Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ihe O Mere Esorola Ya Gawa’

‘Ihe O Mere Esorola Ya Gawa’

‘Ihe O Mere Esorola Ya Gawa’

THEODORE JARACZ, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jechara ozi ya n’ụwa n’ụtụtụ Wenezdee Jun 9, 2010. Ọ dị iri afọ asatọ na anọ tupu ya anwụọ. Onye na-eru uju ọnwụ ya bụ Melita bụ́ nwunye ya, nke ya na ya biri iri afọ ise na atọ. Ndị ọzọ bụ nwanne ya nwaanyị na ụmụ atọ nwanne ya ahụ mụrụ, otu nwoke na ụmụ nwaanyị abụọ.

A mụrụ Nwanna Jaracz na Septemba 28, 1925, na Paịk Kawnti, Kentọki, nke dị n’Amerịka, e mere ya baptizim n’Ọgọst 10, 1941, mgbe ọ dị afọ iri na ise. Ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile n’afọ 1943, mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Afọ niile o jere ozi oge niile bụ iri afọ isii na asaa.

N’afọ 1946, bụ́ mgbe Nwanna Jaracz dị iri afọ abụọ, ọ gụrụ akwụkwọ na klas nke asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke na-elekọta Klivland, Ohayo, nke dị n’Amerika nakwa obodo ndị dị ya nso. N’afọ 1951, a gwara ya ka ọ gaa rụwa ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia, bụ́ ebe ọ bụ ohu alaka. Akwụkwọ bụ́ 1983 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kwuru na Nwanna Jaracz “gbara ụmụnna nọ n’ala ahụ dum ume n’ụzọ na-enweghị atụ site n’otú o si eji nlezianya eme ihe ọgbakọ Chineke kwuru nakwa otú o si eji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ọma.”

Mgbe Nwanna Jaracz lọghachiri Amerika, ọ lụrụ Melita Lasko na Disemba 10, 1956. Mgbe ha lụchara, a họpụtaghachiri Nwanna Jaracz ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, o ji ịnụ ọkụ n’obi lekọta ọtụtụ sekit na distrikti ndị dị n’Amerika. Mgbe afọ 1974 fọrọ obere ka ọ gwụ, a kpọrọ Nwanna Jaracz ka ọ bịa soro n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

Ọ ga-esi ike ichefu Nwanna Jaracz n’ihi na ọ bụ onye raara onwe ya nye Jehova, o rubekwaara ya isi ma jiri obi ya dum rụọ ọrụ ya. Ọ hụrụ nwunye ya n’anya, o jighịkwa ihe gbasara ife Chineke egwu egwu, ọ na-ebutekwa ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. (1 Kọr. 13:4, 5) Ihe gosiri na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ na o nweghị onye ọ na-achọ ka e megbuo, ọ na-achọkwa ka e meere mmadụ niile ebere. Ihe ọzọ gosiri na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya nke ukwuu bụ otú o si eji ịnụ ọkụ n’obi aga ozi ọma.

N’agbanyeghị na ọnwụ nwanna anyị a nke na-arụsi ọrụ ike, bụ́ onye ezinụlọ Betel na ụmụnna nọ n’ụwa niile hụrụ n’anya, na-ewute anyị nke ukwuu, obi dị anyị ụtọ na Nwanna Jaracz ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ọtụtụ afọ. Obi siri anyị ike na o “kwesịrị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ,” nakwa na ọ natala “okpueze bụ́ ndụ.” (Mkpu. 2:10) Anyị jikwa n’aka na ‘ihe o mere esorola ya gawa.’—Mkpu. 14:13.