Ihe Si N’ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie
E Nwetara “Ihe A Na-agaghị Echefu Echefu” n’Oge Kwesịrị Ekwesị
IHE ọtụtụ ndị kwuru banyere “Creation Drama” (Ihe Nkiri nke Okike) bụ, “Ọ bụ ihe a na-agaghị echefu echefu.” E wepụtara ya n’oge kwesịrị ekwesị. Ndị lere ya echefughị ya echefu. N’eziokwu, ozi ọma e ji ya kwusaa nyere Jehova otuto tupu ọchịchị Hitler amalite ịkpagbu ndị ohu Jehova na Yurop. Gịnị bụ “Ihe Nkiri nke Okike”?
N’afọ 1914, isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Bruklin, Niu Yọk, Amerịka, wepụtara fim bụ́ “Photo-Drama of Creation.” Ọ bụ ihe nkiri slaịd na sinima, nke nwere àgwà. A na-anụkwa olu ndị mmadụ na ya. Ikiri ya na-ewe awa asatọ. Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile kiriri ya. N’afọ ahụkwa, e mechara wepụta ụdị fim ahụ nke a kpọrọ “Eureka Drama.” Ikiri ya anaghịkwa ewecha awa asatọ. Ma, n’ihe dị ka afọ 1923, ihe nkiri slaịd ahụ na ígwè e ji egosi ya emeela ezigbo ochie. Ma ọtụtụ ndị ka chọrọ ile fim “Photo-Drama of Creation.” Dị ka ihe atụ, ndị bi n’obodo Ludvigsbọg dị na Jamanị jụrụ, sị, “Olee mgbe ọzọ a ga-egosi anyị ‘Photo-Drama’?” Gịnị ka a ga-eme?
Iji nwee ike igosi ihe nkiri ahụ, ụfọdụ ndị nọ na Betel dị na Magdebọg, Jamanị, gara zụta ụfọdụ fim n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị na Paris, Frans. Ha zụtakwara ụfọdụ ihe nkiri slaịd n’ụlọ ọrụ ọzọ na-arụ ihe gbasara ihe osise n’obodo Laịpsig na Dresden. Ha wepụtara ndị ka dị mma n’ime slaịd “Photo-Drama” ochie ahụ, werekwa ha na ndị nke ahụ ha zụtara mepụta nke ọhụrụ.
Nwanna Erich Frost, bụ́ onye na-akụ egwú nke ọma, kụrụ egwú e tinyere na fim ahụ na ihe nkiri slaịd ahụ. E si n’akwụkwọ bụ́ Creation weta ihe ụfọdụ e kwuru na fim ahụ. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ihe nkiri “Photo-Drama” ahụ ha mepụtara “Creation Drama,” (ya bụ, “Ihe Nkiri nke Okike”).
Ile ihe nkiri ọhụrụ ahụ na-ewekwa awa asatọ ka ihe nkiri nke Photo-Drama. Ndị mmadụ anaghị ele ha niile otu mgbe. Ha na-ele ya obere obere ná mgbede dị iche iche. Ihe e gosiri na ya bụ akụkọ na-atọ ụtọ gbasara ụbọchị ndị ahụ Chineke ji kee ihe niile na ihe Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ kọrọ banyere ihe ndị mere n’oge ochie. E gosikwara na okpukpe ụgha anaghị enyere ụmụ mmadụ aka. E gosiri ihe nkiri ahụ n’Ọstria, Jamanị, Lọksembọg, na Swizaland, gosikwa ya ndị na-asụ Jaman n’obodo ndị ọzọ.
Nwanna Erich Frost kwuru, sị: “Mgbe anyị na-egosi ihe nkiri ahụ, m na-agwa ụmụnna mụ na ha so, karịchaa ndị na-akụ egwú, ka ha jiri oge a kwụsịtụrụ gaa n’oche n’oche kee ndị mmadụ ọmarịcha akwụkwọ anyị dị iche iche. Anyị si otú ahụ nye ndị mmadụ ọtụtụ akwụkwọ karịa ka anyị gaara enye n’ozi ụlọ n’ụlọ.” Johannes Rauthe, bụ́ onye haziri ihe nkiri e gosiri na Poland na n’ebe bụ́ Chek Ripọblik ugbu a, kwuru na ọtụtụ ndị lere ihe nkiri ahụ nyere ha adres ha ka e nwee ike ileta ha. A na-eji adres ndị ahụ agara ndị ahụ nletaghachi.
Malite n’afọ 1931, ndị mmadụ na-eju eju n’ụlọ ebe a na-egosi fim “Creation Drama,” ndị niile nọ n’obodo na-ekwukwa banyere Ndịàmà Jehova. Tupu afọ 1933 agachaa, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na otu nde mmadụ agaala lee fim ahụ alaka ụlọ ọrụ dị na Jamanị na-egosi. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Käthe Krauss kwuru, sị: “Anyị gara lee ihe nkiri ahụ ụbọchị ise. N’ụbọchị nke ọ bụla, anyị ji ụkwụ gaa kilomita iri ma n’uje ma n’ụla. Anyị si n’ụzọ ọhịa, rịa ugwu, rịdata, gafeekwa ndagwurugwu.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Else Billharz kwuru, sị: “Fim ahụ bụ́ ‘Creation Drama’ mere ka m hụ eziokwu Baịbụl n’anya.”
Otu nwanna aha ya bụ Alfred Almendinger kwuru na mgbe mama ya gara lee fim ahụ, “otú obi si tọọ ya ụtọ mere ka ọ gaa zụọ Baịbụl lee ma ọ̀ ga-ahụ okwu ahụ bụ́ ‘pọgatrị’ na ya.” Ebe ọ bụ na ọ hụghị ya na Baịbụl, ọ kwụsịrị ịga chọọchị, e meekwa ya baptizim. Erich Frost kwuru, sị: “Fim ahụ bụ́ ‘Creation Drama’ mere ka ọtụtụ ndị nata eziokwu.”—3 Jọn 1-3.
Ka ọtụtụ ndị na-ele fim ahụ bụ́ “Creation Drama,” ọchịchị ndị Nazi ji nwayọọ nwayọọ na-akpa ike ọjọọ na Yurop. Malite n’afọ 1933, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Jamanị. Malite mgbe ahụ ruo mgbe a lụchara agha ụwa nke abụọ n’afọ 1945, a kpagburu Ndịàmà Jehova bi na Yurop. Erich Frost nọrọ ihe dị ka afọ asatọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, ọ lọtara, mechaa malite ije ozi na Betel dị na Visbadin, Jamanị. Ọ dị mma na e nwetara “Creation Drama,” bụ́ ihe a na-agaghị echefu echefu, n’oge kwesịrị ekwesị iji mee ka obi sie ọtụtụ ụmụnna ike, bụ́ ndị ọnwụnwa mechara bịara mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ.—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Jamanị.