Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Oge A Bụ́ “Ụbọchị Ozi Ọma”
Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Oge A Bụ́ “Ụbọchị Ozi Ọma”
E NWERE ndị ekpenta anọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá Sameria na-arịọ arịrịọ. O nwebeghị onye nyere ha ihe ọ bụla. Ndị Siria nọchibidoro ndị Sameria, nke a mere ka agụụ chọọ ịgụgbu ha. Ọ baghịrị ndị ekpenta a uru ịba n’ime Sameria n’ihi na ihe oriri dị oké ọnụ ebe ahụ. E nwedịrị ndị a sịrị na ha riri anụ mmadụ.—2 Eze 6:24-29.
Ndị ekpenta a nọ na-eche, sị: ‘Ànyị gaakwanụ n’ọmụma ụlọikwuu ndị Siria. ‘Ma ànyị nọ na Sameria ma ànyị gara ebe ahụ, ọ bụ otu ihe ahụ.’ Ha gara ebe ahụ mgbe chi jirila, mgbe ọ na-enweghị onye ga-ahụ ha. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ebe niile dara jụụ. O nweghị ndị nche nọ ya. E liwere ọtụtụ ịnyịnya na ịnyịnya ibu n’ebe ahụ, o nweghịkwa ndị agha ha hụrụ. Ha anọ legharịrị anya ebe niile, ma o nweghị onye ha hụrụ. Ihe oriri na ihe ọṅụṅụ juru ebe niile. Ha malitere iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Ndị ekpenta ahụ hụkwara ọlaedo, ọlaọcha, uwe, na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa. Ha buuru ụfọdụ n’ihe ndị ahụ gaa zoo, bịaghachi iburu ọzọ. Ndị niile nọ ebe ahụ agbalagala. Jehova rụrụ ọrụ ebube wee mee ka ndị Siria nụ ụda ụsụụ ndị agha na-abịa. Ha echee na e nwere ndị bịara ibuso ha agha, wee jiri ụkwụ gbalaga, hapụ ihe niile n’ebe ahụ!
Ndị ekpenta ahụ nọ na-eburu ihe ndị ahụ niile. Ma, mgbe ha chetara na agụụ nọ na-agụgbu ndị Sameria, obi ha malitere ịma ha ikpe. Ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị ozi ọma!” Ndị ekpenta ahụ gbaghachiri Sameria gaa zie ozi ọma banyere ihe ha hụrụ.—2 Eze 7:1-11.
Anyịnwa bikwa n’oge e nwere ike ịkpọ “ụbọchị ozi ọma.” Mgbe Jizọs na-ekwu ihe ndị dị mkpa so ‘n’ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ usoro ihe a,’ ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:3, 14) Olee ihe anyị kwesịrị ime banyere nke a?
Nchegbu nke Ndụ Nwere Ike Ịna-anyịgbu Anyị
Oké obi ụtọ ndị ekpenta ahụ nwere n’ihi ihe ha hụrụ mere ka ha chefuo Sameria ná mmalite. Uche ha niile dị n’ihe ole ha nwere ike ibute. Ihe yiri ihe a ò nwere ike ime anyị? “Ụkọ nri” so n’ihe ịrịba ama e ji mara ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Luk 21:7, 11) Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu.” (Luk 21:34) Anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka nchegbu banyere ndụ a na-adị kwa ụbọchị ghara ime ka anyị chefuo na anyị bi ‘n’ụbọchị ozi ọma.’
Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ́ Blessing ekweghị ka nchegbu nke ndụ nyịgbuo ya. Ọ rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ mgbe ọ na-aga akwụkwọ n’ebe a na-azụ ndị nkụzi, ma mechaa lụọ onye nọ na Betel. Ya na di ya nọ na Betel dị na Benin Republic. Ọ sịrị: “Ọrụ m bụ idowe ụlọ ọcha, ọ na-atọkwa m ụtọ.” Mgbe Blessing chetara
afọ iri na abụọ o jerela ozi oge niile, obi na-atọ ya ụtọ na o kweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya ‘n’ụbọchị ozi ọma’ anyị bi na ya ugbu a.Zere Ihe Ndị Na-eri Oge
Mgbe Jizọs chọrọ izipụ mmadụ iri asaa bụ́ ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Luk 10:2) Dị nnọọ ka ihe ubi ga-ala n’iyi ma ọ bụrụ na onye ọrụ ugbo egbuo oge iwe ha, otú ahụ ka ndụ ndị mmadụ ga-ala n’iyi ma ọ bụrụ na anyị agaghị kwusaara ha ozi ọma. N’ihi ya, Jizọs kwukwara, sị: “Unu amakụkwala onye ọ bụla mgbe unu na-ekele ya n’okporo ụzọ.” (Luk 10:4) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “na-ekele” nwere ike ịpụta ihe karịrị ịsị mmadụ “olee otú i mere?” ma ọ bụ “ndeewo.” O nwere ike ịgụnye ịmakụ mmadụ na ịkọ ogologo akụkọ, dị ka mmadụ na-eme ma ọ hụ ezigbo enyi ya. Ya mere, ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya bụ ka ha ghara ikwe ka ihe na-enweghị isi na-ewekọrọ oge ha. Ozi ha na-aga ikwusa kwesịrị ka e kwusaa ya ngwa ngwa.
Chegodị oge ihe ndị na-adọpụ uche na-ewe. Kemgbe ọtụtụ afọ, televishọn bụ ihe kacha eri oge ndị mmadụ. Oleekwanụ ihe a ga-ekwu banyere ekwe ntị na kọmputa? Otu nnyocha e mere otu puku mmadụ torola eto bi na Britain na-egosi na “otu onye na-eji nkeji iri asatọ na asatọ akpọ fon nkịtị kwa ụbọchị, jiri nkeji iri isii na abụọ na-akpọ ndị mmadụ n’ekwe ntị, na-eji nkeji iri ise na atọ ezipụ ozi na kọmputa, jirikwa nkeji iri abụọ na abụọ ezipụ ozi n’ekwe ntị.” A gbakọọ ha, ha ji ihe karịrị okpukpu abụọ karịa oge onye ọsụ ụzọ inyeaka ji aga ozi ọma kwa ụbọchị! Olee otú gị na ihe ndị a si aga?
Ernst na Hildegard Seliger gbara mbọ hụ na ha na-eji oge ha eme ihe nke ọma. Ha abụọ nọrọ ihe karịrị afọ iri anọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi nakwa n’ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist. Mgbe a hapụrụ ha, ha rụgidere ọrụ ịsụ ụzọ ruo mgbe ha nwụrụ.
Ọtụtụ ndị chọrọ idere Ernst na Hildegard Seliger akwụkwọ ozi. Di na nwunye a gaara eji ihe ka ukwuu n’oge ha na-agụ akwụkwọ ozi ma na-aza ha. Kama nke ahụ, ha butere ihe banyere ozi Chineke ụzọ ná ndụ ha.
O doro anya na ọ na-amasị anyị niile ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-ezirịta ozi, ọ dịghịkwa ihe dị njọ ná nke ahụ. Ọ dịkwa mma ka anyị na-ewepụta oge anyị ga-eji na-atụrụtụ ndụ. Ma, ọ ga-adị mma ma anyị zere ihe ndị ga na-ewekọrọ oge anyị n’oge a e kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma.
Na-ekwusa Ozi Ọma nke Ọma
Mmadụ ịnọ ndụ ‘n’ụbọchị ozi ọma’ bụ ihe ùgwù. Ka anyị ghara ikwe ka ihe ọ bụla dọpụ uche anyị dị ka o mere ndị ekpenta anọ ahụ ná mmalite. Cheta na ha kwuru, sị: “Ihe anyị na-eme ezighị ezi.” N’otu aka ahụ, o zighị ezi ma anyị kwe ka ihe ndị anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị, ma ọ bụ ihe ndị na-ewekọrọ oge, gbochie anyị iso na-agachi ozi ọma anya.
Anyị nwere onye setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya anya na nke a. Mgbe Pọl onyeozi chetara ihe ndị mere n’afọ iri abụọ mbụ o ji jee ozi, ọ sịrị: “Ekwusawo m ozi ọma banyere Kraịst nke ọma.” (Rom 15:19) Pọl ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ịnụ ọkụ n’obi. Ka anyị jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi Alaeze ahụ n’oge a bụ́ “ụbọchị ozi ọma.”
[Foto dị na peeji nke 28]
Blessing ekweghị ka ihe ndị ọ na-eme ná ndụ gbochie ya ije ozi oge niile
[Foto dị na peeji nke 29]
Ernst na Hildegard Seliger gbara mbọ hụ na ha ji oge ha mee ihe nke ọma