Ndị Na-eto Eto—olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme?
Ndị Na-eto Eto—olee Ihe Unu Ga-eji Ndụ Unu Eme?
“Otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.”—1 KỌR. 9:26.
1, 2. Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gaziere gị ka ị na-eto?
Ọ BỤRỤ na ị chọrọ ịga ebe ị na-agatụbeghị, i kwesịrị iwere map ma ọ bụkwanụ gị agwa onye maara ụzọ ka o duga gị. Map ahụ ga-enyere gị aka ịma ebe ị nọ na otú ị ga-esi ruo ebe ị na-aga. Onye ahụ maara ụzọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ifu ụzọ. Ma map ahụ ma onye ahụ agaghị enwe ike inyere gị aka ma ọ bụrụ na ị maghị ebe ị na-aga. Ya mere, i kwesịrị ịma ebe ị na-aga ka i wee ghara ịna-agagheri.
2 Unu ndị na-eto eto nọ n’ọnọdụ yiri nke a ka unu na-etoru ogo mmadụ. Unu nwere map ga-enyere unu aka ịma ebe unu na-aga, nweekwa ihe ga-eduzi unu. Baịbụl bụ map nke nwere ike inyere gị aka ịma otú ị ga-esi ruo ebe ị na-aga. (Ilu 3:5, 6) Ọ bụrụ na ị zụọ akọnuche gị nke ọma, ọ ga-eme ka ị ghara ifu ụzọ. (Rom 2:15) Akọnuche gị dị ka onye ahụ na-ezi gị ụzọ. Ma, i kwesịrị ịma ebe ị na-aga ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gaziere gị ná ndụ. I kwesịrị inwe ihe mgbarụ ọsọ ndị doro anya.
3. Olee uru mmadụ inwe ihe mgbaru ọsọ bara, bụ́ nke Pọl kwuru okwu ya ná 1 Ndị Kọrịnt 9:26?
3 Pọl onyeozi kwuru uru mmadụ inwe ihe mgbaru ọsọ na ịgba mbọ iru ha bara. O dere, sị: “Otú m si agba ọsọ abụghị ihe a na-ejighị n’aka; otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.” (1 Kọr. 9:26) Ọ bụrụ na i nwee ihe mgbaru ọsọ, ị ga na-agba ọsọ ka onye ma ebe ọ gba na-aga. N’oge na-adịghị anya, ị ga-enwe ihe ndị dị mkpa ị ga-ekpebi ihe ị ga-eme banyere ha. Ha gụnyere ma ị̀ ga-anọgide na-efe Jehova, ụdị ọrụ ị ga-arụ, ị̀ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, ụdị onye ị ga-alụ, nakwa ma ị̀ ga-amụ ụmụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ị gaghị ama nke ị ga-eme eme. Ma, ọ bụrụ na i chebara ihe ndị a echiche tupu oge eruo, kwerekwa ka eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke na-eduzi gị mgbe ị na-eme mkpebi, e nweghị ihe ga-eme ka ị chọọ itinye isi n’ebe ị ga-efu ụzọ.—2 Tim. 4:4, 5.
4, 5. (a) Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na i nweghị ihe mgbaru ọsọ? (b) Olee ihe mere i ji kwesị ịna-eme ihe ndị na-egosi na ị chọrọ ime uche Chineke?
4 Ọ bụrụ na i nweghị ihe mgbaru ọsọ, ndị ọgbọ gị na ndị nkụzi gị nwere ike ime ka i mee ihe ha chere na ọ ga-abara gị uru. N’eziokwu, ọ bụrụgodị na i nwere ihe mgbaru ọsọ, ụfọdụ ka nwere ike ịtụrụ gị aro. Ma, mgbe ha na-atụrụ gị aro, jụọ onwe gị sị: ‘Ihe ndị a ha na-agwa m ka m mee, hà ga-enyere m aka icheta Onye kere m ugbu a m ka na-eto eto, ka hà ga-eme ka m chefuo ya?’—Gụọ Ekliziastis 12:1.
5 Olee ihe mere i ji kwesị ịhọrọ ime ihe ndị ga-egosi na ị chọrọ ime ihe dị Chineke mma? Otu n’ime ihe ndị mere i ji kwesị ime nke a bụ na ọ bụ Jehova nyere anyị ezi ihe niile anyị nwere. (Jems 1:17) N’eziokwu, onye ọ bụla kwesịrị igosi Jehova na obi dị ya ụtọ maka ihe ọ na-emere anyị. (Mkpu. 4:11) O nweghị ụzọ ka mma ị ga-esi mee nke a karịa inwe ihe mgbaru ọsọ ndị na-egosi na ị chọrọ ime uche ya. Ka anyị tụlee ihe mgbaru ọsọ ndị i kwesịrị inwe na ihe ị ga-eme ka i wee ruo ha.
Olee Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị I Nwere Ike Inwe?
6. Olee ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi i nwere ike inwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
6 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi i nwere ike inwe bụ ịchọpụta n’onwe gị na ihe e kwuru na Baịbụl bụ eziokwu. (Rom 12:2; 2 Kọr. 13:5) Ndị ọgbọ gị nwere ike ikwere na mmadụ si n’enwe pụta ma ọ bụkwanụ kwere ozizi ụgha dị iche iche ndị okpukpe ụgha na-ezi naanị n’ihi na ndị ọzọ gwara ha na ọ bụ ihe ha kwesịrị ikwere. Ma, i kwesịghị ikwere ihe naanị n’ihi na ndị ọzọ chọrọ ka i mee otú ahụ. Cheta na Jehova chọrọ ka i jiri obi gị dum na-efe ya ofufe. (Gụọ Matiu 22:36, 37.) Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka i nwee ihe mere i ji nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.—Hib. 11:1.
7, 8. (a) Olee ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere ike iru ngwa ngwa bụ́ ndị ga-eme ka okwukwe gị sie ike? (b) Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na i ruo ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị a?
7 Iji mee ka okwukwe gị sikwuo ike, leenụ ma ị̀ ga-enwe ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere ike iru ngwa ngwa. Otu n’ime ha nwere ike ịbụ ikpe ekpere kwa ụbọchị. Iji nwee ihe ọhụrụ ị ga na-ekpe n’ekpere, buru ihe ndị mere n’ụbọchị n’uche ma ọ bụkwanụ detuo ha edetuo, ka i wee tinye ha n’ekpere. Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwula naanị nsogbu ndị i nwere n’ụbọchị, kamakwa, kwuo ihe ndị mere gị obi ụtọ. (Fil. 4:6) Ihe mgbaru ọsọ ọzọ nwere ike ịbụ ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ị̀ ma na ọ bụrụ na ị na-agụ ihe dị ka peeji anọ na Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-agụcha Baịbụl naanị n’otu afọ? * Abụ Ọma 1:1, 2 kwuru, sị: ‘Obi ụtọ na-adịrị onye iwu Jehova na-atọ ụtọ. Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị.’
8 Ihe mgbaru ọsọ nke atọ i nwere ike inwe bụ ịkwadebe ajụjụ ndị ị ga-aza mgbe ọ bụla a gara ọmụmụ ihe. Ná mmalite, i nwere ike ịna-agụpụta azịza otú e si dee ya n’akwụkwọ ma ọ bụkwanụ gụọ Baịbụl. Ka oge na-aga, i nwere ike ịgba mbọ na-aza ajụjụ n’okwu nke Hib. 13:15) Ozugbo i ruru ụfọdụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị a, obi ga-esikwu gị ike, ị ga enwekwukwa obi ụtọ maka ihe Jehova na-emere gị, nke a ga-emekwa ka ị chọọ inwe ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ewetụ oge.
aka gị. N’eziokwu, mgbe ọ bụla ị zara ajụjụ, ị na-enye Jehova onyinye. (9. Ọ bụrụ na ị bụghị onye nkwusa, olee ihe mgbaru ọsọ ga-ewetụ oge nke i nwere ike inwe?
9 Olee ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ewetụ oge, bụ́ ndị i nwere ike inwe? Ọ bụrụ na ị ghọbeghị onye nkwusa, ihe mgbaru ọsọ ga-ewetụ oge nke i nwere ike inwe bụ ịghọ onye nkwusa. Ozugbo i ruru ihe mgbaru ọsọ a magburu onwe ya, i kwesịrị ị na-agachi ozi ọma anya, mụtakwa otú ị ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma ma ghara ikwe ka otu ọnwa gafee n’agaghị ozi ọma. I kwesịkwara ịmụta otú ị ga-esi jiri Baịbụl na-ekwusa ozi ọma. Ka ị na-eme ihe ndị a, ị ga-ahụ na ozi ọma ga na-atọkwu gị ụtọ. I nweziri ike iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụkwanụ gbalịa nwee onye ị na-amụrụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ihe mgbaru ọsọ magburu onwe ya nke i nwere ike inwe bụ iru eru ka i wee ghọọ Onyeàmà Jehova e mere baptizim.
10, 11. Olee ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ewetụ oge ndị na-eto eto e mere baptizim nwere ike inwe?
10 Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova e mere baptizim, lee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ i nwere ike ịgba mbọ ruo. Site n’oge ruo n’oge, i nwere ike inyere ọgbakọ dị iche iche aka ịrụ ọrụ n’ókèala a na-anaghị ejekarị ozi ọma. Ebe ị bụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa ume ka dị n’obi, ahụ́ adịrịkwa gị, i nwere ike ịrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge niile. Ọtụtụ puku ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị na-enwe obi ụtọ, ga-agwa gị na ụzọ kacha enye ọṅụ ị ga-esi cheta Onye kere gị mgbe ị na-eto eto bụ ịbanye n’ozi oge niile. Ihe ndị a bụ ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere ike iru mgbe gị na ndị mụrụ gị ka bi. Ọ bụrụ na i ruo ihe mgbaru ọsọ ndị a, ị ga-abara ọgbakọ unu uru.
11 Ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ, bụ́ ndị ga-ewetụ oge, nwere ike ịbara ma ọgbakọ unu ma ọgbakọ ọzọ uru. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ime atụmatụ ije ozi n’ebe ọzọ ma ọ bụ ná mba ọzọ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. I nwere ike ịchọ inye aka mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ná mba ọzọ. I nwedịrị ike ije ozi na Betel ma ọ bụkwanụ ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ma, ihe mgbaru ọsọ mbụ ị ga-eru tupu gị eruwe ọtụtụ n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị e kwuru ebe a bụ ịgba mbọ ka e mee gị baptizim. Ọ bụrụ na e mebeghị gị baptizim, chebara ihe ndị i nwere ike ime echiche ka e wee mee gị baptizim.
Iru Ihe Mgbaru Ọsọ nke Ịbụ Onye E Mere Baptizim
12. Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji abịa ka e mee ha baptizim, oleekwa ihe mere ihe ndị a ezughị?
12 Olee ihe i chere mere e ji eme mmadụ baptizim? Ụfọdụ nwere ike iche na ọ ga-eme ka ha ghara ịdaba ná mmehie. Ndị ọzọ nwere ike iche na ihe ha ji kwesị ịbụ ndị e mere baptizim bụ n’ihi na e meela ndị ọgbọ ha baptizim. E nwere ndị na-eto eto na-abịa ka e mee ha baptizim ka ha wee mee ndị mụrụ ha obi ụtọ. Ma, baptizim agaghị egbochi gị ime ihe ndị ị ga-achọ ime na nzuzo; i kwesịghịkwa ịbịa ka e mee gị baptizim n’ihi na ndị ọzọ na-agwa gị mee otú a. Mgbe i kwesịrị ịbịa ka e mee gị baptizim bụ mgbe ị ghọtara ihe ịbụ Onyeàmà Jehova pụtara nakwa mgbe ị dị njikere ibu ihe dị na ya.—Ekli. 5:4, 5.
13. Olee ihe mere i ji kwesị ịbịa ka e mee gị baptizim?
13 Otu n’ime ihe ndị mere mmadụ ji kwesị ịbịa ka e mee ya baptizim bụ na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ [ya]. Na-eme ha baptizim.” O setịpụkwara ihe nlereanya site n’ịga ka e mee ya baptizim. (Gụọ Matiu 28:19, 20; Mak 1:9.) Ihe ọzọ bụ na e kwesịrị ime ndị chọrọ ka a zọpụta ha baptizim. Mgbe Pita onyeozi kwuchara otú Noa si wuo ụgbọ e ji zọpụta ya na ezinụlọ ya n’oge Iju Mmiri, ọ sịrị: “Ihe ya na ihe a yiri na-azọpụtakwa unu ugbu a, ya bụ, baptizim, . . . site ná mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst.” (1 Pita 3:20, 21) Nke a apụtaghị na ihe mere mmadụ ga-eji bịa ka e mee ya baptizim bụ naanị ka e wee zọpụta ya. Kama, ihe mere ị ga-eji bịa ka e mee gị baptizim bụ na ị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ iji obi gị dum, mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum, na-ejere ya ozi.—Mak 12:29, 30.
14. Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ha mere ụfọdụ ndị achọghị ka e mee ha baptizim, ma, olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike?
14 Ihe mere ụfọdụ anaghị abịa ka e mee ha baptizim bụ na ụjọ na-atụ ha na e nwere ike ịchụ ha n’ọgbakọ ka oge na-aga. Ị̀ na-atụ ụdị ụjọ a? Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ọ dịchaghị njọ. O nwere ike igosi na ị ghọtara na ịbụ Onyeàmà Jehova abụghị obere okwu. Ọ̀ ga-abụ na e nwere ihe ọzọ na-egbochi gị? O nwere ike ịbụ na i kwetabeghị na ime uche Chineke bụ ihe kacha mma ị ga-eme ná ndụ. Ọ bụrụ otú ahụ, icheta ihe na-eme ndị na-eleghara ihe Baịbụl kwuru anya nwere ike inyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme. O nwekwara ike ịbụ na iwu Chineke masịrị gị ma i cheghị na ị ga-emeli ihe dị na ya. N’eziokwu, iche otú a adịghị njọ n’ihi na ọ na-egosi na ị dị umeala n’obi. A sị kwuwe, Baịbụl kwuru na obi mmadụ niile na-ezughị okè dị aghụghọ. (Jere. 17:9) Ma, ị ga-emeli ya ma ọ bụrụ na ‘ị kpachara anya mgbe niile na-eme ihe Chineke kwuru.’ (Gụọ Abụ Ọma 119:9.) Ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya mere na ị chọghị ka e mee gị baptizim, mee ihe ozugbo banyere ya. *
15, 16. Olee otú ị ga-esi mara ma ì ruola ka e mee gị baptizim?
15 Ma, olee otú ị ga-esi mara ma ì ruola ka e mee gị baptizim? Otu n’ime ụzọ ndị ị ga-esi mara bụ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka ndị a: ‘Ènwere m ike ịkọwara ndị ọzọ ozizi ndị bụ́ isi dị na Baịbụl? Àna m aga ozi ọma a sịgodị na ndị mụrụ m agaghị? Àna m ejisi ike aga ọmụmụ ihe niile? Ènwere m ike icheta oge ụfọdụ m jụrụ ime ihe na-adịghị mma ndị ọgbọ m chọrọ ka m mee? Àga m anọgide na-efe Jehova a sịgodị na ndị mụrụ m na ndị enyi m akwụsị? Èkpekuola m Chineke ekpere ka o mee ka mụ na ya dịrị ná mma? Àrarala m onwe m nye Jehova kpamkpam n’ekpere?’
16 Baptizim bụ ihe na-agbanwe ndụ nke a na-agaghị eji gwurie egwu. Ì toruola ka e mee gị baptizim? Ọ bụghị ime ihe omume nke ọma n’ikpo okwu ma ọ bụ ịza ajụjụ dị mma n’ọmụmụ ihe na-egosi na mmadụ etoruola ka e mee ya baptizim. Ọ bụ mgbe onye ahụ nwere ike ime mkpebi ndị kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru. (Gụọ Ndị Hibru 5:14.) Ọ bụrụ na i nwere ike ime nke a, ihe ùgwù pụrụ iche na-echere gị, ya bụ, iji obi gị dum na-efe Jehova ma na-ebi ndụ otú ga-egosi na ị raara onwe gị nye ya n’eziokwu.
17. Olee ihe ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara gị mgbe e mere gị baptizim?
17 Ozugbo e mechara gị baptizim, o nwere ike ịna-anụ gị ọkụ n’obi ijere Chineke ozi. Ma, n’oge na-adịghị anya, ọnwụnwa ndị ga-anwale ma ị̀ ga-anọgide na-efe Jehova nwere ike ịbịara gị. (2 Tim. 3:12) Echela na a na-atụ anya na ị ga-ebuli ibu a n’onwe gị. Jụọ ndị mụrụ gị ihe i nwere ike ime. Gakwuru ndị ji ọgbakọ kpọrọ ihe ka ha nyere gị aka. Mete ndị ga-enyere gị aka enyi. Echefula na ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi, ọ ga-emekwa ka i nwee ume idi ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara gị.—1 Pita 5:6, 7.
Olee Ihe Ndị Nwere Ike Inyere Gị Aka Iru Ihe Mgbaru Ọsọ Gị?
18, 19. Olee otú ilebara ihe ndị ị na-ebute ụzọ anya ga-esi bara gị uru?
18 N’agbanyeghị na ị chọrọ ime ihe dị mma, ọ̀ dị gị ka oge anaghị ezuru gị ime ihe ị chọrọ ime na ihe i kwesịrị ime? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ilebara ihe ndị ị na-ebute ụzọ anya. Iji maa atụ, buru nkume ole na ole bunye n’ime bọket ma wụjuo ya ájá. Ngwa, wụsa ájá na nkume ndị ahụ dị na bọket ahụ otu ebe. Buru ụzọ wụnye ájá ahụ na bọket ahụ ma dọnye nkume ndị ahụ. Ọ̀ kwa ha abaghị? Ihe mere na ha abaghị bụ na i bu ụzọ wụnye ájá.
19 Otú a ka ọ dị n’ihe banyere oge gị. Ọ bụrụ na i bute ihe ndị dị ka ntụrụndụ ụzọ, ị gaghị enwe ohere maka ihe ndị ka mkpa, ya bụ, ihe ndị metụtara ofufe Jehova. Ma, ọ bụrụ na i mee ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, “chọpụta ihe ndị ka mkpa,” ị ga-enwe ohere maka ihe ndị metụtara Alaeze Chineke, nweekwa oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ otú kwesịrị ekwesị.—Fil. 1:10.
20. Ọ bụrụ na e nwee ihe ndị na-eche gị uche ma ọ bụ ihe ndị na-eme gị obi abụọ ka ị na-agba mbọ iru ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere, olee ihe i kwesịrị ime?
20 Ka ị na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere, gụnyere ịbụ onye e mere baptizim, e nwere ike inwe ihe ndị ga na-eche gị uche mgbe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ ihe ndị ga na-eme gị obi abụọ. Ọ bụrụ na e nwee ihe ndị a, “tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Ọma 55:22) Ka ọ dị ugbu a, i nwere ohere iso na-arụ ọrụ kacha mkpa n’ụwa, nke kacha enye obi ụtọ, ya bụ, ikwusa ozi ọma n’ụwa niile na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. (Ọrụ 1:8) I nwere ike ikpebi ịnọ na-ele ndị ọzọ n’anya ka ha na-arụ ọrụ a ma ọ bụkwanụ iso na-arụ ya. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị iji ike gị niile na-efe Chineke ma na-akwado Alaeze ya. Ị gaghị akwa ụta na i jeere ‘Onye kere gị ozi n’oge ị na-eto eto.’—Ekli. 12:1, nsụgharị bụ́ New International Version.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Gụọ Ụlọ Nche nke Ọgọst 1, 2009, peeji nke 15-18.
^ par. 14 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ ihe ga-enyere gị aka ikpebi ka e mee gị baptizim, gaa n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, isi nke 34.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee ihe mere i ji kwesị inwe ihe mgbaru ọsọ?
• Olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ i kwesịrị iru?
• Olee otú ị ga-esi ruo ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ onye e mere baptizim?
• Olee otú ilebara ihe ndị ị na-ebute ụzọ anya ga-esi enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị ò so n’ihe mgbaru ọsọ gị?
[Foto dị na peeji nke 15]
Olee ihe ndị ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ onye e mere baptizim?
[Foto dị na peeji nke 16]
Olee ihe ị mụtara n’ihe atụ a?