Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-anụ Ákwà Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

Jehova Na-anụ Ákwà Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

Jehova Na-anụ Ákwà Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

DỊ KA Sọlọmọn, bụ́ eze ma ihe, nke chịrị Izrel n’oge ochie kwuru, “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị [anyị] niile.” (Ekli. 9:11) Ọdachi ma ọ bụ ihe isi ike nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, obi anaghị adị anyị mma ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ anyị anwụọ na mberede. Anyị na-eru uju ya ruo ọtụtụ izu ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa. Nke a nwedịrị ike ime ka mmadụ chee na ya erughị eru ikpeku Jehova ekpere.

E kwesịrị ịgba onye ụdị ihe a mere ume, na-egosikwa ya ọmịiko na ịhụnanya. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru ihe mesiri anyị obi ike. Ọ bụrụ abụ, sị: “Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada, ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.” (Ọma 145:14) Baịbụl gwara anyị na “anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe 16:9) Ya na “onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala bikwa, iji mee ka a tụtee mmụọ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, meekwa ka obi nke ndị e gburu mmụọ ha nwee ume.” (Aịza. 57:15) Olee otú Jehova si enyere onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala aka, na-akasikwa ya obi?

“Okwu E Kwuru n’Oge Ya”

Otu n’ime ụzọ dị iche iche Jehova si enyere anyị aka n’oge ya bụ site n’aka ụmụnna anyị. A gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà.’ (1 Tesa. 5:14) Ọ bụrụ na nwanna agwa nwanna ibe ya ihe na-esiri ike ma ọ bụ nke na-eru uju okwu na-egosi na ihe mere ya na-emetụ ya n’obi nakwa na ya hụrụ ya n’anya, nke a nwere ike ịgba ya ume. Okwu na-akasi obi e ji nkeji ole na ole gwa onye dara mbà nwedịrị ike ịgba ya ume. O nwere ike ịbụ na onye ahụ gwara ya okwu nke na-akasi obi bụ onye ụdị ihe ahụ merela, o nwekwara ike ịbụ enyi ya nke ụdị ihe ahụ merela gwara ya ihe ahụ. Jehova nwere ike isi otú a gbaa onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ume.

Tụlee ihe mere otu okenye ọgbakọ aha ya bụ Alex, bụ́ onye ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ gburu nwunye ya na mberede. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke ihe ahụ mere Alex wutere gwara ya okwu gbara ya ume. Nwunye onye nlekọta ahụ nwụkwara anwụ, ma, ọ lụọla nwaanyị ọzọ. Onye nlekọta ahụ kọọrọ ya otú obi na-adị ya mgbe ahụ nwunye ya nwụrụ. Obi na-adị ya mma ma ya na ndị ọzọ soro gaa ozi ọma na ọmụmụ ihe. Ma, owu na-ama ya ma ọ bụrụ na ọ baa n’ime ụlọ ya mechie ụzọ. Alex kwuru, sị: “Enwetara m onwe m mgbe m hụrụ onye mere ka m mata na ọ bụghị m bụ onye mbụ ụdị ihe a merela nakwa na ọ dịtụla ya otú ọ dị m.” N’eziokwu, “okwu e kwuru n’oge ya” nwere ike ịkasi mmadụ obi mgbe o nwere nsogbu.—Ilu 15:23.

Okenye ọzọ, onye maara ụfọdụ ndị nwunye ha ma ọ bụ di ha nwụrụ, gwara Alex okwu gbara ya ume. Ihe a mere Alex metụrụ ya n’obi nke mere ka o jiri obiọma gwa ya na Jehova ma otú obi dị anyị, marakwa mkpa anyị. Nwanna ahụ gwara ya, sị: “I mebighị iwu Jehova ma ị chọọ ịlụ nwaanyị ọzọ n’ọdịnihu.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ndị niile di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ, bụ́ ndị na-emecha chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọzọ, na-emecha lụọ. Ma, mgbe Alex chebaara ihe a nwanna ahụ kwuru echiche, ọ sịrị: “Mgbe nwanna ahụ chetaara m na emebighị m iwu Jehova ma m lụọ nwaanyị ọzọ, nke a mere ka m kwụsị ịna-eche na m na-emejọ nwunye m nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ Jehova ma ọ bụrụ na mụ emechaa lụọ nwaanyị ọzọ.”—1 Kọr. 7:8, 9, 39.

Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nwere ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike, kwuru, sị: “Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.” (Ọma 34:15) N’eziokwu, Jehova nwere ike ịza mkpu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-etiku ya ka o nyere ya aka. O nwere ike ime nke a site n’ime ka nwanna nọterela aka n’ọgbakọ, onye nwekwara obiọma, jiri amamihe gwa ya okwu na-agba ume. Ndokwa a Jehova mere magburu onwe ya, baakwa ezigbo uru.

Anyị Na-enweta Enyemaka n’Ọmụmụ Ihe

Onye dara mbà n’obi na-echekarị ihe ndị na-adịghị mma, bụ́ ndị nwere ike ime ka ọ na-akpa iche. Ma, Ilu isi iri na asatọ amaokwu nke mbụ, gwara anyị, sị: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” Alex kwuru, sị: “Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anwụọ, ihe ga-eju gị obi bụ ihe na-adịghị mma.” O kwuru na ya jụrụ onwe ya, sị: “‘È nwere ihe m mere nke m na-emetaghị? È nwere ihe ọzọ m gaara eme iji gosi ya obiọma nakwa na m na-echebara ya echiche?’ Achọghị m ịna-anọ naanị m. Achọghị m ịnọ n’enweghị nwunye. O siri ike ichefu ihe ndị a n’ihi na e nwere ihe ndị ga na-echetara gị kwa ụbọchị na ị nọ naanị gị.”

Ọ bụ mgbe e gburu mmụọ mmadụ ka ya na ndị Chineke kwesịrị ịkacha na-akpakọrịta. Ebe a ga-ahụ ndị Chineke bụ n’ọmụmụ ihe. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-anụ okwu Chineke, bụ́ nke na-akasi anyị obi ma na-agba anyị ume.

Ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka ile nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ka anyị na-ege ntị mgbe a na-agụ ebe ụfọdụ na Baịbụl, anyị ana-atụgharịkwa uche na ha, anyị ga na-eche ihe ndị dị mkpa, ya bụ, otú anyị ga-esi mee ka a ghọta na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị na otú anyị ga-esi doo aha ya nsọ, ọ bụghị ahụhụ ahụ anyị na-ata. Ihe ọzọ bụ na mgbe a na-akụziri anyị banyere Jehova n’ọmụmụ ihe, ọ na-eme ka anyị ghọta na Jehova ma ahụhụ anyị na-ata na otú obi dị anyị, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ amaghị. Ọ ma na anyị “na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.” (Ilu 15:13) Ezi Chineke chọrọ inyere anyị aka, nke a na-eme ka anyị na-agba mbọ na-aga n’ihu, ọ na-enyekwa anyị ume.—Ọma 27:14.

Mgbe ndị iro Eze Devid na-enye ya nsogbu, o bekuru Chineke ákwá, sị: “Ike na-agwụkwa mmụọ m n’ime m; obi m adawo mbà n’ime m.” (Ọma 143:4) Ahụhụ na-emekarị ka ike na-agwụ mmadụ, na-emekwa ka obi na-ajọ ya njọ. Ọ na-emedị ka onye ahụ daa mbà. Nsogbu anyị nwere ike ịbụ ọrịa ma ọ bụkwanụ nkwarụ ga-adịte aka. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka idi ya. (Ọma 41:1-3) N’agbanyeghị na e nweghị onye Chineke na-eji ọrụ ebube agwọ taa, ọ na-agba onye ahụ nwere nsogbu ume, na-emekwa ka ọ mara ihe ọ ga-eme iji die nsogbu ya. Cheta na Devid kpọkuru Jehova mgbe ọ nọ ná nsogbu. Ọ bụrụ abụ, sị: “Echetawo m oge dị anya gara aga; atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum; eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.”—Ọma 143:5.

Ebe ọ bụ na e dere ihe ndị a mmụọ nsọ mere ka Devid kwuo n’Okwu Chineke, ọ na-egosi na Jehova ma otú obi dị anyị. Ihe ndị a Devid kwuru na-egosi na Jehova na-ege ntị n’ihe ndị anyị na-arịọ ya. Ọ bụrụ na anyị anabata aka Jehova na-enyere anyị, ‘ya onwe ya ga-akwado anyị.’—Ọma 55:22.

“Na-ekpenụ Ekpere n’Akwụsịghị Akwụsị”

Jems 4:8 kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” Ekpere bụ otu n’ime ụzọ ndị anyị si abịaru Chineke nso. Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’ (1 Tesa. 5:17) Ọ bụrụgodị na ọ na-esiri anyị ike ikwu kpọmkwem otú obi dị anyị, “mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu.” (Rom 8:26, 27) Jehova ma n’ezie otú obi dị anyị.

Monika, bụ́ onye ya na Jehova dị n’ezigbo mma kwuru, sị: “Ekpere, ịgụ Baịbụl, na ịmụ ihe n’onwe m emeela ka o doo m anya na Jehova bụ ezigbo Enyi m. Mụ na ya dị n’ezigbo mma nke mere ka m ghọta na ọ na-enyere m aka mgbe niile. Ịghọta na ọ ma ihe dị m n’obi, ọbụna mgbe m na-enweghị ike ikwu otú ọ dị m n’obi, na-akasi m obi. Ama m na obiọma ya na ihe ọma ndị ọ na-emere m enweghị atụ.”

N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna anyị agbaa anyị ume, nke na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ka anyị gbaa mbọ nabata ya, ka anyị mee ihe a gwara anyị n’ọmụmụ ihe, bụ́ nke na-eme ka okwukwe anyị sie ike, ka anyị gwakwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi n’ekpere. Ihe a niile bụ otú Jehova si eme ka anyị ghọta na ya hụrụ anyị n’anya. Alex mụtara ihe n’ihe ahụ mere ya, ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Ọ bụrụ na anyị emee òkè nke anyị, nabatakwa ihe niile Jehova Chineke na-enye anyị iji mee ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma, anyị ga-enwe ‘ike karịrị ike nkịtị’ iji die ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị.”—2 Kọr. 4:7.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Ihe Na-akasi Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya Obi

N’akwụkwọ abụ ọma, e nwere ọtụtụ ebe ndị mmadụ kwuru otú obi dị ha nakwa ọtụtụ ebe Jehova mere ka obi sie anyị ike na ya na-anụ ákwá onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ji mwute na-ebe. Lee ihe ụfọdụ e kwuru n’abụ ọma:

“N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova, ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka. O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m, mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.”—Ọma 18:6.

“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Ọma 34:18.

“Ọ [ya bụ, Jehova] na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.”—Ọma 147:3.

[Foto dị na peeji nke 17]

“Okwu e kwuru n’oge ya” na-akasi obi mgbe mmadụ na-ata ahụhụ