Ezinụlọ Ndị Kraịst—“Dịrịnụ Njikere”
Ezinụlọ Ndị Kraịst—“Dịrịnụ Njikere”
“Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.”—LUK 12:40.
1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị irube isi na ndụmọdụ Jizọs nyere anyị ka anyị ‘dịrị njikere’?
“MGBE Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya” iji kewapụ “ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ,” olee otú ihe ga-adịrị gị na ezinụlọ gị? (Mat. 25:31, 32) Ebe ọ bụ na ọ ga-abịa n’oge awa anyị na-echeghị na ọ ga-abịa, ọ dị nnọọ mkpa ka anyị cheta ndụmọdụ Jizọs nyere anyị ka anyị ‘dịrị njikere.’—Luk 12:40.
2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere otú ndị niile nọ n’ezinụlọ nwere ike isi nyere ezinụlọ ha aka ịmụrụ anya site n’iji ọrụ ha nwere n’ezinụlọ kpọrọ ihe. Ka anyị tụlee ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi mee ka ezinụlọ anyị na Chineke nọgide na-adị ná mma.
Na-elegide Anya Gị “Otu Ebe”
3, 4. (a) Olee ihe ezinụlọ Ndị Kraịst kwesịrị ilezi anya banyere ya? (b) Gịnị ka ilegide anya “otu ebe” pụtara?
3 Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ chọrọ ịdị njikere maka ọbịbịa Kraịst, ha ga-elezirịrị anya ka ihe ọ bụla ghara ịdọpụ uche ha n’ife Chineke. Ha kwesịrị ịnọ na nche ka a ghara inwe ihe ga-emegharị ha anya. Ebe ọ bụ na ịchụ ihe onwunwe na-amata ọtụtụ ezinụlọ n’ọnyà, anyị kwesịrị ichebara ihe ahụ Jizọs gwara anyị echiche, ya bụ, ka anyị na-elegide anya “otu ebe.” (Gụọ Matiu 6:22, 23.) Otú ahụ ọkụ si enye anyị ìhè anyị ewee hụ ụzọ ghara ịda ka ihe anyị ji “anya nke obi” anyị hụ si enye anyị ìhè anyị ewee ghara ịsụ ngọngọ.—Efe. 1:18.
4 Ka anya nkịtị wee hụ ihe ọ chọrọ ịhụ nke ọma, ọ ga-adịrịrị mma ma na-elegide ihe ahụ. Otú a ka ọ dịkwa anya nke obi. Na anya ihe atụ anyị na-elegide n’otu ihe pụtara na anyị na-achụ otu ihe. Kama ịna-achụ ihe onwunwe ka a na-anwụ anwụ ma lekwasị anya naanị n’inye ezinụlọ anyị ihe na-akpa anụ ahụ́ ha, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ofufe Jehova. (Mat. 6:33) Nke a pụtara na ihe ọ bụla anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ, anyị ebutekwa ijere Chineke ozi ụzọ ná ndụ anyị.—Hib. 13:5.
5. Olee otú nwa agbọghọ na-erubeghị iri afọ abụọ si gosi na ya na-elekwasị “anya” n’ife Chineke?
5 Ụmụaka na-abụ ezigbo ụmụ ma a zụọ ha ka ha na-elegide anya otu ebe. Tụlee ihe otu nwa agbọghọ onye Itiopia, nke na-erubeghị iri afọ abụọ, mere. O mere nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ha nke mere ka e nye ya ohere ịga mahadum n’efu mgbe ọ gụchara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ma, ọ jụrụ ohere ahụ e nyere ya ịga mahadum n’efu n’ihi na o lekwasịrị anya n’ife Jehova. N’oge na-adịghị anya ka nke a gachara, a kpọrọ ya òkù ka ọ bịa malite ọrụ n’ebe a ga na-akwụ ya puku dọla anọ na narị abụọ kwa ọnwa, bụ́ nnukwu ego ma e were ya tụnyere ihe a na-akwụ ndị ọrụ kwa ọnwa n’Itiopia. Ma, “anya” nwa agbọghọ ahụ dị n’ọrụ ịsụ ụzọ. Ọ bụ ya mere na ọ gwaghị nne ya na nna ya tupu ya ajụ ọrụ ahụ. Gịnị ka nne ya na nna ya mere mgbe ha nụrụ ihe nwa ha mere? Ihe o mere masịrị ha, ha gwakwara ya na obi dị ha ụtọ maka nke a.
6, 7. Olee ihe anyị kwesịrị ‘ighewe anya anyị oghe’ ka anyị wee zere ya?
6 Na Matiu 6:22, 23, Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị banyere anyaukwu, ọ bụ ezie na ọ kpọghị ya aha kpọmkwem. Ihe Jizọs na-ekwu ebe a abụghị na ọ bụrụ na anya mmadụ anaghị ele “otu ebe” ọ pụtara na ọ na-ele “ọtụtụ ebe,” kama, ihe ọ na-ekwu bụ na anya na-anaghị ele otu ebe dị “njọ.” Onye nwere ‘anya dị njọ’ bụ onye anyaụfụ, ya bụ, onye anyaukwu. (Mat. 6:23) Olee otú Jehova si ele anyaukwu anya? Baịbụl sịrị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.”—Efe. 5:3.
7 Ọ bụ eziokwu na mmadụ anaghị amacha na ya bụ onye anyaukwu, ọ naghị esiri ya ike ịmara na onye ọzọ bụ onye anyaukwu. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka anyị gee ntị na ndụmọdụ Jizọs nyere, nke bụ́: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:15) Anyị ga-enyocha onwe anyị iji mara ebe obi anyị dị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime nke a. Ezinụlọ Ndị Kraịst kwesịrị iche echiche nke ọma banyere oge na ego ha na-etinye n’ịtụrụ ndụ nakwa n’ịchụ ihe onwunwe.
8. Mgbe anyị na-azụ ihe, olee otú anyị nwere ike isi ‘ghewe anya anyị oghe’?
8 Tupu ị zụọ ihe, o nwere ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche ma e wezụga ego ị ga-eji azụ ya. Tụlee ihe ndị dị ka ihe ndị a: ‘M̀ nwere ohere m ga-eji jiri ya na-eme ihe mgbe niile ma ọ bụkwanụ na-elekọta ya? Oge hà otú ole ka ọ ga-ewe m iji mụta otú e si eji ya eme ihe?’ Unu ndị na-eto eto, unu echela na unu ga-enwerịrị ihe dị iche ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-akpọsa, bụ́ nke ga-eme ka unu na-enye ndị mụrụ unu nsogbu ka ha zụọrọ unu ákwà na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ. Ọ bụghị ihe niile unu hụrụ ka unu ga-achọ inweta. Cheekwanụ ma ndị nne na nna unu hà ga-enwe ike ịdị njikere maka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ma ọ bụrụ na ha agbawa mbọ inwetara unu ihe ndị ahụ. Nweenụ okwukwe ná nkwa Jehova kwere, nke bụ́: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Hib. 13:5.
Gbaa Mbọ Ruo Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Otuto
9. Olee uru inwe ihe mgbaru ndị na-ewetara Chineke otuto nwere ike ịbara ezinụlọ?
9 Ụzọ ọzọ ndị nọ n’ezinụlọ si eme ka okwukwe ha sikwuo ike ma were ife Jehova kpọrọ Ndị Filipaị 1:10.
ihe bụ inwe ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke otuto na ịgba mbọ ruo ha. Ime nke a nwere ike inyere ezinụlọ dị iche iche aka ịmata otú ha si eme n’ife Jehova, ọ ga-emekwa ka ha mara ihe ndị ha ga na-ebute ụzọ ná ndụ.—Gụọ10, 11. Olee ihe mgbaru ọsọ ezinụlọ unu na-agba mbọ iru ugbu a, oleekwa ndị nke unu ga-achọ iru n’ọdịnihu?
10 Inwe obere ihe mgbaru ọsọ ndị na-agaghị esiri onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ike iru nwere ike ịbara ezinụlọ uru. Otu n’ime ha nwere ike ịbụ ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị. Ihe ndị nọ n’ezinụlọ na-ekwu mgbe ha na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ga-enyere onyeisi ezinụlọ aka ịmata ma eziokwu ọ̀ na-abamikwa ha n’obi. Ịgụkọ Baịbụl ọnụ n’ezinụlọ na-enyere nnọọ ụmụaka aka ịmụta otú e si agụ ihe nke ọma, na-enyekwara ha aka ịghọta ihe dị na Baịbụl. (Ọma 1:1, 2) Í cheghị na otu n’ime ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị inwe bụ ime ka otú anyị si ekpe ekpere dịkwuo mma? Ịna-akpakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ihe mgbaru ọsọ ọzọ magburu onwe ya anyị kwesịrị inwe. (Gal. 5:22, 23) Ànyị nwere ike iche otú anyị ga-esi gosikwuo na ihe banyere ndị anyị na-ezi ozi ọma na-emetụ anyị n’obi? Ọ bụrụ na nke a bụ ihe mgbaru ọsọ ezinụlọ nwere, ọ ga-enyere ụmụaka aka ịmụta otú ha ga-esi na-enwere ndị ọzọ ọmịiko. O nwekwara ike ime ka ha nwee mmasị ịbụ ndị ọsụ oge niile ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ.
11 Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka gị na ndị ezinụlọ gị tụlee ihe mgbaru ọsọ ndị unu ga-agba mbọ ruo? Ihe mgbaru ọsọ ezinụlọ unu ò nwere ike ịbụ ịnọtekwu aka n’ozi ọma? Ò nwere ike ịbụ otú unu ga-esi kata obi na-eji
fon ezi ozi ọma, otú unu ga-esi na-ezi ozi ọma n’okporo ámá, ma ọ bụ n’ọma ahịa? Ùnu nwere ike ịga jewe ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Otu onye n’ezinụlọ unu ò nwere ike ịmụ asụsụ ọzọ ka o wee kwusaara ndị si mba ọzọ ozi ọma?12. Gịnị ka ndị isi ezinụlọ nwere ike ime iji mee ka ezinụlọ ha na Jehova na-adị ná mma?
12 Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, chọpụta ebe ndị ezinụlọ gị ga-arụ ọrụ ka ha na Jehova wee nọgide na-adị ná mma. Mgbe ị chọpụtara nke a, gbaa mbọ ka unu nwee ihe mgbaru ọsọ ga-enyere unu aka ịrụ ọrụ n’ebe ahụ unu nwere nsogbu. Unu kwesịrị inwe ihe mgbaru ọsọ ndị ọnọdụ unu ga-ekwe unu ruo, bụ́ ndị na-agaghị agbaji unu aka. (Ilu 13:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na ịgba mbọ ruo ihe mgbaru ọsọ nke bara uru na-ewe oge. N’ihi ya, si n’oge i ji ekiri televishọn zụta oge ị ga-eji na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Efe. 5:15, 16) Gbasie mbọ ike ka i ruo ihe mgbaru ọsọ i setịpụụrụ ezinụlọ gị. (Gal. 6:9) Ezinụlọ nke nwere ihe mgbaru ọsọ nke ga-enyere ha aka ife Jehova ga-eme ‘ka ọganihu ha pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.’—1 Tim. 4:15.
Nọgidenụ Na-enwe Ofufe Ezinụlọ
13. Olee mgbanwe e mere n’ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-echebara echiche?
13 Otu n’ime ihe magburu onwe ya nke ga-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ‘ịdị njikere’ maka ọbịbịa Nwa nke mmadụ bụ mgbanwe dị mkpa e mere n’oge anyị ji enwe ọmụmụ ihe kwa izu na Jenụwarị 1, 2009. Kama iwepụta otu ụbọchị n’izu jiri ya na-enwe ọmụmụ ihe a na-akpọbu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, anyị na-enwezi ọmụmụ ihe ahụ n’ụbọchị a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi. E mere mgbanwe a iji nyere ezinụlọ Ndị Kraịst aka ka ha mee ka okwukwe ha sikwuo ike site n’iwepụta otu mgbede n’izu ha ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ. Ugbu a afọ abụọ gaferela kemgbe e mere mgbanwe a, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-enwe Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye n’oge ahụ e wepụtara maka ya? Ndokwa ahụ e mere ọ̀ baarala m uru e kwo mee ya?’
14. (a) Gịnị bụ isi ihe mere anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye? (b) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-ewepụta otu mgbede kwa izu anyị ga-eji na-amụ ihe?
14 Isi ihe mere anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye bụ ka anyị bịarukwuo Chineke nso. (Jems 4:8) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-amụchi Baịbụl anya wee mata Onye kere anyị nke ọma, anyị na ya ga-adị n’ezigbo mma. Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso ka anyị na-ejikwu ‘mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, nakwa ike anyị dum na-ahụ ya n’anya.’ (Mak 12:30) N’eziokwu, irubere Chineke isi na iṅomi ya na-agụsi anyị agụụ ike. (Efe. 5:1) N’ihi ya, inwechi Ofufe Ezinụlọ anya dị ndị niile nọ n’ezinụlọ anyị mkpa ka anyị wee ‘dịrị njikere’ ka anyị na-echere ọbịbịa nke “oké mkpagbu” ahụ Jizọs buru n’amụma. (Mat. 24:21) Nke a ga-enyere anyị aka ịlanahụ oké mkpagbu ahụ.
15. Olee otú ezinụlọ na-enwe Ofufe Ezinụlọ ga-esi na-emeso ibe ha?
15 O nwere ihe ọzọ mere anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ. Ọ na-enye aka eme ka ndị nọ n’ezinụlọ na ibe ha na-adịkwu ná mma. Iwepụta oge nọkọọ na-ekwu banyere Chineke kwa izu na-eme ka ndị nọ n’ezinụlọ na-emeso ibe ha omume ọma. Di na nwunye na-ahụkwukwa ibe ha n’anya ma ha jiri obi ụtọ na-amụkọ Baịbụl ọnụ. (Gụọ Ekliziastis 4:12.) O yikwara ka ndị nne na nna ha na ụmụ ha na-enwe ofufe ezinụlọ ga-ahụ ibe ha n’anya, bụ́ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Kọl. 3:14.
16. Kwuo otú ụmụnna nwaanyị atọ si erite uru n’ọmụmụ ihe ha na-eji otu mgbede enwe.
16 Ka anyị tụlee otú ndokwa e mere ka
e nwee otu mgbede a ga-eji na-amụ Baịbụl kwa izu sirila baara ụmụnna nwaanyị atọ uru. N’agbanyeghị na ụmụnna atọ a di ha na-anọghịzi ndụ abụghị ụmụnne, ha bụ enyi kemgbe ọtụtụ afọ, birikwa n’otu obodo. Ọ na-amasị ha ịnọkọ ọnụ, ha na-achọkwa iji oge ahụ na-ekwu banyere Chineke, ọ bụghị ihe ndị ọzọ. Nke a mere ka ha wepụta otu mgbede ha ga-eji na-anọkọ ọnụ na-amụ Baịbụl. Ha ji akwụkwọ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’ malite ọmụmụ ihe ha. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na-amụ ihe ahụ nke mere ka anyị na-amụ ihe karịa otu awa. Anyị na-eji anya nke uche ahụ otú ihe si dịrị ụmụnna anyị na narị afọ mbụ, anyị na-ekwukwa ihe anyị ga-eme ma ụdị ihe ahụ bịara anyị. Anyị na-ejikwa ihe anyị mụtara aga ozi ọma. Nke a emeela ka ije ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ na-atọkwu anyị ụtọ anyị ana-arụpụtakwa ihe karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” E wezụga na ihe a ndị enyi atọ a na-amụ wusiri okwukwe ha ike, o mere ka ha dịkwuo ná mma. Ha sịrị: “Anyị ejighị ndokwa a egwu egwu.”17. Olee ihe ndị na-eme ka Ofufe Ezinụlọ na-aga were were?
17 Gịnwakwanụ? Olee otú i si erite uru ná mgbede e ji enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụkwanụ ọmụmụ ihe onwe onye? Ị gaghị erite uru e kwo mee ndokwa a ma ọ bụrụ na ị naghị enwechi ya anya. Onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịdị njikere ịnọ n’ọmụmụ ihe ahụ n’oge ha kwekọrịtara na ha ga na-enwe ya. E kwesịghị ikwe ka ụmụ obere ihe dapụtaranụ mee ka a ghara inwe ọmụmụ ihe ná mgbede e ji enwe ya. Ihe ọzọ bụ na ihe unu họọrọ na unu ga na-amụ kwesịrị ịbụ ihe ga-ewusi okwukwe unu ike. Gịnị ka ị ga-eme ka ọmụmụ ihe ahụ na-atọ ụtọ? Chọpụta otú ị ga-esi na-ezi ihe nke ọma, akpasukwala onye ọ bụla iwe.—Jems 3:18. *
“Mụrụ Anya,” ‘Dịrịkwa Njikere’
18, 19. Olee otú ịmara na ọbịbịa Nwa nke mmadụ adịghịzi anya ga-esi nyere gị na ezinụlọ gị aka ịmụrụ anya?
18 Otú ụwa si jọrọ njọ na-aga n’oge anyị a na-egosi nnọọ na oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ Setan malitere kemgbe afọ 1914. Amagedọn adịghịzi anya. N’oge na-adịghị anya, Nwa nke mmadụ ga-abịa mee ndị iro Jehova ihe e kpere n’ikpe. (Ọma 37:10; Ilu 2:21, 22) Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka gị na ezinụlọ gị mụrụ anya?
19 Ị̀ na-erube isi na ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere anyị, ya bụ, ka anya anyị “na-elegide otu ebe”? N’agbanyeghị na ihe bụ mkpa ndị ụwa a bụ inweta akụnụba, ịbụ ndị a na-anụ aha ha ma ọ bụ ndị nọ n’ọchịchị, ịnọgide na-efe Chineke ọ̀ bụ ihe mgbaru ọsọ ezinụlọ gị? Ị̀ na-eji oge e wepụtara maka Ofufe Ezinụlọ ma ọ bụ ọmụmụ ihe onwe onye na-enwe ya? Ị̀ na-erite uru e kwo mee ndokwa a? Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, onye bụ́ di, onye bụ́ nwunye, nakwa nwa nọ n’ezinụlọ, ùnu na-arụ ọrụ Akwụkwọ Nsọ gwara unu ka unu na-arụ n’ezinụlọ, bụ́ nke ga-eme ka ezinụlọ unu “mụrụ anya”? (1 Tesa. 5:6) Ọ bụrụ na ị na-arụ ya, ị ‘ga-adị njikere’ maka ọbịbịa Nwa nke mmadụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe unu ga-eji na-enwe Ofufe Ezinụlọ nakwa ihe unu ga-amụ ya abara ezinụlọ unu uru, unu ana-enwekwa obi ụtọ ma unu na-amụ ihe, gụọ Ụlọ Nche October 15, 2009, peeji nke 29-31.
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Kwuo otú ezinụlọ Ndị Kraịst nwere ike isi ‘dịrị njikere’ site . . .
‘n’ilegide anya otu ebe.’
n’inwe ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Chineke otuto ma na-agba mbọ iru ha.
n’inwechi Ofufe Ezinụlọ anya.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 13]
Ọ bụrụ na anya anyị “na-elegide otu ebe” anyị agaghị ekwe ka ihe dị n’ụwa megharịa anyị anya