A Na-ahụ Amamihe Jehova n’Ihe Ndị O Kere
A Na-ahụ Amamihe Jehova n’Ihe Ndị O Kere
“Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya ka . . . a na-aghọta . . . site n’ihe ndị e kere eke.”—ROM 1:20.
1. Olee ihe amamihe ụwa a na-eme ọtụtụ ndị taa?
A NA-AKPỌ ọtụtụ ndị ndị amamihe, n’agbanyeghị na ha amaghị ihe ọ bụla. Ụfọdụ ndị na-ewere onye gụrụ oké akwụkwọ dị ka onye ma ihe. Ma, ndị ụwa a weere ná ndị ma ihe anaghị enye ndị mmadụ nduzi ga-abara ha uru ná ndụ. Kama inye ha nduzi ga-abara ha uru, ndị nabatara nduzi ha na-abụ ndị “ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.”—Efe. 4:14.
2, 3. (a) Gịnị mere o ji bụrụ ‘naanị Jehova maara ihe’? (b) Olee otú amamihe Chineke si dị iche n’amamihe ụwa?
2 Nke a anaghị emetụta ndị nwere ezigbo amamihe, bụ́ nke si n’aka Jehova Chineke. Baịbụl gwara anyị na Jehova bụ “onye naanị ya maara ihe.” (Rom 16:27) Ọ maara ihe niile banyere eluigwe na ụwa, ọ maara otú e si kee ha na mgbe e kere ha. Iwu niile na-achị ihe niile e kere eke, bụ́ ndị na-enyere ụmụ mmadụ aka ime nnyocha dị iche iche, si n’aka Jehova. N’ihi ya, ihe ndị ụmụ mmadụ na-echepụta na ihe ndị ha na-emepụta, bụ́ ndị a na-ewere na ha dị egwu, enweghị ihe ha bụ n’anya ya. “Amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—1 Kọr. 3:19.
3 Baịbụl gwara anyị na Jehova ‘na-enye ndị ohu ya amamihe.’ (Ilu 2:6) Amamihe si n’aka Chineke adịghị ka amamihe mmadụ, bụ́ nke na-anaghị edo anya. Kama nke ahụ, amamihe Chineke na-enyere mmadụ aka ime mkpebi ziri ezi n’ihi na onye ahụ nwere ezi ihe ọmụma na nghọta. (Gụọ Jems 3:17.) Amamihe Jehova tụrụ Pọl onyeozi n’anya. O dere, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya, na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!” (Rom 11:33) Ebe ọ bụ na Jehova kacha nwee amamihe, obi siri anyị ike na ihe ga-adịrị anyị mma ma ọ bụrụ na anyị na-edebe iwu ya. A sị kwuwe, Jehova ka onye ọ bụla mara ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ.—Ilu 3:5, 6.
Jizọs Bụ “Onye Ọkà Ọrụ”
4. Olee otu n’ime ụzọ anyị nwere ike isi mata na Jehova nwere amamihe?
4 A na-ahụ amamihe Jehova na àgwà ya ndị ọzọ na-enweghị atụ n’ihe ndị o kere eke. (Gụọ Ndị Rom 1:20.) Ihe niile Jehova kere, ma ndị kacha ukwuu ma ndị kacha nta, na-eme ka anyị mata àgwà ya dị iche iche. Ebe ọ bụla anyị lere anya, ma n’eluigwe ma n’ụwa, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe na-egosi na Onye kere anyị kacha nwee amamihe na ịhụnanya. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere Jehova site n’ịtụle ihe ndị o kere.—Ọma 19:1; Aịza. 40:26.
5, 6. (a) Olee onye ọzọ kere ihe ma e wezụga Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
5 Ọ bụghị naanị Jehova nọ mgbe o “kere eluigwe na ụwa.” (Jen. 1:1) Baịbụl gosiri na ogologo oge dị anya gara aga tupu Jehova amalite ike ihe ndị anyị na-ahụ anya, o kere otu onye bụ́ mmụọ, bụ́ onye o si n’aka ya kee “ihe ndị ọzọ niile.” Mmụọ ahụ o kere bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, bụ́ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” onye mechara ghọọ mmadụ a kpọrọ Jizọs. (Kọl. 1:15-17) Jizọs nwere amamihe dị ka Jehova nwere. Ilu isi asatọ kpọrọ ya amamihe. Ebe ahụ kpọkwara ya “onye ọkà ọrụ.”—Ilu 8:12, 22-31.
6 Ya mere, ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya na-egosi na Jehova na Onye Ọkà Ọrụ ya, bụ́ Jizọs, ma ihe. Ha na-akụziri anyị ihe bara uru. Ka anyị tụlee ihe anọ e kwuru n’Ilu 30:24-28 na ha nwere ‘amamihe ha bụ bu pụta ụwa.’ *
Ndanda Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Dịrị Uchu
7, 8. Olee ihe ụfọdụ na-amasị gị banyere ndanda?
7 Ọ bụrụ na anyị enyochaa otú ihe ndị a sị na ha “kasị nta n’ụwa” dị, nakwa otú ha si eme, ha nwere ike ịkụziri anyị ihe. Dị ka ihe atụ, tụlee ụdị amamihe ndanda bu pụta ụwa.—Gụọ Ilu 30:24, 25.
8 Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị na-eme nnyocha, kwuru na e kee ndanda dị n’ụwa ekee, otu onye ga-eketa narị puku abụọ. Ha niile na-arụsikwa ọrụ ike. Ndanda na-anọ n’ìgwè n’ìgwè. N’ọtụtụ ìgwè, a na-enwe ụdị ndanda atọ: ndị nne, ndị oké, na ndị nke na-arụ ọrụ. Ụdị ndanda atọ a na-agbasi mbọ ike ịhụ na e gboro mkpa ndanda niile nọ n’ìgwè ha. O nwere otu ụdị ndanda bụ́ aka ochie n’ịkụ ihe n’ubi nakwa n’ilekọta ihe ha kụrụ n’ubi. Ha na-akụta akwụkwọ ma jiri ya mee ka ubi ha na-eme nke ọma. Ha na-adọgharịkwa ihe ha kụrụ n’ubi, na-elekọtakwa ha ka ubi ha wee mee nke ọma. Ndị na-eme nnyocha achọpụtala na ụdị ndanda a na-agbalịsi ike ịhụ na ha nwere nri ga-ezuru ha. *
9, 10. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie otú ndanda si arụsi ọrụ ike?
9 Ndanda nwere ike ịkụziri anyị ọtụtụ ihe. Ha na-akụziri anyị na anyị aghaghị ịgbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụpụta ezigbo ihe. Baịbụl gwara anyị, sị: “Gakwuru ndanda, gị onye umengwụ; hụ ụzọ ya wee mara ihe. Ọ bụ ezie na o nweghị ọchịagha, onyeisi ma ọ bụ onye na-achị achị, ọ na-akwadebe ihe oriri ya n’ọkọchị; ọ chịkọtawo ihe oriri ya n’oge owuwe ihe ubi.” (Ilu 6:6-8) Ma Jehova ma Onye Ọkà Ọrụ ya, bụ́ Jizọs, na-arụsi ọrụ ike. Jizọs kwuru, sị: “Nna m anọwo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọwokwa m na-arụ ọrụ.”—Jọn 5:17.
10 Ebe anyị bụ ndị na-eṅomi Chineke na Kraịst, anyị kwesịkwara ịna-arụsi ọrụ ike. N’agbanyeghị ụdị ọrụ anyị na-arụ n’ọgbakọ Chineke, anyị niile kwesịrị inwe ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị mee ihe Pọl dụrụ Ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ ka ha mee. Ọ sịrị: “Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme. Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi. Bụrụnụ ndị ohu Jehova.” (Rom 12:11) Mgbalị anyị na-eme ime uche Jehova abụghị n’efu n’ihi na Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma ka na-eje ozi.”—Hib. 6:10.
Ịhụ na Anyị na Chineke Nọgidere Na-adị ná Mma
11. Kwuo ihe ụfọdụ e ji mara ewi nkume.
11 Ewi nkume bụ anụ ọzọ dị obere nke nwere ike ịkụziri anyị ihe bara uru. (Gụọ Ilu 30:26.) O yiri nnukwu oké bekee, ma o nwere obere ntị dị gburugburu, ụkwụ ya dịkwa mkpụmkpụ. Ọ na-ebi ebe bụ́ nkume nkume. Anya ya ndị na-enwu gbaa na-enyere ya aka, ọnụ ọ na-atụ n’ebe bụ́ nkume nkume na-eme ka ọ gbanahụ anụ ọ bụla bịara igbu ya. Ahụ́ na-erukarị ewi nkume ala n’ebe ha hiri nne. Nke a na-echebe ha ma na-eme ka ahụ́ na-ekpo ha ọkụ n’oge oyi. *
12, 13. Olee ihe ewi nkume nwere ike ịkụziri anyị?
12 Gịnị ka ewi nkume nwere ike ịkụziri anyị? Nke mbụ bụ na ọ naghị eme ihe ga-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ. Kama nke ahụ, ọ na-ahụ anụ ọ bụla nwere ike igbu ya mgbe anụ ahụ ka nọ ebe dị anya. Ọ na-anọkwa nso n’ebe ọ tụrụ ọnụ ka o wee nwee ike ịgbaba ma nsogbu bịa. Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ ka anyị wee nwee ike ịmata ebe dị iche iche ihe ize ndụ dị n’ụwa Setan. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Jizọs nọ ná nche mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ bụ ya mere mbọ niile Setan gbara iji mee ka ọ kwụsị ime uche Chineke ji kụọ afọ n’ala. (Mat. 4:1-11) Jizọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ezigbo ihe nlereanya!
13 Otu n’ime ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị mụ anya bụ ime ihe dị iche iche Jehova chọrọ ka anyị na-eme, bụ́ ndị ga-enye aka mee ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma. Anyị kwesịrị ịna-amụchi Okwu Chineke anya, kwesịkwa ịna-agachi ọmụmụ ihe anya. (Luk 4:4; Hib. 10:24, 25) Dịkwa nnọọ ka ahụ́ na-eru ewi nkume ala mgbe ha nọ n’ìgwè, anyị kwesịrị ịna-anọ ụmụnna anyị nso ka “anyị wee gbarịta ibe anyị ume.” (Rom 1:12) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ndị a Jehova chọrọ ka anyị na-eme ka anyị na ya wee nọgide na-adị ná mma, anyị na-egosi na anyị kweere ihe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru mgbe o dere, sị: “Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ. Chineke m bụ oké nkume m. M ga-agbaba n’ime ya.”—Ọma 18:2.
Ịtachi Obi n’Agbanyeghị Mmegide
14. Ọ bụ ezie na otu igurube nwere ike iyi ka ọ gaghị eme ihe ga-atụ mmadụ n’anya, gịnị ka ìgwè igurube nwere ike ime?
14 Igurube nwekwara ike ịkụziri anyị ihe. Otu igurube, nke na-adị naanị ihe dị ka sentimita ise n’ogologo, nwere ike iyi ihe na-agaghị eme ihe ga-atụ mmadụ n’anya, ma, ìgwè igurube nwere ike ime ihe ga-atụ gị n’anya. (Gụọ Ilu 30:27.) Igurube na-eri oké nri, ìgwè igurube nwere ike irichapụ nnukwu ihe dị n’ubi n’otu ntabi anya. Baịbụl ji ụda ìgwè igurube nke kwooro na-abịa tụnyere ìgwè ndị agha gbaara ụgbọ ịnyịnya ha na-abịa, jirikwa ya tụnyere ụda ọkụ nke na-agba oké ọhịa. (Joel 2:3, 5) Ụfọdụ ndị na-esunye ọhịa ọkụ iji kwụsị ìgwè igurube kwooro na-abịa, ma nke a anaghị akwụsị ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na igurube ndị nke ọkụ gbagburu na-emenyụ ọkụ ahụ, ndị nke fọrọ ndụ efere na-aga ebe ha na-aga. Ọ bụ ezie na igurube enweghị eze, ma ọ bụ onye ndú, ha na-arụ ọrụ ka ụsụụ ndị agha a haziri nke ọma, nke na-emeri ihe mgbochi ọ bụla. *—Joel 2:25.
15, 16. Olee otú ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge a si yie ìgwè igurube?
15 Joel onye amụma ji ọrụ ndị ohu Jehova na-arụ tụnyere otú igurube si akpa ike. O dere, sị: “Ha na-agba ọsọ dị ka ndị dị ike. Ha na-arịgo mgbidi dị ka ndị agha. Ha na-agakwa, onye ọ bụla n’ụzọ nke ya, ha adịghị ahapụ ụzọ ha. Ha adịghịkwa enupụ ibe ha. Ha na-aga dị ka dimkpa nke na-aga ebe ọ na-aga n’eleghị anya n’azụ; ọ bụrụgodị na akụ́ ụta atụta ụfọdụ, ndị nke ọzọ adịghị akwụsị ịga ebe ha na-aga.”—Joel 2:7, 8.
16 Amụma a kọwara nnọọ otú ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge a si arụ ọrụ. O nweghị ụdị mmegide ọ bụla nke yiri “mgbidi” nke merela ka Aịza. 53:3) Ọ bụ ezie na ‘akụ́ ụta atụtala’ ụfọdụ Ndị Kraịst, ya bụ, e gbuola ụfọdụ n’ime ha n’ihi okwukwe ha, ma, a ka na-ekwusa ozi ọma, ọnụ ọgụgụ ndị na-ekwusa ya na-amụbakwa. Mkpagbu na-emekarị ka ndị na-agaraghị anụ ozi ọma Alaeze Chineke nụ ya. (Ọrụ 8:1, 4) Dị ka igurube na-anọgide na-aga n’agbanyeghị ihe mgbochi ọ bụla bịaara ha, ị̀ na-anọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ndị na-enweghị mmasị n’ozi ọma, nweekwa ndị na-emegide gị?—Hib. 10:39.
ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Kama nke ahụ, ha na-eṅomi Jizọs, bụ́ onye nọgidere na-eme uche Chineke n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị ledara ya anya. (“Jidesienụ Ezi Ihe Ike”
17. Gịnị mere ụkwụ agụ ụlọ ji anyagide n’ebe na-akwọ mụrụmụrụ?
17 Obere agụ ụlọ na-eyi ka o nweghị ike ịda elu. (Gụọ Ilu 30:28.) N’eziokwu, ọ na-atụ ndị ọkà mmụta sayensị n’anya otú obere anụ a si arịgharị n’ahụ́ ájá nakwa n’uko ụlọ nke na-akwọ mụrụmụrụ n’adaghị ada. Olee otú agụ ụlọ si eme nke a? Ọ bụghị n’ihi na mgbá dị ya n’ụkwụ. Kama nke ahụ, mkpịsị ụkwụ ya nwere ezé. Nke ọ bụla n’ime ụmụ irighiri ezé ndị a nwere ihe yiri ajị nke dị ọtụtụ narị. Otú ihe ndị a yiri ajị si anyagide n’ihe na-eme ka agụ ụlọ ghara ịda, ọ bụrụgodị na ọ na-arịgharị n’ihu enyo na-akwọ mụrụmụrụ. N’ihi otú agụ ụlọ si atụ ndị na-eme nnyocha n’anya, ha kwuru na ọ ga-esi ike ịnyakapụ ihe ọ bụla a rụrụ ka ọ na-anyagide n’ihe otú ụkwụ agụ ụlọ si anyagide. *
18. Olee otú anyị nwere ike isi ‘jidesie ezi ihe ike’?
18 Gịnị ka agụ ụlọ na-akụziri anyị? Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.” (Rom 12:9) Omume rụrụ arụ juru n’ụwa Setan nwere ike ime ka anyị kwụsị ime ihe Chineke nyere n’iwu. Dị ka ihe atụ, anyị na ndị na-anaghị edebe iwu Chineke ịkpakọrịta n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma ọ bụ site n’iji ihe ndị na-anaghị amasị Chineke na-atụrụ ndụ, nwere ike ime ka anyị kwụsị ime ezi ihe. Ekwela ka nke ahụ mee gị! Okwu Chineke dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Abụla onye maara ihe n’anya onwe gị.” (Ilu 3:7) Kama nke ahụ, na-eme ihe amamihe dị na ya nke Mozis dụrụ ndị Chineke ọdụ n’oge ochie ka ha mee. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu. Ọ bụ ya ka ị ga-ejere ozi, n’ahụ́ ya ka ị ga-araparakwa.” (Diut. 10:20) Ọ bụrụ na anyị arapara Jehova n’ahụ́, anyị na-eṅomi Jizọs, bụ́ onye e kwuru banyere ya, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị.”—Hib. 1:9.
Ihe Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị
19. (a) Olee àgwà Jehova ndị ị na-ahụ n’ihe ndị o kere? (b) Olee otú amamihe Chineke nwere ike isi baara anyị uru?
19 Dị ka anyị chọpụtarala, a na-ahụ àgwà dị iche iche Jehova nwere n’ihe ndị o kere. Ihe ndị o kere eke na-akụzikwara anyị ihe bara uru. Ka anyị na-amụtakwu banyere ihe dị iche iche Jehova kere, amamihe ya na-atụkwu anyị n’anya. Ịmụ banyere amamihe Chineke ga-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ ugbu a, ọ ga-echebekwa anyị n’ọdịnihu. (Ekli. 7:12) N’ezie, anyị ga-achọpụta na okwu ahụ e kwuru n’Ilu 3:13, 18 bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye chọtaworo amamihe, na onye nwetara nghọta, ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ndị na-eto eto nwere ike ịgụ Teta! ndị e kwuru okwu ha n’ala ala peeji ndị dị n’isiokwu a ka ha wee nwee ike ikwu ihe ha gụtara mgbe a ga-amụ isiokwu a n’ọgbakọ.
^ par. 8 Ị chọọ ịmatakwu banyere ndanda a na-akụta ahịhịa, gụọ Teta! Bekee nke March 22, 1997, peeji nke 31, nakwa Teta! September 8, 2002, peeji nke 31.
^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ewi nkume, gụọ Teta! Bekee nke September 8, 1990, peeji nke 15-16.
^ par. 14 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere igurube, gụọ Teta! Bekee nke October 22, 1976, peeji nke 11.
^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere agụ ụlọ, gụọ Teta! nke February 8, 2001, peeji nke 30.
Ì Chetara?
Gịnị ka ihe ndị a na-akụziri anyị?
• Ndanda
• Ewi nkume
• Igurube
• Agụ ụlọ
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 16]
Ị̀ dị uchu ka ndanda na-akụta ahịhịa?
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ewi nkume na-agbanahụ nsogbu ma ọ nọrọ n’etiti ìgwè ewi ibe ya. Ị̀ na-eme otú ahụ?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma, na-anọgidesi ike ka igurube
[Foto dị na peeji nke 18]
Dị nnọọ ka agụ ụlọ na-anyagidesi ụkwụ ike n’ihe, Ndị Kraịst na-ejidesi ezi ihe ike
[Ebe E Si Nweta Foto]
Stockbyte/Getty Images