Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Gịnị mere ndị Juu ji amalite idebe Ụbọchị Izu Ike ha ná mgbede?
Mgbe Jehova nyere ụmụ Izrel iwu banyere Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, ọ sịrị: “Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a . . . Ọ bụ ụbọchị izu ike, nke unu ga-ezu naanị ike na ya . . . Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.” (Levitikọs 23:28, 32) Iwu a na-egosi na ụbọchị ha na-amalite ná mgbede, mgbe anyanwụ dara. Ọ na-agwụkwa ná mgbede echi ya. Ya mere, ụbọchị ndị Juu na-amalite ná mgbede, gwụ ná mgbede.
Otú ndị Juu si agụ ụbọchị yiri otú Chineke si gụọ ụbọchị. Baịbụl kwuru banyere ụbọchị mbụ e kere ihe, nke bụ́ ụbọchị ihe atụ, sị: “E wee nwee mgbede, nweekwa ụtụtụ, ya abụrụ ụbọchị nke mbụ.” Ọ bụkwa otú ahụ ka e si gụọ “ụbọchị” ndị ọzọ sochiri ya, malite ná “mgbede.”—Jenesis 1:5, 8, 13, 19, 23, 31.
Ọ bụghị naanị ndị Juu si otú ahụ agụ ụbọchị. Ndị Atens, ndị Numidia, na ndị Finishia sikwa otú ahụ agụ ụbọchị. Ma, ụbọchị ndị Babịlọn na-amalite n’oge anyanwụ wara, ebe ụbọchị ndị Ijipt na nke ndị Rom na-amalite n’etiti abalị, bụ́ otú ọtụtụ ndị si agụ ụbọchị n’oge anyị a. Ma, ndị Juu nke oge a ka na-amalite Ụbọchị Izu Ike ha mgbe anyanwụ dara, na-akwụsịkwa ya mgbe anyanwụ dara n’echi ya.
Gịnị bụ ‘njem otu ụbọchị izu ike’?
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtachara n’Ugwu Oliv wee hụ mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ha laghachiri Jeruselem, “nke bụ́ njem na-ewe otu ụbọchị izu ike site n’ebe ahụ.” (Ọrụ 1:12) Mmadụ nwere ike iji ụkwụ jee kilomita iri atọ ma ọ bụ karịa n’otu ụbọchị. Ma, Ugwu Oliv dị nso na Jeruselem. Ya mere, gịnị ka ‘njem otu ụbọchị izu ike’ pụtara?
Ụbọchị Izu Ike bụ ụbọchị ụmụ Izrel ji ezu ike n’ọrụ ha. Ha ekwesịghịdị ịfụnwu ọkụ n’ụlọ ha n’ụbọchị ahụ. (Ọpụpụ 20:10; 35:2, 3) Jehova nyere ha iwu, sị: “Onye ọ bụla nọrọ n’ụlọ ya. Ka onye ọ bụla ghara isi n’ebe o bi pụọ n’ụbọchị nke asaa.” (Ọpụpụ 16:29) Iwu a mere ka ụmụ Izrel nwee ohere izu ike n’ọrụ ha nakwa ka ha wee tinyekwuo uche n’ife Chineke.
Ma, ihe Jehova nyere n’iwu ezurughị ndị rabaị, bụ́ ndị ime iwu na-atọ ụtọ. Ọ bụ ya mere ha ji jiri aka ha nye iwu ebe mmadụ nwere ike ịgaru n’Ụbọchị Izu Ike iji fee ofufe. Akwụkwọ bụ́ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature kwuru banyere nke a, sị: “N’ihi ọtụtụ iwu siri ike e nyere maka idebe Ụbọchị Izu Ike . . . , e nyere iwu na o nweghị onye Izrel ga-agafe ihe a na-akpọ njem otu Ụbọchị Izu Ike.” Ọ bụ njem dị puku kubit abụọ, bụ́ ihe dị ka otu kilomita.
[Foto dị na peeji nke 11]
Jeruselem, ma a nọrọ n’Ugwu Oliv na-ele ya anya