Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chebe Onwe Gị Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ghara Inweta Gị

Chebe Onwe Gị Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ghara Inweta Gị

Chebe Onwe Gị Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ghara Inweta Gị

JAMES toro n’ebe na-emepeghị emepe n’obodo Malaita mmiri gbara gburugburu, nke dị ná mba Solomon Islands. Malite mgbe ọ dị obere, a kụziiri ya ịsọpụrụ ndị mmụọ. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe gaara eme ka m chewe echiche ịgwa ndị mmụọ ka ha merụọ ndị ọzọ ahụ́, ma, echeghị m na mmadụ ga-enweli obi ụtọ ná ndụ ma onye ahụ emeghị rarafono [ya bụ, ịkpọku ndị mmụọ ọjọọ ka ha nyere mmadụ aka] iji chebe onwe ya.”

Dị ka ọ dị ndị bi n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ n’ụwa, ndị bi na Solomon Islands kweere na ndị mmụọ nwere ike inyere mmadụ aka ma ọ bụ mesie ya ike. N’eziokwu, ọtụtụ ndị Melanesia anaghị atụ ndị mmụọ ha na-akpọ mmụọ obiọma ụjọ, kama ha hụrụ ha n’anya.

E nwere ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si egosi na ha kweere ná ndị mmụọ. Dị ka ihe atụ, mgbe James dị obere, ụmụ nwaanyị na-akpọbasị ụmụ ha ụlọ ozugbo ha nụrụ ube nnụnụ a na-akpọ korokoro. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha kweere na ube nnụnụ ahụ pụtara na o nwere onye ihe ọjọọ na-aga ime.

Ụfọdụ ndị bi n’obodo James na-edowe nkume ọcha pụrụ iche n’elu ọnụ ụzọ ụlọ ha. James mere nke a, chee na nkume ahụ ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara imesi ya ike. N’ebe James na-arụ ọrụ, ọ na-eji akpa atụtụkọta iberibe nri dapụrụ n’ala mgbe ọ na-eri nri ehihie ma tụfuo ha mgbe e mechara. Ihe mere o ji eme ya bụ ka onye na-agwọ ọgwụ ghara ịhụ iberibe nri ahụ ma jiri ya mee ya ọrịa.

Ọ bụ ezie na o nwere ike bụrụ na a naghị emekarị ihe ndị a n’ebe i bi, ikekwe ọ dịla mgbe i chere na ọ dị mkpa ka i mee omenala ndị mmadụ na-eme iji zere nsogbu ndị mmụọ ọjọọ, dị ka James chere. O nwere ike ịbụ na i kweere na ime omenala ndị ahụ ga-eme ka ihe gaziere gị.

Ọ bụrụ na ị na-akwanyere Baịbụl ùgwù, o doro anya na ị ga-achọ ịma ihe ọ zara n’ajụjụ ndị a: (1) Olee ihe ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ime gị? (2) Ime omenala ụfọdụ ò nwedịrị ike ime ka ị daba n’aka ndị mmụọ ọjọọ? (3) Olee otú i nwere ike isi zere nnọọ nsogbu ndị mmụọ ọjọọ ma nwee obi ụtọ?

Otú Ndị Mmụọ Ọjọọ Si Akpatara Ndị Mmadụ Nsogbu

Baịbụl mere ka anyị mara na o nweghị otú ndị mmụọ ọjọọ si bụrụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) N’ezie, ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi ma sonyere Setan ná mgbalị ọ na-eme iduhie ndị mmadụ.—Mkpughe 12:9.

Akwụkwọ Nsọ kwuru hoo haa na ọ dị anyị mkpa ka e chebe anyị ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inye anyị nsogbu. Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ ozi, sị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide . . . ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” Pita onyeozi kwuru na Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, yiri “ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—Ndị Efesọs 6:12; 1 Pita 5:8.

Ụzọ Setan kasị esi akpatara ndị mmadụ nsogbu bụ iduhie ha, ịghọgbu ha ma ọ bụ ịnwa ha ọnwụnwa ime ihe ga-ewute Chineke. Baịbụl kwuru na Setan “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrịnt 11:14) Ọ na-eme ka ọ̀ bụ mmụọ na-echebe mmadụ, ọ bụ ezie na o bu ihe ọjọọ n’obi. Setan na-eme ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì ka ha wee ghara ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ya nakwa eziokwu banyere Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Olee ihe o bu n’obi na-eduhie ndị mmadụ?

Ọ na-agụsi Setan agụụ ike ka e fee ya ofufe, ọ na-achọkwa ka ụmụ mmadụ fee ya ofufe, ma hà ma ụma na-efe ya ma ọ bụ na ha amaghị. Mgbe Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, nọ n’ụwa, Setan chọrọ ka ọ “daa n’ala fee” ya. Jizọs kwuru, sị: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe.’” (Matiu 4:9, 10) Jizọs jụrụ ime ihe ọ bụla pụtara ife Setan ofufe.

Jehova bụ mmụọ kacha mmụọ niile ike, ọ gaghịkwa ekwe ka nsogbu ga-adịgide adịgide bịara ndị na-erubere ya isi. (Abụ Ọma 83:18; Ndị Rom 16:20) Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ otú ahụ Jizọs mere, ọ dị mkpa ka anyị zere irubere Setan ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya isi n’ụzọ ọ bụla. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mata omenala ndị na-eduba ndị mmadụ n’ife ndị mmụọ ọjọọ. Olee otú ị ga-esi mata ha?

Mata Omenala Ndị Na-adịghị Chineke Mma

Jehova Chineke dọrọ ndị ya, bụ́ ndị Izrel oge ochie, aka ná ntị ka ha ghara iṅomi ụfọdụ omenala nke mba ndị gbara ha gburugburu na-eme. O kwuru, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke . . . na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ.” Baịbụl kwuru banyere ndị mere omenala ndị a, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.”—Diuterọnọmi 18:10-12.

N’ihi ya, mgbe ị na-atụle ma omenala ndị a na-eme n’ebe i bi hà dị mma, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: Omenala ahụ ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ kwere n’ihe mgbaàmà ọdịnihu? Ọ̀ na-eme ka mmadụ kwere na ihe ndị na-adịghị ndụ nwere ikike ichebe mmadụ? À na-akọ ndị mmadụ ọgwụ ma e mewe ya ma ọ bụ na-echebe ha ka a ghara ịkọ ha ọgwụ? Ọ̀ ga-eme ka mmadụ na-erubere mmụọ ọzọ na-abụghị Jehova ma ọ bụ onye ọ họpụtara ịnọchi anya ya, bụ́ Jizọs, isi?—Ndị Rom 14:11; Ndị Filipaị 2:9, 10.

Ọ dị ezigbo mkpa ka ị jụ omenala ọ bụla na-agba ndị mmadụ ume ime ihe ndị dị otú ahụ. N’ihi gịnị? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Unu apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova’ na-erikwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ.” Ọ dọrọ anyị aka ná ntị na ndị chọrọ ime ma Chineke ma mmụọ ọ bụla ọzọ obi ụtọ “na-akpali Jehova ikwo ekworo.” (1 Ndị Kọrịnt 10:20-22) Jehova Chineke chọrọ ka anyị na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa, o rukwaara ya.—Ọpụpụ 20:4, 5.

Tụleekwa ajụjụ a: Omenala ahụ ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ kwere na ihe mmadụ mere esighị ya n’aka? Dị ka ihe atụ, ọtụtụ obodo kpọrọ ịkwa iko asị, ma nke ndị lụrụ di na nwunye ma nke ndị na-alụbeghị, Baịbụl katọkwara ya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Ma, n’obodo ụfọdụ dị nso n’Oké Osimiri Pacific, a na-ewere ya na ịkwa iko adịghị njọ ma ọ bụrụ na nwata nwaanyị kwuru na “a kụnyere ya ahịhịa ndụ,” * ya bụ, na ihe mere ya ji kwaa iko bụ na a kọrọ ya ọgwụ.

Ma Baịbụl na-akụzi na anyị ga-aza ajụjụ maka ihe ndị anyị mere. (Ndị Rom 14:12; Ndị Galeshia 6:7) Dị ka ihe atụ, nwaanyị mbụ, bụ́ Iv, kwuru na ọ bụ Setan duhiere ya inupụrụ Chineke isi, gwa Chineke, sị: “Ọ bụ agwọ ahụ duhiere m, m wee rie ya.” Ma, Jehova mere ka Iv zaa ajụjụ maka ihe o mere. (Jenesis 3:13, 16, 19) Anyị ga-azakwa Jehova ajụjụ maka omume anyị.—Ndị Hibru 4:13.

Gịnị Ka Ị Ga-emerịrị?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma gbasoo ụkpụrụ Baịbụl, ọ dị mkpa ka i mee ihe ozugbo. Ndị nwere obi eziokwu bi n’Efesọs na narị afọ mbụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya na nke a. Iji hụ na ọ dịkwaghị ihe jikọtara ha na ndị mmụọ ọjọọ, ha chịkọtara akwụkwọ niile ha nwere, bụ́ ndị kwuru banyere ime mgbaasị, ma “kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.”—Ọrụ 19:19.

Tupu ha akpọọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, ha “na-abịa eme nkwupụta ma na-akọ n’ihu ọha ihe ndị ha na-eme.” (Ọrụ 19:18) N’ihi otú ihe Pọl nọ na-akụzi banyere Kraịst si ruo ha n’obi, ha bibiri akwụkwọ mgbaasị ha. Ha kpebikwara na ha agakwaghị eme ụdị omenala ahụ ọzọ.

N’eziokwu, o nwere ike isiri mmadụ ike ịhapụ omenala ndị obodo ya. O sikwaara James, bụ́ onye a kpọrọ aha na mbụ, ike ime otú ahụ. Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl, ihe ndị ọ na-amụta tọkwara ya ụtọ. Ma, ọ ka nọ na-eme rarafono. Mgbe o chebaara ihe akọ na uche ya na-agwa ya banyere ihe ndị ahụ ọ na-eme echiche, ọ chọpụtara na ya kweere ihe ndị Jehova kwere nkwa ime n’ọdịnihu, ma iji chebe onwe ya ka ihe ọ bụla ghara ime ya, ọ nọgidere na-eme omenala ndị ahụ.

Olee ihe nyeere James aka ịgbanwe echiche ya? O kwuru, sị: “Ekpegaara m Jehova ekpere ma rịọ ya ka o chebe m ma nyere m aka ịtụkwasị ya obi. Ahapụkwara m omenala ndị ahụ m na-emebu.” Ò nweela ihe ọjọọ mere ya? James kwuru, sị: “Mba. Naanị ihe merelanụ bụ na amụtala m ịtụkwasị Jehova obi. Ahụla m na Jehova nwere ike ịbụ ezigbo enyi mmadụ.” N’ezie, kemgbe afọ asaa ugbu a, James na-ekwusa ozi ọma oge niile, na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi.

Ọ́ gaghị adị mma ka i ṅomie James? Nyochaa omenala ndị a na-eme n’ebe i bi, jirikwa ‘ike iche echiche gị’ kpebie ma hà kwekọrọ ‘n’uche Chineke.’ (Ndị Rom 12:1, 2) Katazie obi kwụsị ime omenala ndị si na nkwenkwe ụgha. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi ga-esi gị ike na Jehova ‘ga-akpọbata’ gị ma chebe gị. (2 Ndị Kọrịnt 6:16-18) Dị ka James, ị ga-ahụ na nkwa a Baịbụl kwere bụ eziokwu: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.”—Ilu 18:10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 E ji okwu a akọwa omenala ịgọ ọfọ n’ahịhịa pụrụ iche ma ọ bụ n’ihe oriri. A na-enyezi nwata nwaanyị akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ihe oriri ahụ. A sịrị na ihe ahụ e nyere nwata nwaanyị ahụ na-eme ka o nwee mmasị n’ebe nwoke nọ. Omenala a na itinyere nwata nwaanyị ọgwụ ná nri mgbe ọ na-amaghị ma dinaa ya n’ike abụghị otu. Aka nwata nwaanyị e dinara mgbe ọ na-amaghị onwe ya dị ọcha.

[Foto dị na peeji nke 19]

“Korokoro”

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara Dr. Bakshi Jehangir ikike

[Foto dị na peeji nke 19]

Ebe nwata nwaanyị na-atụtụkọta iberibe nri ndị dapụrụ n’ala ka a ghara iji ha mee ya ọgwụ