Gịnị Mere Anyị Ji Dịrị Ndụ?
Gịnị Mere Anyị Ji Dịrị Ndụ?
GỊNỊ MERE AZỊZA YA JI DỊ ANYỊ MKPA? O nweghị ihe kacha enye mmadụ nsogbu ná mmụọ karịa iche na e nweghị ihe mere anyị ji dịrị ndụ, ya bụ, na ndụ enweghị isi. Ma, onye o doro anya na o nwere ihe mere o ji dịrị ndụ na-enwe ahụ́ iru ala. Viktor E. Frankl, bụ́ ọkà mmụta ọrịa akwara, onye a na-egbughị mgbe ndị Nazi chọrọ igbukpọ ndị mmadụ, dere, sị: “Ihe m nwere ikwu bụ na o nweghị ihe ọ bụla n’ụwa a ga-aka enyere mmadụ aka ịnọrọ ndụ mgbe ihe siri oké ike karịa onye ahụ ịmara na o nwere ihe mere o ji dịrị ndụ.”
Ma, ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ mmadụ ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ya ihe mere o ji dịrị ndụ. Ma, ụfọdụ ndị bụ́ ndị kweere n’ozizi evolushọn na-akụzi na ndụ enweghị isi.
Ma, n’eziokwu, ụzọ kacha mma isi chọpụta ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ bụ ịmata ihe Onye Na-enye Ndụ, bụ́ Jehova Chineke, kwuru. Tụlee ihe Okwu ya kwuru banyere nke a.
Ihe Baịbụl Kwuru
Baịbụl na-akụziri anyị na o nwere ihe Jehova bụ́ Chineke bu n’obi kee nwoke na nwaanyị. Jehova nyere nne na nna mbụ anyị iwu a.
Jenesis 1:28. “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”
Nzube Chineke bụ ka Adam na Iv na ụmụ ha mee ka ụwa dum ghọọ paradaịs. O bughị n’obi ka ụmụ mmadụ na-aka nká, na-anwụ anwụ; ọ chọghịkwa ka ụmụ mmadụ mebie ụwa. Ma, anyị ketara mmehie na ọnwụ n’ihi na nne na nna mbụ anyị họọrọ ime ihe na-ezighị ezi. (Jenesis 3:2-6; Ndị Rom 5:12) N’agbanyeghị nke ahụ, nzube Jehova agbanwebeghị. N’oge na-adịghị anya, ụwa ga-aghọ paradaịs.—Aịzaya 55:10, 11.
Jehova kere anyị ka anyị nwee ike ọkpụkpụ aka na ọgụgụ isi iji mee nzube ya. O keghị anyị ka anyị leghara ya anya wee biwe ndụ otú masịrị anyị. Lekwa otú amaokwu Baịbụl ndị a si kọwaa nzube Chineke maka anyị.
Ekliziastis 12:13. “Ebe a nụworo ihe a dum, ihe bụ́ nkwubi okwu bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”
Maịka 6:8. “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”
Matiu 22:37-39. “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”
Otú Ihe Baịbụl Zara Si Eme Ka Obi Ruo Anyị Ala
Ihe ga-eme ka ígwè ọ bụla dị mgbagwoju anya na-arụ ọrụ nke ọma bụ ma e jiri ya na-arụ ihe onye rụrụ ya bu n’obi rụọ ya, jirikwa ya na-arụ ọrụ otú o kwuru. N’otu ụzọ ahụ, ọ bụrụ na anyị achọghị imebi mmekọrịta anyị na Chineke, ọ bụrụkwa na anyị achọghị imebi echiche anyị na ahụ́ anyị, anyị kwesịrị ibi ndụ otú Onye kere anyị bu n’obi. Legodị ihe ndị
na-egosi na ọ bụrụ na anyị mara ihe bụ́ nzube Chineke, obi ga-eru anyị ala.Mgbe ndị mmadụ na-ekpebi ihe ndị kacha ha mkpa ná ndụ, ọtụtụ n’ime ha taa na-etinye ndụ ha dum n’ịkpa akụ̀. Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na “ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha.”—1 Timoti 6:9, 10.
Otú ọ dị, ndị hụrụ Chineke n’anya kama ịhụ ego n’anya amụtala otú e si enwe afọ ojuju. (1 Timoti 6:7, 8) Ha ghọtara na mmadụ ịrụsi ọrụ ike bara uru, marakwa na ọ bụ ọrụ dịịrị ha ịrụ ọrụ iji nweta ihe ndị na-akpa ha ná ndụ. (Ndị Efesọs 4:28) Ma, ha jikwa ịdọ aka ná ntị Jizọs kpọrọ ihe, nke sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Matiu 6:24.
Ya mere, ndị hụrụ Chineke n’anya weere ime uche ya dị ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha, ọ bụghị iji ịrụ ọrụ ego ma ọ bụ ịchụ akụnụba mere ihe mbụ ná ndụ. Ha maara na ọ bụrụ na ha ebute ime uche Chineke ụzọ ná ndụ ha, Jehova bụ́ Chineke ga-elekọta ha. N’eziokwu, Jehova weere ya na ọ bụ ọrụ dịịrị ya ime otú ahụ.—Matiu 6:25-33.
Mgbe ndị mmadụ na ibe ha na-emekọrịta ihe, ọtụtụ n’ime ha na-ebute ọdịmma ha ụzọ. Udo adịghị n’ụwa taa. Isi ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ọtụtụ ndị aghọọla “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:2, 3) Mgbe mmadụ mere ha ihe na-adịghị ha mma ma ọ bụ mgbe mmadụ na-ekwetaghị ihe ha kwuru, ha na-egosi “iwe na ọnụma,” ha ‘na-etikwa mkpu, kwuokwa okwu mkparị.’ (Ndị Efesọs 4:31) Enweghị njide onwe onye dị otú ahụ anaghị eme ka obi ruo mmadụ ala, kama, ọ “na-akpasu esemokwu.”—Ilu 15:18.
Ma, ndị na-erube isi n’iwu ahụ Chineke nyere nke bụ́ ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị, ‘na-enwe obiọma n’ebe ibe ha nọ, na-enwekwa obi ọmịiko, na-agbaghara ibe ha kpamkpam.’ (Ndị Efesọs 4:32; Ndị Kọlọsi 3:13) Ọbụna mgbe ndị ọzọ mere ha ihe ọjọọ, ha na-agbalị iṅomi Jizọs, bụ́ onye ‘na-ekwujọgwaraghị mgbe a na-ekwujọ ya.’ (1 Pita 2:23) Ha ghọtara na ijere ndị ọzọ ozi, dị ka Jizọs jere, na-eme ka mmadụ nwee ezi obi ụtọ, ọbụna mgbe ndị e jeere ozi ahụ na-enweghị obi ekele. (Matiu 20:25-28; Jọn 13:14, 15; Ọrụ 20:35) Jehova bụ́ Chineke na-enye ndị na-eṅomi Ọkpara ya mmụọ nsọ ya. Mmụọ nsọ a na-eme ka obi ruo ha nnọọ ala.—Ndị Galeshia 5:22.
Ma, olee otú ihe i chere banyere ọdịnihu ga-esi eme ka obi ruo gị ala ma ọ bụ ka ọ ghara iru gị ala?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Mmadụ kwesịrị ịghọta nke ọma ihe mere o ji dịrị ndụ
[Foto dị na peeji nke 7]
Jizọs kụziiri anyị ihe anyị ga-eme ka obi ruo anyị ala