Ka Ofufe Chineke Na-anụ Gị Ọkụ n’Obi
Ka Ofufe Chineke Na-anụ Gị Ọkụ n’Obi
“Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.”—MAT. 9:37.
1. Olee otú i nwere ike isi kọwaa ihe ime ngwa ngwa pụtara?
KA E were ya na ị na-akpọga nwaanyị ime na-emesi ike ụlọ ọgwụ. Olee ihe ị ga-eme? Ị ga-akpọrọ ya gawa ngwa ngwa. Ka e werekwa ya na ị na-aga izute onye gị na ya yiri agba, oge unu yiri agaakwalanụ. Gịnị ka ị ga-eme? Ị ga-agasiwe ike. N’eziokwu, ọ bụrụ na i nwee ihe ị ga-eme, ya abụrụkwa na oge agawala, ọ na-adị gị ọsọ ọsọ. Ahụ́ anaghịkwa eru gị ala, gị ana-agba ka ị ghara ịga n’azụ oge. Ọ bụ ya ka a na-akpọ ime ngwa ngwa!
2. Olee ọrụ Ndị Kraịst kwesịrị ịrụ ngwa ngwa taa?
2 Ezigbo Ndị Kraịst taa ma na ikwusa ozi ọma Alaeze na ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ọrụ a kacha kwesị ịrụ ngwa ngwa. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Mak dere ihe Jizọs kwuru nke bụ́ na a ghaghị “ibu ụzọ” rụọ ọrụ a, ya bụ, tupu ọgwụgwụ abịa. (Mak 13:10) N’eziokwu, otú a ka o kwesịrị ịdị. Jizọs kwuru, sị: “Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” E kwesịghị igbu oge mgbe ihe ubi chara; a na-ewekọta ya tupu oge owuwe ihe ubi agaa.—Mat. 9:37.
3. Olee ihe ọtụtụ ndị merela iji gosi na ha maara na e kwesịrị ikwusa ozi ọma ngwa ngwa?
3 Ebe ọ bụ na ọrụ nkwusa dị anyị mkpa otú a, anyị kwesịrị ịgba mbọ wepụta oge na-arụ ya, jirikwa ume anyị na-arụ ya otú anyị nwere ike. Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ụmụnna anyị na-eme nke a. Ụfọdụ ahapụla ọtụtụ ihe ha na-eme ka ha wee nwee ike ịbanye n’ozi oge niile, ya bụ, ụfọdụ aghọọla ndị ọsụ ụzọ oge niile, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụkwanụ na-eje ozi na Betel. Ha nwere ọtụtụ ihe ha na-eme n’ọrụ Onyenwe anyị. Ha ahapụla ọtụtụ ihe na-amasị ha, ha na-edikwa ọtụtụ ihe. Ma, Jehova na-agọzi ha n’ụba. Mbọ ha na-agba na-eme anyị obi ụtọ. (Gụọ Luk 18:28-30.) Ndị ọzọ na-enweghị ike ịbanye n’ozi oge niile na-ewepụta oge otú o kwere ha omume na-arụ ọrụ a na-azọpụta ndụ, nke gụnyere inyere ụmụ anyị aka ime ihe a ga-eji zọpụta ha.—Diut. 6:6, 7.
4. Olee ihe nwere ike ime ka ọ dịzie ụfọdụ ka ọgwụgwụ ọ̀ ka dị anya?
4 Dị ka anyị hụrụla, ọ bụrụ na a sị na a chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa, ọ pụtara na e nwere oge e kwesịrị imecha ihe ahụ. Anyị bi n’oge ọgwụgwụ, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ihe ndị merela eme, bụ́ ndị na-egosi na nke a bụ eziokwu. (Mat. 24:3, 33; 2 Tim. 3:1-5) Ma, o nweghị mmadụ ma kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “ihe ịrịba ama” nke “ọgwụgwụ usoro ihe a,” o sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Mat. 24:36) N’ihi nke a, ka ọtụtụ afọ na-aga, ọ ga na-esiri ụfọdụ ndị ike ịka kwere na oge agwụwala, karịchaa ma ọ bụrụ na ọ dịla anya ha tụwara anya ya. (Ilu 13:12) Ọ̀ dịtụla gị otú a? Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-arụ ọrụ a Jehova bụ́ Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị na-arụ taa ngwa ngwa?
Tụlee Banyere Jizọs, Bụ́ Onye Anyị Kwesịrị Iṅomi
5. Olee otú Jizọs si jee ozi ya ka onye ma na oge agwụwala?
5 Jizọs Kraịst bụ onye bụ́ isi n’ime ndị niile ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Chineke ozi n’ihi na ha Mat. 9:35) O nweghị onye jitụrụla obere oge rụọ ụdị ihe Jizọs rụrụ. Jizọs rụsiri nnọọ ọrụ ike karịa ka mmadụ ọ bụla ọzọ ga-arụli.—Jọn 18:37.
ma na oge agwụwala. Otu n’ime ihe mere Jizọs ji mee nke a bụ na o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eme n’ime naanị afọ atọ na ọkara. Ma, Jizọs rụrụ ihe dị ukwuu n’ozi Jehova karịa ka mmadụ ọ bụla ọzọ metụrụla. O mere ka ndị mmadụ mara aha Nna ya na nzube ya, kwusaa ozi ọma nke Alaeze Chineke, mee ka a mata ozizi ụgha ndị ndú okpukpe na-ezi nakwa na ha bụ ndị ihu abụọ. Ọ kwadokwara ọchịchị Jehova ruo ọnwụ. O ji oge ya niile gazuo mba Izrel, na-ekwusa ozi ọma, na-enyere ndị mmadụ aka, na-agwọkwa ndị ọrịa. (6. Olee ihe Jizọs butere ụzọ ná ndụ ya?
6 Olee ihe mere Jizọs ji jesie ozi ya ike? Ọ ga-abụ na Jizọs si n’ihe Daniel buru n’amụma mara oge Jehova nyere ọ ga-eji rụọ ọrụ o nyere ya. (Dan. 9:27) Dị ka amụma ahụ kwuru, ọ ga-ejecha ozi ya n’ụwa “n’ọkara izu ahụ,” ma ọ bụ mgbe afọ atọ na ọkara gara. Obere oge ka ọ banyechara na Jeruselem ka eze n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.A., o kwuru, sị: “Oge awa eruwo ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube.” (Jọn 12:23) N’agbanyeghị na Jizọs ma na oge ọnwụ ya eruwela, o kweghị ka nke ahụ na-echu ya ụra, ya bụ, ka ọ bụrụ ihe bụ́ isi o ji na-arụsi ọrụ ike. Kama nke ahụ, ọ gbara mbọ jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eme uche Nna ya, gosikwa na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ mere ka ọ kpọkọta ndị na-eso ụzọ ya ma nye ha ọzụzụ, zipụkwa ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ihe mere o ji mee nke a bụ ka ha wee nwee ike ịrụrụ ọrụ ọ malitere gawa n’ihu ma rụpụta ihe karịrị ihe yanwa rụrụ.—Gụọ Jọn 14:12.
7, 8. Olee otú ọ dị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe o mere ka ụlọ nsọ dị ọcha, oleekwa ihe mere Jizọs ji mee nke a?
7 E nwere otu ihe mere mgbe Jizọs nọ n’ụwa nke gosiri nnọọ na ọ na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụ ná mmalite nke ozi ya n’ụwa, n’oge Ememme Ngabiga nke afọ 30 O.A. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bịara Jeruselem ma hụ “ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru, na ndị na-agbanwe ego, ka ha nọ n’oche ha.” Gịnị ka Jizọs mere, oleekwa otú nke a dị ndị na-eso ụzọ ya?—Gụọ Jọn 2:13-17.
8 Ihe Jizọs mere na ihe o kwuru n’oge ahụ chetaara ndị na-eso ụzọ ya ihe Devid buru n’amụma mgbe ọ bụrụ abụ, sị: “Ekworo [ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi] maka ụlọ gị eripịawo m.” (Ọma 69:9) Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ahụ Jizọs mere nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. A sị kwuwe, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ, ya bụ, ndị nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndị ọzọ, na-akwado ahịa a nọ ebe ahụ na-azụ, bụ́ nke e ji na-erigbu ndị mmadụ. Ọgbụgba Jizọs gbara arụrụala ha na-arụ n’anwụ mere ka ọ bụrụ ezigbo onye iro ha. Ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara n’eziokwu na o nwere ‘ịnụ ọkụ n’obi maka ụlọ Chineke,’ ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe ya. Ma, gịnị bụ ịnụ ọkụ n’obi? Ọ̀ dị iche n’ime ihe ngwa ngwa?
Ihe Dị Iche n’Ime Ihe Ngwa Ngwa na Ịnụ Ọkụ n’Obi
9. Gịnị ka ịnụ ọkụ n’obi pụtara?
9 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na “ịnụ ọkụ n’obi” pụtara “iji obi dum na-eme ihe.” N’eziokwu, Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ bụ nke a mere otu nsụgharị Baịbụl ji sụgharịa amaokwu a ka ọ bụrụ: “Ekworo maka ụlọ gị, Chineke, na-ere m ọkụ n’obi.” Ma, olee ihe na-ere Jizọs ọkụ n’obi nke mere ka o mee ihe ahụ o mere?
10. Gịnị ka okwu bụ́ ‘ịnụ ọkụ n’obi’ pụtara n’ebe ndị ọ dị na Baịbụl?
10 Okwu a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ekworo” n’abụ ọma Devid sitere n’okwu Hibru nke pụtakwara ịnụ ọkụ n’obi. N’ebe ụfọdụ ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, a sụgharịrị ya ka ọ bụrụ ‘ịchọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.’ (Gụọ Ọpụpụ 20:5; 34:14; Jọshụa 24:19.) Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru banyere okwu a, sị: “A na-ekwukarị banyere ya n’ihe metụtara alụmdi na nwunye . . . Otú ahụ ekworo si eme ka nwoke ma ọ bụ nwaanyị chọọ ka nwunye ya ma ọ bụ di ya hụ naanị ya n’anya, otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ndị ya na-efe naanị ya.” Ya mere, na Baịbụl, okwu bụ́ ịnụ ọkụ n’obi abụghị naanị ụdị mmasị dị ukwuu ndị mmadụ na-enwe n’ihe ụfọdụ, dị ka ụdị nke ọtụtụ ndị na-enwe n’egwuregwu. Ịnụ ọkụ n’obi Devid nwere bụ ekworo ziri ezi, ya bụ, ọ chọghị iji anya ahụ ebe a na-emegbu onye ọzọ ma ọ bụkwanụ jiri ntị nụ ebe a na-akọcha onye ọzọ. Nke a pụtara na ọ chọsiri ike ịhụ na a katọghị aha ọma mmadụ, hụkwa na e meziri aha ya e mebiri.
11. Olee ihe mere Jizọs ji jiri ịnụ ọkụ n’obi mee ihe?
11 Ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs chere bụ eziokwu mgbe ihe ahụ Jizọs mere n’ụlọ nsọ chetaara ha ihe Devid kwuru. Ihe mere Jizọs ji gbasie mbọ ike abụghị naanị n’ihi na oge na-agwụnahụ ya, kama, ọ bụ n’ihi na ọ na-anụ ọkụ n’obi, ma ọ bụ na-ekwo ekworo, maka aha Nna ya nakwa maka ezi ofufe. Mgbe ọ hụrụ otú niile e si na-akatọ aha Chineke, ọ nụrụ ya ọkụ n’obi ime ihe, ma ọ bụkwanụ o kworo ekworo, o mekwara ihe ozugbo. Mgbe Jizọs hụrụ ka ndị ndú okpukpe na-emegbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ịnụ ọkụ n’obi o nwere mere ka o mee ka ndị ahụ a na-emegbu emegbu nwere onwe ha, meekwa ka o jiri iwe kọchaa ndị ndú okpukpe ahụ.—Mat. 9:36; 23:2, 4, 27, 28, 33.
Ka Ofufe Chineke Na-anụ Gị Ọkụ n’Obi
12, 13. Gịnị ka ndị ndú okpukpe nke Krisendọm taa merela n’ihe banyere (a) Aha Chineke? (b) Alaeze Chineke?
12 Àgwà ndị okpukpe na-akpa taa yiri nke ndị dịrị ndụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ma ọ bụdị ka ya njọ. Dị ka ihe atụ, ihe mbụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee n’ekpere bụ banyere aha Chineke. Ọ sịrị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Ànyị na-ahụ ebe ndị ndú okpukpe, karịchaa ndị nke Krisendọm, na-akụziri ndị mmadụ aha Chineke, na-akụzikwara ha ka ha doo ya nsọ, ma ọ bụ sọpụrụ ya? Kama nke ahụ, ha na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu banyere Chineke, dị ka na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, nakwa na e nwere ọkụ ala mmụọ. Ihe ndị a bụcha ozizi ndị na-eme ka o yie ka Chineke ọ̀ bụ onye a na-enweghị ike ịghọta otú o si eme ihe nakwa onye obi fere azụ. Akụkọ ọjọọ a na-anụ banyere ha na omume ihu abụọ ha na-eme na-ewetakwara Chineke nkọcha. (Gụọ Ndị Rom 2:21-24.) Ihe ọzọ bụ na ha emeela ihe niile ha nwere ike ime iji zochie ezigbo aha Chineke, na-ewepụdị ya na Baịbụl ndị ha sụgharịrị. Ha si otú a na-egbochi ndị mmadụ ịbịaru Chineke nso na ime ihe ha na ya ga-eji dịrị ná mma.—Jems 4:7, 8.
13 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:10) Ọ bụ eziokwu na ndị ndú okpukpe Krisendọm na-ekpekarị ekpere a, ha na-agba ndị mmadụ ume ka ha na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ na òtù dị iche iche ụmụ mmadụ hiwere. Ihe ọzọ bụ na ha na-akparị ndị na-agba mbọ na-ekwusa ozi ọma ma na-agba àmà banyere Alaeze a. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ghara ịna-ekwu okwu banyere Alaeze Chineke ma ya fọdụkwa ikwere na ya.
14. Olee otú ndị ndú okpukpe nke Krisendọm sirila mee ka e leghara Okwu Chineke anya?
14 Mgbe Jizọs na-ekpeku Chineke ekpere, o kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, o kwuru na ya ga-ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye ndị ohu ya nri ime mmụọ. (Mat. 24:45) Ọ bụ eziokwu na ndị ụkọchukwu nke Krisendọm na-ekwu na ha na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, hà na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere ohu ahụ? Mba. Ha na-ekwudị na ihe e dere na Baịbụl bụ akụkọ ifo. Kama inye atụrụ ha nri ime mmụọ, bụ́ nke ga-akasi ha obi ma mee ka ha mụta ezigbo ihe, ha na-akụziri ha echiche mmadụ nke ga-atọ ha ụtọ ná ntị. Ha ejirikwala ihe ha sị na ọ bụ omume ọgbara ọhụrụ mee ka ndị mmadụ leghara ihe Chineke kwuru na ọ bụ omume kwesịrị ekwesị anya.—2 Tim. 4:3, 4.
15. Olee otú ihe ndị ndú okpukpe na-eme n’aha Chineke dị gị?
15 N’ihi ihe ndị sị na ha na-efe Chineke merela, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu enweghịzi mmasị n’ihe banyere Chineke, ụfọdụ enweghịkwa okwukwe na Chineke nakwa na Baịbụl. Setan na ụwa ọjọọ ya ejirila ha na-eme ihe masịrị ha. Olee otú ọ na-adị gị mgbe ị na-ahụ ma ọ bụ na-anụ ka ihe na-ekwesịghị ekwesị na-eme kwa ụbọchị? Mgbe gịnwa, bụ́ ohu Jehova, na-ahụ ka a na-akọcha ma ọ bụ na-ekwutọ aha Chineke, ị̀ na-agba mbọ ime ihe i nwere ike ime iji mee ka a mara nke bụ́ eziokwu? Mgbe ị na-ahụ ka a na-aghọgbu ma ọ bụ na-emegbu ndị nwere ezi obi, ọ́ naghị emetụ gị n’obi ka ị kasie ha obi? Mgbe Jizọs hụrụ ka ‘a na-agba ndị oge ya akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha,’ o mere ihe karịrị inwe ọmịiko n’ahụ́ ha. Ọ malitere “izi ha ọtụtụ ihe.” (Mat. 9:36; Mak 6:34) Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-anụ ọkụ n’obi maka ofufe Chineke, dị ka Jizọs mere.
16, 17. (a) Gịnị kwesịrị ime ka anyị na-agbasi mbọ ike na-ekwusa ozi ọma? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?
16 Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma, anyị ga-aghọtakwu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru na 1 Timoti 2:3, 4. (Gụọ.) Anyị ga na-ekwusasi ozi ọma ike, ọ bụghị naanị n’ihi na anyị ma na anyị bi n’oge ọgwụgwụ, kamakwa, n’ihi na anyị ma na ọ bụ uche Chineke. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mara eziokwu, ka ha wee nwee ike ịbịa fee ya ofufe ma nweta ngọzi ya. Anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, ọ bụghị naanị n’ihi na oge agwụwala, kamakwa, n’ihi na anyị chọrọ ịsọpụrụ aha Chineke ma nyere ndị mmadụ aka ịma uche ya. Anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ezie maka ofufe Chineke.—1 Tim. 4:16.
17 Anyị bụ́ ndị Jehova ma kpọmkwem ihe bụ́ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na ụwa. Anyị nwere ihe anyị ga-eji nyere ndị mmadụ aka inwe obi ụtọ na inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Anyị nwere ike inyere ha aka ịma ihe ha ga-eme ka a ghara ịla ha n’iyi mgbe a ga-ebibi ajọ ụwa Setan. (2 Tesa. 1:7-9) Kama iwewe iwe ma ọ bụ daa mbà n’obi n’ihi na ụbọchị Jehova yiri ka ọ̀ na-egbu oge ịbịa, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ na anyị ka nwere oge anyị ga-eji na-anụ ọkụ n’obi maka ofufe Chineke. (Maị. 7:7; Hab. 2:3) Olee ihe ga-enyere anyị aka iji ịnụ n’obi na-efe Chineke? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-eso nke a.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Olee ihe mere ka Jizọs jiri ịnụ n’obi jee ozi ya?
• Olee ihe ‘ịnụ ọkụ n’obi’ pụtara na Baịbụl?
• Olee ihe anyị na-ahụ taa nke kwesịrị ime ka ife Chineke na-anụ anyị ọkụ n’obi?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 8]
Jizọs lekwasịrị anya n’ime uche Nna ya na igosi ndị mmadụ na ya hụrụ ha n’anya
[Foto dị na peeji nke 10]
E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-efe Chineke