Ndị Na-eto Eto—ka Okwu Chineke Na-edu Unu
Ndị Na-eto Eto—ka Okwu Chineke Na-edu Unu
“Nweta amamihe, nweta nghọta.”—ILU 4:5.
1, 2. (a) Gịnị nyeere Pọl onyeozi aka imeri mgba ya na anụ ahụ́ na-agba? (b) Olee otú i nwere ike isi nweta amamihe na nghọta?
Ị̀ MA onye kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” Ọ bụ Pọl onyeozi. N’agbanyeghị na Pọl hụrụ Jehova n’anya, o siiri ya ike mgbe ụfọdụ ime ihe ziri ezi. Olee otú nke a dị ya? O dere, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya!” (Rom 7:21-24) Ị̀ ghọtara otú a ọ dị Pọl? Ọ̀ na-esiri gị ike ime ihe ziri ezi mgbe ụfọdụ? Ọ̀ na-eme ka obi jọọ gị njọ otú ahụ ọ jọrọ Pọl? Ọ bụrụ otú a, adala mbà. Pọl meriri ihe isi ike ndị o nwere, i nwekwara ike imeri ndị nke gị.
2 Pọl meriri ihe isi ike ndị o nwere n’ihi na o kwere ka “okwu na-enye ezi ndụ” na-edu ya. (2 Tim. 1:13, 14) Nke a mere ka o nwee amamihe na nghọta, bụ́ ihe ndị nyeere ya aka ime mkpebi ndị dị mma. Jehova bụ́ Chineke nwere ike inyere gị aka ka i nwee amamihe na nghọta. (Ilu 4:5) O nyere anyị ndụmọdụ ndị magburu onwe ha n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. (Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.) Ka anyị tụlee otú ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nwere ike isi nyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-emeso ndị mụrụ gị ihe, ịma otú gị na ego ga-esi na-aga, nakwa ihe i kwesịrị ime mgbe naanị gị nọ.
Ka Okwu Chineke Na-edu Gị n’Ezinụlọ
3, 4. Olee ihe nwere ike ime ka irubere ndị mụrụ gị isi na-esiri gị ike, ma, gịnị mere ndị mụrụ ụmụ ji agwa ụmụ ha ihe ha kwesịrị ime?
3 Ọ̀ na-esiri gị ike idebe iwu ndị mụrụ gị na-enye gị? Olee ihe ndị nwere ike ime ka ọ na-esiri gị ike? Otu n’ime ha nwere ike ịbụ na ị chọrọ ịna-ekpebiri onwe gị ihe ị ga na-eme. O nweghị onye na-anaghị achọ ikpebiri onwe ya ihe. Nke a gosiri na i towela. Ma, i kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ gị isi mgbe gị na ha bi.—Efe. 6:1-3.
4 Ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ndị mụrụ gị chọrọ ma ọ bụrụ na ị mara ihe mere ha ji agwa gị ihe ị ga-eme. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị otú ọ dị Nwamaka, * bụ́ onye dị afọ iri na asatọ. Ọ sịrị: “Ha na-echefu na mụ abụghịzi nwatakịrị. Ha achọghị ka m na-ekwu uche m, ma ọ bụkwanụ na-ekpebiri onwe m ihe.” Dị ka ọ dị Nwamaka, i nwere ike na-eche na ndị mụrụ gị anaghị ekwe gị megharịa ahụ́ otú ị chọrọ. Ma, isi ihe mere ndị mụrụ gị ji agwa gị ihe i kwesịrị ime bụ na ha hụrụ gị n’anya. Ihe ọzọ mere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ji agwa ụmụ ha ihe ha kwesịrị ime bụ na ha ma na ha ga-aza Jehova ajụjụ banyere otú ha si zụọ ha.—1 Tim. 5:8.
5. Olee otú irubere ndị mụrụ gị isi ga-esi baara gị uru?
5 N’eziokwu, irubere ndị mụrụ gị isi yiri mmadụ ịzụ ihe n’aka. Ọ bụrụ na onye ahụ na-akwụ ụgwọ o ji mgbe o kwesịrị, onye ahụ ọ na-azụ ihe ga-atụkwasị ya obi, ọ ga-eresịkwa ya ihe n’aka ma ọ bịa ọzọ. N’otu aka ahụ, i ji ndị mụrụ gị ụgwọ, ya bụ, ịsọpụrụ ha na irubere ha isi. (Gụọ Ilu 1:8.) Ọ bụrụ na ị na-erubere ndị mụrụ gị isi karịa ka ị na-emebu, ha nwere ike ịhapụ gị ka ị na-emekwuru onwe gị mkpebi ụfọdụ. (Luk 16:10) Ma, ọ bụrụ na ị na-enupụkarịrị ha isi, ya atụla gị n’anya na ha nwere ike ghara ịna-ekwe gị megharịa ahụ́.
6. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ha na-erubere ha isi?
6 Otu n’ime ụzọ ndị mụrụ ụmụ nwere ike isi mee ka ụmụ ha na-erubere ha isi bụ isetịpụrụ ha ezigbo ihe nlereanya. Ha na-egosi na iwu Chineke dị mma ma ọ bụrụ na ha ejiri obi ha dum na-erubere Jehova isi. Nke a ga-eme ka ọ dịrị ụmụaka mfe ikweta na ihe ndị mụrụ ha na-agwa ha mee bụ maka ọdịmma ha. (1 Jọn 5:3) Ma, Baịbụl gosiri na o nwere mgbe ụfọdụ Jehova hapụrụ ndị ohu ya ka ha kwuo ihe bụ́ uche ha n’ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime. (Jen. 18:22-32; 1 Eze 22:19-22) Ò nwere mgbe ndị nne na nna nwere ike ịhapụ ụmụ ha ka ha kwuo ihe bụ́ uche ha n’ihe ụfọdụ?
7, 8. (a) Olee nsogbu ndị na-eto eto ụfọdụ na-enwe? (b) Olee ihe i kwesịrị ịghọta nke ga-eme ka ịdọ aka ná ntị baara gị uru?
7 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị ndị na-eto eto ka ndị mụrụ ha hà na-akatọkarị ha. O nwere ike ịbụ na ọ na-adị gị mgbe ụfọdụ otú ọ dịrị otu nwa okorobịa aha ya bụ Craig, bụ́ onye sịrị, “Mama m na-emekarị ka onye uwe ojii, ya bụ, ọ na-enyopụtakarị ebe ndị m na-anaghị emezi emezi.”
8 Ndị nne na nna na-agbazikarị ụmụ ha site n’ịkatọ ihe ha mere. Baịbụl gosiri na ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịnabata ịdọ aka ná ntị, ọbụna mgbe ha mere ihe e kwesịrị iji maka ya dọọ ha aka ná ntị. (Hib. 12:11) Gịnị ga-enyere gị aka irite uru ma a dọọ gị aka ná ntị? Ihe dị mkpa i kwesịrị iburu n’obi bụ na ndị mụrụ gị hụrụ gị n’anya, ọ bụ ya mere ha ji adọ gị aka ná ntị. (Ilu 3:12) Ha achọghị ka ị na-akpa àgwà ọjọọ, kama, ha chọrọ inyere gị aka ka ị na-akpa ezigbo àgwà. Ndị mụrụ gị ma na ọ bụrụ na ha agbazighị gị, ọ pụtara na ha kpọrọ gị asị. (Gụọ Ilu 13:24.) Ihe ọzọ bụ na i kwesịrị ịghọta na mmadụ na-esi n’ihe o mehiere amụta ihe. N’ihi ya, ọ bụrụ na a gbazie gị, lee ma ò nwere ihe i nwere ike ịmụta n’ihe a gwara gị? “Ọ dị mma inweta [amamihe] dị ka uru karịa inweta ọlaọcha dị ka uru, inweta ya dị ka ihe mmadụ rụpụtara dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.”—Ilu 3:13, 14.
9. Gịnị ka ndị na-eto eto kwesịrị ime, kama ịna-eche mgbe niile na ihe ndị mụrụ ha mere adịghị mma?
9 Ndị nne na nna na-emehiekwa ihe. (Jems 3:2) Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ikwu okwu n’echeghị echiche mgbe ha na-adọ gị aka ná ntị. (Ilu 12:18) Gịnị nwere ike ime ka ndị mụrụ gị kwuo okwu n’echeghị echiche? O nwere ike ịbụ na e nwere ihe na-enye ha nsogbu n’obi, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha chere na ihe ahụ i mere gosiri na ha emeghị ihe ha kwesịrị ime. Kama iche na ihe ha mere gị adịghị mma, gosi ha na obi dị gị mma n’otú ha si agba mbọ na-enyere gị aka? Ọ bụrụ na ị na-anabata ịdọ aka ná ntị, ọ ga-enyere gị aka dị ukwuu mgbe i toro.
10. Olee ihe ndị ị ga-eme ka ọ dịrị gị mfe irubere ndị mụrụ gị isi ma nabata ịdọ aka ná ntị ha na-enye gị?
10 Ị̀ chọrọ ka ọ dịrị gị mfe ịnabata ịdọ aka ná ntị ndị mụrụ gị na-enye gị ma rite uru na ya? Ya bụrụ otú a, i kwesịrị ịna-agwa ha okwu otú dị mma. Olee otú i nwere ike isi mee ya? Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ige ntị. Baịbụl sịrị: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Kama iji iwe na-agwa ha na ihe i mere dị mma, medata obi gee ntị n’ihe ha na-agwa gị. Chebara ihe ha gwara gị echiche, ọ bụghị otú ha si gwa gị ya. Gosi ha na ị nabatara ihe ha kwuru site n’iji nkwanye ùgwù kweta na ihe i mere adịghị mma. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọọ ịgwa ha ihe mere i ji kwuo ihe i kwuru ma ọ bụ ihe mere i ji mee ihe i mere? Ọ ga-akacha mma ma ọ bụrụ na ị ‘chịkwaa egbugbere ọnụ gị’ ruo mgbe i mere ihe ha chọrọ ka i mee. (Ilu 10:19) Ndị mụrụ gị ga-ege ntị n’ihe ị na-ekwu ma ha hụ na ị na-ege ntị mgbe ha na-abara gị mba. Ime ihe ndị a ga-egosi na Okwu Chineke na-edu gị.
Ka Okwu Chineke Na-edu Gị Mgbe Ị Na-eme Ihe Ego
11, 12. (a) Olee ndụmọdụ Okwu Chineke nyere anyị banyere ego, ọ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú ndị mụrụ gị nwere ike isi nyere gị aka ka ị ghara ịna-emefu ego aghara aghara?
11 Baịbụl sịrị: “Ego bụ ihe nchebe.” Ma, amaokwu ahụ gosikwara na amamihe ka ego baa uru. (Ekli. 7:12) Okwu Chineke gwara anyị na ego dị mma, ọ gwaghị anyị ka anyị hụ ya n’anya. Gịnị mere na i kwesịghị ịhụ ego n’anya? Tụlee ihe atụ a: Mma dị nkọ na-abara onye na-esi nri nke na-elezi anya uru. Ma, otu mma ahụ nwere ike imerụ onye na-anaghị elezi anya ezigbo ahụ́. N’otu aka ahụ, ego na-aba uru ma e jiri nlezianya na-eme ihe metụtara ya. Ma, ndị “kpebisiri ike ịba ọgaranya” na-elegharakarị ndị enyi ha, ezinụlọ ha, ọbụna adịm ná mma ha na Chineke, anya. Nke a na-eme ka ha “jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.”—Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.
12 Olee otú ị ga-esi jiri nlezianya na-eme ihe ego? Ọ ga-adị mma ma ị gwa ndị mụrụ gị ka ha gwa gị otú ị ga-esi na-ahazi otú i si emefu ego gị. Sọlọmọn dere, sị: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka, ọ bụkwa onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.” (Ilu 1:5) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anna gwara ndị mụrụ ya ka ha nye ya ezi ntụziaka. Ọ sịrị: “Papa m kụziiri m otú m kwesịrị isi na-ahazi otú m si emefu ego, o gosikwara m na ọ dị mkpa ka anyị na-elezi anya otú anyị si emefu ego n’ezinụlọ.” Mama Anna kụzikwaara ya ihe baara ya uru. Anna sịrị: “Ọ kụziiri m na ọ dị mkpa ikwe ihe ọnụ ebe ọzọ tupu mụ azụọ ihe ahụ.” Olee otú nke a si baara Anna uru? O kwuru sị: “Nke a enyerela m aka ịma otú m ga-esi na-ahazi otú m si emefu ego m. M na-elezi anya ma m na-emefu ego, nke a mere ka obi na-adị m ụtọ, obi ana-erukwa m ala n’ihi na anaghị m eji ụgwọ na-enweghị isi.”
13. Olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịna-emefu ego aghara aghara?
13 I nwere ike ịna-ejihi ụgwọ nne ma ọ bụrụ na ị na-azụ ihe ọ bụla ị hụrụ ma ọ bụ na-emefu ego aghara aghara iji gosi ndị enyi gị na i nwere ego. Gịnị nwere ike inyere gị aka ka i wee zere ihe ndị a? I kwesịghị ịna-emefu ego aghara aghara. Ellena, bụ́ onye na-erubeghị iri afọ abụọ na ise, anaghị emefu ego aghara aghara. Ọ sịrị: “Tupu mụ na ndị enyi m agawa ebe ọ bụla, m na-ebu ụzọ kpebie ego ole m ga-emefu. . . . Ndị m na-esokwa aga ahịa bụ ndị enyi m m maara na ha anaghị emefu ego ha aghara aghara, bụ́ ndị ga-agwa m ka m gaa kwee ihe m chọrọ ịzụ ọnụ ebe ọzọ, ọ bụghị ka m zụrụ nke mbụ ahụ m kwere ọnụ.”
14. Gịnị mere i ji kwesị ịkpachara anya maka “ike dị aghụghọ nke akụnụba”?
14 Ịkpata ego na ijizi ya ejizi dị mkpa ná ndụ. Ma, Jizọs kwuru na ndị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ndị “maara mkpa ime mmụọ ha.” (Mat. 5:3) Ọ dọrọ anyị aka ná ntị na “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime ka anyị ghara inwe mmasị n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Mak 4:19) Ọ bụ ya mere i ji kwesị ikwe ka Okwu Chineke na-edu gị, gharakwa ịhụ ego n’anya.
Ka Okwu Chineke Na-edu Gị Mgbe Naanị Gị Nọ
15. Olee mgbe e nwere ike ịkacha lee okwukwe gị ule?
15 Olee mgbe i chere a ga-akacha ele okwukwe gị ule? Ọ̀ bụ mgbe gị na ndị ọzọ nọ ka ọ̀ bụ mgbe naanị gị nọ? Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ
ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ, ị na-akpachara anya ka ị ghara ime ihe ga-emebi adịm ná mma gị na Chineke. Ọ bụ mgbe ị nọ naanị gị ma ọ bụ mgbe ị na-atụrụ ndụ ka ọnwụnwa na-abịakarị.16. Gịnị mere i ji kwesị irubere Jehova isi mgbe ị nọ naanị gị?
16 Gịnị mere i ji kwesị ịgbalị rubere Jehova isi mgbe naanị gị nọ? Cheta na i nwere ike ime ihe ga-ewute Jehova ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka obi ya ṅụrịa. (Jen. 6:5, 6; Ilu 27:11) Ihe ọ bụla i mere gbasara Jehova n’ihi na “ihe banyere [gị] na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ọ chọrọ ka i gee ya ntị ka i wee baara onwe gị uru. (Aịza. 48:17, 18) O wutere Jehova mgbe ụfọdụ ndị ohu ya n’Izrel oge ochie nupụụrụ ya isi. (Ọma 78:40, 41) Ma, Jehova hụrụ Daniel onye amụma n’anya nke ukwuu, nke mere ka otu mmụọ ozi kpọọ ya “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 10:11) Ọ̀ bụ n’ihi gị? Ọ bụ n’ihi na Daniel rubeere Chineke isi ma n’ihu ọha ma mgbe ọ nọ naanị ya.—Gụọ Daniel 6:10.
17. Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị mgbe ị na-eche ihe ndị ị ga-eji atụrụ ndụ?
17 Ka i wee rubere Chineke isi mgbe ị nọ naanị gị, i kwesịrị inwe “ikike nghọta” ka i wee nwee ike “ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Nke a ga-emezi ka i nwee ike ịzụ ikike nghọta ahụ “site n’iji ya eme ihe,” ya bụ, site n’ime ihe ị ma na o ziri ezi. (Hib. 5:14) Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-eche ụdị egwú ị ga-ege, ụdị fim ị ga-ekiri, ma ọ bụ ebe ndị ị ga-aga n’Ịntanet, ihe ga-enyere gị aka ime ihe ziri ezi ma zere ihe na-ezighị ezi bụ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Ihe a ọ̀ ga-enyere m aka inwe obi ọmịiko ka ọ̀ ga-eme ka m na-aṅụrị ọṅụ “n’ọdachi onye ọzọ”?’ (Ilu 17:5) ‘Ọ̀ ga-enyere m aka ịhụ “ezi ihe n’anya” ka ọ̀ ga-eme ka o siere m ike ịkpọ “ihe ọjọọ asị”?’ (Emọs 5:15) Ihe ị na-eme mgbe naanị gị nọ na-egosi ụdị ihe i ji kpọrọ ihe.—Luk 6:45.
18. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị na-eme mmehie na nzuzo, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
18 Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ị ma na ọ dị njọ na nzuzo? Cheta na “onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.” (Ilu 28:13) Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya mmadụ ịnọ na-eme ihe ọjọọ wee “na-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute.” (Efe. 4:30) I kwesịrị ikwupụtara Chineke mmehie i mere, kwesịkwa ịgwa ya ndị mụrụ gị, nke a ga-enyekwara gị aka. “Ndị okenye nke ọgbakọ” ga-enyere gị ezigbo aka na nke a. Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, sịrị: “Ka ha kpeekwara [onye ahụ mere mmehie] ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.” (Jems 5:14, 15) Nke bụ́ eziokwu bụ na nke a nwere ike imenye gị ihere ma wetara gị nsogbu ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na ị kata obi gwa ndị okenye, ị gaghị abanyekwu ná nsogbu, obi ga-erukwa gị ala maka na akọnuche gị adịla ọcha.—Ọma 32:1-5.
Mee Ka Obi Jehova Ṅụrịa
19, 20. Olee ihe Jehova chọrọ ka i nwee, ma, gịnị ka i kwesịrị ime?
19 Jehova bụ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ. (1 Tim. 1:11) O nwekwara nnọọ mmasị n’ebe ị nọ. Ọ bụrụgodị na o nweghị onye na-ahụ mbọ ị na-agba ime ihe ziri ezi, ọ na-ahụ ya. O nweghị ihe Jehova na-anaghị ahụ. Ihe o ji na-ele gị abụghị ka ọ chọpụta ebe ị na-anaghị eme nke ọma, kama, ọ bụ iji kwado gị ná mbọ ị na-agba ime ihe ziri ezi. Baịbụl sịrị: “Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe 16:9.
20 Ya mere, ka Okwu Chineke na-edu gị, na-emekwa ihe ọ na-agwa gị. Nke a ga-enyere gị aka inweta amamihe na nghọta nke ga-eme ka i merie nsogbu ndị siri ike nwere ike ịbịara gị, meekwa ka i nwee ike ime mkpebi ndị nwere ike isiri gị ike omume. Ọ bụghị naanị na ị ga-eme ka obi ndị mụrụ gị na nke Jehova ṅụrịa, ị ga-enwekwa ezigbo obi ụtọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee ihe ndị na-eto eto ga-eme ka o wee dịrị ha mfe irubere ndị mụrụ ha isi ma nabata ịdọ aka ná ntị ha na-enye ha?
• Gịnị mere anyị ji kwesị izere ịhụ ego n’anya?
• Olee otú ị ga-esi na-erubere Chineke isi mgbe ị nọ naanị gị?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 6]
Ị̀ ga-erubere Chineke isi mgbe ị nọ naanị gị?