Ka “Iwu Obiọma” Chebe Ire Gị
Ka “Iwu Obiọma” Chebe Ire Gị
“O meghewo ọnụ ya n’amamihe, iwu obiọma [ma ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide] dịkwa n’ire ya.”—ILU 31:26.
1, 2. (a) Olee àgwà a chọrọ ka ndị na-efe Jehova nwee? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
IHE dị mkpa e ji ama ezigbo nwaanyị so n’ihe gbara ọkpụrụkpụ nne Eze Lemuel, bụ́ eze dịrị ndụ n’oge ochie, gwara ya. Ọ sịrị ya: “O meghewo ọnụ ya n’amamihe, iwu obiọma [ma ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide] dịkwa n’ire ya.” (Ilu 31:1, 10, 26) Nwaanyị maara ihe nakwa ndị niile chọrọ irubere Jehova Chineke isi kwesịrị iji obiọma na-ekwu okwu. (Gụọ Ilu 19:22.) Ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-ekwu okwu otú ga-egosi na ha nwere obiọma.
2 Gịnị ka obiọma a na-ekwu okwu ya ebe a pụtara? Ole ndị ka anyị na-egosi ya? Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka “iwu obiọma” dịrị n’ire anyị? Olee otú ime nke a ga-esi metụta otú anyị na ndị ezinụlọ anyị nakwa ụmụnna anyị si akparịta ụka?
Mgbe Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide Mere Ka E Gosi Obiọma
3, 4. (a) Gịnị bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide? (b) Olee otú o si dị iche n’obiọma?
3 Onye na-egosi ndị ọzọ obiọma hụrụ ha n’anya. Ọ na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-egosikwa nke a site n’inyere ha aka na iji obiọma na-agwa ha okwu. Ebe ọ bụ na ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya ka anyị na-egosi obiọma, ọ pụtara na anyị ga na-emere ha ihe ga-adịrị ha mma. Ma, okwu Hibru e si na ya sụgharịta obiọma a na-ekwu maka ya ebe a pụtara ịhụnanya na-adịgide adịgide. Onye nwere ụdị ịhụnanya a n’ebe mmadụ nọ na-anọgide na-enyere ya aka ruo mgbe o mezuru ihe o buuru ya n’obi.
4 Na mmadụ bụ ezigbo mmadụ, ma ọ bụkwanụ dịrị obiọma apụtaghị na onye ahụ nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide. Mmadụ nwedịrị ike igosi onye ọ na-amabughị obiọma. Ndị bi n’agwaetiti Mọlta gosiri Pọl onyeozi na narị mmadụ abụọ na iri asaa na ise ndị ọzọ, bụ́ ndị ụgbọ ha kpuru, ụdị obiọma a n’agbanyeghị na ha amaghị ndị ha bụ. (Ọrụ 27:37–28:2) N’agbanyeghị na ndị bi n’agwaetiti ahụ dị obiọma, ha enweghị ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe Pọl hà nọ ebe ọ bụ onye mmadụ mabu ka ọ na-egosi ụdị ịhụnanya a. * Igosi ndị ọzọ ịhụnanya na-adịgide adịgide na-eme ka anyị na ha nọgide na-adị ná mma. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a mere ka Jehova na ndị ya nọgide na-adị ná mma.—Diut. 7:9.
Ịtụgharị Uche na Ikpe Ekpere Ga-enyere Anyị Aka Inwe Obiọma
5. Gịnị ga-enyere anyị aka ịchịkwa ire anyị?
5 Iji obiọma ekwu okwu adịghị mfe. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs dere banyere ire, sị: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịzụ̀ ya. Ọ bụ ihe ọjọọ siri ike nchịkwa, o jupụtara ná nsí na-eweta ọnwụ.” (Jems 3:8) Gịnị ga-enyere anyị aka ịchịkwa ihe a dị anyị n’ahụ́, bụ́ nke siri ike nchịkwa? Ihe Jizọs gwara ndị ndú okpukpe mgbe ọ bịara n’ụwa ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Ọ sịrị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Ọ bụrụ na anyị chọrọ iji obiọma na-ekwu okwu, anyị kwesịrị inwe obiọma. Ka anyị tụlee otú ịtụgharị uche na ikpe ekpere si enyere anyị aka ime nke a.
6. Olee ihe anyị ji kwesị iji obi ụtọ na-atụgharị uche n’ihe dị iche iche Jehova mere, bụ́ ndị na-egosi na o nwere obiọma?
6 Baịbụl kwuru na ‘obiọma Jehova Chineke dị ukwuu.’ (Ọpụ. 34:6) Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Jehova, obiọma gị jupụtara ụwa.” (Ọma 119:64) E nwere ọtụtụ ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru otú Jehova si gosi ndị ohu ya obiọma. Ọ bụrụ na anyị na-ewepụta oge jiri obi ụtọ na-atụgharị uche ‘n’ihe niile Jehova mere,’ anyị ga-enwe obiọma ka ya.—Gụọ Abụ Ọma 77:12.
7, 8. (a) Olee otú Jehova si gosi Lọt na ezinụlọ ya obiọma? (b) Olee otú obi dị Devid maka obiọma Chineke gosiri ya?
7 Dị ka ihe atụ, chegodị otú Jehova si napụta nwa nwanne Ebreham bụ́ Lọt nakwa ndị ezinụlọ ya mgbe o bibiri Sọdọm, bụ́ ebe ha bi. Mgbe ọ fọrọ obere ka e bibie obodo ahụ, ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị bịakwutere Lọt, gwara ya ka o mee ngwa ngwa kpọrọ ezinụlọ ya pụọ. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ọ nọ na-egbu oge, [ndị mmụọ ozi] ahụ jidere ya na nwunye ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ n’aka n’ihi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ọ nọ, ha wee kpọpụta ya ma mee ka o guzoro ná mpụga obodo ahụ.” Obi ọ́ naghị adị anyị ụtọ ma anyị cheta ihe a Jehova mere, ọ̀ bụ na nke a anaghị eme ka anyị ghọta na o nwere obiọma?—Jen. 19:16, 19.
8 Tụleekwa ihe mere Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “[Jehova] na-agbaghara gị njehie gị dum, [ọ] na-agwọ gị ọrịa gị niile.” Obi dị nnọọ Devid ụtọ mgbe Jehova gbaghaara ya mmehie nke ya na Bat-shiba mere. O toro Jehova, sị: “N’ihi na dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú ahụ ka obiọma o nwere n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ si dị elu.” (Ọma 103:3, 11) Ịtụgharị uche n’amaokwu ndị a na amaokwu ndị ọzọ na-eme ka anyị nwee obi ụtọ maka obiọma Jehova gosiri anyị. Nke a na-eme ka anyị na-eto ya, na-ekelekwa ya. Ọ bụrụ na anyị na-enwe obi ụtọ maka ihe ezi Chineke na-emere anyị, anyị ga-achọ ime ka ya.—Efe. 5:1.
9. Olee ezigbo ihe mere ndị ohu Jehova ji kwesị ịna-adị obiọma?
9 Akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na-egosi na ndị Jehova na-egosi obiọma, ya bụ, ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, bụ ndị ya na ha dị ná mma. Oleekwanụ banyere ndị ha na Chineke dị ndụ na-adịghị ná mma? Jehova ọ̀ na-eji obi ọjọọ emeso ha ihe? Mbanụ. Luk 6:35 kwuru, sị: “[Chineke] nwere obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.” “Ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:45) Tupu anyị abata n’ọgbakọ, Chineke gosiri anyị obiọma. Ma, ugbu a anyị bụ ndị ohu ya, ọ na-egosi anyị ịhụnanya na-adịgide adịgide. (Gụọ Aịzaya 54:10.) Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ nke ukwuu maka nke a. O kwesịkwara ime ka anyị na-egosi ndị ọzọ obiọma, jirikwa obiọma na-agwa ha okwu.
10. Olee ihe mere ekpere ji dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ịhụnanya na-adịgide adịgide?
10 Ekpere bụ ihe ọzọ dị mkpa nke ga-enyere anyị aka inwe ịhụnanya na-adịgide adịgide. Nke a bụ n’ihi na onye nwere ịhụnanya nke na-adịgide adịgide nwekwara obiọma. Ịhụnanya na obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Anyị ga-enwe ịhụnanya na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na anyị ekwere ka mmụọ nsọ na-edu anyị. Ụzọ kacha mfe anyị ga-esi nweta mmụọ nsọ bụ ịrịọ ya Chineke n’ekpere. (Luk 11:13) Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke mgbe niile ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, kwesịkwa ikwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị. N’eziokwu, ịtụgharị uche na ikpe ekpere dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka iwu obiọma dịrị n’ire anyị.
Di na Nwunye Kwesịrị Iji Obiọma Na-agwa Ibe Ha Okwu
11. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka ndị bụ́ di na-egosi ndị nwunye ha obiọma? (b) Olee otú iwu obiọma ga-esi enyere onye bụ́ di aka ịchịkwa ire ya?
11 Pọl onyeozi gwara ndị bụ́ di, sị: “Na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:25) Pọl chetakwaara ha ihe Jehova gwara Adam na Iv. O dere, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.” (Efe. 5:31) O doro anya na Jehova achọghị ka ndị bụ́ di hapụ nwunye ha, ha kwesịrị ịna-egosi ha obiọma. Di nke nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe nwunye ya nọ anaghị anọ n’ihu ọha akọ ebe nwunye ya na-anaghị emete ma ọ bụkwanụ na-agwa ya okwu ọjọọ. Ọ na-atọ ya ụtọ ịja ya mma. (Ilu 31:28) Ọ bụrụ na ha enwee nghọtahie, di nwere obiọma ga-ejide onwe ya ka ọ ghara ịgwa nwunye ya okwu ọjọọ.
12. Olee otú onye bụ́ nwunye ga-esi na-ekwu okwu iji gosi na iwu obiọma dị n’ire ya?
12 Iwu obiọma kwesịkwara ime ka onye bụ́ nwunye na-achịkwa ire ya. O kwesịghị ịna-ekwu okwu ka ndị nwere mmụọ ụwa. Ebe ọ bụ na ọ “na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu,” ọ ga na-ekwu okwu ọma banyere ya n’ihu ọha, nke a na-eme ka ndị ọzọ na-akwanyekwuru di ya ùgwù. (Efe. 5:33) Ọ naghị anọ n’ihu ụmụ ya arụ di ya ụka ma ọ bụ na-agbagha ihe o kwuru ka ụmụ ya wee ghara ịna-eleda nna ha anya. Ha na-ekwurịta ụdị ihe ndị a mgbe naanị ha abụọ nọ. Baịbụl sịrị: “Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya.” (Ilu 14:1) Ahụ́ na-eru ndị ezinụlọ ya niile ala n’ụlọ ha, ha na-enwekwa obi ụtọ.
13. Olee ebe ka iwu obiọma kwesịrị ịkacha na-achị, oleekwa otú ọ ga-esi na-achị?
13 Di na nwunye kwesịrị ịna-agwa ibe ha okwu otú na-egosi na ha na-akwanyere ibe ha ùgwù, ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị ha nọ. Pọl dere, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu.” O dekwara, sị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. . . . Yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:8, 12-14) Ọ bụrụ na ụmụaka na-anụkarị ka ndị mụrụ ha na-eji obiọma ekwu okwu, ha ga na-eme nke ọma, na-ejikwa obiọma ekwu okwu ka ndị mụrụ ha.
14. Olee otú ndị isi ezinụlọ ga-esi jiri ire ha na-agba ndị ezinụlọ ha ume?
14 Otu ọbụ abụ dere banyere Jehova, sị: Ọma 119:76) Otu n’ime ụzọ dị mkpa Jehova si akasị ndị ya obi bụ ịgba ha ume na iduzi ha. (Ọma 119:105) Olee otú ndị isi ezinụlọ nwere ike isi ṅomie ihe nlereanya Nna anyị nke eluigwe setịpụrụ wee jiri ire ha na-agba ndị ezinụlọ ha ume? Ha ga-eme nke a site n’iduzi ha na ịgba ha ume. Ofufe Ezinụlọ na-enyere ezinụlọ aka nke ukwuu ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl.—Ilu 24:4.
“Biko, ka obiọma gị kasie m obi.” (Nwee Ịhụnanya Na-adịgide Adịgide n’Ebe Ụmụnna Nọ
15. Olee otú ndị okenye na ndị ọzọ ji ọgbakọ kpọrọ ihe ga-esi jiri ire ha na-agba ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ume?
15 Eze Devid kpere ekpere, sị: “Ka obiọma gị nakwa eziokwu gị na-eche m nche mgbe niile.” (Ọma 40:11) Olee otú ndị okenye na ndị ọzọ ji ọgbakọ kpọrọ ihe nwere ike isi ṅomie Jehova? Anyị na-egosi na anyị nwere obiọma n’ebe ndị ọzọ nọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri ire anyị na-agwa ha ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru.—Ilu 17:17.
16, 17. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na iwu obiọma na-achịkwa ire anyị?
16 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere nwanna na-etinye aka n’ihe ga-eme ka o mee ihe ọjọọ? Obiọma anyị nwere n’ebe onye ahụ nọ ó kwesịghị ime ka anyị dụọ ya ọdụ? (Ọma 141:5) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na nwanna mere mmehie nke dị oké njọ, ịhụnanya na-adịgide adịgide anyị nwere n’ebe ọ nọ kwesịrị ime ka anyị gwa ya ka “ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ” ka ha wee ‘kpeere ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova.’ (Jems 5:14) Ọ bụrụ na nwanna ahụ ajụ ịkọrọ ndị okenye, anyị ahụghị nwanna ahụ n’anya, anyị enweghịkwa obiọma n’ebe ọ nọ ma ọ bụrụ na anyị agaghị kọọrọ ndị okenye. E nwere ike inwe ụfọdụ n’ime anyị dara mbà, nwee ndị owu na-ama, nwee ndị chere na ha abaghị uru, ma ọ bụkwanụ ndị obi na-adịghị mma n’ihi ihe e mere ha. Otu n’ime ụzọ ndị dị mma anyị ga-esi gosi na iwu nke obiọma dị n’ire anyị bụ ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà.’—1 Tesa. 5:14.
17 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị anụ ihe na-adịghị mma ndị iro Chineke na-ekwu banyere ụmụnna anyị? Kama inyowe ụmụnna anyị enyowe, anyị kwesịrị ileghara ihe ndị ahụ anya ma ọ bụkwanụ jụọ onye ahụ ebe ọ nụrụ ihe ahụ o kwuru, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ịkọrọ Ilu 18:24.
anyị. Ọ bụrụ na ndị iro ndị Chineke chọrọ ịma ebe ụmụnna anyị nọ ka ha wee mesie ha ike, ịhụnanya na-adịgide adịgide anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ ga-eme ka anyị ghara ịgwa ha ihe ọ bụla.—Onye “Obiọma Ga-enweta Ndụ”
18, 19. Olee ihe mere iwu obiọma ji kwesị ịdịgide n’ire anyị mgbe anyị na-emeso ụmụnna anyị ihe?
18 Anyị kwesịrị ịna-emeso ụmụnna anyị ihe otú ga-egosi na anyị nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe ha nọ. Iwu nke obiọma ka kwesịrị ịdị n’ire anyị mgbe ihe siri ike. Obi adịghị Jehova ụtọ mgbe obiọma ụmụ Izrel dị “ka igirigi nke na-ekusa ngwa ngwa.” (Hos. 6:4, 6) Ma, Jehova na-enwe obi ụtọ ma anyị na-egosi ndị ọzọ obiọma mgbe niile. Ka anyị tụlee otú o si agọzi ndị na-egosi ndị ọzọ obiọma.
19 Ilu isi iri abụọ na otu amaokwu nke iri abụọ na otu sịrị: “Onye na-achụso ezi omume na obiọma ga-enweta ndụ, ezi omume na nsọpụrụ.” Otu n’ime ngọzi onye ahụ ga-enweta bụ ndụ, ọ bụghị ndụ a dịtụ a nwụọ, kama, ọ bụ ndụ ebighị ebi. Jehova ga-enyere ya aka ka o “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:12, 19) Ya mere, ka anyị gbalịsie ike ‘jiri obiọma na-emeso ibe anyị ihe.’—Zek. 7:9.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere obiọma a na-ekwu okwu ya ebe a, gụọ Ụlọ Nche nke Mee 15, 2002, peeji nke 12-13, 18-19.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Olee otú e si ama onye nwere obiọma?
• Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ka iwu obiọma dịrị n’ire anyị?
• Olee otú di na nwunye ga-esi jiri otú ha si ekwu okwu gosi na ha nwere ịhụnanya na-adịgide adịgide?
• Olee otú anyị ga-esi na-agwa ụmụnna anyị okwu iji gosi na iwu nke obiọma dị n’ire anyị?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 23]
Devid toro Jehova maka obiọma ya
[Foto dị na peeji nke 24]
Ị̀ na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya?