Ị̀ Na-ewu Ụlọ Gị n’Elu Ájá Ka Ọ̀ Bụ n’Elu Oké Nkume?
Ị̀ Na-ewu Ụlọ Gị n’Elu Ájá Ka Ọ̀ Bụ n’Elu Oké Nkume?
ỊGỤ Baịbụl ọ̀ na-amasị gị? Ị̀ na-ewepụta oge kwa mgbe kwa mgbe ka gị na otu n’ime Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ị ma na ihe ndị ị mụtarala enyerela gị aka ịghọtakwu ihe mere nsogbu ji jupụta n’ụwa ugbu a. (Mkpughe 12:9, 12) Ọ ga-abụkwa na amaokwu dị iche iche dị na Baịbụl kasiri gị obi mgbe ị nọ ná nsogbu, meekwa ka i nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 145:14; 147:3; 2 Pita 3:13.
Otu ihe dị mkpa ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ime bụ inweta ezi ihe ọmụma nke dị na Baịbụl. Ma, ọ̀ bụ naanị ya ka ha kwesịrị ime? Mbanụ. O nwere ihe ọzọ dị mkpa onye na-amụ Baịbụl kwesịrị ime ka o wee nọgide na-abụ Onye Kraịst, karịchaa, mgbe e lere okwukwe ya ule. Gịnị ka ọ bụ? Iji mata ihe ọ bụ, ka anyị tụlee Ozizi Elu Ugwu ná nkenke, bụ́ okwu Jizọs nọ n’otu ugwu dị na Galili kwuo.—Matiu 5:1, 2.
A Nwalere Ụlọ Abụọ
Ị̀ ma ihe dị iche iche Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu? Ozizi a a ma ama dị n’Oziọma Matiu na Luk. (Matiu 5:1-7:29; Luk 6:20-49) Mmadụ ga-eji naanị nkeji iri abụọ gụchaa ozizi ahụ dum. Ma, Jizọs kwuru kpọmkwem ihe karịrị ihe iri abụọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe karịrị nkà okwu iri ise dị n’ihe ahụ ọ kụziri. Otu ihe atụ nke Jizọs ji otú e si wuo ụlọ abụọ mee pụrụ iche, n’ihi na o ji ya mechie okwu ya. Ọ bụrụ na ị ghọta ihe ihe atụ ahụ o ji mechie okwu ya pụtara, ọ ga-enyere gị aka ịmara otú i nwere ike isi nọgide na-eso ụzọ Kraịst n’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ile okwukwe gị ule.
Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume. Onye ọ bụla nke na-anụkwa okwu m ndị a ma ọ dịghị eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, o wee daa, ọdịda ya dịkwa ukwuu.”—Matiu 7:24-27.
“Onye Gwuru Ala Gwumie Ya Egwumi”
Olee ihe dị mkpa Jizọs ji ihe atụ a o mere banyere mmadụ abụọ wuru ụlọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya? Iji chọpụta ihe ọ bụ, lebakwuo anya n’ihe ahụ Jizọs kwuru. Olee ihe ị chọpụtara banyere ụlọ abụọ ahụ? Otu ụdị ọdachi dakwasịrị ụlọ abụọ ahụ. O nwere ike ịbụ na ụlọ abụọ ahụ yiri. O nwekwara ike ịbụ na e wuru ha abụọ n’otu ebe, otu n’akụkụ nke ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, e wuru otu n’elu ájá, wuo nke ọzọ n’elu oké nkume. Gịnị mere o ji dịrị otú ahụ? Dị ka Oziọma Luk kwuru, ọ bụ n’ihi na nwoke ahụ nke nwere uche “gwuru ala gwumie ya egwumi” iji ruo n’ebe oké nkume dị. (Luk 6:48) Ọ bụ ya mere ụlọ nwoke ahụ nke nwere uche ji kwụrụ n’enweghị ihe mere ya.
Olee ihe Jizọs chọrọ iji ihe atụ ahụ gosi? Jizọs mere ihe atụ ahụ iji gosi ihe ndị wụrụ ụlọ ndị Luk 6:46-48.
ahụ mere, ọ bụghị iji gosi otú ụlọ ndị ahụ dị ma ọ bụ ebe e wuru ha ma ọ bụ iji gosi ike mmiri ozuzo ahụ na idei mmiri ahụ na ifufe ahụ kpara. Otu n’ime ha gwuru ala gwumie ya egwumi, ma, onye nke ọzọ emeghị otú ahụ. Olee otú i nwere ike isi gwuo ala gwumie ya egwumi dị ka nwoke ahụ nke nwere uche mere? Jizọs kwuru ihe mere o ji mee ihe atụ ahụ, sị: “Gịnịzi mere unu ji akpọ m ‘Onyenwe anyị! Onyenwe anyị!’ ma unu adịghị eme ihe ndị m na-ekwu? Onye ọ bụla nke na-abịakwute m ma na-anụ okwu m, na-emekwa ha, m ga-egosi unu onye o yiri. O yiri . . . onye gwuru ala gwumie ya egwumi, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume.”—N’ezie, naanị ige ntị mgbe a na-akụziri mmadụ Baịbụl ma ọ bụ naanị ịnọ n’ụlọ na-agụ Baịbụl yiri mmadụ iwu ụlọ n’elu ájá, n’egwumighị ala egwumi. Ma, ime ihe Kraịst kụziri chọrọ mgbalị dị ukwuu. Ọ chọrọ mmadụ igwu ala gwumie ya egwumi iji ruo n’ebe oké nkume dị.
Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgidesi ike na-eso ụzọ Kraịst, ị ghaghị ịna-eme ihe ị nụrụ, ma ọ́ bụghị ya, ị gaghị anọgidesi ike na-eso ụzọ ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ị mụtara na Baịbụl ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị, ị dị ka nwoke ahụ nwere uche nke gwuru ala gwumie ya egwumi. Ya mere, onye ọ bụla na-amụ Baịbụl kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-anụ naanị ọnụnụ, ka m̀ na-eme ihe m nụrụ? Ihe m na-eme ọ̀ bụ naanị ịgụ Baịbụl na ịmụ ya, ka m̀ na-erube isi n’iwu Baịbụl mgbe m na-eme mkpebi?’
Uru Dị n’Igwu Ala Gwumie Ya Egwumi
Tụlee ihe mere José. Ndị mụrụ ya zụrụ ya ka ọ na-erube isi n’iwu dị na Baịbụl, ma, ọ dịghị mgbe o ji obi ya dum mụọ Okwu Chineke. José sịrị: “Mgbe m gara biri nke onwe m, m gbalịrị ka m na-akpa ezigbo àgwà, ma enwere m ọtụtụ ndị enyi ọjọọ. M malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na-akwa iko, na-alụkwa ọgụ mgbe niile.”
Ka oge na-aga, José kpebiri ịgbanwe ndụ ya, ọ malitekwara iji ọmụmụ Baịbụl kpọrọ ihe. José sịrị: “Otu ihe nke mere m ji gbanwee bụ na m gụrụ Ozizi Elu Ugwu Jizọs ma ghọta ya. Ma, ịgbanwe àgwà m na otú m si ebi ndụ were m oge. Ná mmalite, m nọ na-atụ ụjọ ihe ndị enyi m ga-eche banyere m, ma, ụjọ ahụ mechara pụọ m n’ahụ́. M kwụsịrị ịgha ụgha, kwụsịkwa ikwu okwu rụrụ arụ. M malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. M chọpụtara na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ eziokwu, ya bụ, na mmadụ ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru ma ghara itinye aka n’ọtụtụ ihe ná ndụ.”—Matiu 5:3-12.
Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na i gwuo ala gwumie ya egwumi iji wuo ụlọ gị n’elu oké nkume, ya bụ, ịgba mbọ na-eme ihe ị gụtara n’Okwu Chineke? Jizọs sịrị: “Mgbe e nwere idei mmiri, osimiri asọkwasịkwa ụlọ ahụ, ma o sirughị ike ime ka ọ maa jijiji, n’ihi na e wuru ya nke ọma.” (Luk 6:48) O doro anya na ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ gị nke ọma site n’ime ihe ị na-amụta, ule ndị dị ka oké ifufe agaghị enwe ike ịkwatu ụlọ ihe atụ gị, ha agaghịkwa eme ka ọ maa jijiji. Nke a na-akasi anyị nnọọ obi.
Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye nne ji ya na Jizọs, kwuru ngọzi ọzọ ndị na-amụ Baịbụl na-enweta, bụ́ ndị na-eme ihe e dere n’Okwu Chineke, ọ bụghị ịnụ naanị ọnụnụ. Jems dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ . . . Onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.”—Jems 1:22-25.
O doro anya na ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-enwe obi ụtọ n’eziokwu. Obi ụtọ ahụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enwe ga-eme ka ha nwee ike ịkwụsi ike ma ha nwee nsogbu ndị yiri oké ifufe nke na-ele okwukwe ha ule, nke na-emekwa ka a mara ma hà jikwa obi ha niile na-efe Chineke.
Gịnị Ka Ị Ga-eme?
Mgbe Jizọs ziri Ozizi Elu Ugwu ya, o gosiri kpọmkwem na onye na-efe Jehova bụ́ Chineke agaghị eme ụzọ ihe abụọ na-emegide onwe ha, ebe ọ bụ na otu ga-ezi ezi, nke ọzọ agaghị ezi ezi. Dị ka ihe atụ, Jizọs kụziri na ọ bụrụ na mmadụ anaghị ele anya otu ebe, ọ bụ onye ọjọọ, ọ bụrụ na mmadụ abụghị ohu Chineke, ọ bụ ohu akụnụba, ọ bụrụ na mmadụ anaghị aga ije n’okporo ụzọ dị warara, ọ na-aga na nke dị obosara. (Matiu 6:22-24; 7:13, 14) Mgbe Jizọs nọ na-apịachi ihe atụ ahụ o ji mmadụ abụọ wuru ụlọ mee, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ọzọ ha ga-ahọrọ: Ma ọ́ bụghị ime ka nwoke ahụ nwere uche, ya abụrụ ime ka nwoke nzuzu ahụ.
Ọ bụrụ na i jiri obi gị dum na-eme ihe ị na-amụta na Baịbụl, ị bụ onye nwere uche. N’ezie, igwu ala gwumie ya egwumi iji wuo ụlọ gị n’oké nkume ga-eme ka i nweta ngọzi dị iche iche, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.—Ilu 10:25.
[Foto ndị dị na peeji nke 30]
Ihe ga-eme ka anyị guzosie ike bụ ime ihe anyị na-amụta