Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Atụ Ndị Dị na Baịbụl—Ị̀ Na-aghọta Ha?

Ihe Atụ Ndị Dị na Baịbụl—Ị̀ Na-aghọta Ha?

Ihe Atụ Ndị Dị na Baịbụl—Ị̀ Na-aghọta Ha?

E NWERE ike iji ọtụtụ okwu kọwaa otu ihe atụ, ma mgbe ụfọdụ, otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ abụọ ezuola iji mee ihe atụ. Ihe atụ juru eju na Baịbụl. * Dị ka ihe atụ, otu onye gụtara ihe atụ karịrị iri ise n’otu ozizi Jizọs ziri, ya bụ, n’Ozizi Elu Ugwu ahụ.

Gịnị mere i kwesịrị iji nwee mmasị n’ihe atụ ndị ahụ? Otu ihe mere ya bụ na ịghọta ha ga-eme ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ, meekwa ka ị ghọtakwuo Okwu Chineke. Ọ bụrụkwa na ị ghọta ihe atụ ndị dị na Baịbụl nke ọma, ihe Baịbụl na-ekwu ga-edokwu gị anya. N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ aghọtaghị ihe atụ dị na Baịbụl, ọ bụghị naanị na o nwere ike ịnọ ná mgbagwoju anya, kamakwa, ọ ga-aghọtahie ihe a na-ekwu.

Ịghọta Ihe Atụ

Ihe atụ bụ iji otu ihe atụnyere ihe ọzọ. A na-akpọ ihe e ji tụnyere ihe ọzọ ihe a na-ekwu, na-akpọkwa ihe e ji ya tụnyere ihe o yiri. A na-akpọ ihe mere e ji jiri otu ihe tụnyere ibe ya ebe ha yiri. Ya mere, ihe ga-enyere gị aka ịghọta ihe ihe atụ pụtara kpọmkwem bụ ịchọpụta na ịghọta nke ọ bụla n’ihe atọ a.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdịtụrụ mmadụ mfe ịchọpụta ihe a na-ekwu na ihe ihe a na-ekwu yiri. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ nwere ike isi ghọta ebe ihe a na-ekwu na ihe o yiri yiri. Gịnị ga-enyere gị aka ịchọpụta kpọmkwem ebe ha yiri? Ọtụtụ mgbe, ihe ga-enyere gị aka ịmata ya bụ ihe e kwuru gburugburu ya. *

Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara ọgbakọ dị na Sadis, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na i tetaghị, m ga-abịa dị ka onye ohi.” N’ebe a, Jizọs ji ọbịbịa ya (ihe ọ na-ekwu) na-atụnyere ọbịbịa onye ohi (ihe o yiri). Ma, olee ebe ha abụọ yiri? Ihe e kwuru gburugburu ya ga-enyere anyị aka ịghọta ya. Jizọs kwukwara, sị: “Ị gaghịkwa ama oge awa m ga-abịakwasị gị.” (Mkpughe 3:3) N’ihi ya, ihe mere Jizọs ji mee ihe atụ a abụghị iji kwuo ihe mere o ji abịa. Ọ naghị ekwu na ya na-abịa izu ohi. Kama nke ahụ, ebe ọbịbịa ya na ọbịbịa onye ohi yiri bụ na ọ ga-abịa na mberede, n’ebughị ụzọ maa ọkwa mgbe ọ ga-abịa.

Ma mgbe ụfọdụ, ihe atụ e mere n’otu ebe na Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe atụ ọzọ yiri ya dị n’ebe ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi mekwara ihe atụ ahụ Jizọs mere. O dere, sị: “Unu onwe unu maara nke ọma na ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:2) Ihe ndị gbara ihe a Pọl kwuru gburugburu emechaghị ka ebe ọbịbịa ụbọchị Jehova na ọbịbịa onye ohi yiri doo anya. Ma, ọ bụrụ na i jiri ihe atụ a tụnyere nke Jizọs mere ná Mkpughe 3:3, ị ga-aghọta ebe ha abụọ yiri. Ihe atụ a na-echetara nnọọ ezi Ndị Kraịst niile na ha aghaghị ịmụrụ anya mgbe niile n’ofufe ha na-efe Chineke!

Ihe Atụ Ndị Na-akụziri Anyị Banyere Chineke

Ọ dịghị mmadụ nwere ike ịghọtacha àgwà na ike nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. N’oge ochie, Eze Devid dere na ‘a pụghị ịchọpụtacha ịdị ukwuu Jehova achọpụtacha.’ (Abụ Ọma 145:3) Mgbe Job chebachaara ihe ụfọdụ Chineke kere eke echiche, o tiri mkpu, sị: “Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile, leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị! Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”—Job 26:14.

N’agbanyeghị ya, ihe atụ ndị e mere na Baịbụl ga-enyere gị aka ịghọtatụ àgwà magburu onwe ha Chineke anyị bi n’eluigwe nwere. E kwuru na Jehova bụ Eze, Onye na-enye iwu, Onyeikpe na Onye Agha. O doro anya na anyị kwesịrị ịkwanyere ya ùgwù. E kwukwara na ọ bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ, Onye Ndụmọdụ, Onye Nkụzi, Nna, Onye Na-agwọ Ọrịa, na Onye Nzọpụta. Ọ bụ nnọọ onye anyị nwere ike ịhụ n’anya. (Abụ Ọma 16:7; 23:1; 32:8; 71:17; 89:26; 103:3; 106:21; Aịzaya 33:22; 42:13; Jọn 6:45) Nke ọ bụla n’ihe ndị a a kpọrọ Jehova na-eme ka ọtụtụ ihe gbata gị n’obi, meekwa ka ị hụ ebe dị iche iche àgwà Chineke na ihe ndị ahụ a kpọrọ ya yiri. Ọtụtụ okwu agaghị akọwali ihe ihe atụ ndị ahụ nwere ike ịkọwa.

Baịbụl jikwa Jehova tụnyere ihe ndị na-adịghị ndụ. A kpọrọ ya “Oké Nkume Izrel,” ‘nkume dị elu,’ nakwa ‘ebe e wusiri ike.’ (2 Samuel 23:3; Abụ Ọma 18:2; Diuterọnọmi 32:4) Olee ebe ihe ndị a na Jehova yiri? Otú ahụ oké nkume na-akwụrụ chịm, n’enweghị onye nwere ike ibupụ ya, ọ bụ otú ahụ ka Jehova Chineke nwere ike ịbụrụ gị ebe nchebe siri ike.

E nwere ọtụtụ ihe atụ n’akwụkwọ Abụ Ọma bụ́ ndị na-egosi àgwà dị iche iche Jehova nwere. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 84:11 kwuru na Jehova bụ “anyanwụ na ọta” n’ihi na ọ bụ ya na-enye anyị ìhè, ndụ, ume, ọ bụkwa ya na-echebe anyị. Ma, Abụ Ọma 121:5 kwuru na “Jehova bụ ndò gị n’aka nri gị.” Otú ahụ ndò si ekpuchi gị mgbe anwụ na-achasi ike, ọ bụkwa otú ahụ ka Jehova nwere ike ichebe ndị na-ejere ya ozi n’oge ọdachi, jiri “aka” ya ma ọ bụ “nku” ya kpuchie ha otú ahụ ndò si ekpuchi mmadụ.”—Aịzaya 51:16; Abụ Ọma 17:8; 36:7.

Ihe Atụ Ndị Na-akọwa Jizọs

Ọtụtụ ugboro, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:34; 3:16-18) Ọ na-esiri ụfọdụ ndị na-abụghị Ndị Kraịst ike ịghọta nke a, ebe ọ bụ na Chineke alụghị nwaanyị otú ụmụ mmadụ si alụ, ọ dịghịkwa ka ụmụ mmadụ. O doro anya na Chineke anaghị amụ nwa otú ụmụ mmadụ si amụ. N’ihi ya, okwu ahụ bụ ihe atụ. E dere ya iji nyere onye gụrụ ya aka ịghọta na mmekọrịta dị n’etiti Jizọs na Chineke yiri mmekọrịta nna na nwa. Ihe atụ a na-egosikwa nnọọ na Jizọs nwetara ndụ ya n’aka Jehova, ebe ọ bụ Jehova kere ya. A kpọkwara nwoke mbụ dịrị ndụ, bụ́ Adam, “nwa Chineke.”—Luk 3:38.

Jizọs mere ọtụtụ ihe atụ iji gosi ọrụ dị iche iche ọ na-arụ iji mezuo nzube Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Abụ m ezi osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.” Ya ejirizie ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka osisi vaịn ahụ. (Jọn 15:1, 4) Olee ihe ndị dị mkpa ihe atụ a na-akụzi? Ọ bụrụ na alaka osisi vaịn nkịtị ga-adịgide ndụ ma na-amị mkpụrụ, ọ ga-adịgiderịrị n’ogwe osisi vaịn ahụ. N’otu aka ahụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst na Kraịst aghaghị ịnọgide na-adị n’otu. Jizọs sịrị “E wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” (Jọn 15:5) Jehova na-atụ anya ka ndị ha na Kraịst dị n’otu na-amị mkpụrụ ihe atụ, otú ahụ onye kụrụ osisi vaịn na-atụ anya ka ọ mịa mkpụrụ.—Jọn 15:8.

Hụ na Ị Ghọtara Ebe Ha Yiri

Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe atụ n’aghọtaghị ebe ihe a na-ekwu na ihe o yiri yiri, anyị nwere ike ghọtahie ya. Weregodị ihe e dere ná Ndị Rom 12:20 dị ka ihe atụ, bụ́ ebe sịrị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.” Anyị ikpokwasị mmadụ icheku ọkụ n’isi ọ̀ pụtara ịta onye ahụ ahụhụ iji megwara ya ihe o mere anyị? Anyị agaghị ekwu otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị aghọta ebe ihe ahụ a na-ekwu na ihe o yiri yiri. Ebe e si nweta ihe atụ a bụ n’otú e si agbaze ihe n’oge ochie. A na-edokwasị ihe e gwupụtara n’ala e ji arụpụta ọla n’elu icheku ọkụ, kpokwasịkwa icheku ọkụ n’elu ya. Nke a na-agbaze ihe ahụ e gwupụtara n’ala ma mee ka ihe ndị na-abụghị ọla pụsịa. N’otu aka ahụ, imeso mmadụ omume obiọma na-agbanwekarị àgwà ya, mee ka ọ malite ime omume ọma.

Ọ bụghị naanị na ịghọta ihe atụ na-eme ka anyị mata ihe anyị na-amaghị, kama ọ na-emekwa ka ihe a na-ekwu ruo anyị n’obi. Ojiji Baịbụl ji mmehie tụnyere ụgwọ na-eme ka anyị ghọta otú mmehie si bụrụ ibu dị arọ. (Luk 11:4, ihe e dere n’ala ala peeji) Ma, mgbe Jehova gbaghaara anyị ma kagbuo ụgwọ anyị ji, bụ́ nke anyị gaara akwụrịrị, ahụ́ na-eru anyị nnọọ ala! Mgbe a gwara anyị na ọ ‘na-ekpuchi’ mmehie anyị ma ‘na-ehichapụ’ ha, obi na-esi anyị ike na ọ gaghị ewesa anyị iwe maka mmehie ndị ahụ n’ọdịnihu. (Abụ Ọma 32:1, 2; Ọrụ 3:19) Ọ bụ nnọọ ihe na-akasị obi ịmara na Jehova nwere ike ime ka mmehie ndị na-acha uhie uhie ma ọ bụ ọbara ọbara dị ọcha ka ajị ọcha!—Aịzaya 1:18.

Ihe ndị a anyị lebara anya bụ ole na ole n’ime ihe atụ ndị juru n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Ya mere, mgbe ị na-agụ Baịbụl, leruo ihe atụ ndị dị na ya anya. Wepụta oge mata ebe ndị ihe a na-ekwu na ihe ha na ha yiri yiri, chebakwara ha echiche. Ime otú a ga-eme ka ị ghọtakwuo Akwụkwọ Nsọ ma nwekwuo mmasị na ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 N’isiokwu a, isi ihe “ihe atụ” pụtara bụ nkà okwu niile, ndị dị ka ikwu na otu ihe bụ ihe ọzọ, ikwu na otu ihe yiri ihe ọzọ, ma ọ bụkwanụ ụdị ihe atụ ndị ọzọ.

^ par. 6 Akwụkwọ nkà ihe ọmụma Baịbụl bụ́ Insight on the Scriptures, nke 1 na nke 2, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, nwere ọtụtụ ihe ga-enyere mmadụ aka ịghọta ebe ihe abụọ yiri ibe ha.

[Igbe nke dị na peeji nke 13]

Otú Ihe Atụ Si Enyere Anyị Aka

Ihe atụ na-enyere anyị aka n’ụzọ dị iche iche. E nwere ike iji ihe siri ike tụnyere ihe dị mfe nghọta. E nwekwara ike iji ihe atụ abụọ ma ọ bụ karị mee ka ihe dị iche iche a na-ekwu banyere otu isiokwu dokwuo anya. E nwere ike iji ihe atụ mee ka ihe dị mkpa pụta ìhè ma ọ bụkwanụ mee ka ọ tọkwuo ụtọ.

[Igbe nke dị na peeji nke 14]

Chọpụta Ihe Dị Iche Iche Banyere Ihe Atụ

IHE ATỤ: “Unu bụ nnu nke ụwa.” (Matiu 5:13)

IHE A NA-EKWU: Unu (ndị na-eso ụzọ Jizọs)

IHE HA YIRI: Nnu

EBE HA ABỤỌ YIRI N’IHE A NA-EKWU N’AMAOKWU A: Ikike ichekwa ihe

IHE ANYỊ MỤTARA NA YA: Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa ozi ọma nke nwere ike ichekwa ndụ ọtụtụ ụmụ mmadụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 15]

“Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. Ọ dịghị ihe ga-akọ m.”ABỤ ỌMA 23:1