Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Ị Chọrọ Ime Hà Kwekọrọ ná Nzube Chineke?

Ihe Ndị Ị Chọrọ Ime Hà Kwekọrọ ná Nzube Chineke?

Ihe Ndị Ị Chọrọ Ime Hà Kwekọrọ ná Nzube Chineke?

O NWERE otu nnụnụ na-acha ntụ ntụ, nke na-ebekarị ubé. Nnụnụ a na-efegharị n’oké ọhịa dị n’ebe ọdịda anyanwụ North America. Ọ na-aghọrọ ihe dị ka puku mkpụrụ osisi iri atọ na puku atọ kwa afọ ma lie ha n’ebe dị iche iche ruru puku abụọ na narị ise n’ime ala, iji kwadebe maka oge oké oyi. N’eziokwu, otú nnụnụ a si akpakọba nri ọ ga-eri n’ọdịnihu na-egosi na o nwere ‘amamihe nke o bu pụta ụwa.’—Ilu 30:24.

Mmadụ nwere ikike dị ịtụnanya karịa ya. N’ihe niile Jehova kere n’ụwa, ọ bụ ụmụ mmadụ nwere ikike na-enweghị atụ n’ịmụta ihe n’ihe ndị garala aga nakwa n’iji ihe ndị ha mụtara na-eme atụmatụ maka ọdịnihu. Onye amamihe bụ́ Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Atụmatụ ndị dị n’obi mmadụ dị ọtụtụ.”—Ilu 19:21.

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, ụmụ mmadụ na-adabere naanị n’ihe ha chere echi ga-eweta eme atụmatụ ha. Dị ka ihe atụ, ihe ndị i mere atụmatụ ị ga-eme echi ga-enwe isi ma ọ bụrụ na anyanwụ ga-apụta, nakwa ma ọ bụrụ na ị ga-adịru ndụ echi. O doro anya na anyanwụ ga-apụta echi, ma i jichaghị n’aka na ị ga-adịru ndụ echi. Ọ bụ ya mere onye so dee Baịbụl bụ́ Jems ji kwuo, sị: “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.”—Jems 4:13, 14.

Jehova bụ́ Chineke maara ihe niile. Ọ ma site ‘ná mmalite ihe ga-eme n’ikpeazụ.’ Ihe ọ sọkwara ya bụrụ, nzube ya ga-emezu. O kwuru, sị: “Ihe m kpebiri ga-adịgide, ọ bụkwa ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme.” (Aịzaya 46:10) Ma, olee maka mgbe ihe ụmụ mmadụ chọrọ ime megidere nzube Chineke?

Mgbe Atụmatụ Ụmụ Mmadụ Megidere Nzube Chineke

N’ihe dị ka puku afọ anọ gara aga, ndị wuru Ụlọ Elu Bebel mere atụmatụ ka ụmụ mmadụ ghara ịgbasa n’ụwa. Ha kwuru, sị: “Ngwanụ! Ka anyị wuoro onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”—Jenesis 11:4.

Ma, nzube Chineke maka ụwa dị nnọọ iche na nke a. O nyere Noa na ụmụ ya iwu, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” (Jenesis 9:1) Olee ihe Chineke mere mgbe ndị nnupụisi ahụ nọ na Bebel mere atụmatụ ahụ? Ọ ghagburu asụsụ ha ka ha ghara ịnụ ihe ibe ha na-ekwu. Oleezi ihe merenụ? “Jehova wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa dum.” (Jenesis 11:5-8) Ndị ahụ wuru Bebel mụtara ihe dị mkpa, ma, ha amụtaghị ya n’anya ọma. Mgbe atụmatụ ụmụ mmadụ na-ekwekọghị ná nzube Chineke, “ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike.” (Ilu 19:21) Ị̀ na-ekwe ka ihe ndị ị mụtara n’ihe ndị mere n’oge gara aga na-emetụta ndụ gị?

Nwoke Bara Ọgaranya nke Na-amaghị Ihe

O nwere ike ị naghị eme atụmatụ ịrụ ụlọ elu, ma ọtụtụ ndị taa na-eme atụmatụ inwe nnukwu ego n’ụlọ akụ̀ na ịkpakọba ihe onwunwe ka ụwa wee dị ha ụtọ mgbe ha lara ezumike nká. O nweghị onye ọ na-anaghị amasị ka o rie ihe ọ rụtara. Sọlọmọn dere, sị: “Onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.”—Ekliziastis 3:13.

Anyị ga-aza Jehova ajụjụ ihe anyị ji onyinye a o nyere anyị mee. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jizọs ji otu ihe atụ mee ka nke a doo ndị na-eso ụzọ ya anya. Ọ sịrị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma. N’ihi ya, ọ malitere iche n’obi ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na mụ enweghị ebe ọ bụla m ga-achịkọta ihe ubi m?’ Ya mere, ọ sịrị: ‘Ihe m ga-eme bụ: M ga-etidasị ụlọ nkwakọba ihe m ma wuo ndị ka ibu, n’ebe ahụ ka m ga-achịkọta mkpụrụ m niile na ezi ihe m niile; m ga-asịkwa mkpụrụ obi m: “Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe m kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.”’” (Luk 12:16-19) Atụmatụ nwoke ahụ bara ọgaranya yiri ihe ezi uche dị na ya, ka ọ̀ bụ na o yighị? Dị ka nnụnụ ahụ e kwuru okwu ya na mbụ, o yiri ka nwoke ahụ e ji mee ihe atụ na-akwadebe ihe ndị dị ya mkpa n’ọdịnihu.

Ma, o nwere ihe dị njọ n’echiche nwoke ahụ. Jizọs kwukwara, sị: “Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’” (Luk 12:20) Ihe a Jizọs kwuru, ò megidere ihe Sọlọmọn kwuru nke bụ́ na ọrụ na ihe ọma si na ya apụta bụ onyinye Chineke? Mba. Olee ihe Jizọs na-ekwu? Jizọs sịrị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:21.

Jizọs na-akụziri ndị na-ege ya ntị na Jehova chọrọ ka anyị cheta Ya mgbe ọ bụla anyị na-eme atụmatụ. Nwoke ahụ bara ọgaranya gaara aba ọgaranya n’ebe Chineke nọ site n’ịchọ otú ọ ga-esi mee ka ya na Chineke dịkwuo ná mma na otú ọ ga-esi nwekwuo amamihe Chineke na ịhụnanya. Ihe ndị nwoke ahụ kwuru gosiri na o nweghị mmasị n’ihe ndị ahụ, ọ chọghịkwa ịhapụ ụfọdụ n’ime ihe ubi ya ka ndị ogbenye were ha, ma ọ bụkwanụ were ha nye Jehova. Omume achọghị naanị ọdịmma onwe onye na ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke agbasaghị nwoke ahụ. Atụmatụ ndị o mere bụ naanị maka ọdịmma onwe ya nakwa iji mee onwe ya obi ụtọ.

Ị̀ chọpụtala na ihe ọtụtụ mmadụ na-ebute ụzọ ná ndụ taa bụ otu ihe ahụ Jizọs kwuru banyere nwoke ahụ bara ọgaranya? Ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye, ọ dị nnọọ mfe anyị ịmalite ịhụ ihe onwunwe n’anya na ikwe ka ihe ndị na-akpa anyị na ihe ndị anyị chọrọ ná ndụ mee ka anyị leghara mmekọrịta anyị na Chineke anya. Olee ihe i nwere ike ime iji zere ọnyà a?

Ime Atụmatụ Ibi “Ezi” Ndụ

O nwere ike i nweghị ego ka nwoke ahụ Jizọs ji mee ihe atụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, o doro anya na ị na-eme atụmatụ otú ị ga-esi na-akpata ihe ezinụlọ gị ga-eri, nwetakwa ego ị ga-eji zụọ ụmụ gị n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, atụmatụ ị na-eme nwere ike ịbụ otú ị ga-esi nweta ọrụ ma ọ bụ otú ị ga-esi nọgide na-arụ ọrụ gị, ka i wee ghara ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ. Atụmatụ ndị a adịghị njọ.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12; 1 Timoti 5:8.

Ma, mmadụ ịrụ ọrụ, iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ya bụ, ibi ndụ ndị mmadụ na-ewere na ọ bụ ezi ndụ, nwere ike ime ka mmadụ na-eme ihe megidere uche Chineke. Olee otú nke a nwere ike isi mee? Jizọs sịrị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.

Tupu e nwee Iju Mmiri ahụ, ndị mmadụ nọ na-ebi ụdị ndụ ha chere na ọ bụ ezi ndụ. Ma, nsogbu ha nwere bụ na ha ‘amaghị’ nzube Chineke nke bụ́ iji iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ kpochapụ ndị ajọ omume. O doro anya na ha chere na Noa anaghị ebi ezi ndụ. Ma, mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ụdị ndụ Noa na ezinụlọ ya biri bụ ndụ kacha mma.

Taa, ihe àmà niile e nwere na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ. (Matiu 24:3-12; 2 Timoti 3:1-5) N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke “ga-egwepịa” ụwa ochie a, ‘mee ka ọ ghara ịdịkwa.’ (Daniel 2:44) N’oge Alaeze ahụ ga-amalite ịchị ụwa, ụwa ga-aghọ paradaịs. Alaeze ahụ ga-ewepụ ọrịa na ọnwụ. (Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:3-5) Ihe niile e kere eke nọ n’ụwa ga-adị n’otu, nri agaghị akọ ha.—Abụ Ọma 72:16; Aịzaya 11:6-9.

Ma, tupu Jehova emee ihe, nzube ya bụ ka ‘e kwusaa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’ (Matiu 24:14) Iji mezuo nzube Chineke, ihe dị ka puku Ndịàmà Jehova asaa ji ihe karịrị narị asụsụ anọ na-ekwusa ozi ọma a na narị ala abụọ na iri atọ na isii.

Otú Ndịàmà Jehova si ebi ndụ nwere ike ịdị na-eju ndị nọ n’ụwa anya, o nwekwara ike ịdị na-atọ ha ọchị. (2 Pita 3:3, 4) Dị ka ndị ahụ dịrị ndụ tupu Iju Mmiri, ọtụtụ ndị taa emikpuola onwe ha n’ihe dị iche iche a na-eme ná ndụ. Ha na-ewere onye ọ bụla na-anaghị ebi ndụ otú ha chere e kwesịrị isi na-ebi ndụ dị ka onye ndụ ya na-enweghị isi. Ma, n’ebe ndị nwere okwukwe ná nkwa ndị Chineke kwere nọ, ndụ kacha mma n’ezie bụ nke hiwere isi n’ijere Chineke ozi.

N’ihi ya, ma ị bara ọgaranya ma ị dara ogbenye, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị na-enwetatụ ihe na-ezuru gị, ọ dị mma site n’oge ruo n’oge ka ị na-atụle atụmatụ ndị ị na-eme maka ọdịnihu. Mgbe ị na-eme nke a, jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe ndị m na-achọ ime hà kwekọrọ ná nzube Chineke?’

[Foto dị na peeji nke 11]

Mgbe atụmatụ mmadụ na-ekwekọghị ná nzube Chineke, ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike

[Foto dị na peeji nke 12]

Mgbe nwoke ahụ bara ọgaranya nke Jizọs ji mee ihe atụ na-eme atụmatụ, o leghaara nzube Chineke anya