“Ọ Nọghị n’Ebe Dị Anya n’Ebe Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Nọ”
Bịaruo Chineke Nso
“Ọ Nọghị n’Ebe Dị Anya n’Ebe Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Nọ”
O NWEGHỊ ihe ụmụ mmadụ bụ ma e jiri ha tụnyere eluigwe na ala. Ikekwe, ị jụọla n’obi gị, sị, ‘Ụmụ mmadụ nkịtị na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile hà nwere ike ịdị ná mma?’ Ọ ga-ekwe omume naanị ma ọ bụrụ na Chineke, onye aha ya bụ Jehova, chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. Ọ̀ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso? Azịza ya nke na-akasi obi dị n’okwu Pọl onyeozi ji nkwuwa okwu gwa ndị ikom Atens ndị gụrụ akwụkwọ, nke e dere n’Ọrụ 17:24-27. Ị ga-ahụ ihe anọ Pọl kwuru banyere Jehova.
Nke mbụ, Pọl kwuru na Chineke “kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya.” (Amaokwu nke 24) Ihe dị iche iche mara mma dị n’ụwa, bụ́ ndị na-eme ka ndụ na-atọ ụtọ, na-egosi na Onye Okike anyị bu ọdịmma anyị n’uche, hụkwa anyị n’anya. (Ndị Rom 1:20) Ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya mmadụ iche na Chineke a agaghị ekwe ka ndị ọ hụrụ n’anya bịaruo ya nso.
Nke abụọ, Jehova “na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Amaokwu nke 25) Jehova bụ Onye Na-akwado ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ikuku, mmiri, na nri, bụ́ ihe ndị dị oké mkpa ná ndụ, bụcha onyinye Onye Okike anyị nyere anyị. (Jems 1:17) Ànyị kwesịrị ikweta na Chineke anyị, bụ́ onye na-emesapụ aka, ga-anọ n’ebe dị nnọọ anya ka anyị ghara ịmata onye ọ bụ ma bịaruo ya nso?
Nke atọ, Chineke ‘sitere n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.’ (Amaokwu nke 26) Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ naghịkwa emere ụfọdụ ndị ihe ma hapụ ndị ọzọ. (Ọrụ 10:34) Gịnị mere anyị ji kwere na nke a bụ eziokwu? O kere “otu mmadụ,” ya bụ, Adam, bụ́ onye mba niile na agbụrụ niile sitere n’ebe ọ nọ. Ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile.” (1 Timoti 2:4) N’ihi ya, anyị nwere ohere ịbịaru ya nso n’agbanyeghị otú akpụkpọ ahụ́ anyị na-acha, mba anyị si na ya, ma ọ bụ agbụrụ anyị.
Pọl kwukwara eziokwu kacha emesi obi ike, ya bụ, na Jehova ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Amaokwu nke 27) N’agbanyeghị na Jehova dị elu nke ukwuu, ọ nọ nso mgbe niile n’ebe ndị ji ezi obi na-achọ ịbịaru ya nso nọ. Okwu ya mesiri anyị obi ike na ọ nọghị n’ebe dị anya, kama, ọ “nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”—Abụ Ọma 145:18.
Ihe Pọl kwuru mere ka o doo anya na Chineke chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. Ma, Pọl kọwara na ọ bụ naanị ndị dị njikere ‘ịchọ’ Chineke na ‘ịsọ ìsì’ iji chọta ya, ka ọ ga-eme ka ha bịaruo ya nso. (Amaokwu nke 27) Otu akwụkwọ ndị nsụgharị Baịbụl ji eme nnyocha kwuru na “okwu abụọ ahụ na-egosi ihe mmadụ ga-enwetali . . . ma ọ bụ ihe mmadụ chọrọ nke nwere ike iru ya aka.” Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na ị nọ n’ụlọ gị n’oge ọchịchịrị gbara, i nwere ike na-asọgharị ìsì na-achọ ebe e si agbanye ọkụ eletrik ma ọ bụ ọnụ ụzọ, ma, ị ma na ị ga-achọta ya. Ọ bụrụkwa na anyị ejiri ezi obi na-achọ Chineke, na-asọ ìsì ka anyị chọta ya, anyị ji n’aka na mgbalị anyị ga-arụpụta ihe ọma. Pọl gwara anyị na anyị ‘ga-achọta ya n’ezie.’—Amaokwu nke 27.
Ị̀ chọrọ ịbịaru Chineke nso? Ọ bụrụ na i jiri okwukwe malite ‘ịchọ Chineke’ na ‘ịsọ ìsì ka ị chọta ya,’ ị ga-achọta ya. Ịchọta Jehova dị mfe, n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”