Na-ele Ahụ́ Ike Anya Otú Akwụkwọ Nsọ Si Ele Ya
Na-ele Ahụ́ Ike Anya Otú Akwụkwọ Nsọ Si Ele Ya
“Jiri . . . uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—MAK 12:30.
1. Olee ihe bụ́ nzube Chineke mgbe o kere mmadụ?
MGBE Jehova Chineke kere mmadụ, ọ bụghị nzube ya ka ha na-arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ. E debere Adam na Iv n’ogige Iden, ma ọ bụ na “paradaịs obi ụtọ,” ka ha “na-akụ ihe na ya ma na-elekọta ya,” ọ bụghị naanị ruo iri afọ asaa ma ọ bụ asatọ, kama ruo mgbe ebighị ebi. (Jen. 2:8, 15; Ọma 90:10) A sị na di na nwunye mbụ ahụ rubeere Jehova isi ma gosi na ha hụrụ ya n’anya site n’ikwe ka ọ na-achị ha, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha rịa ọrịa, kaa nká, ma ọ bụ nwụọ.
2, 3. (a) Olee otú e si kọwaa ịka nká n’akwụkwọ Ekliziastis? (b) Ònye kpatara ọnwụ anyị ketara n’aka Adam, oleekwa otú a ga-esi kwụsị ọnwụ?
2 Ekliziastis isi iri na abụọ kọwara nnọọ “oge ọdachi” nke ya na nká ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-aka so aga. (Gụọ Ekliziastis 12:1-7.) E ji isi awọ tụnyere ‘osisi almọnd mara ifuru.’ Jiri ụkwụ tụnyere “ndị ikom nwere ume,” bụ́ ndị huruziri ehuru ma na-amazi jijiji. Ndị inyom, bụ́ ndị na-elepụ anya na windo na-achọ ìhè ma ya abụrụ ọchịchịrị naanị ka ha na-ahụ, bụ nnọọ ihe atụ nke anya na-adịghịzi ahụcha ụzọ. Ebe ọ bụ na ezé ụfọdụ adapụla, ‘ndị inyom na-egwe nri akwụsịla ịrụ ọrụ n’ihi na ha dịzi ole na ole.’
3 O doro anya na Chineke ezubeghị ná mmalite ka ụmụ mmadụ nwee ụkwụ na-ama jijiji, anya na-adịghị ahụcha ụzọ, ma ọ bụ ka ezé gwụ ha n’ọnụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọnwụ anyị ketara n’aka Adam so ‘n’ọrụ Ekwensu’ ndị Ọkpara Chineke ga-eji Alaeze Mesaya ahụ bibie. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụ ihe a mere e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ya bụ, ka o wee bibie ọrụ Ekwensu.”—1 Jọn 3:8.
Ọ Dịghị Njọ Ichetụ Banyere Ahụ́ Ike Anyị
4. Gịnị mere ihe banyere ahụ́ ike ji echetụ ndị ohu Jehova echiche, ma olee ihe anyị kwesịrị icheta?
4 Ka ọ dị ugbu a, ndị ohu Jehova na-arịa ọrịa na-akakwa nká dị ka ọtụtụ ndị ọzọ bi n’ụwa. Ọ dịghị njọ anyị ịdị na-echetụ banyere nke a, ime otú a nwedịrị ike ịbara anyị uru. A sị kwuwe, ọ̀ bụ na anyị achọghị iji ‘ike anyị dum’ na-ejere Jehova ozi? (Mak 12:30) Ma ka anyị na-agbalị inwe ezi ahụ́ ike ruo n’ókè o kwere mee, anyị ekwesịghị ịtụ anya ihe na-agaghị ekwe omume. Anyị kwesịkwara icheta na mee elu mee ala, anyị enweghị ike ịgbanahụ ịka nká ma ọ bụ zetachaa ọrịa niile.
5. Olee ihe anyị nwere ike isi n’otú ndị ohu Chineke si die ọrịa ndị ha nwere mụta?
5 E nweela ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi rịara ọrịa dị iche iche. Epafrọdaịtọs bụ otu onye n’ime ha. (Fil. 2:25-27) Timoti, bụ́ onye ya na Pọl onyeozi jekọrọ ozi, rịara ọrịa afọ ọtụtụ ugboro, bụ́kwa nke mere Pọl ji gwa ya ka ọ na-aṅụ “ntakịrị mmanya.” (1 Tim. 5:23) Pọl n’onwe ya nwere “ogwu n’anụ ahụ́,” nke nwere ike ịbụ ọrịa anya ma ọ bụ ọrịa ọzọ na-enweghị ọgwụgwọ n’oge ahụ. (2 Kọr. 12:7; Gal. 4:15; 6:11) Pọl rịọsiri Jehova arịrịọ ike banyere ‘ogwu a dị n’anụ ahụ́ ya.’ (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:8-10.) Chineke arụghịrị Pọl ọrụ ebube wepụrụ ya ‘ogwu a dị n’anụ ahụ́ ya.’ Kama nke ahụ, Chineke nyere ya ike iji die ya. Ike Jehova si otú a pụta ìhè n’adịghị ike Pọl. È nwere ihe anyị ga-esi na nke a mụta?
Zere Ichegbu Onwe Gị Banyere Ahụ́ Ike
6, 7. Gịnị mere anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị banyere ahụ́ ike anyị?
6 Dị ka ị maara, Ndịàmà Jehova na-aga ụlọ ọgwụ mgbe ha na-arịa ọrịa ma na-anabatakwa ụzọ ndị ọzọ e si agwọ ọrịa. Ọtụtụ mgbe, a na-akọ banyere ọrịa dị iche iche na magazin anyị bụ́ Teta! Ọ bụ ezie na anyị adịghị ekwu kpọmkwem ụdị ọgwụgwọ ka mma, anyị nwere ekele maka enyemaka nke ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụ́ ike ndị ọzọ nakwa maka otú ha si ekwe agwọ anyị otú anyị si chọọ. N’eziokwu, anyị maara na ọ gaghị ekwe omume mmadụ ịnọ n’oge a na-arịaghị ọrịa ọ bụla. N’ihi ya, anyị maara na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe banyere ahụ́ ike anyị na-echu anyị ụra ma ọ bụ bụrụ ihe anyị ga na-akọ banyere ya mgbe niile. Otú anyị si ele ihe gbasara ahụ́ ike anya kwesịrị ịdị iche n’otú ndị ‘na-enweghị olileanya’ si ele ya. Ha chere na ndụ a anyị dị ugbu a bụ naanị ndụ dịnụ, n’ihi ya kwa, ha dị njikere ime ihe ọ bụla a sị ha mee ka ha wee dịrị ndụ. (Efe. 2:2, 12) Anyị ekpebisiela ike na anyị agaghị eme ihe ọ bụla ga-ewe Jehova iwe iji nọgide na-adị ndụ ugbu a, n’ihi na obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị anọgide na-erubere Chineke isi, anyị ‘ga-ejidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ nke bụ́ ndụ ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ nke o kwere ná nkwa.—1 Tim. 6:12, 19; 2 Pita 3:13.
7 E nwere ihe ọzọ mere anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị banyere ahụ́ ike anyị. Ịdị na-echegbu onwe anyị mgbe niile banyere ahụ́ ike anyị nwere ike ime ka anyị na-eche naanị banyere onwe anyị. Pọl dọrọ aka ná ntị ka e zere nke a mgbe ọ gwara ndị Filipaị ka ha “na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe [ha], kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Fil. 2:4) Anyị kwesịrị ilebara onwe anyị anya ruo n’ókè kwesịrị, ma ọ bụrụ na anyị eburu ọdịmma ụmụnna anyị na nke ndị anyị na-ekwusara “ozi ọma nke a nke alaeze” n’uche, ọ ga-egbochi anyị ịnọ na-echegbu onwe anyị banyere ahụ́ ike anyị.—Mat. 24:14.
8. Olee ihe ichegbu onwe anyị banyere ahụ́ ike anyị nwere ike iduga anyị imewe?
8 Ọ dị mfe Onye Kraịst ikwe ka nchegbu banyere ahụ́ ike ya mee ka o kwụsị ibute ihe ndị metụtara Alaeze Chineke ụzọ. Ikwe ka ihe banyere ahụ́ ike na-echu anyị ụra nwekwara ike ime ka anyị kwanye ndị ọzọ ilewe ihe anya otú anyị si ele ya mgbe a bịara ná nri ụfọdụ, ma ọ bụ ụzọ ụfọdụ e si agwọ ọrịa, ma ọ bụ n’ọgwụ ndị na-edozi ahụ́. Tụlegodị otú otu ihe Pọl dere pụrụ isi nyere anyị aka na nke a. Ọ sịrị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa, ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ, gharakwa ịbụ ndị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ ruo ụbọchị nke Kraịst.”—Fil. 1:10.
Olee Ihe Ka Mkpa?
9. Olee otu n’ime ihe ndị ka mkpa anyị na-ekwesịghị ileghara anya, n’ihi gịnịkwa?
9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịchọpụta ihe ndị ka mkpa, anyị ga-adị uchu n’ọrụ inyere ndị mmadụ aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Anyị na-eme nke a site n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Ọrụ a na-enye ọṅụ na-abara ma anyị ma ndị anyị na-ekwusara ya uru. (Ilu 17:22; 1 Tim. 4:15, 16) Site n’oge ruo n’oge, a na-enwe isiokwu ndị na-agba na magazin Ụlọ Nche na Teta! banyere ụfọdụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị na-arịa ọrịa dị ike. Mgbe ụfọdụ, ha na-akọ otú ha si die nsogbu ha, ma ọ bụdị otú ha si nwee ike iwepụ obi na ya site n’ịgbalị inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova na nkwa ya ndị dị ebube. *
10. Gịnị mere anyị ji kwesị ichebara ụzọ anyị họọrọ ka e si gwọọ anyị echiche?
10 Mgbe Onye Kraịst ọ bụla torola eto na-arịa Gal. 6:5) Ma anyị kwesịrị icheta na otú anyị họọrọ ka e si gwọọ anyị gbasara Jehova. Dị nnọọ ka ùgwù anyị na-akwanyere Baịbụl na-eme ka anyị ‘zere ọbara,’ otú ahụ ka ùgwù anyị na-akwanyere nnọọ Okwu Chineke kwesịrị ịkpali anyị izere ụdị ọgwụgwọ ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ma ọ bụ mebie adịm ná mma anyị na Jehova. (Ọrụ 15:20) Ụfọdụ ụzọ e si achọpụta ihe mmadụ na-arịa na ụzọ e si agwọ ọrịa nwere ihe jikọrọ ha na ime mgbaasị. Jehova jụrụ ndị Izrel si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị tinyere aka n’ime “anwansi,” ma ọ bụ mgbaasị. Ọ gwara ha, sị: “Kwụsịnụ iwebata àjà ọka na-abaghị uru. Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ unu bụ ihe arụ n’anya m. Ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ na ụbọchị izu ike unu, ịkpọ òkù ka e nwee mgbakọ, apụghị m ịnabata ime anwansi nakwa nzukọ ukwu.” (Aịza. 1:13) Mgbe mmadụ nọ n’ọrịa ekwesịtụghị ịbụ oge onye ahụ ga-eji mee ihe nwere ike igbochi ekpere ya iru Chineke ntị ma mebie adịm ná mma ya na Chineke.—Ákwá 3:44.
ọrịa, ọ bụ ya “ga-ebu ibu nke ya” mgbe a bịara n’ịhọrọ otú a ga-esi gwọọ ya. (Ọ Dị Mkpa Inwe ‘Uche Zuru Okè’
11, 12. Olee uru inwe ‘uche zuru okè’ na-abara anyị mgbe anyị na-ahọrọ otú a ga-esi gwọọ anyị ọrịa?
11 Mgbe anyị na-arịa ọrịa, anyị agaghị atụwa anya ka Jehova si n’ụzọ ọrụ ebube gwọọ anyị, ma anyị nwere ike ikpe ekpere ka o nye anyị amamihe mgbe anyị na-ahọrọ otú a ga-esi agwọ anyị. Anyị kwesịrị ikwe ka Akwụkwọ Nsọ na-eduzi anyị ma jiri ezi uche na-eme ihe mgbe anyị na-ahọrọ otú anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị. Ọ bụrụ na ọrịa ahụ aka njọ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị hụ ihe karịrị otu dọkịta ndị bụ́ ọkachamara n’ịgwọ ọrịa ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Ime nke a kwekọrọ n’ihe Ilu 15:22 kwuru, nke na-asị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ‘na-ebi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.’—Taị. 2:12.
12 Ọ dị ọtụtụ ndị taa otú ọ dị otu nwaanyị na-arịa ọrịa n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Na Mak 5:25, 26, anyị na-agụ, sị: “E nwere otu nwaanyị nke na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ, ọ tawo ahụhụ nke ukwu n’aka ọtụtụ ndị ọgwọ ọrịa, o mefuwokwa ihe niile o nwere, ma o nwebeghị nke baara ya uru, kama nke ahụ, ọ kara njọ.” Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ nwaanyị ahụ ma gwọọ ya. (Mak 5:27-34) N’ihi amaghị ihe ha ga-eme, a nwatala ụfọdụ Ndị Kraịst ịhọrọ ụzọ e si achọpụta ihe na-arịa mmadụ ma ọ bụ ụzọ e si agwọ ọrịa, bụ́ ndị megidere iwu Chineke.
13, 14. (a) Olee otú Setan nwere ike isi jiri ụdị ọgwụgwọ anyị họọrọ mee ka anyị nupụrụ Jehova isi? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere ihe ọ bụla metụtara anwansi?
13 Setan ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji hụ na anyị kwụsịrị ife Chineke. Dị nnọọ ka ọ na-eji mmekọahụ rụrụ arụ na ịhụ ihe onwunwe n’anya eme ka ụfọdụ mehie, ọ na-agbalịkwa ime ka ndị ọzọ nupụrụ Jehova isi site n’ime ka ha họrọ ụdị ọgwụgwọ ndị metụtara Mat. 6:13; Taị. 2:14.
ime mgbaasị na anwansi. Anyị na-arịọ Jehova n’ekpere ka ọ napụta anyị n’aka “ajọ onye ahụ” nakwa “n’ụdị mmebi iwu niile.” N’ihi ya, anyị ekwesịghị iwere onwe anyị tinye n’aka Setan site n’itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara mgbaasị na anwansi.—14 Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha ghara ịgba afa ma ọ bụ mee anwansi. (Diut. 18:10-12) Pọl gụnyere “ime mgbaasị” ‘n’ọrụ nke anụ ahụ́.’ (Gal. 5:19, 20) Ihe ọzọkwa bụ na “ndị na-eme mgbaasị” agaghị anọ n’usoro ihe ọhụrụ Jehova. (Mkpu. 21:8) N’ihi ya, o doro anya na Jehova kpọrọ ihe ọ bụla metụtara mgbaasị asị.
‘Meenụ Ka A Mara Na Unu Nwere Ezi Uche’
15, 16. Gịnị mere amamihe ji dị anyị mkpa mgbe anyị na-ahọrọ ụzọ a ga-esi agwọ anyị ọrịa, oleekwa ndụmọdụ bara uru òtù na-achị isi narị afọ mbụ nyere?
15 N’ihi ihe ndị a niile anyị tụlere, ọ bụrụ na anyị enwee obi abụọ ma ụzọ ụfọdụ e si achọpụta ọrịa ma ọ bụ agwọ ya ò kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na o kwesịghị, ọ ga-aka mma ịhapụ ya. N’eziokwu, naanị na anyị aghọtaghị ụzọ e si achọpụta ma ọ bụ agwọ otu ọrịa apụtaghị na e nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị. Ile ahụ́ ike anya otú Akwụkwọ Nsọ si ele ya chọrọ anyị inwe amamihe dabeere n’Okwu Chineke nakwa inwe nghọta. N’Ilu isi 3, anyị na-ahụ ndụmọdụ a: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ. . . . Chekwaa ezi amamihe na ikike iche echiche, ha ga-abụkwara mkpụrụ obi gị ndụ.”—Ilu 3:5, 6, 21, 22.
16 Ka anyị na-agbalị inwe ezi ahụ́ ike ruo ókè o kwere mee, anyị kwesịkwara ilezi anya ka anyị ghara ime ihe ga-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma ebe anyị na-achọ ụzọ anyị ga-esi gwọọ ọrịa anyị na-arịa ma ọ bụkwanụ na-achọ ihe anyị ga-eme banyere nsogbu ndị ha na nká so. Dị ka ọ dị n’ihe ndị ọzọ, mgbe a bịara n’ihe metụtara ahụ́ ike, anyị kwesịrị ‘ime ka mmadụ niile mara na anyị nwere ezi uche’ site n’ime ihe ndị Baịbụl kwadoro. (Fil. 4:5) N’otu akwụkwọ ozi dị oké mkpa òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ degaara Ndị Kraịst, ha gwara ha zere ikpere arụsị, ọbara na ịkwa iko. E dekwara okwu a na-emesi obi ike n’akwụkwọ ozi ahụ: “Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma.” (Ọrụ 15:28, 29) Olee otú ọ ga-esi dịrị ha ná mma?
Ilebara Ahụ́ Ike Anyị Anya Taa Otú Kwesịrị ma Buru n’Obi na A Ga-enwe Ahụ́ Ike Zuru Ezu n’Ọdịnihu
17. Olee uru anyị riterela n’ụzọ anụ ahụ́ n’ihi irube isi n’iwu ndị dị na Baịbụl?
17 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Àchọpụtala m uru ndị m riterela n’ihi irube nnọọ isi n’iwu ndị dị na Baịbụl banyere ọbara na ịkwa iko?’ Chetụkwala uru ndị anyị riterela n’ihi mgbalị ndị anyị na-eme ‘ịsachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.’ (2 Kọr. 7:1) Anyị na-ezere ọtụtụ ọrịa mgbe anyị rubere isi n’iwu ndị Baịbụl nyere banyere ịdị ọcha. Ọ na-adịrị anyị mma n’ihi na anyị na-ezere ise sịga na ịṅụ ọgwụ ike, bụ́ ihe ndị na-emebi ahụ́, na-emekwa ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. Cheekwa banyere uru anyị na-erite n’ihi na anyị adịghị eribiga nri ókè ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. (Gụọ Ilu 23:20; Taịtọs 2:2, 3.) Ọ bụ ezie na izu ike na imega ahụ́ nwere ike ime ka ahụ́ gbasie mmadụ ike, ihe kasị mee ka ihe dịrị anyị mma n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ bụ ikwere ka Akwụkwọ Nsọ na-eduzi anyị.
18. Olee ihe bụ́ isi kwesịrị ichegbu anyị, oleekwa amụma banyere ahụ́ ike anyị na-atụ anya mmezu ya?
18 Nke kachanụ bụ na anyị kwesịrị ilebara ọnọdụ ime mmụọ anyị anya ma hụ na anyị mere ka adịm ná mma dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Nna anyị nke eluigwe sikwuo ike. Ọ bụ Nna anyị nke eluigwe bụ Isi Iyi nke ‘ndụ anyị dị ugbu a, na ndụ nke gaje ịbịa’ n’ime ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa. (1 Tim. 4:8; Ọma 36:9) N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, anyị ga-enwe ahụ́ ike zuru ezu ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ ime mmụọ. Nke a ga-emezu mgbe a ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà mgbapụta Jizọs. Nwa Atụrụ Chineke, nke bụ́ Jizọs Kraịst, ga-eduga anyị “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya anyị. (Mkpu. 7:14-17; 22:1, 2) N’oge ahụkwa, anyị ga-ahụ mmezu nke amụma a na-enye obi ụtọ: “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịza. 33:24.
19. Ka anyị na-agbalị ilebara ahụ́ ike anyị anya otú o kwere mee, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?
19 Obi siri anyị ike na nnapụta anyị dị nso, anyị na-atụsikwa anya ike ụbọchị Jehova ga-eme ka ọrịa na ọnwụ ghara ịdị. Ka ọ dịgodị, obi siri anyị ike na Nna anyị nke na-ahụ n’anya ga-enyere anyị aka idi ọrịa ndị anyị nwere ugbu a n’ihi na ‘ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) N’ihi ya, ka anyị gbalịa lebara ahụ́ ike anyị anya, ma hụ na anyị na-eme nke a mgbe niile n’ụzọ kwekọrọ ná ntụziaka dị n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 E depụtara ụfọdụ isiokwu ndị ahụ n’igbe dị na peeji nke 17 n’Ụlọ Nche September 1, 2003.
Ntụleghachi
• Ònye na-akpata ọrịa, ònyekwa ga-anapụta anyị ná nsogbu niile mmehie na-akpatara anyị?
• Ọ bụ ezie na ọ dịghị njọ mmadụ iche banyere ahụ́ ike ya, olee ihe anyị kwesịrị izere?
• Gịnị mere otú anyị họọrọ ka e si gwọọ anyị ji gbasa Jehova?
• A bịa n’ihe metụtara ahụ́ ike anyị, olee uru anyị ga-erite n’irube isi n’iwu ndị dị na Baịbụl?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
E keghị ụmụ mmadụ ka ha na-arịa ọrịa ma na-aka nká
[Foto dị na peeji nke 25]
N’agbanyeghị ọrịa, ndị Jehova na-eji ọṅụ eje ozi ọma