Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1 Mụta Ịtụkwasị Baịbụl Obi

1 Mụta Ịtụkwasị Baịbụl Obi

1 Mụta Ịtụkwasị Baịbụl Obi

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.”—2 Timoti 3:16.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Ọtụtụ ndị na-ekwu na Baịbụl bụ naanị akwụkwọ e ji amamihe mmadụ dee. Ụfọdụ kweere na akụkọ ndị a kọrọ na ya emeghị eme. Ndị ọzọ na-ekwu na ndụmọdụ Baịbụl abaghịzi uru ma ọ bụ na oge ya agafeela.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI MERIE YA? Ọtụtụ mgbe, ndị na-arụ Baịbụl ụka ma ọ bụ na-asị na ọ baghịzi uru ejibeghị aka ha chọpụta nke bụ́ eziokwu. Ihe ha na-eme bụ naanị ikwughachi ihe ndị ọzọ kwuru. Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.

Kama ịnụ na ọ dị iri, chịrị wụnye n’akpa, ọ́ gaghị aka mma ka i mee ihe Ndị Kraịst narị afọ mbụ bi na Beria, nke dị n’ebe ugwu Gris ugbu a, mere? Ọ bụghị ihe ọ bụla ndị ọzọ gwara ha ka ha kweere. Kama nke ahụ, ihe e ji mara ha bụ na ha “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.” (Ọrụ 17:11) Ka anyị lebatụ anya n’ihe abụọ mere obi ga-eji sie gị ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke nke si n’ike mmụọ nsọ.

Akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị na-arụ Baịbụl ụka na-ekwu na e nweghị mgbe ndị a kpọrọ aha na Baịbụl dịrị ndụ nakwa na obodo ndị a kpọrọ aha ha na Baịbụl adịghị adị. Ma ọtụtụ ugboro, e nweela ihe akaebe gosiri na ihe ndị ahụ na-arụ Baịbụl ụka kwuru abụghị eziokwu nakwa na e kwesịrị ịtụkwasị ihe e dere na Baịbụl obi.

Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ndị ọkà mmụta kwuru na Eze Sagọn nke Asiria e kwuru okwu ya n’Aịzaya 20:1 enweghị mgbe ọ dịrị ndụ. Ma, n’agbata afọ 1840 na 1849, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ebe obí eze a dịbu mgbe ha na-egwupụta ihe n’ala. Ugbu a, Sagọn bụ otu n’ime ndị eze Asiria a kacha mara amara.

Ndị nkatọ rụrụ ụka na gọvanọ bụ́ onye Rom nke aha ya bụ Pọntiọs Paịlet, bụ́ onye nyere iwu ka e gbuo Jizọs, enweghị mgbe ọ dịrị ndụ. (Matiu 27:1, 22-24) Ma n’afọ 1961, a hụrụ nkume e dere aha Paịlet na ọkwá ya n’ebe dị nso n’obodo Sesaria nke dị n’Izrel.

Mgbe magazin bụ́ U.S.News & World Report nke October 25, 1999, na-ekwu na akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme, o kwuru, sị: “Ihe ndị e gwupụtara n’ala n’oge a emeela nnọọ ka o doo anya na akụkọ ndị a kọrọ n’Agba Ochie nakwa n’Agba Ọhụrụ mere eme. Ha gosiri na akụkọ banyere ndị nna ochie ụmụ Izrel, ọpụpụ ụmụ Izrel pụrụ n’Ijipt, ndị eze chiri n’ocheeze Devid na ihe ndị mere n’oge Jizọs, bụcha eziokwu.” Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe ndị e gwupụtara n’ala ga-eme ka mmadụ nwee okwukwe na Baịbụl, ị ga-atụ anya ka akụkọ ndị a kọrọ n’akwụkwọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke bụrụ akụkọ mere eme.

Amamihe dị na Baịbụl na-abara ụdị mmadụ ọ bụla uru. Ọtụtụ afọ tupu ndị mmadụ achọpụta ụmụ irighiri nje ndị dịnụ na otú ha si ekesa ọrịa, Baịbụl kwuru ụzọ dị iche iche mmadụ ga-esi na-edebe onwe ya ọcha, ihe o kwuru ka bakwara uru taa. (Levitikọs 11:32-40; Diuterọnọmi 23:12, 13) Ezinụlọ ndị na-emeso ibe ha ihe otú Baịbụl kwuru na-aka enwe obi ụtọ. (Ndị Efesọs 5:28–6:4) Onye na-eso ụkpụrụ Baịbụl ná ndụ ya nwere ike ịghọ ezigbo onye ọrụ ma ọ bụ onye na-echebara ndị o were n’ọrụ echiche. (Ndị Efesọs 4:28; 6:5-9) Iso ụkpụrụ Baịbụl na-emekwa ka obi na-eru mmadụ ala. (Ilu 14:30; Ndị Efesọs 4:31, 32; Ndị Kọlọsi 3:8-10) Ọ bụ ụdị ndụmọdụ ahụ bara uru ka anyị ga-atụ anya inweta n’aka Onye kere anyị.

GỊNỊ GA-ABỤ ỤGWỌ ỌRỤ GỊ? Amamihe dị na Baịbụl nwedịrị ike ime ka onye na-amaghị ihe mara ihe. (Abụ Ọma 19:7) Ozugbo anyị tụkwasịrị Baịbụl obi, ọ ga-enyekwara anyị aka ime ihe ọzọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, bụ́ ihe akwụkwọ ọ bụla ọzọ na-agaghị emeli.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu isiokwu a, gụọ isiokwu bụ́ “Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke,” n’isi nke 2 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.