Inweta Ihu Ọma Chineke Ga-eme Ka a Dị Ndụ Ebighị Ebi
Inweta Ihu Ọma Chineke Ga-eme Ka a Dị Ndụ Ebighị Ebi
“Gị onwe gị, Jehova, ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume; ị ga-eji ihu ọma gbaa ya gburugburu dị ka à ga-asị na ọ bụ ọta ukwu.”—ỌMA 5:12.
1, 2. Gịnị ka Ịlaịja rịọrọ nwaanyị Zarefat di ya nwụrụ, oleekwa ihe o kwuru iji mee ka obi sie ya ike?
AGỤỤ nọ na-agụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke bụ́ onye Zarefat, na-agụkwa nwa ya na onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịja. Ka nwaanyị a nọ na-akwadebe imenwu ọkụ ọ ga-eji sie nri, Ịlaịja rịọrọ ya ka o kunyetụ ya mmiri, rịọkwa ya ka o wetatụrụ ya achịcha. Ọ dị njikere ikunye ya mmiri ọṅụṅụ, ma, naanị ihe o nwere ọ ga-esi rie bụ “ntụ ọka nke juru ọbụ aka dị n’ime nnukwu ite nakwa obere mmanụ dị n’ime obere ite.” Uche ya bụ na nri ya nwere agaghị erute Ịlaịja, ọ gwakwara ya otú ahụ.—1 Eze 17:8-12.
2 Ịlaịja gwara ya, sị: “Buru ụzọ si n’ihe dị n’ebe ahụ meere m obere achịcha, ị ga-ewepụtakwara m ya, e mesịakwa, ị ga-eme nke gị na nwa gị. N’ihi na nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Nnukwu ite ntụ ọka ahụ agaghị agwụ, obere ite mmanụ ahụ agaghịkwa agwụ.’”—1 Eze 17:13, 14.
3. Olee mkpebi dị mkpa anyị kwesịrị ime?
3 Ihe bụ mkpa abụghị ma nwaanyị a ọ̀ ga-enye Ịlaịja nri ma ọ bụ na ọ gaghị enye ya, kama, e nwere ihe ka mkpa mkpebi ọ ga-eme ga-egosi. Obi ọ̀ ga-esi ya ike na Jehova ga-azọpụta ya na nwa ya, ka ihe ọ ga-eri ọ̀ ga-adị ya mkpa karịa inweta ihu ọma Chineke na ịbụ enyi ya? Anyị niile nwere mkpebi ndị yiri nke a anyị ga-eme taa. Inweta ihu ọma Jehova ọ̀ ga-adị anyị mkpa karịa ịchụ ihe onwunwe? E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Chineke obi na ife ya. E nwekwara ihe ndị anyị nwere ike ime iji chọọ ihu ọma ya ma nweta ya.
‘E Kwesịrị Ka E Fee Gị Ofufe’
4. Gịnị mere anyị ji kwesị ife Jehova ofufe?
4 Jehova ruru eru ịchọ ka ndị mmadụ fee Mkpu. 4:11) Anyị kwesịrị ife Jehova n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile.
ya otú kwesịrị ekwesị. Ndị mmụọ ozi ji otu olu kwuo na nke a bụ eziokwu, mgbe ha sịrị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” (5. Gịnị mere anyị ji kwesị ife Chineke ofufe n’ihi otú o si hụ anyị n’anya?
5 Ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ife Jehova ofufe bụ na otú o si hụ anyị n’anya enweghị atụ. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.” (Jen. 1:27) Chineke kere mmadụ otú ọ ga-enwe ike ịna-eche echiche ma na-ekpebi ihe ọ ga-eme. Jehova bụ Nna anyị n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ. (Luk 3:38) Dị ka ezigbo nna ọ bụla na-eme, Jehova emeela ihe niile iji gbooro ụmụ ya mkpa ha ka ha wee na-enwe obi ụtọ. ‘Ọ na-eme ka anyanwụ ya waa, na-emekwa ka mmiri zoo’ ka ụwa anyị wee maa mma, ala emeekwara anyị nri n’ụba.—Mat. 5:45.
6, 7. (a) Olee nsogbu Adam wetaara ụmụ ya niile? (b) Gịnị ka àjà e ji Kraịst chụọ ga-emere ndị na-achọ inweta ihu ọma Chineke?
6 Jehova anapụtakwala anyị ná nsogbu niile jọgburu onwe ha mmehie na-akpata. E nwere ike iji mmehie ahụ Adam mere tụnyere onye na-ezuru ego ezinụlọ ya ma jiri ya na-agba chaa chaa. Mgbe Adam nupụụrụ Jehova isi, ọ napụrụ ụmụ ya ihe ha gaara enwe, ya bụ, obi ụtọ nke gaara adịru mgbe ebighị ebi. Otú o si chọọ ọdịmma onwe ya naanị mere ka ụmụ mmadụ bụrụ ohu ezughị okè. Ọ bụ ya mere mmadụ niile ji arịa ọrịa, obi ana-ajọ ha njọ, ha na-emechakwa nwụọ. A na-akwụ ụgwọ tupu ohu enwere onwe ya. Jehova akwụọkwala ụgwọ iji napụta anyị ná nsogbu ndị ahụ niile mmehie kpatara. (Gụọ Ndị Rom 5:21.) Jizọs Kraịst mere uche Nna ya mgbe o nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) N’oge na-adịghị anya, ndị mere uche Chineke ga-erite uru zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ.
7 Jehova, bụ́ Onye kere anyị, mere ihe onye ọzọ na-emetụbeghị iji mee ka anyị nwee obi ụtọ na olileanya. Ọ bụrụ na anyị enweta ihu ọma ya, anyị ga-ahụ otú o si arụ ọrụ iji dozie nsogbu niile a kpataara ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-achọpụta na Jehova bụ “onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Hib. 11:6.
“Ndị Gị Ga-eji Obi Ha Wepụta Onwe Ha”
8. Gịnị ka ihe Jehova mere tupu ya ezie Aịzaya ozi na-akụziri anyị banyere ife Chineke ofufe?
8 Anyị ga-ejirịrị onyinye Chineke nyere anyị ime ihe ọ bụla anyị chọrọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihu ọma Chineke. Nke a bụ n’ihi na ọ dịghị onye Jehova na-amanye ka o fewe ya ofufe. Mgbe Aịzaya nọ ndụ, Chineke jụrụ, sị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Jehova kwanyeere Aịzaya ùgwù n’ihi na o nweere onwe ya ịjụ ịga ozi ahụ ma ọ bụkwa ikweta ịga ya. Aịzaya nwere obi ụtọ dị ukwuu mgbe ọ sịrị: “Lee m! Ziga m.”—Aịza. 6:8.
9, 10. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-efe Chineke? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iji obi anyị dum na-efe Jehova?
9 Ụmụ mmadụ nweere onwe ha ife Chineke, ha nwekwaara onwe ha ịjụ ife ya. Jehova chọrọ ka anyị jiri aka anyị kpebie ife ya ofufe. (Gụọ Jọshụa 24:15.) Onye ọ bụla nke na-ejighị obi ya dum na-efe Chineke agaghị eme ihe ọ na-achọ; ọ naghịkwa anabata ofufe ndị mkpa ha bụ ime ihe ndị mmadụ na-achọ. (Kọl. 3:22) Anyị agaghị enweta ihu ọma Chineke ma anyị jiri “obi abụọ” na-efe ya, ya bụ, ma ọ bụrụ na ịchụ ihe nke ụwa na-eme ka anyị ghara ife Chineke otú kwesịrị. (Ọpụ. 22:29) Jehova ma na ihe ga-adịrị anyị mma ma anyị jiri obi anyị dum na-efe ya. Mozis gwara ụmụ Izrel ka ha họrọ ndụ ‘site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke ha n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.’—Diut. 30:19, 20.
10 Eze Devid, bụ́ onye chịrị Izrel n’oge ochie, bụkuru Jehova abụ, sị: “Ndị gị ga-eji obi ha wepụta onwe ha n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha. N’ịma mma nke ịdị nsọ gị, i nwere ìgwè ụmụ okorobịa gị ndị si n’afọ nke ụtụtụ dị nnọọ ka igirigi.” (Ọma 110:3) Ihe ọtụtụ ndị na-ebute ụzọ taa bụ inwetahi ego nne na ịchọ otú ha ga-esi na-atụrụ ndụ. Ma, ihe ndị hụrụ Jehova n’anya na-ebute ụzọ bụ ozi dị nsọ ha na-ejere ya. Otú ha si eji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ọma na-egosi ihe ndị ha na-ebute ụzọ. Ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga na-egbo mkpa ha kwa ụbọchị.—Mat. 6:33, 34.
Àjà Chineke Na-anabata
11. Gịnị ka ụmụ Izrel na-atụ anya inweta mgbe ha chụụrụ Jehova àjà?
11 Mgbe ụmụ Izrel nọ n’okpuru Iwu Mozis, ha na-achụ àjà dị mma ka ha wee nweta ihu ọma Chineke. Levitikọs 19:5 sịrị: “Ọ bụrụ na unu achụọrọ Jehova àjà udo, unu ga-achụ ya iji nwetara onwe unu ihu ọma.” Levitikọs 22:29 kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na unu na-achụrụ Jehova àjà ekele, unu ga-achụ ya iji nwetara onwe unu ihu ọma.” Ọ bụrụ na anwụrụ ọkụ akwụgoo elu mgbe ụmụ Izrel ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà kwesịrị ekwesị n’ebe ịchụàjà, anwụrụ ọkụ ahụ dị ka “àjà na-esi ísì ụtọ” e sureere ezi Chineke. (Lev. 1:9, 13) Ihe a ndị ya ji egosi na ha hụrụ ya n’anya na-eme ka obi dị ya ụtọ. (Jen. 8:21) O nwere ihe dị n’àjà ha na-achụ n’oge ahụ nke metụtakwara anyị taa. Ndị na-achụrụ Jehova àjà dị mma na-enweta ihu ọma ya. Olee ụdị àjà Jehova na-anara? Anyị ga-atụle ụzọ ihe abụọ, ha bụ, omume anyị na okwu ọnụ anyị.
12. Olee ihe ndị ọ ga-abụ anyị na-eme Chineke ajụ ‘ahụ́ anyị anyị na-enyefe ya dị ka àjà’?
12 Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ o degaara Ndị Rom, sị: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’ (Rom 12:1) Tupu mmadụ enweta ihu ọma Chineke, onye ahụ ga-edebe ahụ́ ya otú ọ ga-adị Chineke mma. Ọ bụrụ na o ji ụtaba, akị osisi bitel, ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè emerụ onwe ya, Chineke agaghị anara àjà ahụ. (2 Kọr. 7:1) Ebe ọ bụkwa na onye “na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya,” ụdị omume rụrụ arụ ọ bụla mmadụ na-eme ga-eme ka Jehova jụ àjà ọ na-achụrụ ya. (1 Kọr. 6:18) Mmadụ ga-abụrịrị onye ‘dị nsọ n’omume ya niile’ ma onye ahụ chọọ ime ihe Chineke na-achọ.—1 Pita 1:14-16.
13. Gịnị mere anyị ji kwesị ito Jehova?
13 Àjà ọzọ na-eme Jehova obi ụtọ bụ okwu ọnụ anyị. Kemgbe ụwa, ndị hụrụ Jehova Abụ Ọma 34:1-3.) Gụọ Abụ Ọma 148-150 ma hụ ugboro ole abụ ọma atọ a gbara anyị ume ka anyị na-eto Jehova. N’eziokwu, “ndị ziri ezi kwesịrị inye ya otuto.” (Ọma 33:1) Onye anyị kwesịrị iṅomi, bụ́ Jizọs Kraịst, gosiri na iji ikwusa ozi ọma na-eto Chineke dị mkpa.—Luk 4:18, 43, 44.
n’anya na-ekwu okwu ọma banyere ya ma n’ihu ọha ma n’ụlọ ha. (Gụọ14, 15. Olee ụdị àjà Hosia gbara ụmụ Izrel ume ka ha chụọrọ Jehova, oleekwa otú Jehova si lee àjà ahụ anya?
14 Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ inweta ihu ọma ya. Dị ka ihe atụ, chegodị otú Hosia onye amụma si gbaa ụmụ Izrel ume, bụ́ ndị malitere ikpere arụsị nke mere ka Chineke jụ ha. (Hos. 13:1-3) Hosia gwara ha ka ha rịọ Jehova, sị: “Gbaghara njehie anyị; nara ihe dị mma, anyị ga-enyekwa gị ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị.”—Hos. 14:1, 2.
15 Ehi kacha anụmanụ niile ụmụ Izrel ji achụrụ Jehova àjà ada ọnụ. N’ihi ya, “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” pụtara ihe mmadụ chere echiche nke ọma kwuo iji too ezi Chineke. Olee otú Jehova si lee ndị chụrụ àjà a anya? Ọ sịrị: “M ga-eji obi m hụ ha n’anya.” (Hos. 14:4) Jehova gbaghaara ndị chụụrụ ya àjà otuto a, o mere ka ha nweta ihu ọma ya, ya na ha abụrụkwa enyi.
16, 17. Olee otú Jehova si ele otuto mmadụ na-enye ya anya ma ọ bụrụ na ihe mere onye ahụ ji ekwusa ozi ọma bụ na o nwere okwukwe na Chineke?
16 Kemgbe ụwa, ito Jehova n’ihu ọha bụ otu n’ime ụzọ ndị a kacha e si efe Chineke ofufe. Ito ezi Chineke dị otu ọbụ abụ mkpa nke mere ka ọ rịọ Chineke, sị: “Jehova, biko, ka àjà afọ ofufo m ji ọnụ m na-achụ tọọ gị ụtọ.” (Ọma 119:108) Olee otú e si eto Chineke taa? Aịzaya buru amụma banyere oké ìgwè mmadụ nke oge anyị a, sị: “Ha ga-akpọsa otuto Jehova. . . . [Àjà ha] ga-agbagote n’elu ebe ịchụàjà [Chineke], a ga-anabatakwa ha.” (Aịza. 60:6, 7) Nke a na-emezu n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ na-achụrụ Chineke “àjà otuto mgbe niile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.”—Hib. 13:15.
17 Gịnwakwanụ? Ị̀ na-achụrụ Chineke àjà dị mma? Ọ bụrụ na ị naghị achụrụ ya, ị̀ ga-agbanwe wee malite ito Jehova n’ihu ọha? Ọ bụrụ na okwukwe i nwere n’ebe Jehova nọ emee ka ị malite ikwusa ozi ọma, àjà ị na-achụ “ga-atọ Jehova ụtọ karịa oké ehi.” (Gụọ Abụ Ọma 69:30, 31.) Jehova ga-anara àjà otuto “na-esi ísì ụtọ” ị na-achụrụ ya, ị ga-enwetakwa ihu ọma ya. (Ezik. 20:41) Nke a mee, ọṅụ ị ga na-enwe agaghị enwe atụ.
‘Jehova Ga-agọzi Onye Ọ Bụla Bụ́ Onye Ezi Omume’
18, 19. (a) Taa, olee otú ọtụtụ ndị mmadụ si elekarị ife Chineke anya? (b) Gịnị ga-eme onye na-enweghị ihu ọma Chineke?
18 Taa, ọtụtụ ndị na-ekwu ihe ndị ụfọdụ kwuru mgbe Malakaị nọ ndụ. Ha sịrị: “Ọ baghị uru ijere Chineke ozi. Olee uru anyị ritere na anyị anọwo na-eme ihe ọ chọrọ anyị n’aka?” (Mal. 3:14) Ihe onwunwe ha na-achụ ọnwụ ọnwụ na-eme ka ha na-ele nzube Chineke anya ka ihe na-enweghị ike ime eme, ha na-elekwa iwu Chineke anya ka ihe na-agbasaghịzi ndị oge a. Ha na-ele ndị na-ekwusa ozi ọma anya ka ndị na-egbu oge, ozi ọma a na-ekwusa na-ewekwa ha iwe.
19 Ụdị omume a malitere n’ogige Iden. Ọ bụ Setan mere ka Iv ghara iji ndụ magburu onwe ya Chineke nyere ya kpọrọ ihe, meekwa ka o leghara ihu ọma Chineke ọ gaara enweta anya. Taa, Setan na-agbasikwa mbọ ike ime ka ụmụ mmadụ kwere na o nweghị uru ime uche Chineke ga-abara ha. Ma, Iv na di ya mechara chọpụta na ihu ọma Chineke ha na-enweghị ga-akpatara ha ọnwụ. N’oge na-adịghị anya, ihe mere Adam na Iv ga-eme ndị na-eṅomi ha taa.—Jen. 3:1-7, 17-19.
20, 21. (a) Olee ihe nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ mere, oleekwa ihe si na nke a pụta? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ṅomie nwaanyị Zarefat ahụ, gịnịkwa mere anyị ga-eji eṅomi ya?
20 Chegodị otú nsogbu si ná mmehie Adam na Iv mere pụta si dị iche n’ezigbo ihe mere n’akụkọ ahụ anyị kọrọ na mbụ banyere Ịlaịja na nwaanyị Zarefat di ya nwụrụ. Mgbe nwaanyị ahụ nụchara ihe na-agba ume Ịlaịja gwara ya, ọ malitere ime achịcha. Mgbe o mechara, o bu ụzọ bunye Ịlaịja. Nke a mere ka Jehova mezuo ihe o si n’ọnụ Ịlaịja gwa ya. Baịbụl kwuru, sị: “O wee na-eri nri, ya na Ịlaịja na ezinụlọ ya, ruo ọtụtụ ụbọchị. Nnukwu ite ntụ ọka ahụ agwụghị agwụ, obere ite mmanụ ahụ agwụghịkwa, dị ka Jehova kwuru site n’ọnụ Ịlaịja.”—1 Eze 17:15, 16.
21 Nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ mere ihe mmadụ ole na ole n’ime ọtụtụ ijeri mmadụ nọ n’ụwa taa dị njikere ime. Ọ tụkwasịrị Chineke nzọpụta dị n’aka obi ya niile, Chineke nyekwaara ya aka. Akụkọ a na akụkọ ndị ọzọ dị na Baịbụl na-egosi na anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. (Gụọ Jọshụa 21:43-45; 23:14.) Otú ihe si agara Ndịàmà Jehova nke oge a bụ ihe ọzọ na-egosi na ọ dịghị ihe ga-eme ka Jehova leghara ndị nwetara ihu ọma ya anya.—Ọma 34:6, 7, 17-19. *
22. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị chọọ ihu ọma Chineke n’egbughị oge?
22 Ụbọchị Chineke ga-ekpe “ndị niile bi n’elu ụwa niile” ikpe dị nso. (Luk 21:34, 35) Ọ ga-abịarịrị. Ọ dịghị akụnụba ma ọ bụ mkpori ndụ e nwere ike iji tụnyere mmadụ ịnụ ka Onye ikpe Chineke họpụtara na-asị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu.” (Mat. 25:34) N’eziokwu, ‘Jehova ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume; ọ ga-eji ihu ọma gbaa ya gburugburu dị ka à ga-asị na ọ bụ ọta ukwu.’ (Ọma 5:12) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịchọ ka anyị nweta ihu ọma Chineke?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 21 Gụọ Ụlọ Nche March 15, 2005, peeji nke 13, paragraf nke 15; August 1, 1997, peeji nke 20-25.
Ì Chetara?
• Olee ihe mere anyị ji kwesị iji obi anyị dum na-efe Jehova ofufe?
• Olee àjà Jehova na-anara taa?
• Gịnị ka “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” pụtara, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịchụrụ ya Jehova?
• Gịnị ka anyị ji kwesị ịchọ ka anyị nweta ihu ọma Chineke?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Olee mkpebi dị mkpa nke onye amụma Chineke chọrọ ka otu nne ọ na-enweghị ka ọ hà ya mee?
[Foto dị na peeji nke 15]
Olee uru ịchụrụ Jehova àjà otuto na-abara anyị?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ọ gaghị aghọ gị ahịa ma ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi gị dum