Ndị Bụ́ Enyi Kemgbe Afọ Iri Isii, ma Ha Ka Na-amalite Amalite
Akụkọ Ndụ
Ndị Bụ́ Enyi Kemgbe Afọ Iri Isii, ma Ha Ka Na-amalite Amalite
N’otu mgbede n’ihe dị ka ná ngwụcha ọnwa Jun, n’afọ 1951, ụmụ okorobịa anọ, ndị dị ihe dị ka afọ iri abụọ na atọ, guzo n’akụkụ ebe a na-anọ akpọ fon n’Itaka dị na Niu Yọk, n’Amerịka. Ha ji obi ụtọ kpọọ ndị nọ na Mishigan, n’Ayọwa nakwa na Kalịfọnịa, bụ́ ebe ndị dị ezigbo anya. Ha chọrọ ịkọrọ ha ihe ọma meere ha!
N’ỌNWA Febụwarị 1951, otu narị ndị ọsụ ụzọ na iri abụọ na abụọ zukọrọ na Saụt Lansịn dị na Niu Yọk ịga klas nke iri na asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-atụ anya ịghọ ndị ozi ala ọzọ bụ Lowell Turner, William (Bill) Kasten, Richard Kelsey, na Ramon Templeton. Lowell na Bill si Mishigan. Richard si Ayọwa.Ramon esi Kalịfọnịa. Ha anọ ghọrọ enyi n’oge na-adịghị anya.
Mgbe ihe dị ka ọnwa ise gachara, obi dị ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ezigbo ụtọ mgbe a mara ọkwa na Nwanna Nathan Knorr, bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, ga-abịa gwa ha okwu. Ụmụnna anọ ndị ahụ ekwuola na ha chọrọ ka e ziga ha anọ n’otu mba ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Oge ò ruola ka a gwakwuo ha banyere mba ebe a ga-eziga ha ịbụ ndị ozi ala ọzọ? N’eziokwu, oge eruola!
Ka Nwanna Knorr malitere ịgwa ụmụ akwụkwọ ahụ niile okwu, onye nke ọ bụla nọ na-atụsi anya ike ịnụ mba a ga-eziga ya. Ndị mbụ a kpọgotara n’elu ikpo okwu bụ ụmụ okorobịa anọ ahụ. Ahụ́ erughị ha ala. Ma, ahụ́ mechara ruo ha ala mgbe ha chọpụtara na e zigara ha otu ebe! Ma, ebee ka ha na-aga? O juru ụmụ klas ha anya mgbe a mara ọkwa na a na-eziga ha Jamanị, ha kụkwara aka ruo ogologo oge.
Ọ na-atụ Ndịàmà Jehova nọ n’ebe niile n’ụwa n’anya mgbe ha nụrụ otú ụmụnna ha nọ na Jamanị malite n’afọ 1933 gawa si kwesị ntụkwasị obi n’oge ahụ Hitler na-achị. Ọtụtụ ụmụ akwụkwọ chetara otú ha si wekọta uwe na ihe ndị ọzọ ma si n’aka otu ụlọ ọrụ zigara ha ụmụnna nọ na Yurop mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri. Ndị Chineke nọ na Jamanị nwere okwukwe na-enweghị atụ, kpebisie ike ime uche Chineke, nwee obi ike ma tụkwasị Jehova obi. Lowell chetara na ya kwuru n’obi ya mgbe ahụ, sị, ‘Ugbu a, anyị ga-amata ụmụnna anyị ndị ahụ.’ Ka a sịkwa ihe mere obi ji dị ha ụtọ, ha akpọọkwa ọtụtụ ndị na fon ná mgbede ahụ!
MGBE HA NA-AGA JAMANỊ
N’iri abalị abụọ na asaa n’ọnwa Julaị, 1951, otu ụgbọ mmiri kwọpụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri Osimiri Ọwụwa Anyanwụ dị na Niu Yọk, ndị enyi anọ ahụ nọkwa n’ụgbọ ahụ. Ọ ga-ewe ha abalị iri na otu iru
Jamanị. Nwanna Albert Schroeder akụzierela ha ahịrịokwu ole na ole n’asụsụ Jaman. O so ná ndị kụziiri ha ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, mechaakwa soro n’Òtù Na-achị Isi. Ugbu a ha na ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ụgbọ, ikekwe ha ga-amụtakwu asụsụ Jaman. Ma, ọ dị ka otú ndị nọ n’ụgbọ ahụ si na-asụ Jaman ọ̀ dị iche iche. Ọ gbagwojuru ha anya!Ahụ́ kpaghasịrị ụmụnna ndị ahụ mgbe ha nọ n’ụgbọ mmiri. Ma ha rutere Hambọg dị na Jamanị n’ụtụtụ Tuzdee, abalị asaa n’ọnwa Ọgọst. Agha Ụwa nke Abụọ ka bichara afọ isii tupu mgbe ahụ. Ebe ọ bụla ha lere anya, ha hụrụ ihe agha ahụ mebisịrị. Ihe ha hụrụ wutere ha, ha abanye otu ụgbọ okporo ígwè nke na-agba n’abalị ma gawa Visbadin, bụ́ ebe alaka ụlọ ọrụ dị mgbe ahụ.
N’isi ụtụtụ Wenezdee, ha zutere Onyeàmà Jehova mbụ ha ga-ahụ na Jamanị. Aha ya bụ Hans, nke gosiri na ọ bụ onye Jamanị! O si n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ buru ha n’ụgbọala gaa Betel, nyefeekwa ha n’aka otu nwanna nwaanyị merela agadi, nke na-eji obi ya niile eme ihe ọ na-eme. Nwanna nwaanyị ahụ anaghị asụ Bekee. Ma, ọ dị ka ò chere na ọ bụrụ na ya ejiri olu dara ụda sụọrọ ha Jaman, ha ga-aghọta ya. Ma, n’agbanyeghị na ọ nọ na-etiri ụmụnna anọ ahụ mkpu, ahụ́ gbakasịwakwuru ha na ya. Nwanna Erich Frost, bụ́ ohu alaka ụlọ ọrụ ahụ, bịakwutere ha, jiri Bekee kelee ha nke ọma. Obi malitere iru ha ala.
Ná ngwụcha ọnwa Ọgọst, ha anọ gara mgbakọ mbụ ha gara e ji asụsụ Jaman mee, bụ́ Mgbakọ “Ofufe Dị Ọcha” e mere na Frankfọt am Men. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ bụ iri puku anọ na asaa, narị anọ na iri atọ na abụọ. Ndị e mere baptizim dị puku abụọ, narị atọ na iri asaa na atọ. N’ihi ya, ụmụnna anọ ahụ kpebisikwuru ike ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ala ọzọ ha, chọsiekwa ike ikwusa ozi ọma. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gachara, Nwanna Knorr kwuru na ha ga-anọ na Betel, na-arụ ọrụ n’ebe ahụ.
O nweela mgbe a kpọrọ Ramon ka ọ bịa rụwa ọrụ na Betel dị n’Amerịka, ya ajụ n’ihi na obi ya dị n’ozi ala ọzọ. Richard na Bill echetụbeghị echiche
ịga Betel. Ma, ụdị obi ụtọ ha mechara nwewe mgbe ha na-arụ ọrụ na Betel mere ka obi sie ha ezigbo ike na Jehova ma ihe ga-akacha baara ha uru. N’ihi ya, onye maara ihe ga na-eso nduzi Jehova kama ịna-eme ihe dị ya n’obi. Ọ bụrụ na mmadụ amụta ihe a, ọ ga-eji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ebe ọ na-arụ ọrụ nakwa ụdị ọrụ e nyere ya.ARỤ!
Obi dị ọtụtụ ndị ezinụlọ Betel dị na Jamanị ụtọ na e nweela ụmụnna si Amerịka ha na ha ga na-asụ Bekee. Ma otu ụbọchị, mgbe ha nọ n’ebe a na-anọ eri nri, olileanya ha kụrụ afọ n’ala na mberede. Nwanna Frost ji ịnụ ọkụ n’obi malite ikwu okwu otú ọ na-emebu n’asụsụ Jaman. Ọ nọ na-ekwu banyere ihe dị ezigbo mkpa. Ọtụtụ ndị ezinụlọ Betel gbachiri nnọọ nkịtị, onye ọ bụla ekpudo ihu n’efere ya. N’agbanyeghị na ụmụnna ndị ahụ bịara ọhụrụ anaghị aghọta ihe a na-ekwu, ha ji nwayọọ nwayọọ na-amata na ihe a na-ekwu gbasara ha. N’ihi ya, ahụ́ erughịzi ha ala mgbe Nwanna Frost ji olu ike kwuo n’asụsụ Jaman, sị, “Arụ!” kwusiekwa ya ike ugboro ugboro ka a nụ ya nke ọma. Gịnị ka ha mere, nke mere Nwanna Frost ji na-aba ụdị mba ahụ?
Mgbe ha richara nri, onye ọ bụla mere ngwa ngwa gaa n’ụlọ ya. Otu nwanna mechara gwa ha, sị: “O nweghị otú unu ga-esi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na unu amụtaghị asụsụ Jaman. Ọ bụ ya mere Nwanna Frost ji kwuo na ọ bụrụ na unu amụtaghị asụsụ Jaman, ịsụrụ unu Bekee bụ arụ.”
Ezinụlọ Betel mere ihe ahụ o kwuru ozugbo. Ihe ahụ ha mere nyeere ndị ahụ bịara ọhụrụ aka ịmụta asụsụ Jaman, meekwa ka ha mụta na ndụmọdụ nwanna hụrụ mmadụ n’anya nyere ya na-abakarị uru, ọ bụrụgodị na o siiri ya ike na mbụ ime ihe a gwara ya. Ndụmọdụ ahụ Nwanna Frost nyere gosiri na ọ chọrọ ka ihe na-aga nke ọma ná nzukọ Jehova nakwa na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya. * Ka a sịkwa ihe mere ha anọ ji mechaa hụ ya n’anya!
ANYỊ NWERE IKE ỊMỤTA IHE N’AKA NDỊ ENYI ANYỊ
Ọ bụrụ na anyị nwere ndị enyi na-atụ egwu Chineke, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe bara uru n’aka ha, bụ́ ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. Ụmụnna anọ ndị ahụ mụtara ihe n’aka ọtụtụ ụmụnna bụ́ ndị Jamanị, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, mụtakwa ihe n’aka ibe ha.
Richard kwuru, sị: “Lowell matụ asụsụ Jaman, na-asụkwa ya nke ọma, ma o siiri anyị atọ ezigbo ike. Ebe ọ bụ ya tọchara anyị niile, ọ bụ ya ka anyị na-agakwuru ma a sụọ ihe siiri anyị ike nakwa ka o kwuo ihe a ga-eme.” Ramon kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ mgbe otu nwanna bụ́ onye Swizaland gwara anyị bịa nọrọ n’ụlọ ya dị na Swizaland n’oge ezumike mbụ anyị gara mgbe anyị nọchara otu afọ na Jamanị! Ebe anyị ga-anọ naanị anyị ruo izu abụọ, echere m na anyị na asụsụ Jaman agaghị na-alụ! Ma, amaghị m ihe Lowell ga-eme. O siri ọnwụ na anyị ga na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụtụtụ n’asụsụ Jaman! O wutere m nke ukwuu na o kweghị agbanwe obi ya. Ma ihe bara ezigbo uru anyị mụtara bụ na mmadụ kwesịrị ịna-eme ihe ndị na-echere ya echiche ọma gwara ya mee, ọ bụrụgodị na o kwetaghị ihe ha kwuru mgbe ụfọdụ. Ihe ahụ anyị mụtara abaarala anyị uru kemgbe ọtụtụ afọ, meekwa ka ọ dịrị anyị mfe irube isi n’ihe nzukọ Jehova kwuru.”Ndị enyi anọ ndị ahụ mụtakwara ịna-akwanyere ibe ha ùgwù n’ihi ihe ha na-emeta, dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3, sị: “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” N’ihi ya, mmadụ atọ ndị ọzọ ahụ na-akwanyekarịrị Bill ùgwù ma na-enye ya ọrụ ha ma na ọ ga-aka ha arụ nke ọma. Lowell kwuru, sị: “Anyị na-akpọ Bill ma e nwee ihe siri ezigbo ike a ga-eme. E nwee ọrụ tara akpụ nke anyị na-enweghị obi ike ịrụ, ọ ga-arụ ya otú anyị niile ga-ekweta na e kwesịrị isi rụọ ya.”
HA NIILE LỤRỤ NWUNYE MA NA-ENWE OBI ỤTỌ
Onye nke ọ bụla n’ime ha mechara kpebie ịlụ nwaanyị. Ihe mere ha ji bụrụ enyi bụ na ha hụrụ Jehova n’anya, hụkwa ozi oge niile n’anya. N’ihi ya, ha kpebiri ịlụ ndị nwunye ga-eji obi ha niile jeere Jehova ozi. Ozi oge niile akụzierela ha na inye ihe bara uru karịa ịnara ihe nakwa na mmadụ kwesịrị iji ihe gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe karịa ihe yanwa chọrọ. N’ihi ya, ha kpebiri ịlụ ụmụnna nwaanyị ndị ji aka ha kpebie ije ozi oge niile. Ya mere, ha anọ lụrụ nwaanyị ma na-enwe obi ụtọ.
Ihe ga-eme ka enyi na enyi ma ọ bụ di na nwunye dị n’ezigbo mma bụ ha na Jehova ịdị ná mma. (Ekli. 4:12) Ọ bụ ezie na nwunye Bill na nwunye Ramon mechara nwụọ, otú ndị nwunye ha si kwesị ntụkwasị obi ma kwado ha na-eme ha obi ụtọ. Ndị nwunye Lowell na Richard ka na-akwado ha. Bill lụgharịkwara nwaanyị, ma ọ họọrọ onye ga-enyere ya aka ịnọgide n’ozi oge niile.
Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ha jere ozi n’ebe dị iche iche, karịsịa na Jamanị, Ọstria, Lọksembọg, Kanada, na Amerịka. N’ihi ya, ndị enyi anọ ahụ enwekwaghị ike ịnọkọta ọnụ otú ha chọrọ. N’agbanyeghị na ha anọghị ibe ha nso, ha ka na-ezirịta ozi, soro ibe ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe ihe ọma meere ha ma kwaa ákwá mgbe ha na-eru uju. (Rom 12:15) E kwesịrị iji ndị enyi dị otú a kpọrọ ihe. Ha bụ onyinye bara ezigbo uru si n’aka Jehova. (Ilu 17:17) Ezigbo ndị enyi dị ụkọ n’ụwa taa! Ma, ezi Onye Kraịst nwere ike inwe ọtụtụ ụdị ndị enyi ahụ. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile bụ enyi. Nke kacha mkpa bụ na anyị na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst bụ enyi.
Ọ bụghị mgbe niile ka ihe gaara ndị enyi anọ a werewere, dịkwa ka ọ dị anyị niile. Ha enweela nsogbu ndị dị ka obi mgbawa n’ihi na onye ha hụrụ n’anya nwụrụ, ịta ahụhụ n’ihi ọrịa siri ike, ilekọta nne na nna karala nká, mmadụ ịzụ nwa mgbe ọ na-eje ozi oge niile, obi mmapụ n’ihi ọrụ ọhụrụ e nyere mmadụ n’ọgbakọ Jehova, nakwa nsogbu ndị kara nká na-enwe. Ma, ihe ndị mere ha mere ka ha ghọta na ndị enyi, ma ndị nke nọ nso ma ndị nke nọ n’ebe dị anya, na-enyere ndị hụrụ Jehova n’anya aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara ha.
ENYI NKE GA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI
Ọ dị mma na Lowell raara onwe ya nye Jehova mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, Ramon arara onwe ya nye mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, Bill arara onwe ya nye mgbe ọ dị afọ iri na otu, Richard ararakwa onwe ya nye mgbe ọ dị afọ iri. Ha malitechara ozi oge niile mgbe ha nọ n’agbata afọ iri na asaa na afọ iri abụọ na otu. Ha mere ihe ahụ Ekliziastis 12:1 gbara ha ume ka ha mee, nke bụ́: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.”
Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst, ya kwe gị omume, za òkù Jehova na-akpọ gị ka ị banye n’ozi oge niile. I mee otú ahụ, obiọma ya na-erughịrị mmadụ nwere ike ime ka ị dị ka ndị enyi anọ a ma nwee ọṅụ a na-enweta n’ịbụ onye nlekọta sekit, onye nlekọta distrikti, ma ọ bụ onye nlekọta zoonu; ije ozi na Betel, iso ná ndị Kọmitii Alaka; ịkụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ; na ikwu okwu ná mgbakọ distrikti nakwa ná mgbakọ mba niile. Obi dị ndị enyi anọ a ụtọ ịmata na ọtụtụ puku mmadụ ritere uru n’ozi ha! Ihe mere ihe a niile ji kwe ha omume bụ na mgbe ha bụ ụmụ okorobịa, ha anọ zara òkù Jehova kpọrọ ha ma jiri mkpụrụ obi ha dum jeere ya ozi.—Kọl. 3:23.
Taa, Lowell, Richard, na Ramon ejekọtawakwala ozi n’alaka ụlọ ọrụ dịzi na Seltas, na Jamanị. Ọ dị mwute ikwu na Bill nwụrụ n’afọ 2010 mgbe ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’Amerịka. Ọnwụ emeela ka mmadụ anọ a bụ́ enyi kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri isii fọzie atọ! Ma, Chineke anyị, bụ́ Jehova, anaghị echefu ndị enyi ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na mgbe Alaeze ya ga-achịwa, ndị enyi niile bụ́ Ndị Kraịst ọnwụ tisara ga-abụ enyi ọzọ.
Obere oge tupu Bill anwụọ, o dere, sị: “N’ime iri afọ isii anyị bụrụla enyi, echetaghị m ihe ọ bụla ga-eme ka m kwaa ụta na anyị bụ enyi. O nwetụbeghị mgbe m ji ndị enyi m ahụ gwurie egwu.” Ndị enyi ya atọ kwetara na ha ga-abụ enyi banye n’ụwa ọhụrụ. Ha kwuru n’egbughị oge, sị: “Ma anyị ka malitere amalite.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 E biri akụkọ ndụ na-atọ ụtọ nke Nwanna Frost n’Ụlọ Nche (Bekee) April 15, 1961, peeji nke 244-249.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]
Ụdị obi ụtọ ha na-enwe n’ozi ha mere ka obi sie ha ezigbo ike na Jehova ma ihe ga-akacha baara ha uru
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
“N’ime iri afọ isii anyị bụrụla enyi, echetaghị m ihe ọ bụla ga-eme ka m kwaa ụta na anyị bụ enyi”
[Foto dị na peeji nke 17]
Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Richard, Lowell, Ramon, na Bill ghọrọ ndị enyi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
N’elu: Ebe Ramon na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze; n’aka nri: Ebe Richard na-arụzi ígwè e ji ebi adres na Betel dị na Visbadin
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
N’elu: Nwanna Frost (n’aka nri) na ndị ọzọ mgbe Nwanna Knorr (n’aka ekpe) letara ha; n’aka nri: Mgbe ha gara ezumike na Swizaland n’afọ 1952
[Foto dị na peeji nke 20]
Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Richard, Bill, Lowell, na Ramon zutere na Seltas mgbe a raara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na Jamanị nye n’afọ 1984
[Foto dị na peeji nke 21]
Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Ramon, Richard, na Lowell