“Adaberekwala Ná Nghọta Gị”
“Adaberekwala Ná Nghọta Gị”
“Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.”—ILU 3:5.
1, 2. (a) Olee nsogbu ụfọdụ nwere ike ịbịara anyị? (b) Anyị nwee nsogbu, ma ọ bụ chọọ ime mkpebi, ma ọ bụkwanụ chọọ imeri ọnwụnwa, ònye ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, gịnịkwa mere anyị ga-eji mee otú ahụ?
ONYE were Cynthia * n’ọrụ emechiela ụfọdụ ụlọ ọrụ ya, ọ kwụsịkwala ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ya ọrụ. Cynthia na-eche na ọ bụ ya bụ onye ọzọ a ga-akwụsị ọrụ. Gịnị ka ọ ga-eme ma a kwụsị ya ọrụ? Olee otú ọ ga-esi na-akwụ ụgwọ ndị o kwesịrị ịna-akwụ kwa ọnwa? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Pamela chọrọ ịkwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ma ò kwesịrị ime otú ahụ? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Samuel nwere ihe dị iche na-echegbu ya. Ọ dị obere lewe ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ugbu a Samuel gaferela afọ iri abụọ, ọ na-agụsi ya agụụ ike ilewe ihe ndị ahụ ọzọ. Olee otú ọ ga-esi akwụsị agụụ a?
2 Ònye ka ị na-agakwuru ka o nyere gị aka ma i nwee nsogbu, ma ọ bụ ma i kpebiwe ihe ị ga-eme n’okwu ndị dị mkpa, ma ọ bụkwanụ ma ị chọọ imeri ọnwụnwa? Ị̀ na-atụkwasị naanị onwe gị obi, ka ị̀ ‘na-atụkwasị Jehova ibu arọ gị’? (Ọma 55:22) Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.” (Ọma 34:15) Ị̀ hụla ihe mere anyị ji kwesị iji obi anyị dum tụkwasị Jehova obi, gharakwa ịdabere ná nghọta anyị?—Ilu 3:5.
3. (a) Olee otú mmadụ si egosi na ya tụkwasịrị Jehova obi? (b) Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ dabere ná nghọta ha?
3 Otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị dum bụ ime ihe otú o si chọọ, ya bụ, ịna-eme ihe dị ka uche ya si dị. Ihe ga-akacha enyere anyị aka ime nke a bụ iji obi anyị dum na-arịọ ya mgbe niile n’ekpere ka ọ na-eduzi anyị. Ma, ọ naghị adịrị ọtụtụ ndị mfe ịtụkwasị Jehova obi ha dum. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lynn, kwuru, sị: “Ọ dịla anya m gbawara mbọ ịtụkwasị Jehova obi m dum ma ọ naghị ekwe m omume.” Maka gịnị? Ọ sịrị: “Mụ na papa m adịghị ná mma, mama m anaghịkwa achọ ịma ma m̀ dị ndụ ma m̀ nwụrụ anwụ, ma m̀ riri nri ma mụ erighị. Nke a mere ka m jirizie aka m na-emere onwe m ihe niile.” Otú a ihe si dịrị Lynn n’ezinụlọ ha mere ka o siere ya ike ịtụkwasị onye ọ bụla obi ya dum. Ọ bụrụkwa na mmadụ ma ihe ma ọ bụ na ihe na-agaziri ya, onye ahụ nwere ike ịtụkwasị onwe ya obi. Okenye ọgbakọ nwekwara ike ikwo maka na ya anọteela aka n’okenye bido ileba anya n’okwu gbasara ọgbakọ n’ebughị ụzọ rịọ Chineke ka o nyere ya aka.
4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
4 Jehova chọrọ ka anyị gbalịsie ike na-eme ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-arịọ ya, na-emekwa uche ya. Olee otú anyị ga-esi buru nsogbu tara akpụ anyị nwere busara Chineke ma na-agbalịsikwa ike n’onwe anyị ka nsogbu ahụ bie? Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya na ya mgbe anyị na-eme mkpebi? Olee uru ikpe ekpere na-aba mgbe anyị na-achọ imeri ọnwụnwa? Anyị ga-eji ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl zaa ajụjụ ndị a.
Mgbe Anyị Nọ ná Nsogbu
5, 6. Olee ihe Hezekaya mere mgbe eze ndị Asiria yiri ya egwu?
5 O nwere ihe Baịbụl kwuru banyere Eze Hezekaya nke Juda. Ọ sịrị: “O wee rapara Jehova n’ahụ́. Ọ kwụsịghị iso ya, kama ọ nọ na-edebe ihe o nyere n’iwu, nke Jehova nyere Mozis n’iwu.” N’eziokwu, “ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ka ọ tụkwasịrị obi.” (2 Eze 18:5, 6) Gịnị ka Hezekaya mere mgbe Eze Senakerib nke Asiria zigara ndị nnọchiteanya ya Jeruselem, ya bụ, Rabshake na oké ìgwè ndị agha ya? Ụsụụ ndị agha Asiria ndị bụ́ a kwaa akwụrụ ewegharala ọtụtụ obodo ndị e wusiri ike ndị dị na Juda, Senakerib achọwakwala ugbu a iweghara Jeruselem. N’ihi ya, Hezekaya gara n’ụlọ Jehova wee malite ikpe ekpere, sị: “Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, zọpụta anyị n’aka ya, ka alaeze niile nke ụwa wee mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”—2 Eze 19:14-19.
6 Hezekaya mere ihe kwekọrọ n’ihe ọ rịọrọ Chineke. Tupudị ya agawa n’ụlọ nsọ ikpe ekpere, ọ gwara ndị ya ka ha ghara ịtụpụrụ Rabshake ọnụ n’emo ọ na-akwa ha. Hezekaya zigakwara mmadụ ka ọ gaa na nke Aịzaya onye amụma, jụta Aịzaya ihe ya ga-eme. (2 Eze 18:36; 19:1, 2) Hezekaya mere ihe ndị o kwesịrị ime. N’oge a, ọ nwaghị ime ihe n’ekwekọghị n’uche Jehova, ya bụ, ọ kpọghị ndị Ijipt ma ọ bụ mba ndị ọzọ ha na ha gbara agbata obi ka ha bịa nyere ya aka. Hezekaya adabereghị ná nghọta ya, kama, ọ tụkwasịrị Jehova obi. Mgbe mmụọ ozi Jehova gburu otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise, bụ́ ndị agha Senakerib, Senakerib “hapụrụ ebe ahụ” ha mara ụlọikwuu ma laghachi Ninive.—2 Eze 19:35, 36.
7. Olee otú ekpere Hana na Jona nwere ike isi kasie anyị obi?
7 Hana, bụ́ nwunye Elkena onye Livaị, tụkwasịkwara Jehova obi mgbe ọ na-echegbu onwe ya n’ihi na ọ mụtabeghị nwa. (1 Sam. 1:9-11, 18) Tupu a napụta Jona onye amụma n’afọ otu nnukwu azụ̀, o kpere ekpere, sị: “N’ahụhụ ka m nọ kpọkuo Jehova, o wee za m. N’afọ Shiol ka m nọ tie mkpu maka enyemaka. Ị nụrụ olu m.” (Jona 2:1, 2, 10) Ọ bụrụ na anyị aghọta na n’agbanyeghị otú nsogbu anyị nwere siruru ike, anyị nwere ike ịkpọku Jehova ma ‘rịọ ya ka o meere anyị amara,’ nke ahụ ga-akasikwa anyị obi.—Gụọ Abụ Ọma 55:1, 16.
8, 9. Gịnị bụ mkpa Hezekaya, Hana, na Jona n’ekpere ha kpere, oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị?
8 Ekpere Hezekaya, Hana, na Jona na-akụzikwara anyị ihe dị oké mkpa, bụ́ ihe anyị na-ekwesịghị ichefu ma anyị kpewe ekpere n’oge ihe ji anyị n’olu. Ha atọ nwere nsogbu mere ka obi ghara ịdị ha mma. Ma, ihe ha kwuru n’ekpere ha gosiri na ihe bụ mkpa ha abụghị naanị ka e wepụrụ ha nsogbu ahụ ka ahụ́ ruo ha ala. Ihe ka ha mkpa bụ ido aha Chineke nsọ, ife ya, na ime uche ya. O wutere Hezekaya nke ukwuu na a na-akọcha aha Jehova. Hana kwere Chineke nkwa na ya ga-enye ya nwa nwoke ahụ ya na-achọsi ike ka o jewere ya ozi n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Jona kwukwara, sị: “M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.”—Jona 2:9.
9 Mgbe anyị na-arịọ ka a napụta anyị ná nsogbu bịaara anyị, ọ dị mma ka anyị chebara ihe anyị bu n’obi echiche. Ihe bụ mkpa anyị ọ̀ bụ naanị ka nsogbu ahụ pụọ anyị n’ahụ́, ka ànyị na-ebu Jehova na nzube ya n’obi? Nsogbu anyị na ya na-alụ nwere ike ime ka anyị na-eche naanị banyere onwe anyị nke na anyị agaghịzi na-eji ihe gbasara ofufe Chineke akpọrọ ihe. Anyị rịọwa Chineke ka o nyere anyị aka, ka anyị buru Jehova n’obi, cheta ido aha ya nsọ, nakwa igosi na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-enye aka mee ka obi sie anyị ike na ihe ga-aka mma, ọ bụrụgodị na e wepụbeghị nsogbu ahụ bịaara anyị. Otú Chineke nwere ike isi zaa ekpere anyị bụ inyere anyị aka idi nsogbu ahụ.—Gụọ Aịzaya 40:29; Ndị Filipaị 4:13.
Mgbe Anyị Chọrọ Ikpebi Ihe Anyị Ga-eme
10, 11. Gịnị ka Jehọshafat mere mgbe nsogbu ọ na-amaghị ihe ọ ga-eme bịaara ya?
10 Olee otú i si ekpebi ihe ị ga-eme n’okwu ndị dị mkpa ná ndụ gị? Ị̀ na-ebu ụzọ kpebie ihe ị ga-eme ma rịọwazie Jehova ka o mee ka ihe ahụ i kpebirila ime gaa nke ọma? Tụlegodị ihe Jehọshafat, bụ́ eze Juda, mere mgbe ndị Moab na ndị Amọn gbakọrọ aka bịa ibuso ya agha. O nweghị ebe Juda ruru ibuso ha agha. Gịnị ka Jehọshafat ga-eme?
11 Baịbụl kwuru, sị: “Egwu wee tụọ Jehọshafat, o wee kpebie ịchọ Jehova.” O kwuru ka Juda dum buo ọnụ, ọ kpọkọtakwara ha “ka ha jụọ Jehova ase.” O biliziri n’etiti ndị Juda na Jeruselem ma kpee ekpere. Ihe ụfọdụ o kwuru bụ: “Chineke anyị, ị́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ha? N’ihi na anyị enweghị ike iguzo n’ihu nnukwu ìgwè mmadụ a na-abịa ibuso anyị agha; anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ gị ka anyị lekwasịrị anya.” Ezi Chineke anyị nụrụ ekpere Jehọshafat ma rụọ ọrụ ebube napụta ha. (2 Ihe 20:3-12, 17) Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme, karịchaa n’okwu gbasara ozi anyị na-ejere Jehova, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị Jehova obi kama ịdabere ná nghọta anyị?
12, 13. Olee ihe dị mma anyị na-amụta n’aka Eze Devid ma anyị mewe mkpebi?
12 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị nwee nsogbu yiri ka ọ gaghị esiri anyị ike imeri, ikekwe, n’ihi na anyị chetara ozugbo otú anyị si merie nke yiri ya n’oge gara aga? Otu ihe a kọrọ banyere Eze Devid ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Mgbe ndị Amalek wakporo obodo Ziklag, ha kpọọrọ ndị nwunye Devid na ụmụ ya nakwa ndị ikom ya. Devid jụrụ Jehova ase, sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a?” Jehova zara ya, sị: “Chụwa ha, n’ihi na ị ga-achụkwu ha, ị ga-anapụtakwa ha ihe niile.” Devid gawara ma “napụta ihe niile ndị Amalek buuru.”—1 Sam. 30:7-9, 18-20.
13 Obere oge ndị Amalek wakpochara Ziklag, ndị Filistia bịara ibuso ụmụ Izrel agha. Devid jụrụ Jehova ase ọzọ, Jehova agwakwa ya ihe ọ ga-eme. Chineke gwara ya, sị: “Gbagoo, n’ihi na m ga-enyeferịrị ndị Filistia n’aka gị.” (2 Sam. 5:18, 19) Obere oge nke a mechara, ndị Filistia bịakwara ọzọ ibuso Devid agha. Gịnị ka ọ ga-eme na nke ugbu a? Ọ̀ ga-echewe, sị: ‘Ụdị ihe a abịatụrụla m ugbo abụọ, ka m gaa buso ndị iro Chineke agha otú m mere n’ugbo abụọ ndị ahụ’? Ka ọ̀ ga-ajụkwa Jehova ihe ọ ga-eme? Devid ejighị otú ihe si gaa ná ndị nke gara aga kpebie ihe ọ ga-eme na nke a. O kpere ekpere ọzọ jụọ Jehova ihe ọ ga-eme. Ọ ga-abụrịrị na obi dị ya ụtọ na o mere otú ahụ! Ihe a gwara ya mee na nke a dị iche. (2 Sam. 5:22, 23) Ọ bụrụ na ihe yiri nke ahụ abịara anyị, anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara iji otú ihe si gaa mgbe ụdị ihe ahụ mere n’oge gara aga kpebie ihe anyị ga-eme.—Gụọ Jeremaya 10:23.
14. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jọshụa na ndị okenye Izrel mere mgbe ndị Gibiọn bịakwutere ha?
14 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị niile, ma ndị okenye jerela ozi ọtụtụ afọ, ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla ịrịọ Jehova ka o duo anyị mgbe anyị na-eme mkpebi. Tụlegodị ihe Jọshụa, onye nọchiri Mozis, na ndị okenye Izrel mere mgbe ndị Gibiọn maara ihe bịakwutere ha ma mee ka hà si ebe dị anya bịa n’Izrel. Jọshụa na ndị ọzọ ajụghị Jehova ase tupu ha ekweta ka ha na ndị Gibiọn mee udo, ha na ha agbaakwa ndụ. N’agbanyeghị na Jehova mechara kwado nkwekọrịta ahụ, ọ hụrụ na ase a ha n’ajụghị ya so n’ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ ka anyị nwee ike jiri ya mụta ihe.—Jọsh. 9:3-6, 14, 15.
Mgbe Anyị Na-agba Mbọ Imeri Ọnwụnwa
15. Kọwaa ihe mere ekpere ji dị mkpa iji merie ọnwụnwa.
15 Ebe anyị nwere “iwu nke mmehie,” anyị kwesịrị iji ike anyị dum na-alụso agụụ Rom 7:21-25) Anyị ga-emerili n’ọgụ a. Olee otú anyị ga-esi emeri? Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ekpere dị oké mkpa iji merie ọnwụnwa. (Gụọ Luk 22:40.) Ọ bụrụgodị na agụụ ime ihe ọjọọ aka na-agụ anyị mgbe anyị kpegachaarala Chineke ekpere, anyị kwesịrị ‘ịna-arịọ Chineke’ ka o nye anyị amamihe anyị ga-eji na-emeri ọnwụnwa a. Obi siri anyị ike na “ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha.” (Jems 1:5) Jems dekwara, sị: “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie.”—Jems 5:14, 15.
ime mmehie ọgụ. (16, 17. Anyị chọwa ka e nyere anyị aka imeri ọnwụnwa, olee mgbe kacha mma ka anyị kpee ekpere?
16 Ekpere dị oké mkpa iji merie ọnwụnwa, ma, anyị kwesịrị ịghọta na ọ dị mkpa ka anyị kpee ekpere n’oge kwesịrị ekwesị. Tụlee ihe a kọrọ banyere otu nwa okorobịa n’akwụkwọ Ilu 7:6-23. Mgbe chi jiwere, ọ nọ na-aga n’okporo ámá n’ụzọ ụlọ nwaanyị na-akwa iko. Nwaanyị a ji ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya rata ya, ya esoro ya na-aga, dị ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya. Gịnị mere nwa okorobịa a ji gawa ebe ahụ? Ebe ọ bụ na ‘o nweghị uche,’ ya bụ, ọ maghị ihe, ọ ga-abụ na agụụ ihe ọjọọ na-agụ ya. (Ilu 7:7) Olee mgbe ekpere gaara akacha abara ya uru? O doro anya na ọ gaara abara ya uru ma a sị na o kpere ekpere ka o merie ọnwụnwa ahụ mgbe ọ hụrụ nwaanyị ahụ. Ma, ọ gaara akacha baara ya uru ma a sị na o kpere ekpere mgbe ọ gbatara ya n’uche ịgawa n’okporo ámá ahụ.
17 Taakwa, nwoke nwere ike ịna-agbalịsi ike ka ọ ghara ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ma, ka e were ya na ọ gara ebe ọ ma na e nwere foto ma ọ bụ vidio ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet. Ọ̀ bụ na ya na nwa okorobịa ahụ a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ Ilu isi 7 abụghị otu? N’eziokwu, o bidola ije ije n’ụzọ ọjọọ. Ihe ga-enyere mmadụ aka ka ọ ghara ikiri ihe na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka mgbe ọ na-agawabeghị ebe ihe ndị ahụ dị n’Ịntanet.
18, 19. (a) Gịnị mere imeri ọnwụnwa ji esi ike, ma olee otú anyị nwere ike isi merie ya? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?
18 Ọ dịghị mfe imeri ọnwụnwa ma ọ bụ ịkwụsị àgwà ọjọọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Anụ ahụ́ na-emegide mmụọ nsọ n’ọchịchọ ya, mmụọ nsọ na-emegidekwa anụ ahụ.” Nke a na-eme ka anyị “ghara ime ihe ndị ahụ [anyị] na-achọ ime.” (Gal. 5:17) Iji merie ọnwụnwa a, anyị kwesịrị ịna-ekpesi ekpere ike mgbe uche anyị gbagawara n’ihe ọjọọ ma mee ihe kwekọrọ n’ekpere anyị. Ka anyị cheta na “ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị [anyị] nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ,” ọ bụrụkwa na Jehova enyere anyị aka, anyị ga-enwe ike ịna-erubere ya isi mgbe niile.—1 Kọr. 10:13.
19 Ma ànyị nwere ihe na-enye anyị nsogbu n’obi, ma ọ bụ na anyị chọrọ ikpebi ihe anyị ga-eme n’okwu dị mkpa, ma ọ bụkwanụ na anyị na-agba mbọ imeri ọnwụnwa, Jehova enyela anyị onyinye magburu onwe ya, nke bụ́ ikpe ekpere. Ikpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka ga-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, bụ́ nke ga na-edu anyị ma na-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Luk 11:9-13) N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike na-atụkwasị Jehova obi ma ghara ịdabere ná nghọta anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 1 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
Ì Chetara?
• Gịnị ka ị mụtara n’aka Hezekaya, Hana, na Jona n’ihe banyere ịtụkwasị Jehova obi?
• Olee otú ihe Devid na Jọshụa mere si gosi na anyị kwesịrị ịkpachara anya ma anyị mewe mkpebi?
• Olee mgbe kacha mma ka anyị kpee ekpere iji merie ọnwụnwa?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 9]
Olee mgbe ikpe ekpere ga-akacha baara mmadụ uru iji merie ọnwụnwa?