Jiri Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ
Jiri Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ
“Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.”—HIB. 12:1.
1, 2. Gịnị ka Pọl onyeozi ji tụnyere otú Onye Kraịst si ebi ndụ?
KWA afọ, a na-agba ọsọ maratọn n’ọtụtụ ebe. Ụfọdụ ndị na-agba ọsọ a bụ ndị a sịrị na ha bụ ọkaibe, ihe onye ọ bụla n’ime ha na-achọkwa bụ ka o merie. Ọtụtụ ndị ọzọ na-agba ya anaghị agba ka ha merie. Ihe bụ mkpa ha bụ ịgbaru ya n’isi.
2 Na Baịbụl, e ji otú Onye Kraịst si ebi ndụ tụnyere ịgba ọsọ. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọrịnt oge ochie, ọ gwara ha banyere ụdị ọsọ a. O dere, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ? Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu nweta ya.”—1 Kọr. 9:24.
3. Gịnị mere Pọl ji kwuo na naanị otu onye n’ime ndị na-agba ọsọ na-emeri?
3 Ihe Pọl na-ekwu ọ̀ bụ na ọ bụ naanị otu onye n’ime Ndị Kraịst niile na-agba ọsọ ndụ a ga-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ, ndị ọzọ agbara aka laa? Mbanụ! Ndị na-agba ọsọ egwuregwu asọmpi na-enye onwe ha ọzụzụ, na-agbalịsi ike ka ha merie. Pọl chọrọ ka Ndị Kraịst ibe ya si otú ahụ na-agbasi mbọ ike n’ọsọ ha na-agba inweta ndụ ebighị ebi. Ha mee otú ahụ, ha ga-enwe olileanya inweta ihe a na-agbata n’ọsọ, nke bụ́ ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ọsọ Ndị Kraịst na-agba, ndị niile gbaruru ya n’isi ga-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche ka anyị na-agba ọsọ nke ndụ ahụ?
4 Ọ bụ eziokwu na okwu ndị ahụ na-agba ndị niile na-agba ọsọ ndụ taa ume, o kwesịkwara ime ka ha chebara onwe ha echiche. Maka gịnị? Maka na o nweghị ihe karịrị ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, ma ọ̀ bụ nke ịdị ndụ n’eluigwe ma ọ̀ bụkwanụ nke ịdị ndụ n’ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs. Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe a ga-agbaru ọsọ ahụ dị anya, ọ dịghịkwa mfe ịgbaru ebe ahụ; e nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike ịdọla mmadụ azụ, nwee ihe ndị nwere ike ịdọpụ mmadụ uche, nakwa ihe ndị dị ize ndụ n’ụzọ e si agba ọsọ ahụ. (Mat. 7:13, 14) Ọ na-ewute ewute ịnụ na e nwere ụfọdụ ndị na-agbazi ọsọ a ntakịrị ntakịrị, nwee ndị nke ike na-agwụzi, nweekwa ndị nke darala n’ụzọ. Olee ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ daa ka ọ na-agba ọsọ nke ndụ ahụ? Olee otú i nwere ike isi zere ha? Olee ihe i nwere ike ime ka i nwee ike ịgbaru ọsọ a n’isi ma nweta ihe a na-agbata n’ọsọ?
Onye Tachie Obi Ya Emerie
5. Ná Ndị Hibru 12:1, gịnị ka Pọl dere banyere ịgba ọsọ?
5 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ na Jeruselem nakwa na Judia, o kwuru banyere ndị na-agba ọsọ egwuregwu. (Gụọ Ndị Hibru 12:1.) Ihe o kwuru abụghị naanị ihe mere mmadụ ga-eji soro n’ọsọ ahụ, kamakwa, ihe mmadụ ga-emerịrị iji merie. Tupu anyị eleba anya n’ihe anyị ga-amụta na ndụmọdụ Pọl ji ike mmụọ nsọ nye Ndị Kraịst bụ́ Ndị Hibru, ka anyị bu ụzọ leba anya n’ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi ahụ nakwa ihe ọ chọrọ ka ndị ga-agụ ya mee.
6. Olee ụdị nsogbu ndị ndú okpukpe nyere Ndị Kraịst?
6 Ọtụtụ ọnwụnwa bịaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ, karịchaa ndị bi na Jeruselem nakwa na Judia, ihe sikwaara ha ike. Ndị ndú okpukpe Ọrụ 4:1-3; 5:17, 18; 6:8-12; 7:59; 8:1, 3.
ndị Juu, bụ́ ndị ka na-atụrụ ọtụtụ ndị ihe ha na-eme, na-enye Ndị Kraịst ajọ nsogbu. Ọ bụ ndị ndú okpukpe ndị a boro Jizọs Kraịst ebubo na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru ma gbuo ya na ọ bụ onye omekome. Ha adịghịkwa njikere ịkwụsị imegide Ndị Kraịst. N’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, anyị gụtara ọtụtụ ebe e yiri Ndị Kraịst egwu ma meso ha ihe ike. Ha malitere ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ozugbo ihe ahụ dị ebube mechara na Pentikọst 33 O.A. Nke a mere ka ihe siere Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ike.—7. Olee ihe mere oge Ndị Kraịst Pọl degaara akwụkwọ ji bụrụ oge tara akpụ?
7 Ndị Kraịst ndị ahụ bikwa n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu. Jizọs gwara ha na a ga-ebibi mba ndị Juu n’ihi na ha ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ga-eme tupu ọgwụgwụ abịa nakwa ihe ndị ha ga-eme ka ha nwee ike ịgbanahụ mbibi ahụ. (Gụọ Luk 21:20-22.) Gịnịzi ka ha ga-eme? Jizọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya.”—Luk 21:34.
8. Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst selata aka n’ozi ha na-ejere Jehova ma ọ bụdị kwụsịchaa?
8 N’oge ahụ Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ agafeela kemgbe Jizọs dọchara ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ahụ. Olee ihe merela Ndị Kraịst ndị ahụ kemgbe ahụ? Ụfọdụ ndị kwere ka nsogbu a na-enye ha na otú ha ga-esi enweta ihe ndị dị ha mkpa kwa ụbọchị mee ka ha kwụsị ịmụ banyere Jehova na ime ka ha na ya na-adị ná mma. (Hib. 5:11-14) O nwekwara ike ịbụ na ndị ọzọ chere na ihe ga-aka adịrị ha mfe ma ọ bụrụ na ha ana-eme ka ọtụtụ ndị Juu gbara ha gburugburu. Ọ ga-abụ na ọ dị ha ka ndị Juu ahụ ahapụchabeghị Chineke ebe ọ bụ na e nwere ụfọdụ Iwu Mozis ndị ha ka na-edebe. E nwekwara ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị gbalịrị ịmanye ndị ọzọ ka ha na-edebe Iwu Mozis ma na-eso ọdịnala ndị Juu. Ụfọdụ Ndị Kraịst kweere ihe ha kwuru, ndị ọzọ egee ha ntị n’ihi ụjọ. Gịnị ka Pọl kwuru iji gbaa Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha na-ebi ndụ ka Ndị Kraịst ma na-atachi obi ka ha na-agba ọsọ ahụ?
9, 10. (a) Olee ihe Pọl dere ná ngwụcha akwụkwọ Ndị Hibru isi 10 iji gbaa anyị ume? (b) Gịnị mere Pọl ji dee ihe ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mere?
9 Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Pọl gbaa ndị Hibru ahụ bụ́ Ndị Kraịst ume. N’isi 10 nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ha, o kwuru na Iwu ahụ bụ naanị “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa,” kwuokwa uru àjà mgbapụta Kraịst bara. Ná ngwụcha isi nke 10 ahụ, Pọl dụrụ ndị na-agụ akwụkwọ ozi ya ọdụ, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka unu wee nata mmezu nke nkwa ahụ, mgbe unu mesịrị uche Chineke. N’ihi na ọ fọdụrụ ‘nnọọ nwa oge,’ ‘onye ahụ nke na-abịa ga-abịarutekwa, ọ gaghịkwa egbu oge.’”—Hib. 10:1, 36, 37.
10 Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl ji nkà kọwaa ihe inwe ezigbo okwukwe na Chineke pụtara. O jikwa ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere okwukwe mgbe ha dị ndụ mee ihe atụ otú e si enwe ezigbo okwukwe. Ọ̀ bụ oge ka Pọl nọ na-egbu? Mbanụ! Pọl onyeozi ma na Ndị Kraịst ibe ya kwesịrị ịghọta na ọ bụ onye nwere okwukwe ga-enweli ike inwe ndidi ma kata obi na-eme ihe ọma. Ihe nlereanya magburu onwe ya nke ndị ohu Jehova oge ochie ga-ewusi ndị Hibru ike imeri ọnwụnwa ndị na-abịara ha na idi ihe isi ike ndị ha na-enwe. N’ihi ya, mgbe Pọl kwuchara ihe ndị oge ochie nọsiri ike n’akụkụ Jehova mere, o kwuziri, sị: “Ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a gbara anyị gburugburu, ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ nakwa mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị.”—Hib. 12:1.
“Oké Ìgwè Ndị Àmà”
11. Gịnị ka ichebara ihe “oké ìgwè ndị àmà” rụzuru echiche ga-enyere anyị aka ime?
11 “Oké ìgwè ndị àmà” ahụ anọghị ka ndị
na-ekiri ihe na-eme n’ámá egwuregwu, bụ́ ndị ihe ha na-eme bụ naanị ịnọ nkịtị na-ekiri egwuregwu a na-egwu ma ọ bụ na-aja ndị ha na-akwado ike ka ha merie n’egwuregwu asọmpi. Kama, ha so gbaa ọsọ ndụ ahụ ka ndị na-agba ọsọ egwuregwu. Ha gbarukwara ọsọ ahụ n’isi. Ọ bụ eziokwu na ha anwụọla, e nwere ike iwere ha ka ndị bụ́ aka ochie n’ịgba ọsọ, bụ́ ndị na-agba ndị malitere ọhụrụ ume. Chegodị otú ọ ga-adị onye so na-agba ọsọ ma ọ mata na ndị gbara ya gburugburu, ma ọ bụ ndị na-ekiri ya, bụ ụfọdụ n’ime ọtụtụ ndị gbaruru ọsọ ahụ n’isi. Nke a ọ́ gaghị eme ka o mee ike ya dum ma ọ bụdị mee nke ọma karịa otú a tụrụ anya na ọ ga-eme? Ndị àmà ndị ahụ dịrị ndụ n’oge ochie gosiri na n’agbanyeghị otú ịgba ọsọ ndụ ahụ siruru n’ike, mmadụ nwere ike imeri. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ eburu ihe atụ nke “ìgwè ndị àmà” ndị ahụ n’obi, obi ga-aka ha, ha ga-enwekwa ike ‘iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ,’ dịkwa ka anyị nwere ike ime taa.12. Olee otú ihe nlereanya nke ndị Pọl kpọrọ aha ha si abara anyị uru?
12 Ọtụtụ n’ime ndị kwesịrị ntụkwasị obi Pọl kpọrọ aha biri n’ụdị oge dị ka nke anyị. Dị ka ihe atụ, Noa biri n’oge ọgwụgwụ nke ụwa e nwere tupu Iju Mmiri. Anyị bikwa mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-eru nso. O nwere mgbe Chineke gwara Ebreham na Sera ka ha si n’obodo ha kwapụ ma kwaga ebe ọzọ nọrọ na-efe ya ezi ofufe, ka ha nọrọkwa ebe ahụ chere ruo mgbe Jehova ga-emezu nkwa ya. A gbakwara anyị ume ka anyị jụ onwe anyị ka Jehova nabata anyị ma gọzie anyị. Mozis si n’ala ịkpa dị egwu na-aga Ala Nkwa ahụ. Anyị si n’ajọ ụwa a na-aga ịbanye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa. N’eziokwu, anyị kwesịrị ichebara ihe niile gbasara ndị a echiche. Anyị kwesịrị iche maka otú ihe si gaara ha nke ọma na otú ha si mehie ihe, nakwa ebe ndị ha mere nke ọma na ebe ndị ha na-emeghị nke ọma.—Rom 15:4; 1 Kọr. 10:11.
Ihe Nyeere Ha Aka Ịgbaru Ọsọ ahụ n’Isi
13. Olee ọrụ tara akpụ a gwara Noa ka ọ rụọ, oleekwa ihe nyeere ya aka ịrụ ya?
13 Gịnị nyeere ndị ohu Jehova ndị ahụ aka idi nsogbu ndị bịaara ha, nke mere ka ha gbaruo ọsọ ahụ n’isi? Cheta ihe Pọl dere banyere Noa. (Gụọ Ndị Hibru 11:7.) Ihe a na-ekwu okwu ya Noa “na-ahụbeghị anya” bụ “iju mmiri n’elu ụwa [nke a ga-eji] bibie anụ ahụ́ niile.” (Jen. 6:17) Ọ bụ ihe na-emetụbeghị mbụ. Ma, Noa eweereghị ya ka ihe na-enweghị ike ime eme, ma ọ bụdị ihe ga-esi ike omume. Maka gịnị? Maka na o nwere okwukwe na ihe ọ bụla Jehova kwuru Jehova ga-eme ya. Noa echeghị na ihe a gwara ya mee bụ ihe siri ike omume. Kama, “o mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22) A gwara Noa ka o wuo ụgbọ, chịkọta ụmụ anụmanụ, bujuo nri ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-eri n’ụgbọ ahụ, zie ndị mmadụ ozi iji dọọ ha aka ná ntị ma hụ na ezinụlọ ya nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe a niile a chọrọ ka Noa mee echiche, anyị ga-ekweta na ime “nnọọ otú ahụ” abụghị obere ihe. Ma, okwukwe na ntachi obi Noa nwere mere ka a zọpụta ya na ezinụlọ ya, ha enwetakwa ọtụtụ ngọzi.
14. Olee ule Ebreham na Sera meriri, oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị?
14 Ebreham na Sera bụ ndị ọzọ Pọl kpọrọ aha na ha so ‘n’oké ìgwè ndị àmà gbara anyị gburugburu.’ E si n’ala Ọọ nke maarala ha ahụ́ kpọpụta ha, ha amaghịkwa otú ihe ga-adịrị ha ebe ha na-akwaga. Ha ghọrọ ndị e ji ama atụ ma a chọọ ikwu banyere ndị nwere okwukwe siri ike na ndị na-erube isi n’oge ihe tara akpụ. N’ihi ihe niile Ebreham ji obi ya dum hapụ ka o nwee ike ife Chineke ezi ofufe, ọ dabara adaba na a kpọrọ ya “nna nke ndị niile nwere okwukwe.” (Rom 4:11) Naanị ihe Pọl mere bụ ịkpọtụ ihe ndị bụ́ isi Ebreham mere aha ebe ọ bụ na ndị o degaara akwụkwọ ozi ma ihe niile gbasara ndụ Ebreham. Ma Pọl kwuru ihe dị mkpa ọ chọrọ ka a mụta n’ihe o dere. Ọ sịrị: “Ndị a niile [ma Ebreham ma ezinụlọ ya] nwụrụ n’okwukwe, ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya ma nabata ha ma kwusaa n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.” (Hib. 11:13) O doro anya na okwukwe ha nwere na Chineke na adịm ná mma ha na ya nyeere ha aka iji ntachi obi gbaa ọsọ ahụ.
15. Gịnị mere ka Mozis bie ndụ otú o biri?
15 Mozis bụ ohu Jehova ọzọ e ji ama atụ, o sokwa ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ ahụ. Mozis jụrụ ịghọ ọgaranya na ịbụ onye ukwu ma ‘họrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke.’ Gịnị mere o ji mee otú ahụ? Pọl sịrị: “O legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya. . . . O guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Gụọ Ndị Hibru 11:24-27.) Mozis ekweghị ka “ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge” dọpụ uche ya n’ozi Jehova. Mozis kwenyesiri ike na Chineke dị adị nakwa na nkwa ya niile ga-emezu. Ọ bụ nke a mere obi ji sie ya ike, ya atachiekwa obi. Ọ gbara ezigbo mbọ iji hụ na o si n’Ijipt dupụta ụmụ Izrel ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ.
16. Gịnị mere ike ife Chineke agwụghị Mozis mgbe a gwara ya na ọ gaghị aba n’Ala Nkwa ahụ?
16 Dịkwa ka Ebreham, Mozis anọghị ndụ hụ otú nkwa Chineke si mezuo. Mgbe ọ fọrọ obere ka ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, a gwara Mozis, sị: “Ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye ebe ahụ, n’ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel.” A gwara ya ihe a n’ihi ihe ya na nwanne ya bụ́ Erọn mere mgbe iwe ji ha maka isi ụmụ Izrel nupụrụ. Iwe ahụ mere ka ha ghara ‘imeso Chineke otú ha kwesịrị isi meso ya n’etiti ụmụ Izrel, ná mmiri Meriba.’ (Diut. 32:51, 52) Ihe a a gwara Mozis ò mere ka ike ife Chineke gwụ ya, ma ọ bụ ka o buwere Chineke iwe n’obi? Mba. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ gọzie ụmụ Izrel, ihe ndị o kwukwara tupu ya anwụọ bụ: “Obi ụtọ na-adịrị gị, Izrel! Ònye dị ka gị, bụ́ ndị Jehova na-azọpụta, onye bụ́ ọta nke na-enyere gị aka, onye bụkwa mma agha gị nke dị ebube?”—Diut. 33:29.
Ihe Anyị Mụtara
17, 18. (a) Gịnị ka anyị na-amụta n’aka “oké ìgwè ndị àmà” ahụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?
17 Anyị atụleela ụfọdụ ndị so ‘n’oké ìgwè ndị àmà gbara anyị gburugburu.’ O doola anyị anya na tupu anyị enwee ike ịgbaru ọsọ ahụ n’isi, anyị ga-enwerịrị okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ, kwenyesiekwa ike na ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere. (Hib. 11:6) Okwukwe anyị ekwesịghị ịbụ nke na-esichaghị ike; o kwesịrị ịbụ nke ndụ anyị hiwere isi na ya. Ndị ohu Jehova abụghị ndị na-enweghị okwukwe, okwukwe ha na-eme ka ha na-ahụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Anyị na-ahụli onye ahụ bụ́ “Onye a na-apụghị ịhụ anya,” nke a na-emekwa ka anyị jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ.—2 Kọr. 5:7.
18 Ọsọ Ndị Kraịst na-agba adịghị mfe. Ma, anyị nwere ike ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Gịnị mere Pọl ji dee ọtụtụ ihe banyere ndị àmà oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi?
• Olee otú ime ka ànyị na-ahụ “oké ìgwè ndị àmà . . . gbara anyị gburugburu” ga-esi gbaa anyị ume iji ntachi obi na-agba ọsọ ahụ?
• Olee ihe ị mụtara n’akụkọ banyere Noa, Ebreham, Sera, na Mozis, bụ́ ndị so ná ndị àmà ndị kwesịrị ntụkwasị obi?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 19]
Ebreham na Sera dị njikere ịhapụ ala Ọọ bụ́ ebe ha nwere ihe ndị mere ka ahụ́ ruo ha ala