Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
Ntụrụndụ Ị Na-enwe Ọ̀ Na-abara Gị Uru?
“Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—EFE. 5:10.
1, 2. (a) Olee otú Okwu Chineke si gosi na Jehova chọrọ ka anyị na-atụrụ ndụ? (b) Ọ bụrụ na anyị ewere ntụrụndụ ka “onyinye Chineke,” gịnị ka ọ ga-eme ka anyị mee?
NA BAỊBỤL, anyị na-agụta ebe ndị e kwuru ihe gosiri na Jehova chọrọ ka anyị na-atụrụ ndụ ọ bụghị naanị ịna-adị ndụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 104:14, 15 kwuru na Jehova na-eme ka e “si n’ala nweta ihe oriri, na mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ, iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ, nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.” N’eziokwu, Jehova na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi mịa mkpụrụ, na-emekwa ka anyị nweta mmanụ na mmanya, bụ́ ihe ndị na-edozi anyị ahụ́. Ma, mmanya ‘na-emekwa ka obi ṅụrịa ọṅụ.’ Ọ bụghị naanị na ọ na-eme ka anyị na-adị ndụ, kamakwa, ọ na-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ. (Ekli. 9:7; 10:19) N’eziokwu, Jehova chọrọ ka anyị na-aṅụrị ọṅụ, nakwa ka anyị na-enwe “obi ụtọ.”—Ọrụ 14:16, 17.
2 N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na ọ dị njọ ma ọ bụrụ na anyị nọtụ, anyị ‘eleruo anụ ufe nke eluigwe anya,’ leruokwa ‘okooko lili dị n’ọhịa’ anya; ọ dịghịkwa njọ ime ihe ụfọdụ e ji atụrụ ndụ bụ́ ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike, obi adịkwa anyị ụtọ. (Mat. 6:26, 28; Ọma 8:3, 4) Inwe obi ụtọ na ịgbasi ike ná ndụ bụ “onyinye Chineke.” (Ekli. 3:12, 13) Ọ bụrụ na anyị ewere oge ntụrụndụ ka ihe so n’onyinye Chineke, ọ ga-eme ka anyị jiri oge ahụ mee ihe ga-eme ka obi dị Onye nyere anyị ya ụtọ.
E Nwere Ọtụtụ Ihe E Ji Atụrụ Ndụ ma E Nwere Ndị nke E Kwesịrị Ịgbara Ọsọ
3. Gịnị mere o ji baa uru ka anyị ghọta na e nwere ihe ndị dị iche iche e nwere ike iji tụrụ ndụ?
3 Ndị na-ele ntụrụndụ anya otú kwesịrị ekwesị na-aghọta na e nwere ihe dị iche iche mmadụ nwere ike iji tụrụ ndụ, ma, ha na-aghọtakwa na e nwere ndị nke ha kwesịrị ịgbara ọsọ. Gịnị mere ha ji eche otú a? Iji ghọta okwu a nke ọma, ka anyị jiri ntụrụndụ tụnyere nri. Nri ndị mmadụ na-eri n’otu mba na-adị iche ná nri ndị ọzọ na-eri ná mba ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere nri ndị na-atọgbu otu ndị atọgbu n’obodo ha ma ndị ọzọ na-asọ ha asọ n’obodo ha. Otú ahụkwa ka ọ dị ná ntụrụndụ na-amasị Ndị Kraịst. Ntụrụndụ na-amasị Ndị Kraịst n’otu mba nwere ike ọ gaghị amasị ndị nke nọ ná mba ọzọ. Ọ na-adịdị otú ahụ n’etiti Ndị Kraịst bi n’otu ógbè. Ihe otu onye na-ewere ka ntụrụndụ (ikekwe ịna-agụ akwụkwọ na-atọ ya ụtọ), onye ọzọ nwere ike iwere ya ka ihe na-agbụ agbụ; ihe otu onye weere ka ihe na-enye ume (ikekwe ịna-agbagharị igwe), onye ọzọ nwere ike iwere ya ka ihe na-agwụ ike. Ma, anyị ghọtara na n’okwu ndị gbasara nri na ntụrụndụ, e nwere nri dị iche iche mmadụ nwere ike iri, nweekwa ihe ndị dị iche iche e nwere ike iji tụrụ ndụ, onye ọ bụla nwekwaara onwe ya ikpebi ndị ọ ga-ahọrọ.—Rom 14:2-4.
4. Gịnị mere anyị ekwesịghị iji ihe ụfọdụ na-atụrụ ndụ? Nye ihe atụ.
4 Ma, anyị makwa na n’agbanyeghị na e nwere ihe ndị dị iche iche e ji atụrụ ndụ, mmadụ ekwesịghị iji ihe ọ bụla ọ hụrụ na-atụrụ ndụ. Ka anyị jirigodị nri mee ihe atụ. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịchọ iri ụdị nri dị iche iche, anyị agaghị akpachara anya rie nri mebiri emebi. Onye ọ bụla ma na ọ dịghị mma iri nri mebiri emebi, marakwa na o nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. Otú ahụkwa ka ọ dị ná ntụrụndụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe dị iche iche dị mma e ji atụrụ ndụ, anyị agaghị eji ihe Efe. 5:10) Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ya?
ndị nwere ike igbu mmadụ, ihe ndị a na-eme ihe ike na ha, ma ọ bụ ndị nke rụrụ arụ, atụrụ ndụ. Onye na-eji ihe dị otú ahụ atụrụ ndụ anaghị eme ihe Baịbụl kwuru, nke a nwekwara ike imerụ onye ahụ ahụ́ ma ọ bụ mee ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọ bụrụ na anyị achọpụta n’ezigbo oge ma ntụrụndụ ndị na-amasị anyị hà na-abara anyị uru ma ọ bụ na hà anaghị abara anyị uru, ọ ga-enyere anyị aka ịtụrụ ndụ otú kwesịrị ekwesị. (5. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ma ntụrụndụ anyị na-enwe ò kwekọrọ n’ihe Chineke kwuru?
5 Naanị ntụrụndụ nke ga-abara anyị uru nakwa nke dị mma n’anya Jehova bụ nke kwekọrọ n’ihe e kwuru n’Okwu Chineke. (Ọma 86:11) E nwere ihe ole na ole ga-enyere gị aka ịchọpụta ma ntụrụndụ nke nwere ike ịmasị gị ò kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru. E nwere ike ịchịkọta ihe ole na ole ahụ n’ajụjụ atọ, ya bụ, olee ụdị . . . , olee mgbe . . . , nakwa ole ndị . . . ? Ka anyị leba ha anya otu otu.
Olee Ụdị Ntụrụndụ Ọ Bụ?
6. Olee ụdị ntụrụndụ ndị anyị kwesịrị ịjụ, gịnịkwa mere anyị ga-eji jụ ha?
6 Ihe mbụ ị ga-ajụ onwe gị tupu i nwewe ntụrụndụ ọ bụla bụ, ‘Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị m?’ Ka ị na-eche ụdị nke na-amasị gị, ọ ga-abara gị uru ma i buru n’obi na e nwere ụdị ntụrụndụ abụọ bụ́ isi. Anyị anaghị eji nke mbụ atụrụ ndụ, ma, anyị nwere ike iji nke abụọ tụrụ ndụ. Gịnị ka nke mbụ bụ? N’ajọ ụwa a, e nwere ọtụtụ ihe ndị e ji atụrụ ndụ bụ́ ndị rụrụ arụ ma ọ bụ ndị Baịbụl kwuru hoo haa ka anyị zere. (1 Jọn 5:19) Ezigbo Ndị Kraịst anaghị eji nke ọ bụla n’ụdị ihe ndị ahụ atụrụ ndụ. Ihe ndị so na ha bụ ntụrụndụ ndị a na-arụ arụrụala na ha, ndị a na-egosi ebe a na-efe ndị mmụọ ọjọọ, ndị a na-egosi ebe nwoke na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-edina nwaanyị, ndị a na-egosi ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ndị na-eme ihe ike, ma ọ bụkwanụ ndị na-akwado ihe ọjọọ ndị ọzọ, nakwa ndị a na-egosi ebe a na-eme omume rụrụ arụ. (1 Kọr. 6:9, 10; gụọ Mkpughe 21:8.) Ọ bụrụ na anyị ajụwapụ isi iji ụdị ihe ndị ahụ atụrụ ndụ n’agbanyeghị ebe anyị nọ, anyị na-egosi Jehova na anyị ‘kpọrọ ihe ọjọọ asị.’—Rom 12:9; 1 Jọn 1:5, 6.
7, 8. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ụdị ntụrụndụ dị mma na nke na-adịghị mma? Nye ihe atụ.
7 Ụdị ntụrụndụ nke abụọ bụ ndị nke Baịbụl na-akatọghị ọtụtụ ihe ndị a na-eme na ha. Anyị chọọ isi n’ime ha họrọ ndị nke anyị ga-eji tụrụ ndụ, anyị kwesịrị ịsa anya mmiri chọpụta ụdị ntụrụndụ ndị Baịbụl kwuru na ha dị mma n’anya Jehova. (Ilu 4:10, 11) Anyị ga-ejizi aka anyị kpebie ụdị ntụrụndụ ọ ga-abụ anyị họrọ akọnuche anyị aghara ịna-ama anyị ikpe. (Gal. 6:5; 1 Tim. 1:19) Olee otú anyị ga-esi eme nke a? Chegodị banyere nke a: Tupu anyị eriwe nri anyị na-eritụbeghị, anyị ga-ebu ụzọ chọpụta ihe ndị bụ́ isi e ji sie ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ná ntụrụndụ. Tupu anyị ejiri ihe ọ bụla tụrụwa ndụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ihe ndị bụ́ isi dị ná ya.—Efe. 5:17.
8 Dị ka ihe atụ, egwuregwu dị iche iche nwere ike ịna-atọ gị ụtọ. Ọ dịghịkwa ihe nke ahụ mere n’ihi na e nwere egwuregwu ndị na-atọ ọchị, na-atọkwa ezigbo ụtọ. Ma, ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere otu egwuregwu ji atọ gị ụtọ bụ n’ihi otú ndị na-egwu ya si egwu ya ike ike ebe ha na-ama aka onye bụ́ ọkaibe, ma ọ bụ na ha na-eme ihe nwere ike ịta isi ha, ma ọ bụ ihe nwere ike imerụ ha ezigbo ahụ́, ma ọ bụ na-eme oriri na nkwari a na-achịkwaghị achịkwa, ma ọ bụ na-egosi na mba ha ka mba ndị ọzọ mma, ma ọ bụkwanụ ihe ndị yiri ihe ndị a? Ị tụleechaa ihe ndị ha na ntụrụndụ ahụ so aga, i nwere ike ikpebi na ọ ga-eme ka otú i si eche echiche dị iche n’otú Jehova si eche, nakwa na ihe ụdị ntụrụndụ ahụ na-akụzi dị iche n’ozi ọma anyị na-ezi ndị ọzọ ka ha dịrị n’udo ma hụ ibe ha n’anya. (Aịza. 61:1; Gal. 5:19-21) Ma, ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme ná ntụrụndụ ị họọrọ bụ ihe ndị dị mma n’anya Jehova, ntụrụndụ dị otú ahụ nwere ike ịbara gị ezigbo uru ma mee ka i nwee ume.—Gal. 5:22, 23; gụọ Ndị Filipaị 4:8.
Olee Mgbe M Ji Atụrụ Ndụ?
9. Ọ bụrụ na anyị ajụọ onwe anyị, sị, ‘Olee mgbe m kwesịrị ịna-atụrụ ndụ?’ gịnị ka ihe anyị zara ga-egosi?
9 Ajụjụ nke abụọ i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ, ‘Olee mgbe m kwesịrị ịna-atụrụ ndụ? Awa ole ka m kwesịrị iji tụrụ ndụ?’ Ihe anyị zara n’ajụjụ mbụ ahụ bụ́ ‘Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị m?’ na-egosi ihe dị anyị n’obi, ya bụ, ihe na-amasị anyị na ihe na-anaghị amasị anyị. Ma, ihe anyị ga-aza n’ajụjụ bụ́ ‘Olee mgbe m kwesịrị ịna-atụrụ ndụ?’ ga-egosi ihe ndị ka anyị mkpa ná ndụ, ya bụ, ihe ndị anyị weere na ha dị mkpa na ihe ndị anyị weere na ha adịghị mkpa. Oleezi otú anyị ga-esi achọpụta ma otú anyị si were ntụrụndụ ò kwesịrị ekwesị?
10, 11. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 ga-esi nyere anyị aka ikpebi awa ole anyị ga-eji na-atụrụ ndụ?
10 Jizọs Kraịst gwara onye ọ bụla na-eso ụzọ ya, sị: “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) N’ihi ya, ịhụ Jehova n’anya bụ ihe mbụ anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-eme. Anyị na-egosi na anyị na-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe a Jizọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.” (Mat. 6:33) Olee otú ihe a Jizọs kwuru ga-esi enyere anyị aka ịchọpụta awa ole anyị kwesịrị iji na-atụrụ ndụ na otú anyị kwesịrị isi were ntụrụndụ?
11 Buru nke a n’uche: Jizọs gwara anyị ka anyị ‘Buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ Ọ sịghị ka anyị ‘na-achọ naanị alaeze ahụ.’ O doro anya na Jizọs ma na o nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị ga na-achọ ná ndụ ma e wezụga Alaeze Chineke. Ụlọ, nri, uwe, ịga ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị, ọrụ, ntụrụndụ, na ihe ndị ọzọ, dịcha anyị mkpa. Ma, n’ihe niile anyị kwesịrị ịna-achọ, naanị otu ka anyị kwesịrị ibu ụzọ na-achọ, ya bụ, ihe ndị gbasara Alaeze Chineke. (1 Kọr. 7:29-31) Eziokwu a gbara ọkpụrụkpụ kwesịrị ime ka anyị na-achụ ihe ndị ọzọ, dị ka ntụrụndụ, otú ga-eme ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ kacha mkpa ná ndụ anyị, ya bụ, ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ntụrụndụ nke na-anaghị ewekọrọ oge anyị ga-abara anyị uru.
12. Olee otú ihe e dere na Luk 14:28 si gbasa ntụrụndụ?
12 N’ihi ya, n’okwu gbasara awa ole anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ gbakọọ ihe ọ ga-ewe anyị. (Luk 14:28) Anyị kwesịrị ịchọpụta awa ole ntụrụndụ anyị chọrọ inwe ga-ewe anyị. Ihe ọzọ anyị ga-ekpebi bụ awa ole anyị kwesịrị iwepụta maka ya. Ọ bụrụ na ịtụrụ ndụ ga-eme ka anyị leghara ihe ndị dị mkpa anya, dị ka ọmụmụ Baịbụl onwe onye, ofufe ezinụlọ, ịga ọmụmụ ihe, ma ọ bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ gaghị abara anyị uru. (Mak 8:36) Ma, ọ bụrụ na ntụrụndụ emee ka anyị nwekwuo ume ịna-achụ ihe ndị gbasara Alaeze Chineke, anyị nwere ike ikwu na oge anyị ji tụrụ ndụ efughị ọhịa.
Ole Ndị Ka Mụ na Ha Ga-eso Atụrụ Ndụ?
13. Gịnị mere anyị ji kwesị iche echiche tupu anyị ahọrọ ndị anyị na ha ga-anọkọ tụrụ ndụ?
13 Ajụjụ nke atọ ị ga-ajụ onwe gị bụ, ‘Ole ndị ka m chọrọ ka mụ na ha nọkọọ tụrụ ndụ?’ Ọ dị mkpa ka anyị chebara ajụjụ a echiche. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe na-akakarị ekpebi ma ntụrụndụ anyị ọ̀ ga-abara anyị uru ma ọ bụ na ọ gaghị abara anyị uru bụ ndị anyị họọrọ iso na-atụrụ ndụ. Otú ahụ iri nri na-aka atọ gị ụtọ ma gị na ezigbo ndị enyi nọkọọ na-eri ya, otú ahụkwa ka ntụrụndụ ga-esi atọkarị gị ụtọ ma gị na ezigbo ndị enyi nọkọọ na-atụrụ ndụ. Ka a sịkwa ihe mere ntụrụndụ ji atọ ọtụtụ n’ime anyị ụtọ, nke ka nke ndị na-eto eto, ma anyị na ndị ọzọ nọkọọ na-atụrụ ndụ. Ma, ihe mmadụ chọrọ ime ga-abara ya uru ma o bu ụzọ kpebie ụdị ndị ọ ga-ahọrọ ka ha na ya soro mee ya na ụdị ndị ọ na-agaghị achọ iso mee ihe ahụ.—2 Ihe 19:2; gụọ Ilu 13:20; Jems 4:4.
14, 15. (a) Olee otú Jizọs si bụrụ onye e ji ama atụ n’ịhọta ezigbo ndị enyi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị tupu anyị ahọrọ ndị anyị ga-emete enyi?
Ilu 8:31) Mgbe ọ nọ n’ụwa, o gosiri na ya hụrụ ụdị mmadụ dị iche iche n’anya. (Mat. 15:29-37) Ma, ọ bụghị ndị niile ha na Jizọs dị ná mma bụ ezigbo ndị enyi ya. Ọ bụ eziokwu na ya na ụdị mmadụ dị iche iche dị ná mma, ọ bụ naanị ndị na-akpa àgwà otú masịrị ya ka ọ họọrọ ka ha bụrụ ezigbo ndị enyi ya. O nwere ihe Jizọs kwuru banyere mmadụ iri na otu bụ́ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ sịrị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14; tụleekwa Jọn 13:27, 30.) Naanị ndị Jizọs weere ka ndị enyi ya bụ ndị soro ụzọ ya na ndị jeere Jehova ozi.
14 Ime ihe Jizọs mere mgbe ọ na-ahọ ndị ga-abụ ndị enyi ya ga-abara anyị ezigbo uru. Malite oge e kere ihe, Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. (15 N’ihi ya, mgbe ị na-atụle onye ga-abụ ezigbo enyi gị na onye na-agaghị abụ, ọ ga-adị mma ma i buru ihe Jizọs kwuru n’obi. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Otú onye a si ekwu okwu na otú o si akpa àgwà ọ̀ na-egosi na ọ na-erubere Jehova na Jizọs isi? Ọ̀ mụtala ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ihe ọma na ihe ọjọọ otú m mụtarala? Mụ na ya kpawa ọ̀ ga-agba m ume ibute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ m na ịna-erubere Jehova isi mgbe niile?’ Ọ bụrụ na ị zaa ee n’ajụjụ ndị a, mara na i mete ya enyi i metela ezigbo mmadụ enyi, bụ́ onye gị na ya nwere ike ịnọkọ tụrụ ndụ.—Gụọ Abụ Ọma 119:63; 2 Kọr. 6:14; 2 Tim. 2:22.
Ihe Ndị Anyị Ji Atụrụ Ndụ Hà Kwesịrị Ekwesị?
16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịchọpụta banyere ntụrụndụ anyị kwesịrị ịhọrọ?
16 Anyị atụleela ihe atọ gbasara ntụrụndụ, ha bụ, ụdị ntụrụndụ anyị ga-ahọrọ, awa ole anyị ga-eji atụrụ ndụ, na ndị anyị na ha ga-anọ na-atụrụ ndụ. Ntụrụndụ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na o kwekọrọ nnọọ n’otú Baịbụl kwuru ka ọ na-adị n’ihe atọ ndị a anyị tụlere. N’ihi ya, tupu anyị ana-atụrụ ndụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee ya nke ọma. A bịa n’ụdị ntụrụndụ anyị ga-ahọrọ, ihe anyị chọrọ ịma bụ: ‘Gịnị na gịnị ka a ga-eme na ya? Hà bụ ihe ndị dị mma ka hà bụ ihe ndị rụrụ arụ?’ (Ilu 4:20-27) N’ihe gbasara oge ọ ga-ewe anyị, ihe anyị kwesịrị ịchọpụta bụ: ‘Awa ole ka m ga-eji atụrụ ndụ? Ọ̀ karịrị akarị ka ọ̀ dị otú o kwesịrị?’ (1 Tim. 4:8) A bịakwa na ndị anyị na ha ga-anọ na-atụrụ ndụ, ihe anyị kwesịrị ịchọpụta bụ: ‘Ole ndị ka mụ na ha ga-anọ na-atụrụ ndụ? Hà bụ ndị ezigbo mmadụ ka hà bụ ndị ọjọọ?’—Ekli. 9:18; 1 Kọr. 15:33.
17, 18. (a) Olee otú anyị ga-esi achọpụta ma ntụrụndụ anyị ò kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru? (b) Gịnị ka i kpebiri ime ma ị họwa ihe ị ga-eji atụrụ ndụ?
17 Ọ bụrụ na e nwee ntụrụndụ na-ekwekọghị n’ihe Baịbụl kwuru na nke ọ bụla n’ihe atọ ndị a anyị tụlerela, mara na o kwesịghị ekwesị. Ma, ọ bụrụ na e nwee ntụrụndụ kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru na nke ọ bụla n’ihe atọ ndị anyị tụlere n’isiokwu a, ntụrụndụ anyị họọrọ ga-ewetara Jehova nsọpụrụ ma baara anyị uru.—Ọma 119:33-35.
18 N’ihi ya, n’ihe gbasara ntụrụndụ, ka anyị gbaa mbọ hụ na anyị chọtara ndị kwesịrị ekwesị anyị na ha ga-anọ mee ihe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị. Ka anyị si n’ala ala obi anyị kpebie iso ndụmọdụ a Baịbụl nyere anyị, sị: “Ma ùnu na-eri ihe ma ùnu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma ùnu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 Kọr. 10:31.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
A bịa ná ntụrụndụ, olee otú anyị ga-esi eme ihe dị na . . .
• Matiu 6:33?
• Ilu 13:20?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Ihe osise dị na peeji nke 9]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
✔Olee ụdị . . .
[Ihe osise dị na peeji nke 10]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
✔Olee mgbe . . .
[Ihe osise dị na peeji nke 12]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
✔Ole ndị . . .
[Foto dị na peeji nke 10]
Olee otú anyị ga-esi mee ka Jizọs ma anyị họwa ndị ga-abụ ndị enyi anyị nakwa ihe anyị ga-eji atụrụ ndụ?