“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”
Bịaruo Chineke Nso
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”
OBIỌMA. Ọmịiko. Mgbaghara. Ịhụnanya. Ọ dị mwute ikwu na ọ na-esi ike ịhụ ndị nwere àgwà ọma ndị a taa. Olee maka gị onwe gị? Ò nwetụla mgbe i chere na mgbalị ị na-eme ka i nwee àgwà ọma ndị a agaghị enwe isi? Onye obi na-esighị ike nwere ike ịna-eche na ihe ụfọdụ, dị ka àgwà ọjọọ riri ya ahụ́ ma ọ bụ ihe ndị na-adịghị mma meerela ya ná ndụ, na-eme ka ịmụta ịkpa ezigbo àgwà ghara ikwe ya omume. Ma, Baịbụl na-akụzi eziokwu a na-emesi obi ike, nke bụ́ na Onye kere anyị ma na anyị nwere ike ịmụta ịkpa àgwà ọma.
Okwu Chineke dụrụ ezigbo Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Okwu a na-egosi nke ọma na Chineke nwere obi ike n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Jehova bụ́ Chineke kere mmadụ n’onyinyo Ya, dị ka oyiyi Ya si dị. (Jenesis 1:26, 27) Ya mere, Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha nwee àgwà yiri nke ya. * N’ihi ya, mgbe Baịbụl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke,’ o yiri ka à ga-asị na Jehova na-asị ha: ‘Ama m na unu ga-emeli ya. Ama m na n’agbanyeghị na unu ezughị okè, unu nwere ike ịdịtụ ka m.’
Olee àgwà Chineke ụfọdụ anyị nwere ike iṅomi? Amaokwu ndị ọzọ dị ya nso zara ajụjụ a. Cheta na Pọl bu ụzọ kwuo, “ya mere,” mgbe ọ na-enye ndụmọdụ ka anyị na-eṅomi Chineke. Nke a na-egosi na ọ na-ekwu banyere amaokwu bu ya ụzọ, nke kwuru banyere obiọma, ọmịiko, na mgbaghara. (Ndị Efesọs 4:32; 5:1) Ya mere, mgbe Pọl nyechara ndụmọdụ ka anyị ṅomie Chineke, ọ gwara Ndị Kraịst n’amaokwu sochiri ya ka ha na-ebi ndụ nke na-egosi na ha nwere ịhụnanya nke na-anaghị achọ ọdịmma onwe ya naanị. (Ndị Efesọs 5:2) N’eziokwu, a bịa n’igosi obiọma, ọmịiko si n’ala ala obi, ịhụnanya na ịgbaghara ndị ọzọ kpamkpam, anyị nwere onye anyị kwesịrị iṅomi, bụ́ onye kacha nwee àgwà ndị a. Ọ bụ Jehova Chineke.
Olee ihe mere anyị kwesịrị iji chọọ ịdị ka Chineke? Pọl kwuru ihe dị mkpa mere anyị ga-eji mee otú ahụ, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” Okwu ahụ ó metụghị gị n’ahụ́? Jehova weere ndị na-efe ya ofufe dị ka ụmụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Dị ka nwata nwere ike ịgbalị ka ọ dị ka nna ya, ọ bụ otú ahụ ka ezigbo Ndị Kraịst na-agbalị ike ha niile ka ha dị ka Nna ha nke eluigwe.
Jehova anaghị amanye ụmụ mmadụ ka ha na-eṅomi ya. Kama nke ahụ, o kere anyị ka anyị nwere onwe anyị ịhọrọ ihe anyị ga-eme. N’ihi ya, ọ bụ gị ga-ahọrọ ma ị̀ ga-eṅomi Chineke ma ọ bụ na ị gaghị eṅomi ya. (Diuterọnọmi 30:19, 20) Ma, ya adịla mgbe ị ga-echefu na i nwere ikike ịmụta ịkpa àgwà ndị ahụ Chineke nwere. Otú ọ dị, tupu gị enwee ike iṅomi Chineke, ị ga-eburịrị ụzọ mata ụdị onye ọ bụ. Baịbụl ga-enyere gị aka ịmụta àgwà Chineke na ụzọ ya, bụ́ onye nwere àgwà magburu onwe ya nke merela ka ọtụtụ nde mmadụ ghọọ ndị na-eṅomi ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ndị Kọlọsi 3:9, 10 na-egosi na okike e kere anyị n’onyinyo Chineke bụ n’àgwà. A gbara ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ume ka ha yiri “mmadụ ọhụrụ,” bụ́ nke e mere “ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ [ya bụ, Chineke] kere ya si dị.”