Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya ya

Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya ya

Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya ya

“Obiọma na-erughịrị mmadụ [ga-achị] dị ka eze site n’ezi omume nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.”—ROM 5:21.

1, 2. Olee onyinye abụọ e nwere ike ichebara echiche, oleekwa nke ka mkpa n’ime ha?

OTU prọfesọ Mahadum Melbọn, nke dị n’Ọstrelia kwuru na iwu Alaeze Ukwu Rom bụ onyinye ndị Rom hapụụrụ ndị nọchiri ha nke ga na-abara ha uru. Ma, Baịbụl kwuru na Chineke nyere anyị onyinye kacha baa uru, nke na-egosikwa na ọ hụrụ anyị n’anya. Onyinye a bụ ihe Chineke nyere anyị nke ga-eme ka anyị bụrụ ndị ezi omume n’anya Chineke, nweekwa olileanya na a ga-azọpụta anyị, anyị adị ndụ ebighị ebi.

2 E nwere ike ikwu na Chineke nyere anyị onyinye a otú iwu ya kwadoro. Ná Ndị Rom isi 5, ihe Pọl onyeozi na-ekwu okwu ya abụghị naanị otú o si kwekọọ n’iwu. Kama, o ji okwu na-emesi obi ike malite. Ọ sịrị: “Ebe a kpọworo anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe, ka anyị na Chineke dịrị n’udo site n’aka Onyenwe anyị Jizọs.” Ndị natara onyinye Chineke na-ahụ Chineke n’anya otú o si hụ ha. Pọl so ná ndị natara onyinye ahụ. O dere, sị: “A wụsawo ịhụnanya nke Chineke n’obi anyị site na mmụọ nsọ nke e nyere anyị.”—Rom 5:1, 5.

3. Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ilebara anya?

3 Ma, olee ihe mere onyinye a ji dị mkpa? Olee otú o si bụrụ na Chineke na-enye ya ndị kwesịrị inweta ya? Oleekwa ihe a chọrọ ka ndị mmadụ mee iji ruo eruo inweta ya? Ka anyị hụ azịza ha ndị doro anya, hụkwa otú azịza ha si egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya.

Ịhụnanya Chineke na Mmehie

4, 5. (a) Olee otú Jehova si gosi na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịma nke ga-enyere anyị aka ịghọta ihe e kwuru ná Ndị Rom 5:12?

4 Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ bịa nyere ụmụ mmadụ aka iji gosi ụmụ mmadụ na ya hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Pọl si otú a kwuo ya: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:8) Chebara otu ihe o kwuru n’ebe ahụ echiche, ya bụ, “anyị ka bụ ndị mmehie.” Anyị niile kwesịrị ịma otú anyị si ghọọ ndị mmehie.

5 Pọl mere ka anyị mara otú nke a si mee. Ọ sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Rom 5:12) Anyị kwesịrị ịghọta nke a n’ihi na Chineke mere ka e dee otú ndụ mmadụ si malite. Jehova kere mmadụ abụọ, bụ́ Adam na Iv. Onye kere ihe niile zuru okè, otú ahụkwa ka mmadụ abụọ mbụ, bụ́ nne na nna anyị mbụ, zuru. Chineke nyere ha naanị otu iwu ha ga-edebe, gwakwa ha na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha adaa iwu ahụ. (Jen. 2:17) Ma, ha họọrọ ime ihe ga-egbu ha, ya bụ, ha dara ezigbo iwu Chineke nyere ha, si otú a gosi na ha achọghị ka ọ bụrụ Onye Na-enye Iwu na Ọkaakaa.—Diut. 32:4, 5.

6. (a) Olee ihe mere ụmụ Adam ji na-anwụ tupu Chineke enye Iwu Mozis nakwa mgbe e nyechara iwu ahụ? (b) Olee ihe e nwere ike iji ọrịa mmadụ nwere ike ibute n’aka ndị mụrụ ya tụnyere?

6 Adam emehiechaala tupu ya amụọ ụmụ, si otú ahụ bufee ụmụ ya niile mmehie na ihe ọ na-akpata. O doro anya na ha adaghị iwu Chineke otú Adam dara, n’ihi ya, ọ bụghị ikpe a mara Adam ka a mara ha, e nweghịkwa iwu e dere ede dị mgbe ahụ. (Jen. 2:17) Ma, ụmụ Adam ketara mmehie. N’ihi ya, mmehie na ọnwụ chịrị dị ka eze ruo mgbe Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ya nke mere ka o doo anya na ha bụ ndị mmehie. (Gụọ Ndị Rom 5:13, 14.) E nwere ike iji nsogbu mmehie e ketara eketa na-akpata tụnyere ọrịa ụmụ nwere ike ibute n’aka ndị mụrụ ha. N’agbanyeghị na ụfọdụ ụmụaka nọ n’ezinụlọ ahụ butere ọrịa ahụ, o nwere ike ọ gaghị abụ ha niile ga-ebute ya. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka mmehie dị. Anyị niile ketara mmehie n’aka Adam, n’ihi ya kwa, ọnwụ na-eche anyị niile. È nwere otú anyị ga-esi nwere onwe anyị?

Ihe Chineke Si n’Aka Jizọs Kraịst Nye Anyị

7, 8. Olee otú ụdị ndụ ndị ikom abụọ zuru okè biri si rụpụta ihe dị iche?

7 N’ihi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ, o mere ihe ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha pụọ ná mmehie ha ketara eketa. Pọl kọwara na onye e si n’aka ya mee ka nke a nwee isi bụ nwoke ọzọ, onye zukwara okè ka Adam, bụ́ onye e nwere ike ịkpọ Adam nke abụọ. (1 Kọr. 15:45) Ma ụdị ndụ onye nke ọ bụla n’ime ndị ikom abụọ a biri rụpụtara ihe dị iche. Olee otú o si bụrụ eziokwu?—Gụọ Ndị Rom 5:15, 16.

8 Pọl dere, sị: “Ọ bụghị otú onyinye ahụ dị ka njehie ahụ dị.” Ọ bụ Adam bụ onye jehierenụ, a makwara ya ikpe kwesịịrị ya, ọ nwụrụ. Ma, ọ bụghị naanị ya ga-anwụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ mmadụ nwụrụ site ná njehie nke otu onye [ahụ].” Ikpe a mara Adam, bụ́ nke kwesịịrị ya, ka e kwesịkwara ịma ụmụ ya niile na-ezughị okè, ma anyịnwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ịmata na Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, nwere ike imere anyị ihe dị iche, ga-emeli ka obi rutụ anyị ala. Olee ihe dị iche ọ ga-eme? Pọl zara ya mgbe o kwuru okwu banyere ‘ịkpọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.’Rom 5:18.

9. Ndị Rom 5:16, 18 kwuru na Chineke kpọrọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume. Gịnị ka ọ pụtara?

9 Gịnị ka okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ịkpọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume” nakwa ‘ịkpọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume’ pụtara? Otu onye na-asụgharị Baịbụl dere banyere nke a, sị: “E nwere ihe ya na ya yiri n’okwu ikpe. Ọ na-akọwa mgbanwe e nwere n’otú Chineke si na-ele mmadụ anya, ọ bụghị mgbanwe onye ahụ mere ná ndụ ya . . . Ọ dị ka iji Chineke tụnyere onyeikpe nke kpelaara onye a kpọtara n’ụlọikpe ya nke e boro ebubo na ọ bụ onye ajọ omume. Ma Chineke ekpebie ka a hapụ ya.”

10. Gịnị ka Jizọs mere nke a ga-agbakwasị ụkwụ kpọọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume?

10 Na gịnị ka “Onyeikpe nke ụwa dum” ga-agbakwasị ụkwụ kpebie ka a hapụ onye ajọ omume? (Jen. 18:25) Ihe mbụ Chineke mere iji mee ka nke a kwe omume bụ izite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Jizọs mere uche Nna ya ruo n’isi n’agbanyeghị na a nwara ya ọnwụnwa, kwaa ya emo, kwutọọkwa ya. O guzosiri ike n’ezi ihe ruo mgbe ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ. (Hib. 2:10) Mgbe Jizọs chụrụ ndụ ya zuru okè n’àjà, o nyere ihe mgbapụta nke nwere ike ịtọhapụ ụmụ Adam, ma ọ bụ gbapụta ha ná mmehie na ọnwụ.—Mat. 20:28; Rom 5:6-8.

11. Olee otú o si bụrụ na ihe mgbapụta ahụ bụ nke kwekọrọ ekwekọ?

11 N’ebe ọzọ, Pọl kpọrọ nke a “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ.” (1 Tim. 2:6) Olee otú o si bụrụ nke kwekọrọ ekwekọ? Adam mere ka ọtụtụ ijeri mmadụ, ya bụ ụmụ ya, bụrụ ndị na-ezughị okè na ndị na-anwụ anwụ. O doro anya na Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, gaara amụta ọtụtụ ijeri ndị zuru okè. * N’ihi ya, ọ pụtara na ndụ Jizọs na nke ụmụ zuru okè ọ gaara amụta bụ àjà kwekọrọ ekwekọ maka Adam na ụmụ na-ezughị okè ọ mụrụ. Ma, Baịbụl anaghị ekwu na nwa ọ bụla Jizọs gaara amụta so n’ihe mgbapụta ahụ. Ndị Rom 5:15-19 gosiri na ọnwụ “otu onye” mere ka e nwee ike ịtọhapụ ụmụ mmadụ. N’eziokwu, ndụ zuru okè nke Jizọs kwekọrọ na nke Adam. Onye a na-ekwu ya ebe a bụ Jizọs Kraịst, ọ bụkwa naanị ya ka o kwesịrị ịbụ. Ọ bụ ‘otu omume ziri ezi’ nke Jizọs, ya bụ, otú o si rube isi ma kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, mere ka o kwe omume ka ụdị mmadụ niile nweta onyinye ahụ e nyere n’efu na ndụ. (2 Kọr. 5:14, 15; 1 Pita 3:18) Olee otú nke a si mee?

Ndị A Tọhapụrụ n’Ihi Ihe Mgbapụta Ahụ

12, 13. Gịnị mere a ga-eji sị na ọ bụ n’ihi na Chineke meere ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume ebere, hụkwa ha n’anya, mere o ji kpọọ ha ndị ezi omume?

12 Jehova Chineke nabatara àjà mgbapụta nke Ọkpara ya chụrụ. (Hib. 9:24; 10:10, 12) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị nọ n’ụwa n’oge ahụ, tinyere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, ka bụ ndị na-ezughị okè. Ọ bụ eziokwu na ha gbara mbọ ka ha ghara ime ihe ọjọọ, o kweghị ha omume mgbe niile. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ketara mmehie. (Rom 7:18-20) Ma, o nwere ihe Chineke nwere ike ime banyere nke ahụ, o mekwara ya. Ọ nabatara ‘ihe mgbapụta ahụ kwekọrọ ekwekọ,’ nweekwa mmasị iji ya gbapụta ụmụ mmadụ na-ejere ya ozi.

13 Ọ pụtaghị na iwu ji Chineke iji ihe mgbapụta ahụ gbapụta ndịozi Jizọs na ndị ọzọ n’ihi ọrụ ọma ndị ha rụrụ. Kama nke ahụ, Chineke ji ihe mgbapụta ahụ gbapụta ha n’ihi na o nwere obi ebere n’ebe ha nọ, hụkwa ha n’anya nke ukwuu. O kpebiri ka a hapụ ndịozi Jizọs na ndị ọzọ, na-ele ha anya ka ndị ikpe mmehie ha ketara eketa na-amaghịzi. Pọl mere ka nke a doo anya. Ọ sịrị: “Site n’obiọma a na-erughịrị mmadụ, a zọpụtawo unu site n’okwukwe; nke a esighịkwa unu n’aka, ọ bụ onyinye Chineke.”—Efe. 2:8.

14, 15. Olee ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ndị Chineke kpọrọ ndị ezi omume, ma olee ihe ha ka kwesịrị ime?

14 N’eziokwu, ọ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-agbaghara mmadụ mmehie o ketara eketa na mmehie ndị onye ahụ mere. Ị gaghị agụtali mmehie ole ndị mmadụ mere tupu ha aghọọ Ndị Kraịst, ma, Chineke nwere ike ịgbaghara ha n’ihi àjà mgbapụta ahụ. Pọl dere, sị: “Ọ bụ ọtụtụ njehie wetara onyinye ahụ nke rụpụtara ịkpọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume.” (Rom 5:16) Ndịozi na ndị ọzọ e nyere onyinye a (ya bụ, ịbụ ndị a kpọrọ ndị ezi omume) ga-ejirịrị okwukwe na-efe ezi Chineke. Olee ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ha n’ọdịnihu? “Ndị na-anata obiọma dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ na onyinye ezi omume dị ukwuu nke e nyere n’efu ga-adị ndụ wee chịa . . . dị ka ndị eze site n’aka otu onye ahụ, ya bụ, Jizọs Kraịst.” N’ezie, onyinye ezi omume na-eme ihe dị iche n’ihe mmehie Adam mere. Onyinye ahụ na-eme ka e nweta ndụ.—Rom 5:17; gụọ Luk 22:28-30.

15 Ndị e nyere onyinye ahụ, ya bụ, ndị a kpọrọ ndị ezi omume, na-aghọ ụmụ ime mmụọ Chineke. Ebe ha bụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ha nwere olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha agaa eluigwe ghọọ ụmụ Chineke ndị bụ́ mmụọ, ndị ga-eso Jizọs Kraịst ‘chịa dị ka ndị eze.’—Gụọ Ndị Rom 8:15-17, 23.

Otú Chineke Si Gosi Ndị Ọzọ Ịhụnanya

16. Olee otú ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nwere ike isi nata onyinye Chineke na-enye?

16 Ọ bụghị Ndị Kraịst niile kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị nwere okwukwe na Chineke ma na-efe ya ofufe, ga-eso Kraịst ‘chịa dị ka ndị eze’ n’eluigwe. Ọtụtụ n’ime ha nwere olileanya e kwuru okwu ya na Baịbụl nke yiri nke ndị ohu Chineke dịrị ndụ tupu Kraịst abịa n’ụwa nwere. Ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs. Hà nweziri ike ịnata onyinye Chineke na-enye, a kpọọ ha ndị ezi omume, ha enweekwa olileanya ịdị ndụ n’ụwa? Ee. Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom kwadoro nke a.

17, 18. (a) Olee otú Chineke si were Ebreham n’ihi okwukwe o nwere? (b) Olee ihe mere Jehova ji gụọ Ebreham n’onye ezi omume?

17 Pọl kwuru banyere otu onye natara onyinye a. Ọ bụ Ebreham, bụ́ nwoke nwere okwukwe, onye dịrị ndụ tupu Jehova enye ụmụ Izrel iwu ya e dere ede, nakwa ogologo oge tupu Kraịst emee ka e nwee ndị ga-adị ndụ n’eluigwe. (Hib. 10:19, 20) Anyị na-agụ, sị: “Ọ bụghị site n’iwu ka e kwere Ebreham ma ọ bụ mkpụrụ ya nkwa na e nwere ụwa ọ ga-eketa, kama ọ bụ site n’ezi omume nke si n’okwukwe.” (Rom 4:13; Jems 2:23, 24) N’ihi ya, Chineke gụrụ Ebreham kwesịrị ntụkwasị obi n’onye ezi omume.—Gụọ Ndị Rom 4:20-22.

18 Nke a apụtaghị na Ebreham emeghị mmehie n’ime ọtụtụ iri afọ o jeere Jehova ozi. Na ọ bụ onye ezi omume apụtaghị na o metụghị mmehie. (Rom 3:10, 23) Ma, ebe Jehova nwere amamihe n’enweghị atụ, o chefughị okwukwe pụrụ iche Ebreham nwere na ọrụ ndị ọ rụrụ iji gosi na ya nwere okwukwe. Otu ihe bụ na Ebreham nwere okwukwe ná “mkpụrụ” ahụ ga-esi n’eriri ya. Mkpụrụ ahụ bụ Mesaya ahụ, ma ọ bụ Kraịst. (Jen. 15:6; 22:15-18) N’ihi ya, Onyeikpe kacha elu na-ekwo maka ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ’ gbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga. Nke a mere a ga-eji kpọlite Ebreham na ndị ọzọ nwere okwukwe tupu Kraịst abịa n’ụwa n’ọnwụ.—Gụọ Ndị Rom 3:24, 25; Ọma 32:1, 2.

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Onye Ezi Omume n’Anya Chineke Ugbu A

19. Olee ihe mere otú Chineke si lee Ebreham anya ji kwesị ịgba ọtụtụ ndị ume taa?

19 Na Chineke nke hụrụ anyị n’anya gụrụ Ebreham n’onye ezi omume kwesịrị ịgba ezigbo Ndị Kraịst ume taa. Jehova agụghị ya n’onye ezi omume otú ahụ o si gụọ ndị o ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka ha bụrụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe.” A kpọrọ ndị a o tere mmanụ “ịbụ ndị nsọ,” a kpọkwara ha “ụmụ Chineke.” (Rom 1:7; 8:14, 17, 33) Ma, ihe a kpọrọ Ebreham bụ “enyi Jehova,” a kpọkwara ya nke a tupu a chụọ àjà mgbapụta. (Jems 2:23; Aịza. 41:8) Oleekwanụ maka ezigbo Ndị Kraịst ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ghọrọ Paradaịs?

20. Olee ihe Chineke na-achọ n’aka ndị ọ gụrụ ná ndị ezi omume taa otú o si gụọ Ebreham?

20 E nyeghị ha “onyinye ezi omume dị ukwuu nke e nyere n’efu,” nke ndị e nyere ya nwere olileanya ịdị ndụ n’eluigwe “site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” (Rom 3:24; 5:15, 17) N’agbanyeghị nke a, ha nwere okwukwe siri ike na Chineke nakwa n’ihe mgbapụta o nyere ha. Ha na-arụkwa ọrụ ọma iji gosi na ha nwere okwukwe siri ike. Otu n’ime ọrụ ndị ha na-arụ bụ ‘ikwusara ndị mmadụ alaeze Chineke, na izi ha ihe banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.’ (Ọrụ 28:31) Nke a nwere ike ime ka Jehova gụọ ha ná ndị ezi omume otú ahụ ọ gụrụ Ebreham. Onyinye ha nwetara, ya bụ, ịbụ ndị enyi Chineke, dị iche ‘n’onyinye e nyere ndị e tere mmanụ n’efu.’ Ma, obi dị ha ụtọ nke ukwuu n’ezie maka onyinye nke e nyere ha.

21. Olee ihe ndị ga-abịara anyị n’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi?

21 Ọ bụrụ na i nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, i kwesịrị ịma na ihe mere i ji nwee olileanya a abụghị na e nwere onye ọchịchị họọrọ gị ná ndaba. Kama, ọ bụ n’ihi na ọ bụ nzube nke Ọkaakaa Eluigwe na Ala. Jehova emeela ọtụtụ ihe iji hụ na nzube ya mezuru. Ihe ndị a gosiri na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Nke ka nke bụ na ha gosiri na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.”—Rom 5:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Dị ka ihe atụ, a kọwara ihe a e kwuru banyere ụmụ Adam n’akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 736, paragraf nke 4 na nke 5.

Ì Chetara?

• Olee ihe ụmụ Adam ketara n’aka ya, gịnịkwa ka nke a kpataara ha?

• Olee otú e si kwụọ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ, oleekwa otú o si bụrụ nke kwekọrọ ekwekọ?

• Olee olileanya i nwere n’ihi na a gụrụ gị n’onye ezi omume?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Adam, bụ́ nwoke zuru okè, mehiere. Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, kwụrụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”

[Foto dị na peeji nke 15]

Na e nwere ike ịgụ anyị ná ndị ezi omume site n’aka Jizọs bụ ozi ọma n’eziokwu