È Nwere Ihe O Mere ma Ọ Bụrụ na E Nweghị Onye Na-ahụ Ihe Ị Na-arụ?
ỊRỤ ihe abụrụghị Bezalel na Oholiab ihe ọhụrụ. Mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt, ọ ga-abụ na ha agaghịdị achọ icheta brik ole ha kpụrụ. Ma, afọ ndị ahụ agaala. Mgbe e nyere ha ọrụ ịrụ ụlọikwuu Chineke, ha ga-abụzi ezigbo ndị omenkà. (Ọpụ. 31:1-11) Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-ahụ ụfọdụ ọmarịcha ihe ndị ha ga-arụ. Iwe ọ̀ ga-ewe ha na a gaghị akwanyere ha ùgwù pụrụ iche? Ò nwere ihe o mere ma ọ bụrụ na e nweghị ndị hụrụ ihe ha rụrụ? Ò nwere ihe o mere ma ọ bụrụ na e nweghị onye na-ahụ ihe ị na-arụ?
ỌRỤ MARA EZIGBO MMA NAANỊ MMADỤ OLE NA OLE HỤRỤ
Ụfọdụ ihe ndị e ji chọọ ụlọikwuu Chineke mma mara mma na-enweghị atụ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere cherọb ndị e ji ọlaedo kpụọ n’elu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Pọl onyeozi kwuru na ha “dị ebube.” (Hib. 9:5) Chegodị ụdị mma cherọb ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ mara.—Ọpụ. 37:7-9.
Ọ bụrụ na a chọta ihe ndị ahụ Bezalel na Oholiab rụrụ, e kwesịrị idewe ha n’ebe a na-edewe ihe ndị mgbe ochie ka ndị mmadụ gaa na-ele ha. Ma, mgbe a rụrụ ihe ndị ahụ, mmadụ ole hụrụ ụdị mma ha mara? Cherọb ndị ahụ dị n’Ebe Kasị Nsọ. N’ihi ya, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-ahụ ha ma ọ banye ebe ahụ naanị otu ugboro n’afọ, n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Hib. 9:6, 7) N’ihi ya, ọtụtụ ndị ahụghị ha.
OBI DỊ HA ỤTỌ N’AGBANYEGHỊ NA NDỊ MMADỤ ETOGHỊ HA
Ọ bụrụ na ị bụ Bezalel ma ọ bụ Oholiab, gị ataa ahụhụ rụchaa ihe niile ahụ, olee otú obi ga-adị gị ebe ị ma na ọtụtụ ndị agaghị ahụ ha? Taa, ihe na-eme ka obi dị ọtụtụ ndị mma maka ihe ha rụrụ bụ ma ndị ọzọ na-eto ha ma na-aja ha mma. Ọ bụ ihe ha ji ama na ihe ha rụrụ bara uru. Ma, ndị ohu Jehova anaghị eme otú ahụ. Obi na-adị anyị ụtọ otú ahụ ọ dị Bezalel na Oholiab maka na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ, marakwa na ọ na-eme ya obi ụtọ.
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị ndú okpukpe na-ekpekarị ekpere ka ndị ọzọ hụ ha wee too ha. Ma, Mat. 6:5, 6) O doro anya na ihe kacha mkpa abụghị ihe ndị mmadụ chere banyere ekpere anyị, kama ọ bụ ihe Jehova chere. Ọ bụ ihe o chere ga-eme ka ekpere anyị baa uru. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe anyị rụrụ n’ozi anyị na-ejere ya. Ihe mere ọrụ anyị ji dị mkpa abụghị na ndị ọzọ na-eto anyị, kama ọ bụ na ọ na-eme Jehova obi ụtọ. Ọ bụ ya “na-ahụ ihe na nzuzo.”
Jizọs gwara ndị mmadụ ihe dị iche. Ọ sịrị ha jiri obi ha niile na-ekpe ekpere ma ghara ime ka ndị mmadụ hụ ha wee too ha. Olee uru ọ ga-aba? Jizọs sịrị: “Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.” (Mgbe a rụchara ụlọikwuu ahụ, ígwé ojii ‘malitere ikpuchi ụlọikwuu nzute, ebube Jehova ejupụtakwa n’ụlọikwuu ahụ.’ (Ọpụ. 40:34) O gosiri na obi dị Jehova ụtọ. Olee otú i chere obi dị Bezalel na Oholiab mgbe ahụ? N’agbanyeghị na e deghị aha ha n’ihe ndị ahụ ha rụrụ, ọ ga-abụrịrị na obi dị ha ezigbo ụtọ maka na Chineke gọziri mbọ niile ha gbara. (Ilu 10:22) Ka oge na-aga, obi dịkwa ha ụtọ mgbe ha hụrụ na a ka ji ihe ndị ahụ ha rụrụ na-efe Jehova. Mgbe a ga-akpọlite Bezalel na Oholiab n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ, obi ga-adị ha ụtọ ịmata na a nọ n’ụlọikwuu ahụ fegide Jehova ruo ihe dị ka narị afọ ise.
Ná nzukọ Jehova taa, a naghị anụ aha ndị na-emepụta katuun anyị, ndị na-ese foto na ihe ndị ọzọ na-adị n’akwụkwọ anyị, ndị na-akụ egwú e ji emepụta abụ anyị, ndị nsụgharị, na ndị na-ede akwụkwọ anyị. E nwere ike ikwu na e nweghị onye “na-ahụ” ihe ha na-arụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọtụtụ ihe a na- arụ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri n’ụwa niile. Ònye na-ahụ mgbe nwanna na-ahụ maka ihe ndekọ ego na-edejupụta akwụkwọ ndị e kwesịrị idejupụta ná ngwụcha ọnwa? Ònye na-ahụ mgbe odeakwụkwọ na-edekọ akụkọ ozi ọgbakọ? Ònye na-ahụ mgbe nwanna na-arụzi ihe mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
Tupu Bezalel na Oholiab anwụọ, ọ dịghị ihe nrite ma ọ bụ iko ọlaedo e nyere ha maka ihe niile ha ji nkà ha rụọ. Ma, ha nwetara ihe bara uru karịa ọlaedo ọ bụla, ya bụ, adịm ná mma ha na Chineke. Obi siri anyị ike na Jehova hụrụ ihe ndị ha rụrụ. Ka anyị ṅomie otú ha si jiri obi umeala wepụta onwe ha jeere Jehova ozi.