Ị̀ Na-ekwe Ka Jehova Jụọ Gị Ajụjụ?
Ị̀ Na-ekwe Ka Jehova Jụọ Gị Ajụjụ?
ỌTỤTỤ narị ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chebara onwe ya echiche dị na Baịbụl. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova Chineke ji ajụjụ akụziri ndị mmadụ eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ. Dị ka ihe atụ, Jehova jụrụ Ken ọtụtụ ajụjụ mgbe ọ na-agwa ya ka ọ gbanwee ụzọ ọjọọ ya. (Jen. 4:6, 7) N’oge ọzọ, naanị otu mkpụrụ ajụjụ Jehova jụrụ mere ka mmadụ mee ihe. Mgbe Aịzaya onye amụma nụrụ ka Jehova jụrụ, sị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” ọ sịrị: “Lee m! Ziga m.”—Aịza. 6:8.
Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, jụrụ ndị mmadụ ajụjụ ndị mere ka ha chee echiche. N’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, e dere ihe karịrị narị ajụjụ abụọ na iri asatọ Jizọs jụrụ ndị mmadụ. N’agbanyeghị na o nwere mgbe Jizọs jụrụ ndị iro ya ajụjụ ka ha wee mechie ọnụ, ihe o ji ajụkarị ndị na-ege ya ntị ajụjụ bụ ka ha wee chebara ihe ọ na-agwa ha echiche, bụ́ nke na-eme ka ha chebara mmekọrịta ha na Chineke echiche. (Mat. 22:41-46; Jọn 14:9, 10) Pọl onyeozi, bụ́ onye dere akwụkwọ iri na anọ n’ime akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, jụkwara ndị mmadụ ajụjụ ndị ga-enyere ha aka ime mkpebi. (Rom 10:13-15) Dị ka ihe atụ, ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ ozi nke o degaara ndị Rom karịrị akarị. Ajụjụ ndị Pọl jụrụ n’akwụkwọ ndị o dere na-enyere ndị na-agụ ha aka ịmara “otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi.”—Rom 11:33.
Ajụjụ ụfọdụ na-achọ ka ndị a jụrụ ha zaa ha, ebe a na-ajụ ndị nke ọzọ iji mee ka ndị a jụrụ ha chemie echiche ime. Ọtụtụ ajụjụ Jizọs jụrụ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn nyeere ndị gere ya ntị aka ichemi echiche ime. O nwere mgbe Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii nakwa maka ihe iko achịcha nke Herọd,” ya bụ, ka ha lezie anya maka na ndị Farisii na Herọd bụ ndị ihu abụọ na-ezi ozizi ụgha. (Mak 8:15; Mat. 16:12) Ndị na-eso ụzọ Jizọs aghọtaghị ihe o kwuru, ha malitekwara ịrụrịta ụka maka achịcha ha chefuru iweta. N’ime mkpụrụ okwu ole na ole ha na Jizọs kwuru, ọ jụrụ ha ọtụtụ ajụjụ. “Ọ sịrị ha: ‘Gịnị mere unu ji arụ ụka maka na unu ejighị achịcha? Ùnu amatabeghị, ùnu aghọtabeghịkwa ihe ọ pụtara? Ọ̀ na-esiri obi unu ike ịghọta ihe? ‘Ùnu adịghị ahụ ụzọ, ọ bụ ezie na unu nwere anya; ùnu adịghịkwa anụ ihe ọ bụ ezie na unu nwere ntị?’ . . . Ùnu aghọtabeghị ihe ọ pụtara?’” Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ ndị ahụ iji mee ka ha chee echiche, ka ha wee chemie echiche ime banyere ihe ihe o kwuru pụtara.—Mak 8:16-21.
“Ka M Jụọ Gị Ajụjụ”
Jehova Chineke ji ajụjụ gbazie echiche ohu ya bụ́ Job. Jehova ji ọtụtụ ajụjụ mee ka Job mara na o nweghị onye ọ bụ ma e were ya tụnyere Onye kere ya. (Job isi 38-41) Jehova ọ̀ chọrọ ka Job zaa ya nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị ahụ? O yighị ka ọ chọrọ. Jehova jụrụ Job ajụjụ ndị dị ka “Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?” iji mee ka o chee echiche. Mgbe Jehova jụchara Job ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, okwu ekweghịzi Job okwukwu. Naanị ihe o kwuru bụ: “Gịnịkwanụ ka m ga-aza gị? Ekpuchiwo m ọnụ m aka.” (Job 38:4; 40:4) Job ghọtara ihe Jehova nọ na-agwa ya wee wetuo onwe ya ala. Ma, ihe Jehova nọ na-akụziri Job abụghị naanị ka o wetuo onwe ya ala. Jehova gbazikwara echiche Job. Olee otú o si mee nke a?
N’agbanyeghị na Job bụ “nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,” mgbe ụfọdụ, ọ na-ekwu Job 1:8; 32:2; 33:8-12) Ya mere, ajụjụ dị iche iche Jehova jụrụ Job mere ka ọ ghọtakwuo ihe ụfọdụ nke ọma. Chineke si n’oké ifufe gwa Job okwu, sị: “Ònye bụ onye a nke na-ekpuchi ihe e zubeworo site n’ikwu okwu amamihe na-adịghị na ya? Biko, kee ájị̀ n’ume dị ka dimkpa, ka m jụọ gị ajụjụ, gị onwe gị azaakwa m.” (Job 38:1-3) Jehova ji ajụjụ ndị ahụ chetara Job na ihe ndị o kere eke na-egosi na ya nwere amamihe na ike na-enweghị atụ. Ajụjụ ndị a Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile jụrụ Job mere ka ọ tụkwasịkwuo obi n’otú Jehova si eme ihe. Nke a mekwara ka Job na-atụkwu egwu Jehova.
ihe na-ezighị ezi, bụ́ nke Elaịhu chọpụtara wee baara ya mba maka “na ọ kpọrọ mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume.” (Otú Anyị Ga-esi Kwe Ka Jehova Jụọ Anyị Ajụjụ
Oleekwanụ maka anyị? Ànyị nwere ike irite uru n’ajụjụ ndị a jụrụ na Baịbụl? Ee, anyị nwere ike! Anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na anyị na-echebara ajụjụ ndị a echiche. Ajụjụ ndị katara ahụ́ ndị dị n’Okwu Chineke na-eme ka ndị na-agụ ya chemie echiche ime. N’eziokwu, “okwu Chineke . . . na-akpa ike, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Hib. 4:12) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ajụjụ ndị a baara anyị uru, anyị kwesịrị ịjụ ha onwe anyị dị ka à ga-asị na ọ bụ Chineke ji ọnụ ya na-ajụ anyị ha. (Rom 15:4) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
“Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?” (Jen. 18:25) Ebreham jụrụ Jehova ajụjụ a mgbe Chineke chọrọ ibibi Sọdọm na Gọmọra, ọ bụ ezie na ọ chọghị ka ọ zaa ya. Ebreham ma na Jehova enweghị ike ime ihe na-ezighị ezi, ya bụ, ịla ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume n’iyi. Ajụjụ a Ebreham jụrụ na-egosi na obi siri ya ike na Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe niile.
Taa, ụfọdụ ndị nwere ike na-ekwu na ọ bụ otú a ma ọ bụ otú a ka Jehova ga-esi kpee ndị mmadụ ikpe n’ọdịnihu, ha nwere ike ịna-ekwu ụdị ndị Amagedọn na-agaghị egbu ma ọ bụkwanụ ụdị ndị ga-ebilite n’ọnwụ. Kama ikwe ka ụdị echiche a na-enye anyị nsogbu, anyị nwere ike icheta ajụjụ ahụ Ebreham jụrụ Jehova. Ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe nke nwere obiọma, ọ bụrụkwa na obi siri anyị nnọọ ike, dị ka o siri Ebreham, na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ebere, anyị agaghị eji oge na ike anyị na-echegbu onwe anyị ma na-arụ ụka ihe na-enweghị isi.
“Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” (Mat. 6:27) Mgbe Jizọs na-agwa ìgwè mmadụ nke gụnyere ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ jụrụ ha ajụjụ a iji mee ka ha mara na ha kwesịrị ịhapụru Jehova, bụ́ onye hụrụ ha n’anya, nsogbu ha. Anyị na-enwe ọtụtụ nsogbu n’oge ikpeazụ a jọgburu onwe ya, ma, ichegbu onwe anyị agaghị agbakwụnye ihe ná ndụ anyị ma ọ bụkwanụ mee ka ndụ anyị ka mma.
Mgbe ọ bụla anyị malitere ichegbu onwe anyị n’ihi nsogbu anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi nsogbu nke ndị anyị hụrụ n’anya, icheta ajụjụ a Jizọs jụrụ nwere ike ime ka anyị ghara ichegbubiga onwe anyị okè. O nwere ike ime ka anyị kwụsị ichegbu onwe anyị n’ihi na ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị, ọrịa nwere ike ịbịa anyị ma ọ bụkwanụ obi ana-ajọ anyị njọ. Dị ka Jizọs mesiri anyị obi ike, Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye na-enye anụ ufe nke eluigwe ihe ha na-eri ma na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, ma nnọọ ihe na-akpa anyị.—Mat. 6:26-34.
“Mmadụ ọ̀ pụrụ ịgụnye ọkụ n’obi ya, uwe ya aghara ire ọkụ?” (Ilu 6:27) Otu n’ime ihe dị n’isi itoolu mbụ nke akwụkwọ Ilu bụ okwu ndị dị mkpirikpi otu nna nọ na-agwa nwa ya nwoke iji mee ka ọ mara ihe. Ajụjụ a nke dị n’Ilu 6:27 na-eme ka anyị mara ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ akwaa iko. (Ilu 6:29) Ọ bụrụ na anyị na-emeso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye anyị omume na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụkwanụ na-enwe agụụ ịkwa iko, ajụjụ a kwesịrị ichetara anyị na anyị na-aga ịdaba n’ezigbo nsogbu. Mmadụ nwekwara ike ịjụ onwe ya ajụjụ a mgbe ọ bụla ọ chọrọ itinye aka n’ihe ọjọọ. Nke a na-egosi nnọọ na ihe ahụ Baịbụl kwuru enweghị mgbagha. Ọ sịrị: ‘Ị ga-aghọrọ mkpụrụ ị kụrụ.’—Gal. 6:7.
“Ònye ka ị bụ ikpe odibo onye ọzọ ikpe?” (Rom 14:4) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o kwuru banyere nsogbu e nwere n’ọgbakọ na narị afọ mbụ. Ndị Kraịst ụfọdụ malitere ịkọcha otú ụmụnna ha, ndị si n’agbụrụ dị iche iche, si eme ihe. Ajụjụ a Pọl jụrụ ha chetaara ha ka ha na-anabata ibe ha ma hapụrụ Jehova ikpe.
Taa, ndị Jehova sikwa n’agbụrụ dị iche iche. Ma, Jehova emeela ka anyị dịrị n’otu. Ànyị na-eme ihe ga-eme ka anyị nọgide na-adị n’otu? Ọ bụrụ na ọ na-adị anyị ọkụ n’obi ịkọcha nwanna anyị n’ihi na o mere ihe na-adịghị njọ nke akọnuche ya nabatara, ọ ga-adị nnọọ mma ma anyị jụọ onwe anyị ajụjụ ahụ Pọl jụrụ nke dị ná Ndị Rom isi iri na anọ amaokwu anọ.
Ajụjụ Na-eme Ka Anyị na Jehova Dịkwuo ná Mma
Ajụjụ ole na ole ndị a anyị tụlere na-egosi na ajụjụ ndị dị n’Okwu Chineke nwere ike inyere mmadụ aka ichebara onwe ya echiche. Ịtụle amaokwu ndị gbara ajụjụ ọ bụla gburugburu nwere ike inyere anyị aka ịma otú ajụjụ ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ọnọdụ anyị nọ na ya. Ka anyị na-agụ Baịbụl, anyị ga-ahụkwu ajụjụ ndị ọzọ ga-enyere anyị aka.—Gụọ igbe dị na peeji nke 14.
Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ajụjụ ndị katara ahụ́ dị n’Okwu Chineke echiche, anyị na Jehova ga-adị ná mma. Mgbe Jehova jụchara Job ajụjụ, Job sịrị: “Ọ bụ n’akụkọ ka m nụrụ banyere gị, ma ugbu a, anya m na-ahụ gị.” (Job 42:5) Job ghọtakwuru onye Jehova bụ, dị ka à ga-asị na Jehova nọ n’ihu ya. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs mechara kwuo, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ka anyị kwe ka ihe niile dị n’Okwu Chineke, gụnyere ajụjụ ndị dị na ya, nyere anyị aka ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma ka anyị wee “na-ahụ” Jehova nke ọma!
[Igbe dị na peeji nke 14]
Olee otú ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a nwere ike isi nyere gị aka ịmata ihe uche Jehova bụ?
▪ “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru?”—1 Sam. 15:22.
▪ “Onye ahụ nke kere anya, ọ́ pụghị ịhụ ụzọ?”—Ọma 94:9.
▪ “Ndị mmadụ ịchọrọ onwe ha otuto ọ̀ bụ otuto?”—Ilu 25:27.
▪ “Iwe dị ọkụ ị na-ewe ò ziri ezi?”—Jona 4:4.
▪ “Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?”—Mat. 16:26.
▪ “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Kraịst?”—Rom 8:35.
▪ “Olee ihe i nwere nke a na-enyeghị gị enye?”—1 Kọr. 4:7.
▪ “Olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?”—2 Kọr. 6:14.
[Foto dị na peeji nke 15]
Gịnị ka Job mụtara n’ajụjụ niile Jehova jụrụ ya?