“Na-achụso Ihe Na-eweta Udo”
“Na-achụso Ihe Na-eweta Udo”
OKPORO ụzọ a rụrụ ọhụrụ na-esi ike, yie ihe na-agaghị emebi emebi. Ma ka oge na-aga, ọ na-abịa nwechaa ebe ndị gbawara agbawa na okokoro. Ọ na-adị mkpa ka e mezie ebe ndị ahụ mebiri emebi iji hụ na e chebere ndị na-esi na ya na-aga nakwa iji hụ na ụzọ ahụ alaghị n’iyi kpamkpam.
N’otu aka ahụ, anyị na ndị ọzọ nwere ike inwe nghọtahie ma ọ bụdị see ezigbo okwu. Pọl onyeozi kwuru na Ndị Kraịst bi na Rom nwere echiche dịrịta iche n’etiti onwe ha. Ọ dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Ka anyị na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.” (Rom 14:13, 19) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị “na-achụso ihe na-eweta udo”? Olee otú anyị nwere ike isi kata obi chụsoo udo?
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịchụso Udo?
E nwee ebe ụzọ gbawara obere, ọ bụrụ na e mezighị ya ngwa ngwa, o nwere ike ịghọ olulu nwere ike ịkpata ihe mberede. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị edozighị obere nghọtahie anyị na nwanna anyị nwere, o nwere ike ịghọ ihe ọzọ. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị: ‘Ahụrụ m Chineke n’anya,’ ma ọ kpọrọ nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha. N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.” (1 Jọn 4:20) Ọ bụrụ na Onye Kraịst na nwanna ya edozighị nghọtahie dị n’etiti ha, o nwere ike ime ka ha kpọọ ibe ha asị.
Jizọs Kraịst kwuru na Jehova agaghị anabata ofufe anyị ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ mee ka anyị na ndị ọzọ dị n’udo. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.” (Mat. 5:23, 24) N’ezie, otu ihe dị mkpa mere anyị ga-eji na-achụso udo bụ n’ihi na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ. *
Otu ihe mere n’ọgbakọ dị na Filipaị na-enyere anyị aka ịhụ ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-achụso udo. Otu nsogbu a na-ekwughị ihe ọ bụ nke dị n’etiti ụmụnna nwaanyị abụọ bụ́ Yuodia na Sintiki, chọrọ ịkpata nsogbu n’etiti ndị niile nọ n’ọgbakọ. (Fil. 4:2, 3) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ edozighị nsogbu dị n’etiti ha, o nwere ike ọ gaghị ara ahụ́ ya agbasa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ịhụnanya na ịdị n’otu dịgide n’ọgbakọ, anyị ga-agbalị hụ na anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị dị n’udo.
Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” (Mat. 5:9) Ịchụso udo na-eme ka anyị nwee ọṅụ na afọ ojuju. Ihe ọzọkwa bụ na udo na-eme ka mmadụ nwee ezi ahụ́ ike, n’ihi na “obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” (Ilu 14:30) N’aka nke ọzọ, ibu iwe n’obi nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ Ndị Kraịst kwetara na ọ dị mma ịchụso udo, i nwere ike ịdị na-eche otú ị ga-esi edozi nghọtahie gị na onye ọzọ nwere. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ kwuru ga-enyere anyị aka.
Iji Obi Umeala Kparịta Nsogbu Na-eme Ka Udo Dị
E nwere ike imezi ebe ụzọ mebiri obere site n’ịwụchi ebe ahụ. Ọ̀ ga-ekwe omume ịgbaghara obere mmejọ ma kpuchie ya? O yiri ka ime nke a ọ̀ ga-edozi ọtụtụ n’ime nghọtahie ndị dị n’etiti otu onye na ibe ya n’ihi na Pita onyeozi dere na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.
Ma, mgbe ụfọdụ, e nwere ike inwe nsogbu nke yiri ka anyị agaghị elegharali ya nnọọ anya. Tụlee ihe mere ndị Izrel obere oge ka ha banyechara n’Ala Nkwa ahụ. Tupu “ụmụ Ruben na ụmụ Gad nakwa ọkara ebo Manase” agaa biri n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, ha wuru “ebe ịchụàjà nke dị ukwuu n’ile anya.” Ụmụ Izrel ndị ọzọ chere na ha chọrọ iji ebe ịchụàjà ahụ fewe arụsị, wee kpebie na ha agaghị elegharali nnọọ nke ahụ anya. Ha jikeere ịga buso ha agha.—Jọsh. 22:9-12.
O nwere ike ụfọdụ ndị Izrel chere na e nwere nnọọ ihe ndị na-agba akaebe na ndị a etinyela aka n’ihe ọjọọ, ma chee na ọ ga-aka mma ma ha busoo ha agha ná mberede, ka a ghara inwe ọtụtụ ndị ga-anwụ. Ma, kama iji ọsọ gbaba n’agha ahụ, ebo ndị ahụ nọ n’ofe nke ọzọ nke Jọdan zigara ụfọdụ ndị ka ha na ụmụnne ha kparịta nsogbu ahụ. Ha jụrụ ha, sị: “Gịnị bụ omume ekwesịghị ntụkwasị obi nke a unu mesoro Chineke Izrel site n’ịkwụsị taa iso Jehova?” Nke bụ́ eziokwu bụ na ebo ndị ahụ wuru ebe ịchụàjà emeghị omume ekwesịghị ntụkwasị obi. Ma gịnị ka ha ga-eme n’ihi ebubo a e boro ha? Hà ga-amalite bawara ndị a na-ebo ha ebubo mba ma ọ bụ gba ha nkịtị? Ebo ndị ahụ e boro ebubo ji nnọọ obi umeala zaghachi ndị boro ha ebubo, kọwaara ha n’ụzọ doro anya na ihe mere ha ji mee ihe ahụ bụ n’ihi na ha chọrọ ịnọgide na-efe Jehova. Otú a ha si zaghachi mere ka ha na Chineke nọgide na-adị ná mma, meekwa ka a ghara ịla ndị mmadụ n’iyi. Obi nwayọọ ahụ ha ji kọwaa ihe merenụ mere ka udo dịghachi.—Jọsh. 22:13-34.
Tupu ndị Izrel ndị nke ọzọ ahụ ebusowe ụmụnne ha agha, ha gosiri na ha maara ihe site n’ịgakwuru ebo Ruben na ebo Gad na ọkara ebo Manase ka ha kwurịta nsogbu ahụ. Okwu Chineke na-agwa anyị, sị: “Adịla ngwa ná mmụọ gị Ekli. 7:9) Ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro anyị ga-esi na-edozi esemokwu dị n’etiti anyị na onye ọzọ bụ anyị na onye ahụ iji obi umeala kwurịta ya. Ànyị ga-atụ anya na Jehova ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eburu onye ọzọ iwe n’obi ma ghara ịgakwuru onye ahụ anyị weere na o mejọrọ anyị?
ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe anyị abịakwute anyị ka anyị na ya kwurịta nsogbu anyị nwere, ikekwe ya ebo anyị ihe anyị na-emeghị? Baịbụl na-ekwu, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) Ndị Izrel ahụ e boro ebubo ji obi umeala kọwaara nnọọ ụmụnne ha ihe mere ha ji mee ihe ha mere, si otú a mee ka iwe ha dajụọ. Ma ọ̀ bụ anyị gakwuuru nwanna anyị iji dozie nsogbu anyị na ya nwere ma ọ bụ ya bịakwutere anyị, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee ụdị ihe ọ ga-abụ m kwuo, ma ọ bụ ụdị olu m ga-eji kwuo ya, na omume ọ ga-abụ m mee ya akacha mee ka udo dị?’
Jiri Ire Gị Mee Ihe Otú Dị Mma
Jehova ghọtara na ọ na adị anyị mkpa ikwupụta ihe na-echegbu anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị agakwughị onye anyị na ya nwere nghọtahie ahụ iji dozie ya, o yikarịrị ka anyị ga-achọ onye ọzọ anyị ga-akọrọ ya. Mgbe anyị buuru mmadụ ihe n’obi, nke a nwere ike ime ka anyị na-ekwu okwu ọjọọ banyere onye ahụ. Ilu 11:11 kwuru banyere iji ire anyị eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, sị: “A na-etida [obodo] n’ihi ọnụ ndị ajọ omume.” N’otu aka ahụ, okwu mmadụ na-echeghị echiche kwuo banyere Onye Kraịst ibe ya nwere ike ime ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ anyị, bụ́ nke dị ka obodo.
Ma, ịchụso udo apụtaghị na anyị ga na-ezere ikwu ihe ọ bụla banyere ụmụnna anyị. Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.” Kwuokwa, sị: “Ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma. . . . Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.” (Efe. 4:29-32) Ọ bụrụ na otu nwanna ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere kpasuru iwe abịakwute gị, ọ́ gaghị akara gị mfe ịrịọ ya mgbaghara, gị na ya emeekwa udo, ma ọ bụrụ na nwanna ahụ na-agwabu ndị ọzọ okwu ọma banyere gị? N’ihi ya, ịdị na-ekwu okwu ọma banyere Ndị Kraịst ibe anyị ga-eme ka ọ dị mfe anyị na ha ime udo mgbe nsogbu dapụtara.—Luk 6:31.
‘Jirinụ Otu Obi Na-efe Chineke Ofufe’
N’ihi ezughị okè anyị, ihe anyị na-achọkarị bụ izere onye ọ bụla mejọrọ anyị, na-agbalị ka a ghara inwe ihe ọ bụla jikọrọ anyị na ya ọzọ. Ma nke ahụ ekwesịghị ekwesị. (Ilu 18:1) Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị dị n’otu na-akpọku aha Jehova, anyị kwesịrị ikpebisi ike iji “otu obi na-efe ya ofufe.”—Zef. 3:9.
Okwu ọjọọ ma ọ bụ omume ọjọọ mmadụ mesoro anyị ekwesịghị ime ka anyị laa azụ n’ife Jehova. Mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà, bụ́ nke nọchiri anya àjà ndị a na-achụ n’ụlọ nsọ, nke bụ́kwa obere oge ka ọ katọchara ndị odeakwụkwọ nọ n’ụlọ nsọ ahụ, Jizọs hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ na-atụnye “ihe niile o nwere o ji ebi ndụ” n’igbe a na-atụnye ego nke dị n’ụlọ nsọ ahụ. Jizọs ọ̀ baara ya mba ka ọ ghara ịtụnye obere ego ahụ? Kama ịbara ya mba, o kwuru ihe dị mma banyere otú o si jiri obi ya niile na-akwado nzukọ Jehova n’oge ahụ. (Luk 21:1-4) Nwaanyị ahụ ekweghị ka ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme mee ka ọ ghara ime ihe o kwesịrị ime, nke bụ́ ịkwado ofufe Jehova.
Ọ bụrụgodị na ọ dị anyị ka otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị kpara àgwà na-adịghị mma, ma ọ bụdị mesoo anyị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, gịnị ka anyị ga-eme? Ànyị ga-ekwe ka nke a mee ka anyị gharazie iji obi anyị niile na-ejere Jehova ozi? Ka ànyị ga-eji obi ike gaa dozie nghọtahie ọ bụla anyị na nwanna anyị ahụ nwere iji hụ na udo dịgidere n’ọgbakọ Chineke taa?
Akwụkwọ Nsọ dụrụ anyị ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Rom 12:18) Ka anyị kpebisie ike ime nke a, si otú a hụ na anyị nọgidere n’ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ị chọọ ịmatakwu banyere ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere na Matiu 18:15-17, gụọ Ụlọ Nche nke October 15, 1999, peeji nke 17-22.
[Foto dị na peeji nke 17]
O kwesịrị ka Yuodia na Sintiki chụsoo udo
[Foto dị na peeji nke 18]
Olee ụdị okwu, ụda olu, na omume ndị ga-akacha mee ka udo dị?