Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Anyị A
Ihe Ndị E Buru n’Amụma na Ha Ga-eme n’Oge Anyị A
BAỊBỤL buru amụma na Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee udo na obi ụtọ na-agaghị akwụsị akwụsị n’ụwa. (Daniel 2:44) N’ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Mgbe Jizọs nọ n’Ugwu Oliv buo amụma ọtụtụ ndị ma, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya kpọmkwem otú ihe ga-adị na ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya tupu Alaeze ahụ abịa. Ihe niile ahụ o kwuru ga-abụ ihe àmà nke ndị niile nwere ezi obi ga na-ahụ nke ọma. Ole n’ime ihe ndị a na-esonụ ka i jirila anya gị hụ?
Agha Mba na Mba. Jizọs buru amụma, sị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:7) Tupu a lụọ agha ụwa nke mbụ n’afọ 1914, ọtụtụ mba anaghị alụso mba ndị ọzọ agha. Ọ bụghị naanị na ọtụtụ mba so lụọ Agha Ụwa nke Mbụ, kama agha ahụ mekwara ka a malite ịrụpụta ajọ ngwá agha dị iche iche ụmụ mmadụ na-ahụtụbeghị ụdị ha tupu mgbe ahụ. Dị ka ihe atụ, e ji otu ụgbọelu a rụpụtara ọhụrụ tụọ ndị nkịtị bọmbụ. Ọtụtụ ngwá agha a rụpụtara n’oge ahụ mere ka e gbuo ọtụtụ mmadụ n’agha ahụ karịa n’agha ọ bụla ọzọ. Ihe dị ka ọkara nde ndị agha iri isii na nde ise nwụrụ n’agha ahụ ma ọ bụ merụọ ahụ́. N’agbanyeghị nke ahụ, agha ndị ọzọ a lụrụ rikwuru isi ọtụtụ ndị mmadụ. Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na “e nweghị ike ịmata” ndị agha ole na ndị nkịtị ole Agha Ụwa nke Abụọ gburu. A ka na-alụkwa agha ruo ugbu a.
Ụnwụ Nri nke Zuru Ebe Niile. Jizọs buru amụma, sị: “A ga-enwekwa ụkọ nri.” (Matiu 24:7) N’afọ 2005, magazin bụ́ Science kwuru, sị: “E nwere narị nde mmadụ asatọ na iri nde ise na nde anọ n’ụwa (ya bụ, ihe karịrị otu onye n’ime mmadụ asaa ọ bụla), bụ́ ndị agụụ na-emekpọ ọnụ.” N’afọ 2007, Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo kwuru na mba iri atọ na atọ enweghị nri ga-ezuru ụmụ amaala ha. Gịnị kpatara ya, ebe ọ bụ na a na-akọpụtakwu ọka na nri ndị dị ka ya? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na a na-ejizi ọka a kọpụtara n’ala, bụ́ nke ndị mmadụ gaara na-eri, emepụta mmanụ ụgbọala. Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na South Africa bụ́ The Witness kwuru, sị: “Ihe ọ ga-ewe iji mepụta mmanụ a ga-agbanye naanị otu ugboro n’ụgbọala a rụrụ maka ụzọ ọjọọ bụ ọka otu onye ga-eri n’otu afọ.” Ná mba ndị mepere emepe, oké ọnụ nri na-ada emeela ka ọtụtụ ndị ghara ịma nke ha ga-eme eme, ọ̀ bụ iji ego ha zụrụ nri ka ọ̀ bụ iji ya kwụọ ụgwọ ihe ndị dị ha mkpa, dị ka ịkwụ ụgwọ ọgwụ ma ọ bụ ụgwọ ọkụ.
Oké Ala Ọma Jijiji. Jizọs sịrị: “A ga-enwekwa oké ala ọma jijiji.” (Luk 21:11) Ọ bụrụ na i chere na ala ọma jijiji na-akpa ọtụtụ mmadụ aka ọjọọ karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ihe i chere bụ eziokwu. Onye India bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ala ọma jijiji, bụ́ R. K. Chadha, kwuru n’afọ 2007, sị: “Anyị na-ahụzi ọtụtụ ala ọma jijiji n’ụwa dum otú anyị na-atụghị anya ya. Ọ dịghị onye ma ihe kpatara ya.” Nkwaga ọtụtụ mmadụ na-akwaga n’ebe ndị ala ọma jijiji nwere ike ime emeela ka ala ọma jijiji na-egbu ọtụtụ ndị. Ụlọ Ọrụ United States nke Na-enyocha Ọdịdị Ala kwuru na ala ọma jijiji nke mere n’Oké Osimiri India n’afọ 2004 na oké ebili mmiri sochiri ya bụ nke “kacha njọ n’ala ọma jijiji niile mere kemgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ ise” nakwa na ọ bụ ya bụ “nke abụọ kacha gbuo ndị mmadụ” n’ala ọma jijiji niile merelanụ.
Ajọ Ọrịa. Jizọs buru amụma na ‘a ga-enwe ọrịa na-efe efe.’ (Luk 21:11) Ọrịa dị iche iche, ma ndị dịbu adị ma ndị pụtara ọhụrụ, na-arịa ọtụtụ mmadụ. Ịgwọ ha na-esikwa ike. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ugboro, mba dị iche iche na-ekwu oge ha ga-eme ka ọrịa ịba kwụsị, ma oge ha kwuru ruo, ha ekwugharịa, maka na ọ ka ha ike. E wezụga nke ahụ, ọrịa ndị dịbu adị na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. Otu n’ime ha bụ ụkwara nta, bụ́ nke ya na ọrịa o biri n’ájá ọcha na ọrịa ndị ọzọ pụtara ọhụrụ na-egbu ọtụtụ mmadụ. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa a nwere nje ọrịa ụkwara nta.” Ngalaba ahụ kwukwara na nje ọrịa o biri n’ájá ọcha so na-eme ka ụkwara nta na-agbasa n’ọtụtụ mba. N’ime tịnkọm tịnkọm ọ bụla, otu onye na-ebute ụkwara nta. Ọgwụ ndị na-agwọbu ụkwara nta anaghịzi agwọ ya. Magazin bụ́ New Scientist kwuru na ọgwụ niile e nyere otu onye na-arịa ụkwara nta n’afọ 2007 “enweghị nke rụrụ ọrụ.”
Mmebi Iwu na Enweghị Ezi Mmekọrịta. Jizọs sịrị: “N’ihi ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) E wezụga ihe Jizọs kwuru, Pọl onyeozi kwuru na oge na-abịa mgbe ndị mmadụ na ibe ha na-agaghị enwe ezi mmekọrịta, mmebi iwu ejukwa ebe niile. O kwuru otú ‘oge ikpeazụ’ a siri ike ga-adị tupu Alaeze Chineke emebie ndị ajọ omume n’oge na-adịghị anya. Ọ sịrị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ na ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ ndị a ugbu a karịa otú ha na-akpabu?
Jizọs na Pọl ekwughị ụzọ niile ndọrọ ndọrọ ọchịchị, àgwà ndị mmadụ, na ihe ndị mere eme ga-esi mee ka ụwa dị otú ọ dị ugbu a. Ma, amụma ha buru kwuru kpọmkwem ihe ndị na-eme ugbu a na àgwà ndị mmadụ na-akpa. Gịnị ga-eme n’ọdịnihu? Amụma Aịzaya buru banyere ọbịbịa Mesaya mezuru, o bukwara amụma banyere mgbanwe dị mma Alaeze Chineke ga-eweta n’ụwa a. Ka anyị tụlee banyere ya n’isiokwu na-esonụ.
[Foto dị na peeji nke 6]
“Mba ga-ebuso mba ọzọ agha”
[Foto dị na peeji nke 7]
‘A ga-enwe ọrịa na-efe efe’
[Ebe E Si Nweta Ya]
© WHO/P. Virot