Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ọ̀ dị mgbe e ji osisi pịrị ọnụ gbaa Jeruselem gburugburu, dị ka Jizọs kwuru na ọ ga-eme?

Mgbe Jizọs na-ebu amụma banyere mbibi Jeruselem, o kwuru banyere obodo ahụ, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị mgbe ndị iro gị ga-eji osisi pịrị ọnụ wuo ogige gburugburu gị, ha ga-agbakwa gị gburugburu ma si n’akụkụ niile na-enye gị nsogbu.” (Luk 19:43) Ihe ahụ Jizọs kwuru mezuru n’afọ 70 Oge Anyị mgbe ndị agha Rom, ndị Ọchịagha Titus du, ji osisi gbaa obodo ahụ ogige gburugburu. Titus bu ihe atọ n’obi bịa, ya bụ, ime ka ndị Juu ghara inwe ike ịgbapụ, ime ka ha chịlie aka elu, na ịkwụ ndị obodo ahụ agụụ ruo mgbe ha chịliri aka elu.

Flavius Josephus, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke dịrị ndụ na narị afọ mbụ, kwuru na ozugbo e kpebiri iwu ogige a, ìgwè ndị agha Rom dị iche iche nọ na-amarịta aka ịma ndị ga-ebu ụzọ wuchaa ebe nke e kenyere ha. E gbuturu osisi niile gbara obodo ahụ gburugburu ruo ebe dị ihe dị ka kilomita iri na isii, e jikwa naanị abalị atọ wuo ogige ahụ dị kilomita asaa n’ogologo. Josephus kwuru na mgbe nke a mere, “o nwekwaghị otú ndị Juu ga-esi agbapụ.” N’ihi ụnwụ dị n’obodo ahụ na ọgụ òtù ndị agha dị iche iche nọ n’ime ya nọ na-alụ n’etiti onwe ha, obodo ahụ chịliri aka elu mgbe ihe dị ka ọnwa ise gasịrị.

Eze Hezekaya ò wuru ọwa mmiri mmiri si abanye na Jeruselem n’ezie?

Hezekaya chịrị Juda n’ọgwụgwụ narị afọ nke asatọ Tupu Oge Anyị, bụ́ oge obodo ya na obodo Asiria siri ike nọ n’esemokwu. Baịbụl gwara anyị na o mere ọtụtụ ihe iji chebe Jeruselem na iji hụ na obodo ahụ nọgidere na-enweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ. Otu n’ime ihe ndị ọ rụrụ bụ ọwa mmiri dị narị mita ise na iri atọ na atọ n’ogologo iji mee ka mmiri iyi na-asọbata n’obodo ahụ.—2 Ndị Eze 20:20; 2 Ihe E Mere 32:1-7, 30.

Na narị afọ nke iri na itoolu, e gwupụtara ọwa mmiri dị nnọọ otú ahụ. A kpọwara ya Ọwa Mmiri Hezekaya, ma ọ bụ Ọwa Mmiri Siloam. N’ime ọwa mmiri ahụ, a hụrụ otu ihe odide kọwara otú e si gwuo akụkụ ikpeazụ nke ọwa mmiri ahụ. Otú mkpụrụ akwụkwọ ihe odide ahụ dị mere ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Baịbụl kwere na e dere ya n’oge Hezekaya. Ma, afọ iri gara aga, ụfọdụ ndị kwuru na ọ ga-abụ na e gwuru ọwa mmiri ahụ narị afọ ise ka oge Hezekaya gasịrị. N’afọ 2003, otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị Izrel bipụtara ihe ha chọpụtara ná nnyocha ha mere iji chọpụta kpọmkwem mgbe e gwuru ọwa mmiri ahụ. Olee ihe ha kwubiri?

Dr. Amos Frumkin nke na-arụ na Mahadum Hibru dị na Jeruselem kwuru, sị: “Nnyocha carbon-14 anyị mere n’ụrọ ndị e ji tee ahụ́ Ọwa Mmiri Siloam, nakwa nke anyị mere n’okwute na n’ájá e ji rụọ ọwa mmiri ahụ, na-egosi nnọọ na a rụrụ ya n’oge Hezekaya.” Otu isiokwu dị n’otu magazin nke na-ekwu banyere nkà mmụta sayensị bụ́ Nature kwukwara, sị: “Ụzọ nnyocha atọ ndị e mere—ịchọpụta afọ ole ihe nọrọla, ịmụ aka akwụkwọ e ji dee ihe n’oge ochie na ịmụ akụkọ ihe mere eme—na-egosicha na a rụrụ ọwa mmiri ahụ n’ihe dị ka afọ 700 BC, bụ́ nke mere ka Ọwa Mmiri Siloam bụrụ ihe owuwu a kacha kwuo kpọmkwem mgbe e wuru ya n’ime ihe owuwu ndị Baịbụl kwuru na e wuru n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga.”