Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Ndị Ezinụlọ Ha Na-abụghị Ndị Kraịst Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ

Ndị Kraịst Ndị Ezinụlọ Ha Na-abụghị Ndị Kraịst Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ

Ndị Kraịst Ndị Ezinụlọ Ha Na-abụghị Ndị Kraịst Nwere Ike Inwe Obi Ụtọ

“Olee otú i si mara na ị gaghị azọpụta [di gị ma ọ bụ nwunye gị]?”—1 KỌR. 7:16.

LEE MA Ị̀ GA-ACHỌTALI AZỊZA AJỤJỤ NDỊ A?

․․․․․

Gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ime iji hụ na udo dị n’ezinụlọ e nwere ndị bụ́ Ndị Kraịst na ndị na-abụghị Ndị Kraịst?

․․․․․

Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi nye aka ka ndị ezinụlọ ya na-abụghị Ndị Kraịst ghọọ Ndị Kraịst?

․․․․․

Gịnị ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji nyere ụmụnna ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst aka?

1. Gịnị nwere ike ime n’ezinụlọ ma ọ bụrụ na e nwee onye n’ime ha natara eziokwu?

N’OTU oge Jizọs zipụrụ ndịozi ya, ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:1, 7) Ozi ọma a ga-eme ka ndị ji obi ha dum nabata ya nwee udo na obi ụtọ. Ma, Jizọs gwakwara ndịozi ya na ọtụtụ ndị agaghị achọ iji ntị anụ ozi Alaeze ahụ. (Mat. 10:16-23) Ụdị ihe a na-akacha ewute ewute ma ọ bụrụ ndị ezinụlọ Onye Kraịst jụrụ ige ntị n’ozi Alaeze ahụ.—Gụọ Matiu 10:34-36.

2. Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị abụghị Ndị Kraịst?

2 Nke a ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst enweghị ike inwe obi ụtọ? Mbanụ! Ọ bụ eziokwu na ezinụlọ ụfọdụ na-akpagbu ndị ezinụlọ ha bụ́ Ndị Kraịst, ọ bụghị ha niile na-eme otú ahụ. Ihe ọzọkwa bụ na mkpagbu a na-akpagbu ụfọdụ ndị n’ezinụlọ ha anaghị adịte aka. Ma, n’agbanyeghị otú e si akpagbu anyị, anyị nwere ike inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ndị ezinụlọ anyị na-akpagbu anyị ma ọ bụ mgbe ha na-enweghị mmasị n’eziokwu ahụ. E wezụgakwa nke ahụ, Jehova na-agọzi ndị kwụsiri ike n’akụkụ ya, ọ na-emekwa ka ha na-enwe ọṅụ n’oge ha nwere nsogbu. Ndị Kraịst nwere ike inwekwu obi ụtọ ma ha (1) na-agbasi mbọ ike ka ha na ndị ezinụlọ ha dịrị n’udo nakwa ma ha (2) jiri obi ha dum na-agbalị inyere ndị ezinụlọ ha aka ịghọ Ndị Kraịst.

HỤ NA GỊ NA NDỊ EZINỤLỌ UNU DỊ N’UDO

3. Gịnị mere Onye Kraịst ji kwesị ịhụ na ya na ndị ezinụlọ ya na-abụghị Ndị Kraịst dị n’udo?

3 Mkpụrụ nke ezi omume ga-enwe ike ịmị n’ezinụlọ ma ọ bụrụhaala na udo dị n’ezinụlọ. (Gụọ Jems 3:18.) Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ Onye Kraịst aghọbeghị Ndị Kraịst, Onye Kraịst ahụ ga-agbarịrị mbọ ka ya na ndị ezinụlọ ya dịrị n’udo. Olee otú ọ ga-esi eme nke a?

4. Olee ihe Ndị Kraịst nwere ike ịna-eme obi eruo ha ala?

4 Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na obi ruru ha ala. Obi ga-eru ha ala ma ọ bụrụ na ha esi n’ala ala obi kpee ekpere ka Chineke nye ha udo na-enweghị atụ, ya bụ, “udo nke Chineke.” (Fil. 4:6, 7) Mmadụ ga-enwe obi ụtọ na udo ma ọ mụọ banyere Jehova ma na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mgbe niile. (Aịza. 54:13) Ihe ọzọ ga-eme ka mmadụ nwee udo na obi ụtọ bụ ịna-aga ọmụmụ ihe na iji ịnụ ọkụ n’obi na-aga ozi ọma. Onye Kraịst ndị ezinụlọ ya na-abụghị Ndị Kraịst ka nwere ike ime ihe ndị a. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Enza, * onye di ya na-etikarị ihe. Ọ na-aga ozi ọma ma ya rụchaa ọrụ ndị dịịrị ya n’ụlọ. Enza sịrị: “Jehova na-agọzi m nnọọ mgbe ọ bụla m gbara mbọ gaa zie ndị ọzọ ozi ọma.” Otú Jehova si agọzi ya mere ka o nwee udo na obi ụtọ, meekwa ka obi ruo ya ala.

5. Olee nsogbu Ndị Kraịst ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst na-enwekarị, oleekwa ihe nwere ike inyere ha aka imeri nsogbu ndị ahụ?

5 Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndị Kraịst dịrị n’udo. Nke a nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ n’ihi na ha nwere ike ịchọ ka anyị mee ihe Baịbụl sị anyị emela. Ọ bụrụ na anyị anọsie ike na-eme ihe ziri ezi, ụfọdụ n’ime ha nwere ike iwesa anyị iwe, ma anyị na ha ga-emechakwa dịrị n’udo. Ma, ọ bụrụ na anyị esiwe ọnwụ na anyị agaghị eme ihe ha chọrọ ka anyị mee n’agbanyeghị na Akwụkwọ Nsọ akatọghị ihe ahụ, o nwere ike ime ka anyị na ha sewe okwu n’ihi ihe na-enweghị isi. (Gụọ Ilu 16:7.) Mgbe e nyewere anyị nsogbu, anyị kwesịrị ime ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche gwara anyị n’akwụkwọ anyị ka anyị mee, nke sikwa na Baịbụl. Anyị kwesịkwara ime ihe ndị okenye ga-eji Baịbụl gwa anyị ka anyị mee.—Ilu 11:14.

6, 7. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị ji akpagbu ndị ezinụlọ ha Ndịàmà Jehova bidoro ịmụrụ Baịbụl? (b) Olee ihe onye a na-amụrụ ihe ma ọ bụ Onye Kraịst kwesịrị ime ma ndị ezinụlọ ya kpagbuwe ya?

6 Anyị na ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịdị n’udo ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi ma ghọta ihe mere obi ji dị ha otú ọ dị ha. (Ilu 16:20) Ndị ka malitere ịmụ Baịbụl amalite nwedịrị ike igosi na ha ghọtara otú obi dị ndị ezinụlọ ha. Ụfọdụ ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-abụghị Ndị Kraịst nwere ike ikwe ka nwunye ha ma ọ bụ di ha mụwa Baịbụl. Ha nwedịrị ike ikwu na ọ ga-abara ndị ezinụlọ ha uru. Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụwapụ isi. Esther, onye bụ́ Onyeàmà ugbu a, kwuru na ezigbo iwe bịara ya mgbe di ya na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl. O kwuru ihe ọ na-eme di ya. Ọ sịrị: “Ma mụ etufughị akwụkwọ ndị o ji amụ ihe mụ akpọọ ha ọkụ.” Howard, bụ́ onye sogbuburu nwunye ya mgbe o bidoro ịmụ Baịbụl, sịrị: “Ihe na-abụ ụjọ ọtụtụ ndị di bụ na ha chere na a ghọgbuola nwunye ha ka ha kpewe okpukpe ọzọ. O nwere ike di ahụ amaghị ihe ọ ga-eme eme n’okwu a, o nwekwara ike ime ka o wesawa nwunye ya iwe.”

7 E kwesịrị inyere onye a na-amụrụ ihe aka, bụ́ onye di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enye nsogbu, ka ọ ghọta na ihe ọ ga-eme abụghị ịkwụsị ịmụ Baịbụl. Ihe na-emekarị ka udo dịrị bụ ma onye ahụ na-amụ ihe dịrị nwayọọ ma na-akwanyere di ya ma ọ bụ nwunye ya ahụ na-enye ya nsogbu ùgwù. (1 Pita 3:15) Howard sịrị, “Obi dị m ụtọ na nwunye m medara obi ma ghara iwesawa m iwe!” Nwunye ya sịrị: “[Di m] gwara m ka m kwụsị ịmụ Baịbụl. Ọ sịrị na a kọjuola m isi. Kama ịrụwa ya ụka, agwara m ya na ihe o kwuru nwere ike ịbụ eziokwu, ma m gwakwara ya na n’eziokwu, amaghị m otú o si bụrụ na a kọjuola m isi. M gwaziri ya ka ọ gụgodị akwụkwọ ahụ m na-amụ. Ọ gụrụ ya, kwetakwa na ihe ọ gụtara bụ eziokwu. Nke a mere ka ọ gbanwee otú o si eme.” Anyị kwesịrị icheta na di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onye Kraịst nwere ike iche na nwunye ya ma ọ bụ di ya bụ́ Onye Kraịst ahapụla ya. Ụjọ nwekwara ike ijide ya ma ọ hapụ ụlọ ha gawa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ Ndị Kraịst na-eme. Ma, ọ bụrụ na anyị emee ka obi sie ha ike na anyị anaghị ahapụ ha, o nwere ike ime ka ha kwụsị ịtụ ụdị ụjọ ahụ.

NYERE HA AKA ỊGHỌ NDỊ KRAỊST

8. Olee ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndị Kraịst?

8 Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ghara ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha naanị n’ihi na ọ bụghị Onye Kraịst. * (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:12-16.) Ọ bụrụ na Onye Kraịst eburu n’obi na di ma ọ bụ nwunye ya nwere ike ịghọ Onye Kraịst otu ụbọchị, nke ahụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na di ya ma ọ bụ nwunye ya aghọbeghị Onye Kraịst. Ma, ka anyị na-agbalị inyere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị aka ka ọ ghọọ Onye Kraịst, o nwere ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya na ya. Ahụmahụ ndị anyị na-aga ịkọ ugbu a ga-eme ka nke a doo anya.

9. Mgbe anyị na-agwa di anyị ma ọ bụ nwunye anyị eziokwu ndị si na Baịbụl, gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya na ya?

9 Obi tọgburu Jason atọgbu mgbe mbụ ọ nụrụ eziokwu si na Baịbụl. Ọ sịrị: “Achọrọ m ịkọrọ ya onye ọ bụla!” Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ Baịbụl achọpụta na ihe a na-akụziri ya bụ eziokwu, otú obi si tọọ ya ụtọ nwere ike ime ka ọ chọọ ịna-ekwu gbasara ya mgbe niile. O nwere ike tụwa anya ka ndị ezinụlọ ya na-abụghị Ndị Kraịst nabata ozi ọma Alaeze ahụ ozugbo, ma e nwere ike ha agaghị achọ iji ntị anụ ya. Olee otú obi dị nwunye Jason n’ihi otú di ya si na-anụ ọkụ n’obi? Nwunye ya sịrị, “Ọ na-eji ozi ọma ya enye m nsogbu.” Otu nwaanyị, bụ́ onye natara eziokwu afọ iri na asatọ ka di ya natachara eziokwu, sịrị na ya na-aka aghọta ihe a na-akụziri ya ma e jiri nwayọọ nwayọọ na-akụzi ya.” Ọ bụrụ na ị na-eduziri onye di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enweghị mmasị n’eziokwu ahụ ọmụmụ Baịbụl, ọ ga-adị mma ma gị na onye ahụ ị na-amụrụ ihe na-amụgharị otú ọ ga-esi jiri akọ na-enyere di ya ma ọ bụ nwunye ya aka inwe mmasị n’eziokwu ahụ. Mozis kwuru, sị: “Ntụziaka m ga na-atasị dị ka mmiri ozuzo, okwu m ga na-adasị dị ka igirigi, dị ka mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa.” (Diut. 32:2) Okwu ole na ole si na Baịbụl nke anyị kwuru otú kwesịrị ekwesị ga-aka eru mmadụ n’obi karịa ọtụtụ okwu.

10-12. (a) Olee ndụmọdụ Pita onyeozi nyere Ndị Kraịst di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndị Kraịst? (b) Olee otú otu onye na-amụ Baịbụl si mee ihe Pita dụrụ n’ọdụ na 1 Pita 3:1, 2?

10 Pita onyeozi si n’ike mmụọ nsọ gwa Ndị Kraịst bụ́ nwunye, bụ́ ndị di ha na-abụghị Ndị Kraịst, otú ha kwesịrị isi na-emeso di ha. O dere, sị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.” (1 Pita 3:1, 2) Nwaanyị nwere ike ime ka di ya ghọọ Onye Kraịst ma ọ bụrụ na yanwa ana-edo onwe ya n’okpuru di ya, na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu, ọ bụrụgodị na di ya na-esogbu ya. Di bụ́ Onye Kraịst nwekwara ike ime ka nwunye ya ghọọ Onye Kraịst ma yanwa na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ ma bụrụ onyeisi ezinụlọ nke hụrụ ezinụlọ ya n’anya n’agbanyeghị ma nwunye ya ọ̀ na-emegide ya.—1 Pita 3:7-9.

11 Ọtụtụ Ndị Kraịst taa na-eme ihe a Pita kwuru. Nke a emeekwala ka anyị mata na ihe ahụ o kwuru na-aba uru. Selma bụ otu n’ime ha. Mgbe ya na Ndịàmà bidoro ịmụ Baịbụl, obi adịghị di ya, bụ́ Steve, mma. Steve kwuru, sị, “Iwe were m, achọghị m ịhụ ka nwunye m na onye ọzọ nọ, ụjọ ji m na ọ ga-ahapụ m.” Selma kwuru, sị: “Tupudị mụ anata eziokwu, m na-akpachara anya n’ihe ọ bụla m na-ekwu na n’ihe ọ bụla m na-eme. Di m bụ onye iwe ọkụ. Mgbe m bidoro ịmụ Baịbụl, iwe ọkụ ya bịara ka njọ.” Gịnị mere ka ọ kwụsị ịna-ewe iwe ọkụ?

12 Selma chetara otu ihe Onyeàmà mụụrụ ya ihe kụziiri ya mgbe ọ na-amụrụ ya ihe. Selma sịrị, “O nwere otu ụbọchị m na-achọghị ka ọ mụọrọ m ihe. N’abalị bọtara ụbọchị ahụ, di m tiri m ihe ka m na-agbalị ime ka o kweta n’otu ihe mụ na ya na-akpa, obi jọrọ m njọ mụ emetewere onwe m ebere. Mgbe m kọchaara nwanna nwaanyị ahụ ihe merenụ na otú obi dị m, ọ gwara m ka m gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4-7. Ka m gụchara ya, ihe m malitere ịtụgharị n’uche m bụ, ‘Di m anatụdịghị egosi m ụdị ịhụnanya ebe a kwuru ka mmadụ na-egosi ibe ya.’ Ma, nwanna nwaanyị ahụ jụrụ m ajụjụ mere ka m kwụsị iche otú ahụ. Ọ jụrụ m, sị, ‘Ole n’ime ụzọ ndị a e si egosi ịhụnanya ka i sitụrụla gosi di gị na ị hụrụ ya n’anya?’ M zara ya, sị, ‘O nwebeghị, n’ihi na ọ na-esi ike imete ya mma.’ Nwanna nwaanyị ahụ jizi nwayọọ sị m, ‘Selma, olee onye n’ime unu nke na-achọ ịghọ Onye Kraịst? Ọ̀ bụ gịnwa ka ọ̀ bụ di gị?’ Mgbe m ghọtara na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ele ihe anya, ekpere m ekpere rịọ Jehova ka o nyere m aka ịhụkwu di m n’anya. Di m bịara jiri nwayọọ nwayọọ na-agbanwe.” Mgbe afọ iri na asaa gachara, Steve ghọrọ Onye Kraịst.

OTÚ NDỊ ỌZỌ NWERE IKE ISI NYE AKA

13, 14. Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi nyere Ndị Kraịst ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst aka?

13 Otú ahụ mmiri na-avụsị avụsị si ede ala ka ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ sikwa enye aka eme ka Ndị Kraịst ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ. Elvina, onye bi na Brazil, sịrị: “Ihe nyeere m aka ịnọsi ike n’eziokwu bụ otú ụmụnna m si hụ m n’anya.”

14 Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ egosi onye na-abụghị Onye Kraịst obiọma, bụ́ onye ndị ezinụlọ ya bụ Ndị Kraịst, gosikwa na ihe gbasara ya na-emetụ ha n’obi, obi onye ahụ nwere ike ịgbanwe. Otu nwoke nke bi na Naịjirịa, onye natara eziokwu afọ iri na atọ nwunye ya natachara eziokwu, kwuru, sị: “Ka mụ na otu Onyeàmà Jehova ji ụgbọala ya na-eme njem, ụgbọala ya mebiri. Ọ chọtara Ndịàmà Jehova ibe ya n’otu obodo anyị na ha gbara agbata obi, ha nyekwara anyị ebe anyị hiri ụra n’abalị ahụ. Ha lere anyị ọbịa nke ọma ka à ga-asị na anyị na ha ma kemgbe anyị dị obere. Ozugbo ahụ ka m bidoro hụwa otú Ndị Kraịst si ahụ ibe ha n’anya, bụ́kwanụ ihe nwunye m gwawara m kemgbe.” N’Ingland, otu nwaanyị, bụ́ onye natara eziokwu afọ iri na asatọ ka di ya natachara eziokwu, kwuru, sị: “Ndịàmà na-akpọkarị mụ na di m oriri. Ha na-eme ka ahụ́ ruo m ala.” * Otu di bikwa n’Ingland, bụ́ onye mechara ghọọ Onyeàmà, sịrị: “Ma ụmụnna abịaghị leta anyị n’ụlọ anyị ha akpọọ anyị ka anyị bịa na nke ha, achọpụtakwara m na ha ma otú e si elekọta mmadụ. M kacha chọpụta nke a mgbe m nọ n’ụlọ ọgwụ, ọtụtụ n’ime ha abịa leta m.” Ì nwere ike icheta ụzọ ndị i nwere ike isi gosi ndị onye ezinụlọ ha bụ Onye Kraịst na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi?

15, 16. Gịnị nwere ike inyere Onye Kraịst aka ka obi ghara ịna-ajọ ya njọ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ya achọghị ịghọ Ndị Kraịst?

15 O doro anya na ọ bụghị ndị niile nọ n’ezinụlọ Onye Kraịst na-aghọ Ndị Kraịst, n’agbanyeghị na Onye Kraịst ahụ na-akpa ezigbo àgwà ma jiri akọ na-agbara ha àmà ruo ọtụtụ afọ. E nwedịrị ụfọdụ n’ime ha ndị na-anatụdịghị ekwe ekwe, nweekwa ndị nke na-enye nsogbu n’akwụsịghị akwụsị. (Mat. 10:35-37) Ma, ọ bụrụ na Ndị Kraịst ana-akpa àgwà e ji mara ndị na-efe Chineke, ihe nwere ike imecha gbanwee. Otu onye bụ́bu di na-ekweghị ekwe, sịrị: “Ị gaghị ama ihe na-aga n’uche na n’obi onye na-ekweghị ekwe ka ọ na-ahụ ka di ma ọ bụ nwunye ya bụ́ Onye Kraịst na-akpa àgwà ndị ahụ magburu onwe ha. N’ihi ya, ike agwụkwala gị ka ị na-agbalị inyere di gị ma ọ bụ nwunye gị na-abụghị Onye Kraịst aka.”

16 Ọ bụrụgodị na onye ezinụlọ nke Onye Kraịst ekweghị aghọ Onye Kraịst, Onye Kraịst ahụ ka nwekwara ike ịna-enwe obi ụtọ. E nwere otu nwanna nwaanyị di ya na-ekweghị anabata ozi ọma Alaeze ahụ kemgbe iri afọ abụọ na otu nwanna nwaanyị ahụ gbawara mbọ inyere ya aka. Nwanna nwaanyị ahụ, sịrị: “M na-enwe ọṅụ ka m na-agbalị ime ihe dị Jehova mma, na ka m na-akwụsi ike n’akụkụ ya ma na-agba mbọ ka mụ na ya dịkwuo ná mma. Iji ihe ndị gbasara ofufe m na-efe Chineke kpọrọ ihe, dị ka, inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, na inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka, na-adọta m nso n’ebe Jehova nọ, o meekwala ka m na-echebe obi m.”—Ilu 4:23.

IKE AGWỤKWALA GỊ!

17, 18. Olee ihe ga-enyere Onye Kraịst aka ịna-enwe olileanya na ihe nwere ike ịka mma ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ ya abụghị Ndị Kraịst?

17 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, onye si n’ezinụlọ e nwere ndị na-abụghị Ndị Kraịst, ike agwụkwala gị. Cheta na “Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.” (1 Sam. 12:22) Ọ gaghị ahapụ gị ma ọ bụrụ na ị hapụghị ya. (Gụọ 2 Ihe E Mere 15:2.) N’ihi ya, “ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu.” Gbalịa ‘nyefee ụzọ gị n’aka Jehova, ma dabere n’ebe ọ nọ.’ (Ọma 37:4, 5) ‘Nọgidesie ike n’ekpere,’ ka obi siekwa gị ike na Nna anyị nke bi n’eluigwe, onye hụrụ anyị n’anya, ga-enyeliri gị aka idi ụdị nsogbu niile na-abịara gị.—Rom 12:12.

18 Rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya nke ga-enyere gị aka ịna-eme ka gị na ndị ezinụlọ unu dịrị n’udo. (Hib. 12:14) Nke bụ́ eziokwu bụ na gị na ndị ezinụlọ unu ga-adịli n’udo, nke a nwekwara ike ime ka obi ha mechaa gbanwee. Ị ga-enwe obi ụtọ, obi ga-erukwa gị ala ka ị ‘na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto.’ (1 Kọr. 10:31) Ka ị na-agba mbọ eme ihe ndị a, obi sie gị ike na ụmụnna gị, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, bụ́ ndị hụrụ gị n’anya, kwụ gị n’azụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 8 Ndụmọdụ a Pọl nyere apụtaghị na ọ dị njọ mmadụ ịnata akwụkwọ ikike nkewa ma di ya ma ọ bụ nwunye ya chiwe ya ọnụ n’ala. Ọ bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya kpebie, ma onye ahụ kwesịrị ichebara ya echiche. Gụọ akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 220-221.

^ par. 14 Akwụkwọ Nsọ ekwughị na o nwere ihe o mere ma mmadụ na onye na-abụghị Onye Kraịst rikọọ ihe.—1 Kọr. 10:27.

[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Mata mgbe kwesịrị ekwesị ị ga-akọwa ihe mere i ji kwere n’ihe i kweere

[Foto dị na peeji nke 29]

Gosi di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onye Kraịst na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi