Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
Gịnị mere otu nwaanyị nke na-ezu onye ọ na-arụrụ ọrụ ohi ma na-ebuga dayamọnd ofesi, bụ́ ahịa iwu n’obodo ha, ji ghọọ onye ọrụ na-akwụwa aka ọtọ? Olee ihe nyeere otu nwaanyị nwarala igbu onwe ya ugboro abụọ aka inwe obi ụtọ ná ndụ? Olee otú otu onye aṅụrụma nke na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ si nwee ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ ririla ya ahụ́? Legodị ihe ha kwuru.
ONYE M BỤ
AHA M BỤ: MARGARET DEBRUYN
ADỊ M AFỌ: 45
ABỤ M ONYE: BOTSWANA
NDỤ M BIRI: M NA-ERE AHỊA IWU, M BỤKWA ONYE OHI
AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Nna m bụ onye Germany. Ma, ọ ghọrọ nwa amaala South-West Africa (nke bụ́ Namibia ugbu a). Mama m bụ onye agbụrụ Mangologa nke Botswana. A mụrụ m na Gobabis, Namibia.
N’agbata afọ 1970 na 1979, gọọmenti South Africa kpara ike na Namibia, hụkwa na iwu ịkpa ókè agbụrụ ruru n’obodo ukwu na n’obodo nta niile dị na Namibia. Ebe ọ bụ na nne m na nna m esighị n’otu agbụrụ, a manyere ha ikewa. N’ihi ya, mama m kpọọrọ mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwaanyị gaa biri na Ghansi, Botswana.
N’afọ 1979, m kwagara Lobatse, Botswana, biri na nke otu di na nwunye gụchaa akwụkwọ. Mgbe e mechara, m nwetara ọrụ idekọrọ otu ụlọ ọrụ na-arụzi ụgbọala ihe. Ihe a kụziiri m mgbe m na-eto bụ na ọ bụghị Chineke na-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha, kama na mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla o chere na o kwesịrị ime iji gboo mkpa ya na ezinụlọ ya, ma ihe ahụ ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ.
Ebe m nọ n’ezigbo ọkwá n’ụlọ ọrụ anyị, m ji ohere ahụ na-ezuru ngwá ụgbọala nke onye m na-arụrụ ọrụ. Mgbe ọ bụla ụgbọ okporo ígwè na-agbafe n’abalị, mụ na ndị enyi m na-abanye na ya zuru ihe ọ bụla ruru anyị aka. M malitekwara ibuga dayamọnd, ọlaedo, na ọla nchara ofesi, bụ́ ahịa iwu n’obodo anyị. M ṅụwara ọgwụ ọjọọ, mewe ihe ike, nweekwa ọtụtụ ndị enyi nwoke.
Ma, n’afọ 1993, a nwụdere m ebe m na-ezu ohi, chụọ m n’ọrụ. Ndị sị na ha bụ ndị enyi m gbahapụrụ m, n’ihi na ha na-atụ ụjọ na a ga-anwụdekwa ha. Ihe a ha mere wutere m nke ukwuu, mụ ekpebizie na o nweghị onye m ga-atụkwasị obi.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’afọ 1994, Tim na Virginia, bụ́ Ndịàmà Jehova si
mba ọzọ bịa, ziri m ozi ọma. Ha na-akụziri m ihe n’ebe ọhụrụ m nwetara ọrụ, na-enyere m aka ịmụ Baịbụl n’oge nri ehihie. Mgbe m chọpụtara na ha kwesịrị ntụkwasị obi, m kwetaziri ka ha bịawa n’ụlọ m na-akụziri m ihe.N’oge na-adịghị anya, m ghọtara na ọ bụrụ na m ga-eme ihe dị Chineke mma, ọ dị mkpa ka m gbanwee àgwà ụfọdụ m na-akpa. Dị ka ihe atụ, m mụtara ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10 na “ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.” M ji nwayọọ nwayọọ hapụ àgwà ọjọọ ndị m na-akpa. M kwụsịrị izu ohi. M kwụsịrị iso ndị òtù ọjọọ ahụ mụ na ha tokọrọ. Sitekwa n’enyemaka Jehova, m hapụrụ ndị enyi m nwoke.
URU NDỊ M RITERELA: M gbara ezigbo mbọ mụta ijide mmụọ m na izere ịbara ụmụ m oké mba ma ha mejọọ ihe. (Ndị Efesọs 4:31) M na-agbalị iji olu ọma agwa ha okwu. Isi otú a agwa ha okwu na-eme ka ha na-akpa ezi àgwà, na-emekwa ka ezinụlọ anyị dị n’otu.
Ndị enyi m ochie nakwa ndị agbata obi anyị amatala na ha nwere ike ịtụkwasị m obi. M ghọọla onye ọrụ na-akwụwa aka ọtọ, nke e nwere ike ịhapụrụ ngwá ahịa na ego n’atụghị egwu. N’ihi ya, m na-enwe ike inweta ihe na-ezuru m ma na-ewepụta oge dị ukwuu na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta Baịbụl. M ji obi m dum kwere ihe e kwuru n’Ilu 10:22, nke na-asị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”
ONYE M BỤ
AHA M BỤ: GLORIA ELIZARRARÁS DE CHOPERENA
ADỊ M AFỌ: 37
ABỤ M ONYE: MEXICO
NDỤ M BIRI: M NWARA IGBU ONWE M
AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: Etoro m n’obodo bara ọgaranya bụ́ Naucalpan, nke dị na Mexico State. Adị m obere malite ime ezigbo isi ike na ịga oriri na nkwari. Amalitere m ịṅụ sịga mgbe dị afọ iri na abụọ, malite ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe m dị afọ iri na anọ, malitekwa ịṅụ ọgwụ ọjọọ mgbe m dị afọ iri na isii. Mgbe afọ ole na ole gafere, ahapụrụ m ụlọ. Ọtụtụ ndị enyi m si n’ezinụlọ ebe a na-akụkasị ha ahụ́ ma ọ bụ na-agwa ha okwu na-egbu mmụọ mgbe ha dị obere. Ndụ gbụrụ m nke na anwara m ugboro abụọ igbu onwe m.
Mgbe m dị afọ iri na itoolu, aghọrọ m onye e ji egosi uwe a dụrụ ọhụrụ. N’ihi ya, mụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-eme ihe ntụrụndụ kpawara. Emechara m lụọ di, mụọkwa ụmụ, ma ọ bụ m na-ekpebi ihe niile na-eme n’ezinụlọ anyị. Anọgidekwara m na-aṅụ sịga na mmanya na-aba n’anya, na-ebikwa ndụ gbalụ gbalụ. Okwu rere ure anaghị akọ m akọ n’ọnụ, ana m amakarịkwa njakịrị rụrụ arụ. Abụkwa m onye iwe ọkụ.
Ọtụtụ ndị m họọrọ ka mụ na ha na-akpa na-ebi ụdị ndụ m na-ebi. Ha chere na ụwa zuuru m. Ma, ndụ ka gwụrụ m ike, ndụ m enweghịkwa isi.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Ndịàmà Jehova malitere ịkụziri m Baịbụl n’afọ 1998. Baịbụl mere ka m mụta na e nwere ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Amụtara m na Jehova Chineke zubere ime ka ụwa bụrụghachi Paradaịs, na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, nakwa na m nwere ike inweta ngọzi ndị ahụ n’ọdịnihu.
Amụtakwara m na otú m ga-esi egosi na m hụrụ Chineke n’anya bụ irubere ya isi. (1 Jọn 5:3) Nke a siiri m ike na mbụ n’ihi na o nwetụbeghị onye m kwere ka ọ gwa m ihe m ga-eme. Ma, emechara m chọpụta na e nweghị otú m ga-esi nọgide na-eduzi onwe m. (Jeremaya 10:23) Ekpekuru m Jehova ekpere ka o duzie m. Arịọrọ m ya ka o nyere m aka ime ihe o kwuru na ịkụziri ụmụ m ibi ndụ dị iche na nke m biri.
O siiri m ezigbo ike ime mgbanwe ndị m kwesịrị ime. Ma, amalitere m ime ihe Ndị Efesọs 4:22-24 kwuru, nke sịrị: “Unu kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga . . . unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” Iyiri mmadụ ọhụrụ pụtara na m ga-akwụsị àgwà ndị rụrụ arụ, dị ka ịṅụ sịga, hapụ okwu rụrụ arụ, kwuwezie okwu na-arụghị arụ. O were m ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ iji mee mgbanwe ndị m kwesịrị ime tupu e mee m baptizim, mụ abụrụ Onyeàmà Jehova.
Amalitekwara m ịrụ ọrụ nwaanyị a lụ alụ nke ji ụmụ kwesịrị ịrụ n’ụlọ. Amalitere m ime ihe e kwuru na 1 Pita 3:1, 2, nke na-asị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.”
URU NDỊ M RITERELA: Ekelere m nnọọ Jehova n’ihi na amatala m na o nwere ihe mere m ji dịrị ndụ. Echere m na abụrụla m nnọọ ezigbo mmadụ karịa otú m bụbu nakwa na m nwere ike inye ụmụ m ezigbo ọzụzụ. Obi m na-ama m ikpe mgbe ụfọdụ maka ihe ndị m mere n’oge gara aga, ma Jehova maara obi m. (1 Jọn 3:19, 20) O doro anya na ibi ndụ otú Baịbụl kwuru emeela ka m zere nsogbu, meekwa ka obi ruo m ala.
ONYE M BỤ
AHA M BỤ: JAILSON CORREA DE OLIVEIRA
ADỊ M AFỌ: 33
ABỤ M ONYE: BRAZIL
NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE AṄỤRỤMA, M NA-AṄỤKWA ỌGWỤ ỌJỌỌ
AKỤKỌ NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m na Bagé, bụ́ obodo dị na Brazil nke ihe dị ka otu narị puku mmadụ bi. Bagé dị nso n’ókè Brazil na Uruguay. Ịkọ ugbo na ịzụ anụmanụ bụ ọrụ ndị a kacha arụ n’obodo ahụ. Ebe m nọ too n’obodo ahụ bụ ebe ndị ogbenye bi, ndị nọ n’òtù ọjọọ na-emekarị ihe ike na ya, e jikwa ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ mara ndị na-eto eto bi n’ebe ahụ.
Mgbe m gachara akwụkwọ, m malitere ịṅụ mmanya, ise wii wii, na ige egwú rock na-ada oké ụda. Ekweghị m na Chineke. M chere na ahụhụ na ọgba aghara niile dị n’ụwa na-egosi na Chineke adịghị.
Ana m akpọ ụbọ, na-edekwa egwú. M na-esikarị n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe enweta ihe m na-ede n’egwú m. Òtù egwú m emeghị nke ọma otú m chọrọ, n’ihi ya, m ṅụwakwuru ọgwụ ike. Achọdịghị m ịma ma ịṅụfe ọgwụ ike ókè ọ̀ ga-egbu m. Ọtụtụ ndị na-agụ egwú m na-akwanyere ùgwù si otú ahụ gbuo onwe ha.
M na-agbazinara nne nne m, bụ́ onye zụrụ m, ego m ji aṅụ ọgwụ ahụ riri m ahụ́. M na-aghara ya ụgha ma ọ jụọ m ihe m ji ego ahụ eme. Nke ka njọ bụ na m tinyere aka ná mgbaasị. Nke masịrị m bụ ịkụ ọgwụ, n’ihi na m chere na ọ ga-enyere m aka ide egwú dị ụtọ karị.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl na ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, m malitere ịgbanwe otú m si eche echiche. M ji nwayọọ nwayọọ malite inwe mmasị ịdị ndụ na inwe obi ụtọ. Otú m sizi eche echiche mere ka m kpụlata ogologo ntutu m. M ma ụma hapụ ya ka o tojuo iji gosi na obi adịghị m mma nakwa na m na-enupụ isi. M ghọtaziri na ọ bụrụ na m chọrọ ka Chineke nwee mmasị n’ebe m nọ, m ga-akwụsịrịrị ịṅụfe mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ise sịga. M hụkwara na ọ dị mkpa ka m gbanwee ụdị egwú m na-enwe mmasị na ya.
Ụbọchị mbụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, m hụrụ ihe si n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ahụ́ ụlọ. O si n’Ilu 3:5, 6, nke na-asị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” Mgbe m chebaara amaokwu ndị ahụ echiche, obi siri m ike na Jehova ga-enyere m aka ịgbanwe ndụ m ma ọ bụrụ na mụ ekwe.
Ma, ịgbanwe ụdị ndụ ahụ m biwere kemgbe na ịhapụ aṅụrụma na ọgwụ ọjọọ siiri m oké ike nke na ọ dị m ka igbupụ onwe m aka. (Matiu 18:8, 9) M sị ka m jiri nwayọọ nwayọọ hapụ ha, ọ gaghị ekwe m. N’ihi ya, m kara obi hapụ ha niile otu mgbe. M kwụsịkwara ịgakwuru ndị niile nwere ike ịrabanye m ná ndụ ọjọọ ahụ m na-ebibu na ebe niile nwere ike ịrabanye m na ya.
M malitere ikwe ka ezi ihe ndị m mere n’ụbọchị na-eme m obi ụtọ, kama ichewe ihe ndị ga-eme m obi ọjọọ. M weere ya na ọ ga-abụrụ m ihe ùgwù ịdị ọcha n’anya Jehova, ma n’anụ ahụ́, ma n’omume ma ná mmekọrịta mụ na ya. M kpekuru Jehova ekpere ka o nyere m aka ka m ghara ichewe banyere omume mbụ m, kama ka m legide anya n’ọdịnihu, ọ zakwara ekpere m. O nwere oge ụfọdụ m mere omume ọjọọ m na-emebu. N’agbanyeghị ya, m na-ejisi ike hụ na mụ na onye na-akụziri m Baịbụl mụrụ ihe, ọ bụrụgodị na ahụ́ adịchaghị m n’ihi ịṅụ oké mmanya.
Eziokwu ndị m mụtara na Baịbụl banyere Chineke masịrị m nke ukwuu. M mụtara na Chineke hụrụ anyị n’anya n’otu n’otu, na ọ ga-ebibi okpukpe ụgha, nakwa na ọ na-akwado ozi ọma a na-ekwusa ugbu a n’ụwa dum. (Matiu 7:21-23; 24:14; 1 Pita 5:6, 7) Eziokwu ndị ahụ dị m mma. N’ikpeazụ, m kpebiri inyefe Chineke ndụ m. M chọrọ ikele ya maka ihe niile o meere m.
URU NDỊ M RITERELA: M chere ugbu a na ndụ m enweela isi, dịkwa ụtọ. (Ekliziastis 12:13) Kama ịnara ndị ezinụlọ m anara, m na-enye ha enye. M kọọrọ nne nne m ihe ọma ndị m mụtara na Baịbụl, o nyefeekwala Jehova ndụ ya ugbu a. E nwere ndị ezinụlọ anyị nyeferela Jehova ndụ ha, otu n’ime ndị òtù egwu ochie m emeekwala otú ahụ.
Alụọla m nwaanyị, mụ na ya na-ejikwa ihe ka ukwuu n’oge anyị enyere ndị ọzọ aka ịmụta Baịbụl. Ama m na Chineke agọziela m nke ukwuu, n’ihi na m mụtala ‘iji obi m dum tụkwasị Jehova obi.’
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]
“M ji nwayọọ nwayọọ malite inwe mmasị ịdị ndụ na inwe obi ụtọ”