragramatọn, ya bụ́, aha nwere mkpụrụ akwụkwọ anọ. . . . N’ezie, ihe a bụ aha kacha nsọ ma dị ukwuu Chineke nwere.” Ihe a Nicholas Cusa kwuru kwadoro eziokwu ahụ bụ́ na aha Chineke dị n’ihe odide mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Ọpụ. 6:3.
Codex a nke dịwara kemgbe mmalite narị afọ nke iri na ise, so n’otu n’ime akwụkwọ ndị kacha ochie ka dịnụ, bụ́ ebe a sụgharịrị Tetragramatọn ahụ ịbụ “Iehoua.” Ihe a e dere ede bụ ihe ọzọ na-agba akaebe na ụdị aha Chineke nke ya na aha ahụ bụ́ “Jehova” yiri, bụ ụzọ e si na-asụgharị aha Chineke kemgbe ụwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A na-akpọkwa Nicholas Cusa Nikolaus Cryfts (Krebs), Nicolaus Cusanus, na Nikolaus von Kues. Kues bụbu aha otu obodo dị na Germany bụ́ ebe a mụrụ ya.
^ par. 3 Okwuchukwu ya a bụ iji kwadoo ozizi Atọ n’Ime Otu.
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọ́bá Akwụkwọ Cusa