Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azatali ajụjụ ndị a na-esonụ:
• Nwa nwụrụ n’afọ nne ya ò nwere ike ibilite n’ọnwụ?
Ndụ mmadụ na-amalite mgbe a tụụrụ ime ya. Jehova nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’agbanyeghị ma ọ̀ nwụrụ n’afọ ma ọ bụkwanụ na o toola tupu nwụọ, n’ihi na “ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:27) Ma, Baịbụl ekwughị kpọmkwem ma ọ̀ ga-akpọlite nwa nwụrụ n’afọ ma ọ bụ na ọ gaghị akpọlite ya.—4/15, peeji nke 12, 13.
• Ò nwere ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndanda, ewi nkume, igurube, na agụ ụlọ?
Anụ anọ ndị a bu amamihe pụta ụwa. Amamihe ha bu pụta ụwa na-egosi na Chineke nwere amamihe. (Ilu 30:24-28)—4/15, peeji nke 16-19.
• Olee otu ihe dị mkpa nke mere n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova otu narị afọ gara aga?
N’afọ 1909, e si na Pittsburgh, Pennsylvania, bufee isi ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society na Brooklyn, New York. Watch Tower Bible and Tract Society bụ ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke na-ebiri Ndịàmà Jehova akwụkwọ. A ka nọ na Brooklyn, New York, na-arụsi ọrụ ike.—5/1, peeji nke 22-24.
• N’ihi gịnị ka Baịbụl ji kwuo na ọ dị mma ịgbachi nkịtị?
Baịbụl gosiri na ịgbachi nkịtị nwere ike igosi na anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ, nakwa na ọ na-enyere anyị aka ịtụgharị uche, na-egosikwa na anyị ma ihe, nweekwa nghọta. (Ọma 37:7; 63:6; Ilu 11:12)—5/15, peeji nke 3-5.
• Olee otu ihe e ji mara John Wycliffe, William Tyndale, Robert Morrison, na Adoniram Judson?
Ha niile hụrụ Okwu Chineke n’anya, sụgharịakwa ya n’asụsụ ndị nkịtị ga-agụli. John Wycliffe na William Tyndale sụgharịrị ya n’asụsụ Bekee, Morrison sụgharịrị ya n’asụsụ Chinese, ebe Judson sụgharịrị ya n’asụsụ Burmese (nke a na-asụ na Myanmar).—6/1, peeji nke 8-11.
• Ole n’ime ndị eze chịrị Juda nụụrụ nnọọ ụlọ Chineke ọkụ n’obi?
Ndị eze iri na itoolu chịrị alaeze ebe ndịda Izrel nke bụ́ Juda, ma, anọ n’ime ha nụụrụ nnọọ ụlọ Chineke ọkụ n’obi. Ha bụ Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya.—6/15, peeji nke 7-11.
• Ndị Kraịst niile e tere mmanụ nọ n’ụwa hà na-eso enye nri ime mmụọ?
Mba. Ndị niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ so n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, ma, ọ bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi na-ahụ maka nri ime mmụọ.—6/15, peeji nke 22-24.
• Olee ihe mere ndị agha Rom ji chọsie ike inweta uwe ime Jizọs?
Ndị agha ahụ kpọgburu Jizọs ekeghị uwe ime ya n’etiti onwe ha. Otú a na-esikarị akpa ụdị uwe a bụ ijikọta ákwà abụọ, ma uwe Jizọs enwetụghị ebe a dụkọtara ya adụkọta, nke mere ka ọ bụrụ ihe a na-achọsi ike.—7/1, peeji nke 22.
• Olee ihe mere anyị ji kwuo na ọ bụ ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ mere ka otú o si akụzi ihe dị iche na nke ndị ndú okpukpe?
Kama ndị ndú okpukpe ga-ahụ ndị mmadụ n’anya, ha ledara ha anya. Ihe ọzọkwa bụ na ha ahụghị Chineke n’anya. Jizọs hụrụ Nna ya n’anya, ọmịiko o nwekwara n’ebe ndị mmadụ nọ mere o ji kụziere ha ihe. (Mat. 9:36) Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, nwee ọmịiko n’ahụ́ ha, nweekwa obiọma n’ebe ha nọ.—7/15, peeji nke 15.
• Olee ihe mere okwu ego ji akpatara di na nwunye nsogbu, gịnịkwa ga-enyere ha aka ịma ihe ha ga-eme?
Mgbe mgbe, ihe na-akpatara di na nwunye esemokwu ego bụ ụjọ na atụkwasịghị ibe ha obi, o nwekwara ike ịbụ na otú e si zụlite ha dị iche iche. Ihe anọ ga-eme ka ha nwee ihe ịga nke ọma bụ: Ịmụta ikwurịta banyere ego n’eweghị iwe, ikwekọrịta otú ha ga-esi na-ele ego ha na-akpata anya, ide atụmatụ ha ede, na ikwekọrịta onye ga-eme nke ọ ga-eme.—8/1, peeji nke 10-12.