Mmiri Na-asụpụta Asụpụta Inye Ndụ Ebighị Ebi
Mmiri Na-asụpụta Asụpụta Inye Ndụ Ebighị Ebi
“Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị, kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.”—JỌN 4:14.
“NA MBEREDE, ìhè si n’azụ ọnwa na-apụta . . . na-egbuke egbuke ka ọ na-apụta, ọ na-acha ọcha, na-achatụkwa anụnụ anụnụ. Ọ dị okirikiri, ihe dị ka alụlụụ ọcha nke na-achatụ anụnụ anụnụ na-erugharị n’elu ya. O ji nke nta nke nta pụtachaa wee yie obere nkume dị oké ọnụ ahịa n’etiti oké ọchịchịrị nke gbara ya gburugburu.”—Edgar Mitchell, onye na-aga na mbara igwe, si otú a kọwaa otú ụwa dị mgbe ọ nọ na mbara igwe lee ya anya.
Gịnị mere ụwa anyị ji egbuke egbuke nke ukwuu nke na nwoke a na-aga na mbara igwe ji ya dee uri? Ọ bụ n’ihi mmiri nke kpuchiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ụwa. N’ezie, ọ bụghị naanị na mmiri mere ka ụwa anyị maa mma; ọ na-enyekwara ihe niile e kere eke dị ndụ n’ụwa aka. N’ezie, ihe karịrị ọkara nke ihe dị mmadụ n’ahụ́ bụ mmiri. Ọ bụ ya mere akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica ji kwuo, sị: “Ọ bụ ihe dị oké mkpa ná ndụ, ọ dịkwa osisi na anụmanụ mkpa.”
Mmiri dị n’ụwa anaghị agwụ agwụ n’ihi ụzọ magburu onwe ya mmiri zoro ezo si alaghachi n’eluigwe ma zoo ọzọ. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmiri ọ bụla anyị ji mee mkpa anyị na-alaghachi n’oké osimiri. Ya laghachi n’ebe ahụ, anyanwụ amịkọrọ ya. E mechaa, ya aghọọ mmiri ozuzo, zoo. Anyị na-eji otu mmiri eme mkpa anyị ugboro ugboro. Ọ naghị agwụ agwu.” N’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Baịbụl kọwara ụzọ a dị ịtụnanya anyị si enweta mmiri, sị: “Iyi niile na-asọba n’oké osimiri, ma oké osimiri adịghị eju eju. N’ebe iyi si asọpụta, n’ebe ahụ ka ọ na-asọghachi ka o wee sọpụta.” Otú mmiri si ezo ma na-alaghachi n’eluigwe bụ ihe e kere eke dị ịtụnanya!—Ekliziastis 1:7.
N’ihi otú mmiri si dị mkpa ná ndụ na ụzọ dị ịtụnanya anyị si enweta ya, o kwesịghị iju anyị anya na e dere ya na Baịbụl ihe karịrị narị ugboro asaa. Baịbụl na-ejikarị uru mmiri bara, karịchaa, otú o si eme ka ihe dị ọcha na otú o si akwado ndụ eme ihe atụ otú Okwu Chineke nwere ike isi mee ka ofufe anyị na-efe Chineke dị ọcha.—Aịzaya 58:11; Jọn 4:14.
Ikike Baịbụl Nwere Ime Ka Mmadụ Dị Ọcha
E ji ịdị ọcha mara ndị Izrel n’ihi otú ha si asa ahụ́ na uwe ha mgbe niile. Ọ bụ omenala ha mmadụ ịsa ụkwụ mgbe ọ na-abanye n’ụlọ ịga rie nri. (Luk 7:44) E wezụga iji mmiri saa ahụ́ na iji ya saa ihe ndị ọzọ, ụmụ Izrel na-eji mmiri edebe onwe ha ọcha dị ka iwu kwuru. Ndị nchụàjà ndị na-eje ozi n’ụlọikwuu na-asa ahụ́ na uwe ha mgbe niile. (Ọpụpụ 30:18-21) Mgbe Sọlọmọn wuru ụlọ nsọ na Jeruselem, o ji ọla kọpa rụọ “oké osimiri a wụrụ awụ” nke a na-awụnye mmiri karịrị puku iri lita anọ na puku anọ, nke na-ezu iji debe ihe niile Iwu Chineke kwuru ka a saa mmiri ọcha. (2 Ihe E Mere 4:2, 6) Gịnị ka ihe a ha ji mmiri eme pụtaara Ndị Kraịst taa?
Pọl onyeozi kọwara na Jizọs ji mmiri saa ọgbakọ Ndị Kraịst “wee mee ka ọ dị ọcha site n’okwu Chineke.” Otú ahụ mmiri si asacha ihe, eziokwu nke okwu Chineke nwekwara ikike ịsacha omume mmadụ na otú onye ahụ si efe ofufe. Onye okwu Chineke sachara ‘ga-adị nsọ, ọ gaghịkwa enwe mmerụ.’ (Ndị Efesọs 5:25-27) Ya mere, ndị niile chọrọ ka Chineke nwee mmasị n’ebe ha nọ ga-abụrịrị “ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ” n’omume ha nakwa n’ofufe ha. (2 Pita 3:11, 14) Olee otú Okwu Chineke si enyere ha aka ime nke a?
Ndị chọrọ ime ka obi tọọ Jehova bụ́ Chineke ụtọ na-aṅụ mmiri nke okwu Chineke site n’ịmụchi Baịbụl anya. Mgbe ihe ha na-amụta ruru ha n’ime obi nakwa n’uche, ọ na-eme ka ọ gụsie ha agụụ ike ime ihe Baịbụl kwuru, nke na-asị: “Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.
Ịmụta uche Chineke nke ọma ga-enyere ha aka ịchọpụta ihe na-adịghị mma n’omume ha na echiche ha. Ka ha na-agbaso ihe Baịbụl kwuru ná ndụ ha, Okwu Chineke ‘ga-asacha’ ha dị ka mmiri ka oge na-aga, ọbụna sachapụ ha mmehie dị oké njọ.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.
Lee otú okwu Chineke si gbanwee otu nwa okorobịa nke bi na Spain. Alfonso kọrọ, sị, “Mgbe m dị afọ iri na asatọ, ndụ m adịghị m ụtọ.” Ọgwụ ọjọọ eriela ya ahụ́, ọ bụkwa onye omekome. Ọ sịrị: “Onwe m gbụrụ m n’ihi ihe m na-eme ahụ́ m na otú m si emeso ndị ọzọ ihe.
“N’ụlọ akwụkwọ, achọpụtara m na e nwere otu nwa agbọghọ mụ na ya bụ ọgbọ nke àgwà ya na ejiji ya dị mma nke mere ka ọ dị iche n’ebe ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nọ. Otú o si ebi ndụ mere ka ibi ndụ dị ọcha ka ya gụwa m agụụ. Ọ gwara m ka m gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, m wee gaa. N’oge na-adịghị anya, m malitere ịmụ Baịbụl na ime ka mụ na Chineke bụrụ enyi. N’ime otu afọ, m mere ka ndụ m dị ọcha, m wee ghọọ Onyeàmà e mere baptizim. Oké mgbanwe ahụ m mere mere ka ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị agbata obi anyị bịakwute m na-arịọ m ka m nyere ụmụ ha na-eto eto aka bụ́ ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ririla ahụ́.”
Mmiri nke Na-enye Ndụ Ebighị Ebi
Jizọs gwara nwaanyị Sameria nke bịara isere mmiri n’olulu mmiri Jekọb banyere “mmiri na-enye ndụ.” Ọ sịrị: “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị, kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:10, 14) Ihe Jizọs kwuru na-egosi na ‘mmiri ahụ na-enye ndụ’ bụ ndokwa niile Chineke mere iji nye ụmụ mmadụ ndụ, bụ́ nke a kọwara n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Ndokwa ndị a na-eme ka o kwe ụmụ mmadụ omume ịdị ndụ ebighị ebi. Otu n’ime ihe dị mkpa so ná ndokwa a, nke e ji mmiri mee ihe atụ ya, bụ àjà mgbapụta Kraịst Jizọs. Jizọs kwuru na “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.
Alfonso, nke e kwuru okwu ya na mbụ, aghọtala na “mmiri na-enye ndụ” nke Chineke na-enye dị oké mkpa. O kwuru banyere ndị na-esepụghị aka n’ime mpụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ, sị: “Nwanne m nwoke anwụọla, ndị enyi m anwụchaala. Otu ihe ahụ gaara eme m ma à sị na ọ bụghị ihe m mụtara n’Okwu Chineke. Ọ bụ n’ihi ndokwa Jehova mere m ka ji dịrị ndụ.” Ọ bụghị naanị nke ahụ, n’ihi ihe Alfonso mụtara n’Okwu Chineke, ọ na-atụ anya ibi ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13.
Òkù A Na-Akpọ Mmadụ Niile
N’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, a kọrọ banyere “osimiri nke mmiri nke ndụ, nke na-egbuke egbuke dị ka kristal, ka o si n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ na-asọpụta.” (Mkpughe 22:1) Mmiri ahụ na-anọchi anya ndokwa Chineke nke ga-emecha mee ka ụmụ mmadụ zuo okè otú ahụ Adam na Iv zuru okè mgbe e kere ha.
Mgbe Baịbụl kwuchara banyere osimiri ahụ, ọ kpọrọ òkù, sị: “Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa; onye ọ bụla nke chọrọ, ya Mkpughe 22:17) Taa, a na-akpọ òkù a n’ụwa dum. Kwa afọ, Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise, na-eji ihe karịrị otu nde awa enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe dị na Baịbụl, bụ́ nke na-enye ndụ.
nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mmiri nke ndụ ọ̀ na-agụ gị agụụ? Ọ bụrụ na ị ṅụọ mmiri ahụ dị ọcha, ya bụ, ọ bụrụ na ị mụta banyere ndokwa Chineke mere, nabatakwa ya ná ndụ gị, ị ga-esokwa ná ndị “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:19.
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo dị na peeji nke 14]
Otú ahụ mmiri si asacha ihe, okwu Chineke nwere ikike ịsacha omume mmadụ na otú onye ahụ si efe ofufe
[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]
EBE E SI ENWETA MMIRI N’OGE OCHIE
N’oge ochie, ndị mmadụ gbara mbọ dị ukwuu iji nweta ebe ha ga na-echute mmiri dị mma. Ebreham na Aịzik gwuru ọtụtụ olulu mmiri n’ebe na-adịghị anya na Bia-shiba iji hụ na ha ga na-enweta mmiri ga-ezuru ezinụlọ ha na anụ ụlọ ha.—Jenesis 21:30, 31; 26:18.
Mmiri na-ata n’olulu mmiri na-emighị emi ma e nwee oké ọkọchị. A na-egwumi olulu mmiri egwumi ka mmiri dị na ya ghara ịta. (Ilu 20:5) Otu olulu mmiri nke dị na Lachish ruru mita iri anọ na anọ n’ịdị omimi. Otu olulu mmiri ọzọ, nke dị na Gibeon, ruru mita iri abụọ n’ise n’ịdị omimi, obosara ya adịrị mita iri na otu. E gwupụtara nkume dị ihe dị ka puku tọn atọ n’olulu mmiri ahụ. Nwaanyị Sameria nke gara isere mmiri n’olulu mmiri Jekọb gwara Jizọs, sị: ‘Olulu mmiri a miri emi.’ Ikekwe, ebe mmiri dị n’olulu ahụ bụ n’ala ala ya, ebe ruru mita iri abụọ na atọ site n’elu ya.—Jọn 4:11.
N’ala Izrel oge ochie, ụzọ ọzọ e si enweta mmiri bụ igwu olulu e ji echeta mmiri ozuzu. Mmiri nke na-ezo malite n’October ruo April na-asọba n’olulu ndị ahụ. A na-egburu mmiri si n’ugwu na-asọdata ọwa ka ọ hụ ebe ọ ga-esi na-asọba n’olulu ahụ. Ụmụ Izrel na-egwu olulu buru ibu ha ji echekwa mmiri.—2 Ihe E Mere 26:10.
Isete mmiri n’olulu mmiri ndị ahụ abụghị obere ọrụ. Ọ bụghị obere ọrụ ka ụmụ nwaanyị ndị dị ka Ribeka na ụmụ Jetro na-arụ n’oge ha na-esetere ezinụlọ ha na anụ ụlọ ha mmiri kwa ụbọchị.—Jenesis 24:15-20; Ọpụpụ 2:16.
[Foto dị na peeji nke 15]
Mgbe Alfonso na-ekwusa ozi ọma taa