Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Iche Nche N’aka Ndịozi Jizọs

Mụta Iche Nche N’aka Ndịozi Jizọs

Mụta Iche Nche N’aka Ndịozi Jizọs

“Sorokwanụ m na-eche nche.”—MAT. 26:38.

1-3. Olee otú ndịozi si ghara iche nche n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, oleekwa ihe gosiri na ha mụtara ihe n’ihe ha mehiere?

WERE ya na ị nọ ya n’abalị ikpeazụ ahụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Jizọs gara ebe ọ na-agakarị, ya bụ, n’ogige Getsemeni nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem. Ọ kpọ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi gaa ebe ahụ. Ebe o nwere ihe na-enye ya nsogbu n’obi, na ihe na-eche ya uche, ọ chọrọ ịnọ ebe naanị ya ga-anọ kpee ekpere.—Mat. 26:36; Jọn 18:1, 2.

2 Ndịozi ya atọ, ya bụ, Pita, Jems, na Jọn, so Jizọs banye n’ime ime ogige ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.” Mgbe ọ gwachara ha ihe a, ọ gawara ebe ọzọ ikpe ekpere. Mgbe ọ lọghachiri, ọ hụrụ ndị enyi ya ka ha nọ n’ezigbo ụra. Ọ gwara ha ọzọ, sị: “Na-echenụ nche.” Ma, ha hidịrị ụra ugbo abụọ ọzọ! Mgbe e mechara n’otu abalị ahụkwa, ndịozi ahụ niile gosiri na ha amụghị anya n’ihe gbasara ozi ha na-ejere Jehova. Ha hapụdịrị Jizọs gbaa ọsọ!—Mat. 26:38, 41, 56.

3 Ndịozi ahụ mechara kwaa mmakwaara na ha echeghị nche n’abalị ahụ. Ndị ikom ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mụtara ihe ozugbo n’ihe ahụ ha mehiere. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gosiri na ha mechara ghọọ ndị e ji ama atụ n’iche nche. Ọ ga-abụrịrị na otú ha si kwesị ntụkwasị obi mere ka Ndị Kraịst ibe ha mewe ka ha. Anyị kwesịrị ịna-eche nche ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Mat. 24:42) Ka anyị tụlee ihe atọ anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi banyere iche nche.

HA MỤ ANYA KA HA MATA EBE HA GA-EKWUSA OZI ỌMA

4, 5. Olee otú mmụọ nsọ si duo Pọl na ndị ibe ya?

4 Otu n’ime ihe ndị anyị ga-amụta bụ na ndịozi ahụ mụ anya ka ha mata ebe ha ga-ekwusa ozi ọma. N’otu ihe a kọrọ na Baịbụl, anyị chọpụtara otú Jizọs si jiri mmụọ nsọ Jehova nyere ya duzie Pọl onyeozi na ndị ibe ya n’otu oge ha na-eme njem pụrụ iche. (Ọrụ 2:33) Ka anyị leba anya n’otú ha si mee njem ahụ.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:6-10.

5 Pọl, Saịlas, na Timoti hapụrụ obodo Listra dị ebe ndịda Galeshia. Ka ụbọchị ole na ole gachara, ha rutere n’otu n’ime okporo ụzọ awara awara nke si Rom gawa n’ebe ọdịda anyanwụ n’ógbè ndị mmadụ kacha biri na ya n’Eshia. Ha chọrọ isi ụzọ ahụ gaa zie ọtụtụ puku ndị mmadụ chọrọnụ ozi ọma banyere Kraịst. Ma, o nwere ihe mere ka ha ghara iru ebe ahụ. Amaokwu 6 sịrị: “Ha gafekwaara Frijia na obodo Galeshia, n’ihi na mmụọ nsọ machibidoro ha iwu ikwu okwu Chineke n’ógbè Eshia.” Mmụọ nsọ gbochiri ndị njem ahụ ikwusa ozi ọma n’ógbè Eshia, ma anyị amaghị otú o si gbochie ha. O doro anya na Jizọs ji ike mmụọ nsọ chọọ iduru Pọl na ndị ibe ya gaa ebe ọzọ.

6, 7. (a) Gịnị mere Pọl na ndị ibe ya mgbe ha rutewere Bitinia? (b) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebiri ime, gịnị mekwara mgbe ha mere ihe ahụ?

6 Olee ebe ndị njem a na-anụ ọkụ n’obi gara? Amaokwu nke 7 sịrị: “Mgbe ha nọkwa na-eru Mishia, ha gbalịrị ịbanye Bitinia, ma mmụọ Jizọs ekweghị ha.” Ebe e gbochiri Pọl na ndị ibe ya ikwusa ozi ọma n’Eshia, ha gawara ebe ugwu, buru n’obi ikwusa ozi ọma n’obodo ndị dị na Bitinia. Ma, mgbe ha rutewere Bitinia, Jizọs jikwa mmụọ nsọ gbochie ha ikwusa ozi ọma ebe ahụ. Ọ ga-abụrịrị na nke ugbu a juru ndị ikom a anya. Ha ma ihe ha ga-ekwusa, mara otú ha ga-esi ekwusa ya, ma ha amaghị ebe ha ga-ekwusa ya. Otú ọzọ anyị nwere ike isi kwuo ya bụ: Ha akụọla aka n’ọnụ ụzọ e si abanye n’Eshia ma e kweghị emepere ha ụzọ. Ha akụọkwala aka n’ọnụ ụzọ e si abanye Bitinia, e kweghịkwa emepere ha ụzọ. Hà kwụsịrị ịkụ aka? Ndị nkwusa a na-anụ ọkụ n’obi agaghị anwa ya anwa!

7 Ugbu a, ndị ikom ahụ kpebiri ime ihe nwere ike iju mmadụ anya ma ya nụ ya. Amaokwu nke 8 gwara anyị, sị: “Ya mere, ha gafeere Mishia gbadata Troas.” Ọ pụtara na ha gawara ebe ọdịda anyanwụ, jiri ụkwụ gaa narị kilomita ise na iri isii na atọ, na-agafe obodo dị iche iche ruo mgbe ha rutere ọdụ ụgbọ mmiri Troas, bụ́ ebe ndị mmadụ na-esi abanye Masedonia. Pọl na ndị ibe ya kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke ugbo atọ n’ebe a, ma na nke ugbu a, e mepeere ha ụzọ, ghewe ya oghe! Amaokwu nke 9 kọrọ ihe ọzọ merenụ, sị: “N’abalị, Pọl hụrụ otu ọhụụ: otu nwoke Masedonia guzo na-arịọsi ya arịrịọ ike, sị: ‘Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.’” Pọl amataziela ugbu a ebe ha ga-ekwusa ozi ọma. Ndị ikom ahụ kwọọrọ ụgbọ mmiri ozugbo gawa Masedonia.

8, 9. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a kọrọ banyere njem Pọl mere?

8 Gịnị ka ihe a merenụ na-akụziri anyị? Cheta na ọ bụ naanị mgbe Pọl tinyewerela isi n’Eshia ka mmụọ Chineke sịrị ya abanyela. Naanị mgbe Pọl rutewerela Bitinia ka Jizọs gwakwara ya ihe ọ ga-eme. Ọ bụkwa mgbe Pọl rutecharala Troas ka Jizọs gwara ya banye na Masedonia. Ebe Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ ya, o nwere ike ime anyị ihe yiri nke ahụ. (Kọl. 1:18) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị nọ na-eche otú ị ga-esi ghọọ onye ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ otú ị ga-esi kwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ma, o nwere ike bụrụ naanị mgbe i bidocharala ime ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọ ọsụ ụzọ oge niile ka Jizọs ga-eji mmụọ nsọ duzie gị. Iji maa atụ: Ọkwọ ụgbọala nwere ike iduzi ụgbọala ya ka ọ gaa aka ekpe ma ọ bụ aka nri, ma, ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na ụgbọala ahụ na-agba agba. Ọ bụkwa otú ahụ ka Jizọs nwere ike isi duzie anyị ịna-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma naanị ma ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike ime otú ahụ.

9 Ma, ọ́ bụrụkwanụ na i melighị ya ozugbo n’agbanyeghị mbọ niile ị gbara? Ì kwesịrị ikwe ka ike gwụ gị, na-ewere ya na mmụọ Chineke ekweghị ka i mee ya? Echefula na Pọl nwekwara ihe ndị dọlara ya azụ n’ozi ọma ọ chọrọ ikwusa. Ma, ọ kwụsịghị ịna-achọ na ịna-akụ aka n’ọnụ ụzọ ruo mgbe e mepeere ya ụzọ. Ọ bụrụ na ị kwụsịghị ịna-achọ “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ,” e nwekwara ike ime ka i nweta ihe ị na-achọ.—1 Kọr. 16:9.

HA MỤ ANYA KA HA WEE NA-EKPE EKPERE

10. Olee ihe gosiri na ekpere ga-enyere anyị ezigbo aka ịna-eche nche?

10 Ka anyị tụlezie ihe nke abụọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ya bụ: Ha mụ anya ka ha wee na-ekpe ekpere. (1 Pita 4:7) Ịna-ekpesi ekpere ike ga-enyere anyị ezigbo aka ịna-eche nche. Cheta na n’ogige Getsemeni, obere oge tupu a nwụchie Jizọs, ọ gwara mmadụ atọ n’ime ndịozi ya, sị: “Na-echenụ nche ma na-ekpe ekpere mgbe niile.”Mat. 26:41.

11, 12. Gịnị mere Herọd ji mesoo Pita na Ndị Kraịst ndị ọzọ mmeso ọjọọ, oleekwa otú o si mee ya?

11 Pita, bụ́ onye so na ndị nọ oge ihe a mere, mechara chọpụta n’onwe ya otú ikpesi ekpere ike si enye aka. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 12:1-6.) N’amaokwu ndị mbụ nke Ọrụ Ndịozi isi iri na abụọ, anyị hụrụ na Herọd mesowere Ndị Kraịst mmeso ọjọọ iji mee ka obi dị ndị Juu mma. Ọ ga-abụ na ọ ma na Jems bụ onyeozi nke ya na Jizọs kpachiri anya. Ọ bụ ihe mere Herọd ji jiri “mma agha” gbuo Jems. (Amaokwu nke 2) Otú a ka onyeozi a ọgbakọ hụrụ n’anya si nwụnahụ ha. Ihe a merenụ bụ ezigbo ule nke bịaara ụmụnna ndị fọrọnụ!

12 Gịnị ọzọ ka Herọd mere? Amaokwu nke 3, sịrị: “Ebe ọ hụrụ na ọ dị ndị Juu mma, o jidekwuru Pita.” Ma, o nwere mgbe a tụrụ ndịozi mkpọrọ ha apụta otú juru ndị mmadụ anya, Pita sokwa ná ndịozi ahụ. (Ọrụ 5:17-20) Ọ ga-abụ na Herọd ma banyere akụkọ a. Onye ọchịchị a dị akọ sara anya ná mmiri n’oge a. O nyefere Pita n’aka “ìgwè ndị agha anọ dị mmadụ anọ anọ bụ́ ndị na-agbanwerịta onwe ha iche ya nche, ebe o bu n’uche ịkpọpụtara ya ndị Juu ma ememme ngabiga gasịa.” (Amaokwu nke 4) Ị̀ hụtụla ebe ụdị ihe a mere? Herọd mere ka e kee Pita ụdọ ígwè abụọ, ya anọrọ n’agbata ndị agha abụọ, e nweekwa ndị nche iri na isii bụ́ ndị na-agbanwerịta ibe ha n’ehihie na n’abalị iji hụ na onyeozi a esighị n’ụlọ mkpọrọ ahụ gbapụ. Ihe Herọd bu n’uche bụ ịkpọpụtara ndị Juu Pita ma ememme ngabiga gasịa, gbuokwa ya ka obi dị ìgwè ndị Juu ahụ ụtọ. Olee ihe ụmụnna Pita ga-eme n’oge a tara akpụ?

13, 14. (a) Gịnị ka ọgbakọ mere mgbe a tụrụ Pita mkpọrọ? (b) Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe ụmụnna Pita mere n’okwu gbasara ekpere?

13 A naghị ajụ ajụ ma ọgbakọ Ndị Kraịst hà ma ihe ha kwesịrị ime. Amaokwu nke 5 sịrị: “N’ihi ya, e debere Pita n’ụlọ mkpọrọ; ma ọgbakọ ahụ nọ na-ekpekusi Chineke ekpere ike maka ya.” Ha kpesiri ekpere ike maka nwanna ha ha hụrụ n’anya, ya bụ, ha si n’ala ala obi ha rịọsie arịrịọ ike. Ihe ọ pụtara bụ na ogbugbu e gburu Jems emeghị ka ha gharazie inwe olileanya; o meghịkwa ka ha were na ekpere anaghị akpa ike. Kama nke ahụ, ha ma na Jehova anaghị eji ekpere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi egwu egwu. Ọ na-aza ekpere ha ma ọ bụrụ na ha rịọrọ ya ihe kwekọrọ n’uche ya.—Hib. 13:18, 19; Jems 5:16.

14 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ụmụnna Pita mere? Anyị mụtara na otú anyị ga-esi na-eche nche abụghị naanị ịrịọ Chineke ka o nye anyị ihe na-akpa anyị, kama, ịna-ekpekwa ekpere ka o nyere ụmụnna anyị aka. (Efe. 6:18) Ò nwere ụmụnna ndị ị ma nwere ule ndị ha na ha na-alụ? Ụfọdụ nwere ike ịna-edi mkpagbu a na-akpagbu ha, ma ọ bụ iwu ndị ọchịchị machibidoro ha, ma ọ bụkwanụ ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọ́ gaghị adị mma ma i si n’ala ala obi gị rịọ Chineke ka o nyere ha aka? I nwere ike ịma ụfọdụ ụmụnna ndị na-enwe ụdị ihe isi ike ndị ọzọ na-anaghị achọpụta ngwa ngwa. Ha nwere ike ịna-enwe nsogbu ezinụlọ, ma ọ bụ daa mbà n’obi, ma ọ bụkwanụ na-arịa ọrịa. Gbalịa na-akpọ ụfọdụ ndị ị ma nwere nsogbu ndị a aha mgbe ị na-ekpeku “Onye na-anụ ekpere,” bụ́ Jehova, ekpere?—Ọma 65:2.

15, 16. (a) Kọwaa otú mmụọ ozi Jehova si napụta Pita n’ụlọ mkpọrọ. (Lee foto dị n’okpuru ebe a.) (b) Olee otú ịtụgharị uche n’otú Jehova si napụta Pita si akasi anyị obi?

15 Ma, olee otú ihe sizi gaara Pita? N’abalị ga-abọta ụbọchị a ga-esi n’ụlọ mkpọrọ kpọpụtara ndị Juu Pita, mgbe Pita nọ na-ehi ezigbo ụra n’agbata ndị nche abụọ na-eche ya nche, o nwere ihe ndị merenụ tụrụ Pita n’anya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 12:7-11.) Legodị ihe merenụ: N’otu ntabi anya, ìhè nwuru n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Otu mmụọ ozi guzo ebe ahụ, kpọtee Pita, gwa ya ka o bilie ọsọ ọsọ, ma o doro anya na ndị nche ahụ ahụghị mmụọ ozi ahụ. Agbụ ígwè ndị ahụ e kere ya n’aka ji aka ha dapụ! Mmụọ ozi ahụ duziiri Pita pụọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, gafere n’akụkụ ndị nche guzo n’èzí, gaferekwa ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee, bụ́ nke meghekwaara ha “n’onwe ya.” Ozugbo ha si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụta, a hụghịzi mmụọ ozi ahụ. Otú ahụ ka Pita si nwere onwe ya.

16 Okwukwe anyị na-esikwu ike ka anyị na-atụgharị uche n’otú Jehova si eji ike ya anapụta ndị ohu ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị anaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube iji napụta anyị ná nsogbu. Ma, obi siri anyị ike na o ji ike ya enyere ndị ya aka taa. (2 Ihe 16:9) O nwere ike iji mmụọ nsọ ya dị ike mee ka anyị nwee ike idi ule ọ bụla bịaara anyị. (2 Kọr. 4:7; 2 Pita 2:9) N’oge na-adịghịkwa anya, Jehova ga-enye Ọkpara ya ike ime ka ọtụtụ nde ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, bụ́ ndị e nwere ike ịsị na ọnwụ tụrụ mkpọrọ, si n’ọnwụ bilie. (Jọn 5:28, 29) Okwukwe anyị nwere na nkwa niile Chineke kwere ga-emezu nwere ike ime ka obi kaa anyị idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị taa.

ỊGBA ÀMÀ NKE ỌMA N’AGBANYEGHỊ NSOGBU NDỊ ANYỊ NA-ENWE

17. Olee otú Pọl si bụrụ onye e ji ama atụ n’iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma na ikwusa ya otú na-egosi na ọ ma na oge agwụla agwụ?

17 Ihe nke atọ anyị ga-amụta n’aka ndịozi banyere iche nche bụ: Ha akwụsịghị ịgba àmà nke ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị ha nwere. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma na ịna-ekwusa ya ngwa ngwa ga-enyere anyị ezigbo aka ịna-eche nche. Pọl onyeozi bụ onye e ji ama atụ n’ikwusa ozi ọma. O ji ịnụ ọkụ n’obi zie ozi ọma, gaa ọtụtụ ebe, hiwekwa ọtụtụ ọgbakọ. Ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ma o nweghị mgbe o kwere ka ha mee ka ọ kwụsị ịna-anụ ọkụ n’obi ma ọ bụ chefuo na oge ikwusa ozi ọma agwụla agwụ.—2 Kọr. 11:23-29.

18. Olee otú Pọl si nọsie ike na-ezi ozi ọma mgbe a kpọchiri ya na Rom?

18 Ka anyị tụlee ebe ikpeazụ a kọrọ banyere Pọl n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ya bụ, n’Ọrụ Ndịozi isi 28. Pọl eruola Rom, bụ́ ebe ọ ga-anọ zara ọnụ ya n’ihu Nero. A kpọchiri ya mgbe o ruru ebe ahụ, ikekwe e kedoro agbụ ígwè e kere ya n’aka onye na-eche ya nche. Ma, e nweghị agbụ ígwè ga-akwụsịli onyeozi a na-anụ ọkụ n’obi ikwusa ozi ọma! Pọl nọ na-echeta ụzọ dị iche iche ọ ga-esi na-ekwusa ozi ọma. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 28:17, 23, 24.) Mgbe abalị atọ gachara, Pọl kpọkọtara ndị isi ndị Juu ka o zie ha ozi ọma. N’ụbọchị ya na ha yiri, o zidịrị ha ozi ọma karịa ka o ziburu. Amaokwu 23 sịrị: “Ya na ha [ya bụ, ndị Juu] wee yie otu ụbọchị, ha bịakwutekwara ya n’ebe obibi ya n’ọnụ ọgụgụ ka ukwuu. O wee kọwaara ha okwu ahụ site n’ịgba àmà nke ọma banyere alaeze Chineke, sitekwa n’iwu Mozis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma ọ gwara ha okwu na-eru n’obi banyere Jizọs, malite n’ụtụtụ ruo anyasị.”

19, 20. (a) Gịnị mere ozi ọma Pọl ziri ndị mmadụ ji ruo ha n’obi? (b) Gịnị ka Pọl mere mgbe ụfọdụ ndị na-anabataghị ozi ọma o ziri ha?

19 Gịnị mere ozi ọma Pọl ziri ndị mmadụ ji ruo ha n’obi? Ị̀ chọpụtara na amaokwu nke 23 gwara anyị ihe ndị a? (1) Ozi ya hiwere isi n’Alaeze Chineke nakwa na Jizọs Kraịst. (2) Ọ gbalịrị ịgwa ndị na-ege ya ntị “okwu na-eru n’obi.” (3) O mere ka ha na ya tụgharịa uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (4) Ọ chọghị naanị ọdịmma ya, kama, o kwusara ozi ọma “malite n’ụtụtụ ruo anyasị.” Pọl zisiri ozi ọma ike, ma, ọ bụghị mmadụ niile nabatara ihe o ziri. Amaokwu nke 24 sịrị: “Ụfọdụ ndị malitekwara ikwere ihe ndị a na-ekwu; ndị ọzọ ekweghị.” Ebe ọ bụ na ha ekwekọrịtaghị, ha malitere ịpụ.

20 Ike ọ̀ gwụrụ Pọl maka na ọ bụghị mmadụ niile nabatara ihe o ziri? N’ebeekwanụ? Ọrụ Ndịozi 28:30, 31, gwara anyị, sị: “Ọ nọgidere ruo afọ abụọ zuru ezu n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya, ọ na-ejikwa obiọma anabata ndị niile bịakwutere ya, jiri oké nkwuwa okwu na-ekwusara ha alaeze Chineke, na-ezikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’enweghị ihe mgbochi.” Ọ bụ okwu ndị a na-agba ume ka e ji pịachie akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, bụ́ nke e ji ike mmụọ nsọ dee.

21. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Pọl mere mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya?

21 Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Pọl? Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya, a naghị ekwe ya kwusaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma, ọ kwụsịghị ịna-enwe ọṅụ, kama, o kwusaara ndị niile bịara ileta ya ozi ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị ohu Chineke taa. N’agbanyeghị na a na-ekpe ha ikpe na-ezighị ezi tụọ ha mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere, ha na-enwe ọṅụ ma na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya anaghị apụ apụ n’ụlọ ha, ikekwe, biridị n’ebe a na-elekọta ndị agadi n’ihi nká ma ọ bụ ọrịa. Ha na-ezi ndị dọkịta, ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ, ndị bịara ileta ha, na ndị ọzọ na-abịa ebe ahụ, ozi ọma otú ike kwere ha. Ha chọsiri ike ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ha na-eme ihe anyị kwesịrị iṅomi!

22. (a) Olee ihe e wepụtara nke ga-enyere anyị aka irite uru n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? (Gaa n’igbe dị n’elu.) (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime ka ị na-eche ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a?

22 O doro anya na n’okwu gbasara iche nche, e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ndịozi Jizọs nakwa n’aka Ndị Kraịst ndị ọzọ dịrị ndụ na narị afọ mbụ, bụ́ ndị a kpọrọ aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Ka anyị na-eche mgbe usoro ihe ochie a ga-agwụ, ka anyị kpebisie ike iṅomi Ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ, bụ́ ndị ji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi gbaa àmà. Ka ọ dị ugbu a, o nweghị ihe ùgwù anyị nwere nke karịrị ‘ịna-agba àmà nke ọma’ banyere Alaeze Chineke!—Ọrụ 28:23.

GỊNỊ KA Ị MỤTARA BANYERE:

․․․․․

Ịmụ anya ka ị mata ebe ị ga-ekwusa ozi ọma?

․․․․․

Ịmụ anya ka i wee na-ekpe ekpere?

․․․․․

Ịgba àmà nke ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị ị na-enwe?

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Igbe dị na peeji nke 13]

“AGHỌTAKWUOLA M URU AKWỤKWỌ ỌRỤ NDỊOZI BARA”

Mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị gụchara akwụkwọ ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke,’ o kwuru otú obi dị ya, sị: “Aghọtakwuola m uru akwụkwọ Ọrụ Ndịozi bara.” Ọ gụchaala akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ọtụtụ mgbe, ma, ọ bụ ugbu a ọ gụchara akwụkwọ ọhụrụ a ka ọ chọpụtara na ihe e dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi baara ya uru karịa otú o cheburu.

[Foto dị na peeji nke 12]

Otu mmụọ ozi duuru Pita gafee n’ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee