Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?

Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?

Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?

Ọ BỤ asụsụ Hibru, Arameik, na Grik a na-asụ n’oge ochie ka e ji dee Baịbụl mgbe e dere ya. Ya mere, ihe ọtụtụ ndị ndị chọrọ ịgụ ya ga-agụ bụ nke a sụgharịrị asụgharị.

Taa, Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha sụgharịa n’ọtụtụ asụsụ. E nwere akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị anọ. Ụfọdụ asụsụ nwere ọtụtụ Baịbụl a sụgharịrịla n’asụsụ ha. Ọ bụrụ na a sụgharịala ọtụtụ Baịbụl n’asụsụ gị, o doro anya na ị ga-achọ inweta nsụgharị nke kacha mma.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata nke bụ́ ezigbo nsụgharị, ọ dị mkpa ka ị mara azịza nke ajụjụ ndị a: Olee nsụgharị Baịbụl ndị unu nwere n’asụsụ unu? Olee ihe nsụgharị nke ọ bụla n’ime ha ji kara ndị nke ọzọ mma? Gịnị mere ị ga-eji kpachara anya mgbe ị na-agụ nsụgharị Baịbụl ụfọdụ?

Otú Otu Si Dịrị Iche n’Ibe Ya

E nwere ọtụtụ ụzọ e si asụgharị Baịbụl, ma e kewara ha niile ụzọ atọ. Otu n’ime ha bụ nsụgharị e dere asụsụ abụọ na ya. N’ụdị nsụgharị a, e dee otu okwu n’asụsụ e ji dee Baịbụl, a sụgharịa ya n’asụsụ ọzọ kpọmkwem otú ahụ e si dee ya.

Ụdị nsụgharị ọzọ bụ ịkọwa Baịbụl akọwa. Ndị na-eme ụdị nsụgharị a na-ede ihe ọ bụla ha ghọtara Baịbụl na-ekwu otú ha chere ọ ga-atọ ndị ga-agụ ya ụtọ.

N’ụdị nsụgharị nke atọ, a na-agbalịsi ike ka a ghara ịsụgharị Baịbụl kpọmkwem otú e si dee mkpụrụ okwu ya ma gharakwa ịkọwa ya akọwa. Ndị na-eme ụdị nsụgharị a na-agbalịsi ike ide ihe asụsụ ndị e ji dee Baịbụl kwuru na otú e si kwuo ya, ma n’otu mgbe ahụ, ha na-eme ka ọ dị mfe ọgụgụ.

Ọ̀ Bụ Baịbụl A Sụgharịrị Kpọmkwem Otú E Si Dee Ya Kacha Mma?

Ịsụgharị Baịbụl kpọmkwem otú e si dee ya n’asụsụ mbụ e ji dee ya anaghị asụgharịta ya nke ọma. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya. Nke a bụ abụọ n’ime ha:

1. Ọ dịghị asụsụ abụọ ụtọ asụsụ ha, okwu ha, na otu e si ede ha bụ otu. Otu ọkachamara n’asụsụ Hibru bụ́ S. R. Driver kwuru na ‘ụtọ asụsụ, otú okwu si malite, nakwa . . . otú e si ejikọ okwu n’asụsụ ọ bụla dị iche n’asụsụ ọzọ.’ Otú ndị na-asụ otu asụsụ si eche echiche dị iche n’otú ndị na-asụ asụsụ ọzọ si eche. Ọkachamara ahụ kwukwara, sị: “Ya mere, otú e si ede ihe n’otu asụsụ abụghị otú e si ede ya n’asụsụ ọzọ.”

Ebe ọ bụ na ọ dịghị asụsụ nke okwu ya na ụtọ asụsụ ya na nke asụsụ Hibru na Grik e ji dee Baịbụl bụ otu, ịsụgharị Baịbụl kpọmkwem otú ahụ e si dee ya n’asụsụ Hibru na Grik agaghị edo anya, o nwekwara ike ime ka a sụgharịa ihe na-adịghị na Baịbụl. Tụlee ihe atụ ndị a.

N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Efesọs, o dere okwu bụ́ “ná mkpụrụ ludo nke ụmụ mmadụ,” ma a sụgharịa ya kpọmkwem otú o si dee ya n’asụsụ Grik. (Ndị Efesọs 4:14, nsụgharị The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures) * Okwu ahụ na-akọwa aghụghọ ndị mmadụ na-aghọ ndị ọzọ mgbe ha na-egwu ludo. Ma, ịsụgharị okwu ahụ otú ahụ e si dee ya n’asụsụ Grik e nweghị ihe ọ pụtara n’ọtụtụ asụsụ. Ịsụgharị okwu ahụ ‘aghụghọ nke ụmụ mmadụ’ bụ otú ka mma e kwesịrị isi sụgharịa ya.

Mgbe Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi, o dere okwu bụ́ “nye mmụọ nke na-agbọ agbọ,” ma a sụgharịa ya kpọmkwem otú e si dee ya n’asụsụ Grik. (Ndị Rom 12:11, Kingdom Interlinear) Ò nwere ihe okwu a pụtara n’asụsụ gị? Ihe okwu ahụ pụtara bụ ka “mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi.”

Mgbe Jizọs na-ekwu otu n’ime okwu ya a kacha mara, o kwuru otu okwu a na-asụgharịkarị: “Ngọzi na-adịrị ndị bụ́ ogbenye n’ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ma, ịsụgharị ya otú ahụ e si dee ya n’asụsụ Grik mere ka ọ ghara ido anya n’ọtụtụ asụsụ. N’asụsụ ụfọdụ, ịsụgharị ya kpọmkwem otú ahụ e si dee ya n’asụsụ Grik na-egosi na uche ezughị “ndị bụ́ ogbenye n’ime mmụọ ha” okè nakwa na ha bụ ndị umengwụ na-enweghị ọgụgụ isi. Ma, ihe Jizọs kụziiri ndị na-ege ya ntị bụ na ọ bụghị igbo mkpa anụ ahụ́ ha ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ, kama ọ bụ ha ịmata na nduzi Chineke dị ha mkpa. (Luk 6:20) Ya mere, okwu ndị dị ka “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” ma ọ bụ “ndị ma na Chineke dị ha mkpa” sụgharịtara ihe ahụ Jizọs kwuru.—Matiu 5:3; nsụgharị The New Testament in Modern English.

2. Ihe otu okwu pụtara n’otu ebe nwere ike ịgbanwe n’ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, okwu Hibru a na-asụgharị aka mmadụ nwere ike inwe ọtụtụ ihe ọzọ ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, dabere n’ihe a na-ekwu, e nwere ike ịsụgharị okwu a ‘inweta,’ “mmesapụ aka,” ma ọ bụ ‘aka.’ (2 Samuel 8:3; 1 Ndị Eze 10:13; Ilu 18:21) N’ezie, e ji ihe karịrị okwu iri anọ dị iche iche sụgharịa ya na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, nke Bekee.

Ebe ọ bụ na ihe a na-ekwu nwere ike imetụta otú a ga-esi sụgharịa okwu, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku okwu Bekee iri na isii sụgharịa puku okwu Grik ise na narị ise e ji dee Baịbụl, jirikwa puku okwu Bekee iri abụọ na puku asaa sụgharịa puku okwu Hibru asatọ na narị ise. * Gịnị mere e ji sụgharịa okwu ndị ahụ n’ụzọ dị iche iche? Ndị sụgharịrị Baịbụl a ghọtara na ọ ka mkpa ịsụgharị ihe okwu ndị ahụ pụtara dabere n’ihe a na-ekwu karịa ịsụgharị ha kpọmkwem otú e si dee ha n’asụsụ Hibru na Grik. N’agbanyeghị nke ahụ, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị okwu Hibru na okwu Grik nke ọ bụla otu ihe n’ebe ọ bụla o kwere mee.

O doro anya na ịsụgharị Baịbụl abụghị naanị ịsụgharị okwu ọ bụla e ji dee Baịbụl otu ihe n’ebe ọ bụla a hụrụ ya. Ndị nsụgharị aghaghị iji ezi nghọta sụgharịa okwu dị iche iche e ji dee Baịbụl n’ụzọ ziri ezi ma kwe nghọta. Ha kwesịkwara ijikọta okwu dị iche iche mgbe ha na-eme nsụgharị ka o kwekọọ n’otú e si ede ihe n’asụsụ ha na-asụgharị.

Olee Maka Nsụgharị Ndị nke Na-akọwa Baịbụl Akọwa?

Ndị na-akọwa Baịbụl akọwa na-asụgharị ihe e dere n’asụsụ e ji dee Baịbụl otú masịrị ha. Olee otú ha si eme ya? Ha na-ede ihe ha chere dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl ma ọ bụ hapụ ide ihe ụfọdụ dị na ya. Baịbụl ndị a kọwara akọwa nwere ike ịdị ụtọ n’ihi na ọ na-adị mfe ọgụgụ. Ma, ịsụgharị Baịbụl ka ọ dị mfe ọgụgụ na-eme mgbe ụfọdụ ka a ghara ịghọta ihe dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl ma ọ bụ gbanwee ihe dị na ya.

Lee otú otu Baịbụl a kọwara akọwa si sụgharịa ekpere a ma ama nke Jizọs kụziri: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, mee ka anyị mara onye ị bụ.” (Matiu 6:9, nsụgharị The Message: The Bible in Contemporary Language) Ụzọ ka mma e si sụgharịa ekpere ahụ Jizọs kụziri bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” Leekwa otú Baịbụl ụfọdụ si sụgharịa Jọn 17:26. Otu Baịbụl a kọwara akọwa kwuru na Jizọs gwara Nna ya n’abalị ahụ e jidere ya, sị: “Emere m ka ha mara gị.” (Today’s English Version) Ma, otú ka mma e si sụgharịa ekpere ahụ Jizọs kpere, bụ: ‘Emewo m ka ha mara aha gị.’ Ị̀ hụla otú ndị nsụgharị ụfọdụ si zochie eziokwu bụ́ na Chineke nwere aha e kwesịrị ịdị na-akpọ ya, nke e kwesịkwara ịkwanyere ùgwù?

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Lezie Anya?

Baịbụl ụfọdụ a kọwara akọwa na-eme ka a ghara ịmata iwu ndị dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl bụ́ The Message: The Bible in Contemporary Language kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10, sị: “Únu amaghị na ọ bụghị otú a ka e kwesịrị isi na-ebi ndụ? Ndị ajọ omume ndị na-anaghị eche banyere Chineke agaghị eso banye n’alaeze ya. Ndị ha na ibe ha na-emetọ onwe ha, ndị na-enwe mmekọahụ na-ezighị ezi, ndị na-emetọ ụwa na ihe niile dị n’ime ya, erughị eru ịbụ ụmụ amaala nke alaeze Chineke.”

Were otú e si sụgharịa amaokwu ndị ahụ na Baịbụl ahụ tụnyere otú e si sụgharịa ha n’ụzọ ziri ezi ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ: “Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.” Ị ga-ahụ na ihe ndị Pọl onyeozi kwuru, bụ́ kpọmkwem ụdị àgwà ndị anyị kwesịrị izere, adịghị na Baịbụl ahụ a kọwara akọwa.

Ihe onye nsụgharị kweere nwere ike imetụta ihe ọ na-asụgharị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl bụ́ Today’s English Version, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-akpọ Good News Bible, si otú a sụgharịa ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara banye, n’ihi na ọnụ ụzọ hel dị obosara, ụzọ na-edugakwa na ya dị mfe ọgịga, ọtụtụ ndị na-agakwa na ya.” (Matiu 7:13) Ndị sụgharịrị ya dere “hel” n’agbanyeghị na ihe akwụkwọ Matiu kwuru n’ụzọ doro anya bụ “mbibi.” Gịnị mere ha ji si otú a sụgharịa ya? Ọ ga-abụ na ha chọrọ ịkwado echiche bụ́ na a ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị ibibi ha ebibi. *

Otú Ị Ga-esi Mata Nsụgharị Kacha Mma

E ji asụsụ ndị nkịtị na-asụ, ndị dị ka ndị ọrụ ubi, ndị na-azụ atụrụ, na ndị ọkụ azụ̀, dee Baịbụl. (Nehemaya 8:8, 12; Ọrụ 4:13) Ya mere, Baịbụl a sụgharịrị nke ọma kwesịrị ịdịrị ndị nwere ezi obi mfe nghọta, n’agbanyeghị ụdị ndị ha bụ. Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ndị e ji ama Baịbụl a sụgharịrị nke ọma:

Ihe ọ na-ekwu bụ kpọmkwem ihe e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee na Baịbụl mgbe e dere ya.—2 Timoti 3:16.

Okwu ndị dị na ya ga-abụ ndị a sụgharịrị otú e si dee ha n’asụsụ e ji dee Baịbụl mgbe okwu ndị ahụ na otú e si dee ha dabara n’otú e si asụ asụsụ ahụ a na-asụgharị.

Okwu ndị dị na ya ga-abụ ndị a sụgharịrị n’ụzọ ziri ezi a ga-aghọta ha ma ọ bụrụ na ịsụgharị ha otú ahụ e si dee ha n’asụsụ e ji dee Baịbụl ga-agbanwe ihe ha pụtara ma ọ bụ mee ka a ghara ịghọta ha.

Ọ ga-abụ nke e ji asụsụ dị mfe nghọta nke ndị mmadụ na-asụ sụgharịa, bụ́ nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị ịgụ ya.

Baịbụl e si otú a sụgharịa ọ̀ dị? Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-amasị ọtụtụ nde ndị na-agụ magazin a. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha kwetara ihe kọmitii sụgharịrị ya kwuru, bụ́ nke dị n’okwu mmalite nke Bekee mbụ e bipụtara. Ọ sịrị: “Anyị anaghị akọwa Akwụkwọ Nsọ akọwa. Anyị gbalịsiri ike hụ na anyị sụgharịrị Baịbụl a otú e si dee ya n’asụsụ e ji dee Baịbụl n’ebe ọ bụla o kwekọrọ n’otú e si ede asụsụ Bekee n’oge a nakwa n’ebe ịsụgharị ya otú e si dee ya na-agaghị eme ka a ghara ịghọta ihe a na-ekwu.”

E bipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ozuzu ya ma ọ bụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik n’ihe karịrị asụsụ iri isii. Ọnụ ọgụgụ e bipụtara ha karịrị otu narị nde na nde iri anọ na ise! Ọ bụrụ na Baịbụl a dị n’asụsụ gị, ọ ga-adị mma ka ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha nye gị otu ka i jiri anya gị hụ otú Baịbụl a a sụgharịrị nke ọma si baa uru.

Ọ dị ndị ji ezi obi ha na-amụ Baịbụl mkpa ịghọta ihe ndị dị na Baịbụl ma na-eme ha eme. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ha, Baịbụl a sụgharịrị nke ọma dị gị mkpa. N’ezie, i kwesịrị inweta Baịbụl a sụgharịrị nke ọma ị ga na-agụ ma ghọta.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Nsụgharị e dere asụsụ abụọ na ya na-enyere onye na-agụ ya aka ịhụ asụsụ e ji dee Baịbụl na otú e si sụgharịa okwu nke ọ bụla n’asụsụ ọzọ kpọmkwem otú ahụ e si dee ya.

^ par. 17 Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ nsụgharị Baịbụl Bekee ji ọtụtụ okwu ndị ha na ibe ha yiri sụgharịa ọtụtụ okwu karịa otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mere. O mere ka okwu ndị ahụ ghara inwecha otu olu.

^ par. 25 Baịbụl kwuru na anyị na-alaghachi n’ájá mgbe anyị nwụrụ, na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, nakwa na onye nwụrụ anwụ anaghị eche echiche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla. (Jenesis 3:19; Ekliziastis 9:5, 6; Ezikiel 18:4) Ọ dịghị ebe Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi ndị ajọ omume na-ata ahụhụ n’ọkụ mmụọ ruo ebighị ebi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Baịbụl ndị a kọwara akọwa nwere ike ịdị ụtọ n’ihi na ọ na-adị mfe ọgụgụ. Ma, ịsụgharị Baịbụl ka ọ dị mfe ọgụgụ na-eme mgbe ụfọdụ ka a ghara ịghọta ihe dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl ma ọ bụ gbanwee ihe dị na ya

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

E bipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ozuzu ya ma ọ bụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik n’ihe karịrị asụsụ iri isii. Ọnụ ọgụgụ e bipụtara ha karịrị otu narị nde na nde iri anọ na ise!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

BAỊBỤL A KỌWARA AKỌWA N’OGE OCHIE

Baịbụl ndị a kọwara akọwa abụghị ihe ọhụrụ. N’oge ochie, ndị Juu chịkọtara ma sụgharịa Baịbụl a na-akpọ ugbu a Baịbụl Arameik, ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ a kọwara akọwa. Ọ bụ ezie na nsụgharị ha ezighị ezi, ọ na-eme ka a mata otú ndị Juu si ghọta amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl, na-enyekwara ndị nsụgharị aka ịghọta amaokwu ụfọdụ siri ike na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, na Job 38:7, a kọwara na “ụmụ Chineke” bụ “ìgwè ndị mmụọ ozi.” Na Jenesis 10:9, okwu Hibru a gbakwụnyere na Baịbụl Arameik mgbe a na-akọwa ụdị onye Nimrọd bụ pụtara “imegide” ma ọ bụ “nke na-emegide,” ọ bụghị “n’ihu” nkịtị. Mgbe a na-agụ amaokwu ndị ahụ a kọwara akọwa, a na-agụkwa ndị nke a na-akọwaghị akọwa dị na Baịbụl, e jighị ha dochie anya Baịbụl.

[Foto]

AMAOKWU NDỊ A SI NA BAỊBỤL BỤ́ “BIBLIA POLYGLOTTA,” NKE WALTON SỤGHARỊCHARA NA 1657 JOB 38:1-15

Ebe e dere ya n’asụsụ Hibru (deekwa nsụgharị Latin ya n’okpuru okwu Hibru nke ọ bụla)

Otú e si sụgharịa amaokwu ndị ahụ na Baịbụl Arameik

[Foto dị na peeji nke 19]

AMAOKWU SI NA BAỊBỤL BỤ́ “THE KINGDOM INTERLINEAR TRANSLATION OF THE GREEK SCRIPTURES,” NDỊ EFESỌS 4:14

Ahịrịokwu ndị dị n’aka ekpe bụ ebe a sụgharịrị ya kpọmkwem otú e si dee ya. Ahịrịokwu ndị dị n’aka nri bụ ebe a sụgharịrị ihe ọ pụtara

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 18]

Akwụkwọ dị n’azụ: Shrine of the Book, Israel Museum, Jerusalem