Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto
Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto
“Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—ILU 14:15.
1, 2. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe ọ bụla anyị na-eme mkpebi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
ANYỊ na-eme ọtụtụ mkpebi kwa ụbọchị. Ọtụtụ n’ime ha adịchaghị mkpa. Ma, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịgbanwe nnọọ ndụ anyị. Ihe anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe ọ bụla anyị na-eme mkpebi bụ ka mkpebi niile anyị na-eme, ma ndị dị mkpa ma ndị na-adịchaghị mkpa, wetara Chineke otuto.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31.
2 Ime mkpebi ọ̀ na-adịrị gị mfe ka ọ̀ na-esiri gị ike? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè, anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi na-amata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Nke a ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị kwekọrọ n’ihe anyị kweere, ọ bụghị ndị kwekọrọ n’ihe onye ọzọ kweere. (Rom 12:1, 2; Hib. 5:14) Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọzọ dị mkpa mere anyị ji kwesị ịmụta otú anyị ga-esi na-eme mkpebi ndị dị mma? Olee ihe mere ime mkpebi ji esi nnọọ ike mgbe ụfọdụ? Oleekwa ihe ndị anyị ga-eme ka mkpebi ndị anyị na-eme na-ewetara Chineke otuto?
Gịnịdị Mere Anyị Ji Eme Mkpebi?
3. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwe ka o gbochie anyị ime mkpebi dị mma?
3 Ọ bụrụ na ime ihe Baịbụl kwuru na-eme anyị obi abụọ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị nwere ike ịna-eche na anyị ejighị obi anyị dum kwere ihe anyị kweere. Nke a ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ime ka anyị mee ihe ọjọọ. Ha nwere ike na-agha ụgha, na-aghọ aghụghọ, ma ọ bụ na-ezu ohi wee mee ka anyị ‘sonyere ìgwè mmadụ’ site n’iso ha na-eme ihe ha na-eme ma ọ bụ na-ekpuchiri ha ihe ha na-eme. (Ọpụ. 23:2) Ma, onye na-eme mkpebi ndị na-ewetara Chineke otuto agaghị ekwe ka egwu mmadụ ma ọ bụ otú ndị ọzọ si ele ya anya mee ka o mee ihe akọnuche ya e ji Baịbụl na-azụ ga-eji maa ya ikpe.—Rom 13:5.
4. Olee ihe nwere ike ime ka ndị ọzọ chọọ imere anyị mkpebi?
4 Ọ bụghị ndị niile chọrọ imere anyị mkpebi na-eburu anyị ihe ọjọọ n’obi. Ndị enyi anyị ndị chere na ha na-emere anyị ihe ọma nwere ike isi ọnwụ ka anyị mee ihe ha gwara anyị. Ọ bụrụ na anyị na ndị mụrụ anyị ebighịzi, ndị mụrụ anyị, Ọrụ 15:28, 29) Ma, ọ kapịaghị ihe ndị ọzọ metụtara ịgwọ ọrịa ọnụ. Nke a pụtara na onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebi otú a ga-esi agwọ ya ọrịa. * Ndị ikwu anyị nwere ike ịchọ ka anyị mee ihe anyị na-achọghị ime. Ma, mgbe ọ bụla Onye Kraịst nke raara onwe ya nye Chineke, e meekwa ya baptizim, na-ekpebi otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa, o kwesịrị iburu “ibu nke ya.” (Gal. 6:4, 5) Ihe bụ mkpa anyị kwesịrị ịbụ ime ihe dị Chineke mma, ọ bụghị ihe dị ụmụ mmadụ mma.—1 Tim. 1:5.
bụ́ ndị ka buuru anyị ihe ọma n’obi, nwere ike ịchọ imere anyị mkpebi ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, tụlee banyere ịgwọ ọrịa. Baịbụl kwuru hoo haa na iri ọbara adịghị mma. (5. Olee ihe anyị nwere ike ime ka ụgbọ anyị ghara ikpu n’ihe banyere okwukwe anyị?
5 Anyị nwere ike ịba n’ezigbo nsogbu ma ọ bụrụ na anyị na-enwe obi abụọ. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere na onye nwere obi abụọ anaghị “akwụsi ike n’ụzọ ya niile.” (Jems 1:8) Onye ahụ dị ka nwoke nọ n’ụgbọ mmiri nke na-enweghị ụmara e ji akwọ ya n’oge e nwere ebili mmiri. Echiche ụmụ mmadụ, bụ́ nke na-agbanwe agbanwe, ga-eme ka onye ahụ ghara ịkwụdosi ike n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ naghị ara ahụ́ ụgbọ onye ahụ ekpuo n’ihe banyere okwukwe ya. Nke a mee, o nwere ike ịtawa ndị ọzọ ụta. (1 Tim. 1:19) Olee ihe anyị nwere ike ime ka nke a ghara ime anyị? Anyị kwesịrị ‘ịgbasi ike n’okwukwe.’ (Gụọ Ndị Kọlọsi 2:6, 7.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbasi ike n’okwukwe, anyị ga na-eme mkpebi ndị na-egosi na anyị kwenyesiri ike n’ihe Okwu Chineke e ji mmụọ nsọ dee kwuru. (2 Tim. 3:14-17) Ma, olee ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eme mkpebi ndị dị mma?
Ihe Mere Ime Mkpebi Ji Esi Ike
6. Olee otú ịtụ egwu nwere ike isi tinye anyị ná nsogbu?
6 Anyị nwere ike ịna-atụ egwu na anyị nwere ike ime mkpebi na-adịghị mma, na ihe agaghị adịrị anyị mma n’ọdịnihu, ma ọ bụkwanụ na anyị nwere ike ime ihe ndị ọzọ ga-eji na-eleda anyị anya. Iche otú a adịghị njọ. O nweghị onye ọ na-amasị ime mkpebi na-adịghị mma, bụ́ nke nwere ike itinye ya ná nsogbu ma ọ bụkwanụ wetara ya ihere. N’agbanyeghị nke a, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ nakwa otú anyị si hụ Okwu ya n’anya ga-eme ka anyị ghara ịna-atụ egwu. Olee otú nke a ga-esi mee? Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-eme nchọnchọ n’Okwu ya nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl tupu anyị emee mkpebi ọ bụla dị mkpa. Nke a ga-eme ka ebe ndị anyị na-anaghị emete dị ole na ole. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl na-eme “ka ndị na-enweghị amamihe nwee amamihe, meekwa ka nwa okorobịa nwee ihe ọmụma na ikike iche echiche.”—Ilu 1:4.
7. Gịnị ka ihe ndị mere ná ndụ Eze Devid nwere ike ịkụziri anyị?
7 Ọ̀ bụ mgbe niile ka anyị ga na-eme mkpebi dị mma? Mba. O nweghị onye n’ime anyị na-anaghị emejọ ihe. (Rom 3:23) Dị ka ihe atụ, Eze Devid bụ nwoke maara ihe ma kwesị ntụkwasị obi. Ma, mgbe ụfọdụ, o mere mkpebi ndị na-adịghị mma, bụ́ ndị kpataara ya na ndị ọzọ nsogbu. (2 Sam. 12:9-12) N’agbanyeghị nke ahụ, Devid ekweghị ka ihe ndị ọ na-emetaghị mee ka ọ ghara ịna-eme mkpebi ndị dị Chineke mma. (1 Eze 15:4, 5) N’agbanyeghị ihe ndị anyị na-emetaghị n’oge gara aga, anyị ga na-eme mkpebi ma ọ bụrụ na anyị emee ka Devid wee cheta na Jehova ga-eleghara ebe ndị anyị na-emetaghị anya ma gbaghara anyị mmehie anyị. Ọ ga-anọgide na-enyere ndị hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi aka.—Ọma 51:1-4, 7-10.
8. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Pọl onyeozi kwuru banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
8 Anyị nwere ike ịkwụsịlata ichegbu onwe anyị banyere mkpebi anyị ga-eme. Olee otú anyị ga-esi eme nke a? Ọ bụ site n’ịmata na mgbe ụfọdụ, o nwere ọtụtụ mkpebi ndị dị mma anyị nwere ike ime otu n’ime ha. Ka anyị tụlee ihe Pọl onyeozi kwuru banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye. 1 Kọr. 7:36-38) Pọl kwuru na ọ ka mma ma ọ bụrụ na mmadụ alụghị di ma ọ bụ nwunye, ma, ọ bụghị nke a bụ naanị ihe dị mma o kwuru n’ebe ahụ na mmadụ nwere ike ime.
O ji ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ya na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị mgbe ọ bụ onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ bụrụ na onye ahụ agafewo oge ntoju ntorobịa, ọ bụrụkwa na ọ bụ ihe a ka o kwesịrị ime, ya mee ihe ọ chọrọ; o mehieghị. Ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’obi ya, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ya mkpa, kama o nwere ike ịchịkwa ọchịchọ ya, ya ekpebiekwa n’ime obi ya na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma.” (9. Ànyị kwesịrị ịna-echegbu onwe anyị banyere otú ndị ọzọ si ele mkpebi ndị anyị na-eme anya? Kọwaa.
9 Otú ndị ọzọ si ele mkpebi anyị mere anya ò kwesịrị ịna-enye anyị nsogbu? O nwere ike ịna-enyetụ anyị nsogbu. Cheta ihe Pọl kwuru banyere iri ihe nke yiri ka è ji ya chụọrọ arụsị àjà. O kwuru na mmadụ nwere ike mee mkpebi na-adịghị njọ, ma, mkpebi ahụ nwere ike ime ka onye akọnuche ya na-esighị ike sụọ ngọngọ. Gịnị ka Pọl kpebiri ime? O dere, sị: “Ọ bụrụ na ihe oriri na-eme ka nwanna m sụọ ngọngọ, m gaghị atakwa anụ ọzọ ma ọlị, ka m wee ghara ime ka nwanna m sụọ ngọngọ.” (1 Kọr. 8:4-13) Anyịnwa kwesịkwara ịna-echebara mkpebi ndị anyị na-eme echiche iji mara ma hà na-eme ka akọnuche ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Ma, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị bụ ma mkpebi ndị anyị na-eme hà na-eme ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma ka ọ bụ na ha anaghị eme. (Gụọ Ndị Rom 14:1-4.) Olee ihe Baịbụl kwuru, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị ga-ewetara Chineke otuto?
Ihe Isii Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ime Mkpebi Ndị Dị Mma
10, 11. (a) Olee otú anyị nwere ike isi ghara ịdị mpako n’ezinụlọ? (b) Olee ihe ndị okenye kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-ekpebi otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ?
10 Adịla mpako. Tupu anyị emee mkpebi, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Ọ̀ bụ mụnwa ka ọ dịịrị ime mkpebi a?’ Eze Sọlọmọn dere, sị: “Mpako ọ̀ bịawo? Mgbe ahụ, mmechuihu ga-abịa; ma ndị dị obi umeala nwere amamihe.”—Ilu 11:2.
11 Ndị nne na nna nwere ike ikwe ka ụmụ ha na-ekpebi ihe ụfọdụ, ma, ụmụ ha ekwesịghị iche na ọ bụ ha ga na-emere onwe ha mkpebi niile. (Kọl. 3:20) Ndị bụ́ nwunye na ndị bụ́ nne na-eme mkpebi ụfọdụ n’ezinụlọ, ma, onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị icheta na ọ bụ di ya bụ onyeisi ezinụlọ. (Ilu 1:8; 31:10-18; Efe. 5:23) Ndị bụ́ di kwesịkwara icheta na ha abụghị o jechaa ọ gwụ, ha nọ n’okpuru Kraịst. (1 Kọr. 11:3) Ndị okenye ọgbakọ na-ekpebi otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ. Ma, ha ga-ahụ na ha ‘agabigaghị ihe e dere’ n’Okwu Chineke. (1 Kọr. 4:6) Ha kwesịkwara ịna-erube nnọọ isi n’ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-agwa ha. (Mat. 24:45-47) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị umeala n’obi na-eme mkpebi naanị mgbe ọ dịịrị anyị ime otú ahụ, anyị nwere ike ime ihe ga-eme ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-echegbu onwe anyị ma ọ bụkwanụ na-enwe mwute.
12. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme nchọnchọ? (b) Kwuo otú mmadụ nwere ike isi na-eme nchọnchọ.
Ilu 21:5) Dị ka ihe atụ, ị̀ chọrọ ịmalite azụmahịa? Amabala ya n’ike. Chọpụta ihe ndị ga-enyere gị aka, gakwuru ndị ụdị ahịa ahụ doro anya, chọpụtakwa ihe Baịbụl kwuru nke nwere ike inyere gị aka. (Ilu 20:18) Tupu i mee nchọnchọ, wepụta ebe ndị ị ga-ede ma abamuru ma ọghọm dị n’azụmahịa ahụ. Tupu i kpebie ihe ị ga-eme, “gbakọọ ihe ọ ga-efu” gị. (Luk 14:28) Chọpụta ego ole o nwere ike ifu gị nakwa ihe o nwere ike ime adịm ná mma gị na Jehova. Ime nchọnchọ na-ewe oge, chọọkwa mgbalị. Ma, ime nchọnchọ nwere ike ime ka ị ghara ime mkpebi ọkụ ọkụ, bụ́ nke ga-eme ka i nwee nsogbu n’ọdịnihu.
12 Mee nchọnchọ. Sọlọmọn dere, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (13. (a) Olee otú Jems 1:5 si emesi anyị obi ike? (b) Olee otú ikpe ekpere ka Chineke nye anyị amamihe ga-esi enyere anyị aka?
13 Kpee ekpere ka Chineke nye gị amamihe. Mkpebi ndị anyị na-eme ga-ewetara Chineke otuto ma ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nyere anyị aka mgbe anyị na-eme ha. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” (Jems 1:5) Ihere ekwesịghị ime anyị ikwu na anyị chọrọ ka Chineke nyere anyị aka mgbe anyị na-eme mkpebi. (Ilu 3:5, 6) A sị ka e kwuwe, ọ gaghị ara ahụ́ anyị agahie ụzọ ma anyị na-adabere naanị n’amamihe onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere ka Chineke nye anyị amamihe, anyị achọọkwa ihe ahụ dị anyị mkpa n’Okwu Chineke, anyị na-egosi na anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ịghọta ihe anyị bu n’obi n’eziokwu na-eme ihe ahụ anyị chọrọ ime.—Hib. 4:12; gụọ Jems 1:22-25.
14. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịna-egbu oge tupu anyị emee mkpebi?
14 Kpebizie ihe ị ga-eme. Ebula ụzọ eme mkpebi tupu i mewe nchọnchọ ma ọ bụkwanụ tupu i kpee ekpere ka Chineke nye gị amamihe. Onye ma ihe “na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) N’agbanyeghị nke a, egbula oge tupu i mee mkpebi. Onye na-anaghị eme ihe ngwa ngwa nwere ike ikwu ihe ndị na-enweghị isi, bụ́ ihe ndị mere ka ọ ghara ime ihe o kwesịrị ime. (Ilu 22:13) Ma, ihe ahụ ọ na-eme bụ mkpebi, ya bụ na o kpebiri ka ndị ọzọ na-achị ndụ ya.
15, 16. Gịnị ka mmadụ ime ihe o kpebiri gụnyere?
15 Mezie ihe ahụ i kpebiri. Mbọ anyị gbara wee mee ezigbo mkpebi nwere ike ịla n’iyi ma ọ bụrụ na anyị aghara ime ihe anyị kpebiri. Sọlọmọn dere, sị: “Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha.” (Ekli. 9:10) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe anyị kpebiri, anyị ga-adịrịrị njikere ime ihe ga-enyere anyị aka ime nke a. Dị ka ihe atụ, onye nkwusa nwere ike ikpebi na ya ga-amalite ọrụ ịsụ ụzọ. Ọ̀ ga-emeli ya? Ọ ga-emeli ya ma ọ bụrụ na ọ naghị eji oge hiri nne achụ ego ma ọ bụkwanụ na-atụrụ ndụ, bụ́ ihe ndị ga-eme ka ike na-agwụkarị ya ma mee ka ọ ghara ị na-enwe ohere ọ ga-eji na-aga ozi ọma.
16 Ọ naghị adịcha mfe ime ihe ndị kacha mma anyị mere ná mkpebi. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị ga-agbarịrị mgba megide ‘ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megidekwa ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.’ (Efe. 6:12) Ma Pọl onyeozi ma Jud bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru na ndị kpebiri ime ihe ga-ewetara Chineke otuto nwere ọgụ ha ga na-alụ.—1 Tim. 6:12; Jud 3.
17. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị banyere mkpebi ndị anyị mere?
17 Leruo mkpebi ahụ i mere anya, meekwa mgbanwe ụfọdụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ọ bụghị mkpebi niile mmadụ mere na-aga otú a chọrọ ya. “Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị” anyị niile. (Ekli. 9:11) N’agbanyeghị nke a, Jehova chọrọ ka anyị mee ihe ụfọdụ anyị kpebiri, ọ bụ ezie na o nwere ike isiri anyị ike. Onye kpebiri ịrara onwe ya nye Jehova ma ọ bụkwanụ onye kwere nkwa n’ụbọchị ọ gbara akwụkwọ ga-emerịrị ihe o kwuru. Chineke chọrọ ka anyị mee ihe anyị kpebiri n’ihe ndị a. (Gụọ Abụ Ọma 15:1, 2, 4.) Ma, ọtụtụ mkpebi anyị na-eme adịchaghị oké mkpa. Ọ na-abụ onye ma ihe nọtụ ya eleruo mkpebi ndị ahụ o mere anya. Ọ naghị ekwe ka mpako mee ka ọ ghara ịgbanwe ihe ụfọdụ ná mkpebi o mere ma ọ bụdị gbanwee ya kpamkpam. (Ilu 16:18) Ihe bụ́ mkpa ya bụ ka otú o si ebi ndụ nọgide na-ewetara Chineke otuto.
Kụziere Ndị Ọzọ Otú Ha Ga-esi Na-eme Mkpebi Ndị Ga-ewetara Chineke Otuto
18. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha otú ha ga-esi na-eme mkpebi ndị dị mma?
18 E nwere ọtụtụ ihe ndị nne na nna ga-eme nke ga-eme ka ụmụ ha mara otú ha ga-esi na-eme mkpebi ndị ga-ewetara Chineke otuto. Isetịpụrụ ha ezigbo ihe nlereanya bụ otu n’ime ụzọ ndị kacha mma a ga-esi na-akụziri ha ihe. (Luk 6:40) Mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna nwere ike ịkọrọ ụmụ ha otú hanwa si mee mkpebi mgbe ha bụ ụmụaka. Ha nwekwara ike ịhapụ ụmụ ha ka ha meere onwe ha mkpebi ụfọdụ, jaakwa ha mma ma mkpebi ahụ ha mere gazie. Gịnịkwanụ ka ndị nne na nna ga-eme ma nwa ha mee mkpebi na-adịghị mma? Ihe mbụ nne ma ọ bụ nna nwere ike ime bụ ịgba mbọ ka nwa ya ghara ịta ahụhụ ya, ma, ọ bụghị mgbe niile ka ime otú ahụ na-abara nwa ahụ uru. Dị ka ihe atụ, nne ma ọ bụ nna nwere ike ikwe ka nwa ya nweta akwụkwọ ikike e ji akwọ ụgbọala. Ka e were ya na a dara nwa ahụ nhá n’ihi na ọ dara iwu okporo ụzọ. Nne ma ọ bụ nna ya nwere ike ịkwụ ụgwọ ahụ. Ma, o yiri ka nwa ahụ ọ̀ ga-akpachara anya ka ọ ghara ịda iwu n’oge ọzọ ma ọ bụrụ na a gwa ya ka ọ gaa rụta ego ọ ga-eji akwụ ụgwọ ahụ.—Rom 13:4.
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?
19 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-akụziri ndị ọzọ ihe. (Mat. 28:20) Otu n’ime ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl bụ otú ha ga-esi na-eme mkpebi ndị dị mma. Ka anyị wee mee nke a nke ọma, anyị agaghị na-agwa ha ihe ha ga na-eme. Ọ kacha mma ka anyị kụziere ha otú ha ga-esi na-echebara ihe Baịbụl kwuru echiche, nke ga-eme ka ha kpebie ihe ha ga-eme. A sị ka e kwuwe, “onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Rom 14:12) N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị niile ji kwesị ịna-eme mkpebi ndị na-ewetara Chineke otuto.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ ihe ntinye isiokwu ya bụ “Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?,” bụ́ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2006, peeji nke 3-6.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Gịnị mere anyị ji kwesị ịmara otú anyị kwesịrị isi na-eme mkpebi?
• Gịnị ka egwu nwere ike ime anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi kwụsị ịtụ egwu?
• Olee ihe isii anyị nwere ike ime ka anyị wee na-eme mkpebi ndị na-ewetara Chineke otuto?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]
Ihe Ndị Anyị Kwesịrị Ime Ka Anyị Wee Na-eme Mkpebi Ndị Dị mma
1 Adịla Mpako
2 Mee Nchọnchọ
3 Kpee Ekpere Ka Chineke Nye Gị Amamihe
4 Kpebizie Ihe Ị Ga-Eme
5 Mezie Ihe ahụ I Kpebiri
6 Leruo Mkpebi ahụ I Mere Anya, Meekwa Mgbanwe Ụfọdụ Ma Ọ Bụrụ na Ọ Dị Mkpa
[Foto dị na peeji nke 15]
Onye nwere obi abụọ dị ka ụgbọ mmiri nke na-enweghị ụmara e ji akwọ ya n’oge e nwere ebili mmiri