“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”
“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”
JIZỌS dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ekwensu ga na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu.” Ma, tupu Jizọs adọọ ha aka ná ntị, ọ sịrị: “Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha.” Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Setan ga na-atụ ụmụnna anyị mkpọrọ iji kwụsị ha ikwusa ozi ọma, ọ pụtara na ndị ọchịchị ụfọdụ ga na-akpagbu Ndị Kraịst. (Mkpu. 2:10; 12:17) N’ihi ya, gịnị ga-eme ka anyị ghara ịda mbà ma Setan kpagbuwe anyị, oleekwa ihe ga-eme ka anyị ghara ‘ịtụ egwu,’ dị ka Jizọs dụrụ anyị n’ọdụ?
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị enweela mgbe ha tụrụ egwu. Ma, Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịtụ egwu wee mee ihe anyị na-ekwesịghị ime. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Otu n’ime ụzọ Jehova si enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ma a kpagbuwe anyị bụ ime ka anyị mata otú Setan na ndị òtù ya si akpagbu anyị. (2 Kọr. 2:11) Iji mata otú Jehova nwere ike isi mee nke a, ka anyị tụlee otu ihe mere n’oge ochie, bụ́ nke e dere na Baịbụl. Anyị ga-atụlekwa ụfọdụ n’ime ihe ndị mere ndị ohu Chineke n’oge a, bụ́ ndị ‘guzosiri ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.’—Efe. 6:11-13.
Eze Ọjọọ Eyie Eze Na-efe Chineke Egwu
Na narị afọ asatọ T.O.A, eze ọjọọ bụ́ Senakerib, bụ́ onye na-achị Asiria, meriri ọtụtụ mba n’agha. Nke a mere ka onwe ya ju ya afọ, ya ewee chọọ ibuso ndị Jehova na isi obodo ha bụ́ Jeruselem agha, bụ́ ebe Hezekaya bụ́ eze na-efe Chineke na-achị. (2 Eze 18:1-3, 13) O doro anya na Setan chọrọ iji Senakerib mezuo uche ya, ka e wee ghara inwe ndị na-efe Chineke n’ụwa.—Jen. 3:15.
Senakerib zigara ndị ozi na Jeruselem ka ha gwa ndị Juu ka ha chilie aka elu. Rabshake, bụ́ ọnụ na-ekwuchitere eze, so ná ndị gara ozi ahụ. * (2 Eze 18:17) Nzube Rabshake bụ ime ka ụjọ bịa ndị Juu ka ha wee chilie aka elu n’alụghị agha ọ bụla. Olee ihe ndị Rabshake kwuru iji mee ka egwu jide ndị Juu?
Ha Tụkwasịrị Jehova Obi n’Agbanyeghị na O Nweghị Mmadụ Na-enyere Ha Aka
Rabshake gwara ndị na-anọchite anya Hezekaya, sị: “Nke a bụ ihe eze ukwu, bụ́ eze Asiria, kwuru: ‘Gịnị ka ị tụkwasịrị obi nke na-enye gị obi ike? . . . Leenụ! ị tụkwasịwo obi ná nkwado nke ahịhịa amị a a zọturu azọtu, bụ́ Ijipt, ga-enye gị, nke ga-adụ mmadụ n’ọbụ aka 2 Eze 18:19, 21) Ihe a Rabshake kwuru abụghị eziokwu n’ihi na o nweghị ihe ọ bụla jikọrọ Hezekaya na ndị Ijipt. Ma, Rabshake chọrọ iji ihe a o kwuru mee ka ndị Juu buru otu ihe n’uche: ‘O nweghị onye ga-enyere unu aka. O nweghị onye kwụ unu n’azụ, unu kwụ naanị unu.’
wee dụpuo ya ma ọ bụrụ na ọ dabere na ya.’” (N’oge a, ndị na-akpagbu ezigbo Ndị Kraịst na-achọ ime ka egwu tụwa ha site n’ịgwa ha na o nweghị ndị kwụ ha n’azụ. Otu nwanna nwaanyị, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ ma mee ka ọ ghara ịhụ ụmụnna ya anya ruo ọtụtụ afọ maka na ọ bụ Onye Kraịst, kwuru ihe mere ka ọ ghara ịda mbà n’ihi egwu. Ọ sịrị: “Ekpere mere ka m bịaruo Jehova nso . . . Echetara m ihe dị n’Aịzaya 66:2, nke na-emesi anyị obi ike na Chineke na-elekwasị ‘onye nwere mwute na mmụọ ya’ anya. Nke a na-akasi m obi ma na-eme ka okwukwe m sie ike.” Otu nwanna nwoke a tụrụ mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ọnụ ụlọ naanị ya nọ kwukwara, sị: “Achọpụtara m na obere ọnụ ụlọ mkpọrọ nwere ike ịha mmadụ ka ụwa niile ma ọ bụrụ na onye ahụ na Chineke dị ná mma.” N’eziokwu, ihe mere ụmụnna abụọ a adaghị mbà n’agbanyeghị na o nweghị mmadụ na-anọ ha nso, bụ na ha na Jehova dị ná mma. (Ọma 9:9, 10) Ọ bụ ezie na ndị kpagburu ụmụnna ndị a kewapụrụ ha n’ebe ndị ezinụlọ ha, ndị enyi ha, na ụmụnna ha nọ, ma, ha ma na ha enweghị ike ikewapụ ha n’ebe Jehova nọ.—Rom 8:35-39.
Nke a na-egosi nnọọ na anyị kwesịrị ịna-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. (Jems 4:8) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-echeta Jehova n’ihe ọ bụla m na-eme? Tupu mụ ekpebie ihe m ga-eme, ma ihe ukwu ma ihe nta, m̀ na-echeta ihe Baịbụl kwuru?’ (Luk 16:10) Ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị agaghị na-atụ egwu ihe ọ bụla. Jeremaya onye amụma kwuchitere ọnụ ndị Juu a dọọrọ n’agha mgbe ọ sịrị: “Jehova, esiwo m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị . . . Ị bịakwutere m n’ụbọchị m kpọkuru gị. Ị sịrị: ‘Atụla egwu.’”—Ákwá 3:55-57.
Mbọ A Gbara Ka Ha Malite Inwe Obi Abụọ Akụọ Afọ n’Ala
Rabshake ji aghụghọ kwuo ihe ga-eme ka ndị Juu malite inwe obi abụọ. Ọ sịrị: “Ọ́ bụghị [Jehova] bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu ya nakwa ebe ịchụàjà ya? . . . Ọ bụ Jehova sịrị m, ‘Gbagoo buso ala a agha, laakwa ya n’iyi.’” (2 Eze 18:22, 25) Ihe Rabshake kwuru bụ na Jehova agaghị alụrụ ndị ya agha n’ihi na ha mere ihe na-adịghị ya mma. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Ihe Hezekaya na ndị Juu ndị maliteghachiri ife Jehova na-eme dị Jehova mma.—2 Eze 18:3-7.
Taa, ndị na-emegide anyị, bụ́ ndị aghụghọ juru obi, nwere ike ikwu ihe yiri eziokwu, bụ́ nke ha chọrọ iji megharịa anyị anya ka anyị wee malite inwe obi abụọ. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ, a na-agwa ụmụnna ndị a tụrụ mkpọrọ na nwanna na-edu ndú ná mba ha adapụla n’ọgbakọ nakwa na ọ ga-adị mma ka ha gbanwee obi ha. Ma, nke a anaghị eme ka ụmụnna ndị ma nke a na-akọ malite inwe obi abụọ.
Tụlee ihe mere otu nwanna nwaanyị n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, e gosiri ya ihe e dere n’otu akwụkwọ, nke na-egosi na otu okenye adapụla n’ọgbakọ. Onye gosiri ya akwụkwọ ahụ jụrụ ya ma ọ̀ bụ Ọma 146:3.
na ó kweghị na ihe nwanna ahụ mere ziri ezi. Nwanna nwaanyị ahụ zara ya, sị: “[Ọ] bụ mmadụ na-ezughị okè.” Ọ gwakwara ya na Chineke ji ya rụọ ọrụ mgbe ọ na-erubere ya isi. “Ma, ebe ọ bụ na ihe o kwuru dị iche n’ihe dị na Baịbụl, ọ bụghịzi nwanna m.” Nwanna nwaanyị ahụ, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, mere nnọọ ihe ahụ Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Unu atụkwasịla ndị a ma ama obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya.”—Ọ bụrụ na anyị nwere ezi ihe ọmụma nke dị n’Okwu Chineke ma na-eme ihe ọ dụrụ anyị n’ọdụ, o nweghị ihe okwu aghụghọ a na-ekwu iji mee ka anyị gbanwee obi anyị ga-eme anyị. (Efe. 4:13, 14; Hib. 6:19) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkwadebe onwe anyị ka anyị wee mara ihe anyị ga-eme ma a kpagbuwe anyị. (Hib. 4:12) N’eziokwu, ugbu a bụ oge anyị kwesịrị inwetakwu amamihe ma mee ka okwukwe anyị sikwuo ike. Otu nwanna nwoke nke a tụrụ mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ọnụ ụlọ naanị ya nọ kwuru, sị: “M na-agba mmadụ niile ume ka ha jiri nri ime mmụọ niile a na-enye anyị kpọrọ ihe, n’ihi na anyị amaghị otú ọ ga-esi baara anyị uru n’ọdịnihu.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya na-amụ Okwu Chineke nakwa akwụkwọ dị iche iche ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ebipụta, mgbe anyị nwere nsogbu, mmụọ nsọ ‘ga-echetara anyị’ ihe anyị mụrụla.—Jọn 14:26.
E Mere Ka Obi Kaa Ha
Rabshake gbalịrị ime ka egwu tụọ ndị Juu. Ọ sịrị: “Biko, gị na onyenwe m bụ́ eze Asiria tie n’aka, ka m nye gị puku ịnyịnya abụọ lee ma ì nwere ike ime ka ndị na-agba ịnyịnya nọkwasị na ha. Oleezi otú ị pụrụ isi mee ka otu gọvanọ bụ́ otu n’ime ndị kasị nta na-ejere onyenwe m ozi tụgharịa laghachi azụ?” (2 Eze 18:23, 24) E lewe ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, Hezekaya na ndị ya enweghị ihe ha ga-emeli ndị agha Asiria ndị bụ́ a kwaa akwụrụ.
Taakwa, ndị na-akpagbu ndị Chineke nwere ike iyi ka hà nwere ike na-enweghị atụ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị kwụ ha n’azụ. Nke a bụ ihe mere mgbe ndị ọchịchị Nazi na-akpagbu ndị Chineke oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ha gbalịrị ka ha mee ka egwu tụwa ọtụtụ ndị Chineke. Otu nwanna nke nọrọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ mechara kwuo otú ha si gbalịa ime ka egwu tụwa ya. Onye uwe ojii jụrụ ya otu ụbọchị, sị: “Ị̀ hụrụ otú e si gbagbuo nwanne gị? Gịnị ka nke a na-akụziri gị?” Nwanna ahụ zara ya, sị: “Abụ m Onyeàmà Jehova, o nweghịkwa ihe ga-akwụsị m.” Onye uwe ojii ahụ wee sị ya: “Ọ bụ gị bụ onye ọzọ a ga-agbagbu.” N’agbanyeghị nke a, nwanna ahụ kwụsiri ike, nwoke ahụ hapụkwara ya. Gịnị nyeere nwanna ahụ aka ịkwụsi ike? Ọ zara, sị: “Atụkwasịrị m aha Jehova obi.”—Ilu 18:10.
Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, anyị amara na anyị bu ọta ukwu nke na-echebe anyị ka ihe ọ bụla Setan ji eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma ghara ime anyị ihe ọ bụla. (Efe. 6:16) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova n’ekpere ka o mee ka okwukwe anyị sie ike. (Luk 17:5) Anyị kwesịkwara iji ihe dị iche iche ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Mgbe mkpagbu bịaara anyị, okwukwe anyị ga-esi ike ma anyị cheta okwu na-emesi obi ike Jehova gwara Ezikiel onye amụma, bụ́ onye Jehova nyere ọrụ ịgwa ndị kpọrọ ekwo nkụ okwu. Jehova gwara ya, sị: “M mewo ka ihu gị sie ike dị ka ihu ha, meekwa ka egedege ihu gị sie ike dị ka egedege ihu ha. M mewo ka egedege ihu gị dịrị ka dayamọnd, siekwa ike karịa ọmụ́.” (Ezik. 3:8, 9) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, Jehova ga-enyere anyị aka ịdị ike ka dayamọnd otú ahụ Ezikiel dị.
Imeri Ọnwụnwa
Ndị na-akpagbu Ndị Kraịst ma na ihe ndị na-adọ akpịrị nwere ike ime ka ha kwụsị ife Chineke a sịgodị na ihe ndị ọzọ enwetalighi ha. Rabshake ji nke a chọọ inweta ndị Juu. Ọ gwara ndị nọ na Jeruselem, sị: “Nke a bụ ihe eze Asiria kwuru: ‘Chịlierenụ m aka elu ma pụkwutenụ m . . . ruo mgbe m ga-abịa kpọrọ unu laa n’ala nke dị ka ala unu, ala ọka na mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịn, ala osisi oliv mmanụ na ala mmanụ aṅụ; unu ga-anọrọkwa ndụ wee ghara ịnwụ.’” (2 Eze 18:31, 32) Ịta achịcha e ghere ọhụrụ na ịṅụ mmanya ọhụrụ aghaghị ịna-adọ ndị ahụ a nọchibidoro anọchibido akpịrị!
O nwere mgbe e ji ụdị ihe a chọọ inweta otu onye ozi ala ọzọ a tụrụ mkpọrọ. A gwara ya na a ga-akpọga ya ‘n’ọmarịcha ụlọ’ nke dị ‘n’ogige mara mma,’ ka ọ nọọ ebe ahụ ọnwa isii chebara ihe a gwara ya echiche. Ma, nwanna nwoke ahụ ekweghị, ọ kwụsiri ike n’okwukwe ya. Gịnị nyeere ya aka? O mechara kwuo, sị: “M na-eche na Alaeze Chineke ga-abịarịrị. . . . Ihe ndị m ma banyere Alaeze Chineke nakwa otú obi si sie m ike na ọ ga-abịarịrị mere ka m ghara ịda mbà mgbe ahụ.”
Ọ̀ dị gị ka Alaeze Chineke ọ̀ ga-abịa n’ezie? Nna ochie bụ́ Ebreham, Pọl onyeozi, na Jizọs merichara ọnwụnwa ndị bịaara ha n’ihi na ha ma na Alaeze ahụ ga-abịarịrị. (Fil. 3:13, 14; Hib. 11:8-10; 12:2) Ọ bụrụ na anyị na-ebute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị ma na-echeta ngọzi ebighị ebi ndị ọ ga-eweta, anyịnwa ga-ajụ ihe ọ bụla nke ga-akwụsị ọnwụnwa bịaara anyị n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.—2 Kọr. 4:16-18.
Jehova Agaghị Ahapụ Anyị
N’agbanyeghị ihe niile Rabshake mere ka ndị Juu malite ịtụ egwu, Hezekaya na ndị ọ na-achị tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam. (2 Eze 19:15, 19; Aịza. 37:5-7) Nke a mere ka Jehova zaa ekpere ha kpekuru ya ka o nyere ha aka. O zitere otu mmụọ ozi nke gara n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu wee gbuo otu narị puku ndị agha na iri puku asatọ na puku ise. N’echi ya, Senakerib ji ọsọ kpọrọ mmadụ ole na ole fọdụrụ ná ndị agha ya laghachi isi obodo ya bụ́ Ninive n’ihere.—2 Eze 19:35, 36.
Nke a gosiri na Jehova ahapụghị ndị tụkwasịrị ya obi. Otú ihe si agara ụmụnna anyị n’oge a, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’agbanyeghị mkpagbu, na-egosi na Jehova anaghị ahapụ ndị tụkwasịrị ya obi taa. Ọ bụ ya mere nna anyị nke eluigwe ji mesie anyị obi ike, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịza. 41:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 “Rabshake” bụ aha a na-etu otu nwoke nwere ọkwá ukwu n’ọchịchị Asiria. Baịbụl agwaghị anyị ezigbo aha ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
Jehova mesiri ndị ohu ya obi ike ihe karịrị ugboro iri atọ na Baịbụl, sị: “Atụla egwu”
[Foto dị na peeji nke 12]
Olee otú ihe ahụ Rabshake gwara ndị Juu si yie ihe ndị na-emegide ndị Chineke na-agwa ha taa?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ọ bụrụ na anyị na Jehova dị n’ezigbo mma, anyị ga-anọgide na-eme uche ya mgbe a na-akpagbu anyị