Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere e ji asị “amen” ma e kpechaa ekpere?

Ma na Bekee ma na Grik, “amen” bụ okwu ya na okwu Hibru bụ́ ʼa·menʹ pụtara otu ihe. Ihe bụ́ isi ọ pụtara bụ “ka ọ dị otú ahụ.” Ọ bụrụ na a na-ekpe ekpere, na-aṅụ iyi, na-agọzi mmadụ ma ọ bụ na-akọcha mmadụ, ndị na-ege ntị na-eji otu olu kwuo ya. Ha kwuo ya, ọ pụtara na ha kweere n’ihe ndị e kwuru. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru na “okwu ahụ na-egosi nkwenye, eziokwu, ntụkwasị obi na enweghị obi abụọ.” N’oge Baịbụl, ọ bụrụ na a ṅụọ iyi ma ọ bụ gbaa ndụ, mmadụ ekwe “amen,” iwu ji onye ahụ na o kwetara n’ihe ahụ e kwuru, kwetakwa ịta ahụhụ ma ọ jụ ime ya.—Diuterọnọmi 27:15-26.

Mgbe Jizọs na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe, o ji “amen” malite okwu ụfọdụ o kwuru. Ihe mere o ji kwuo ya bụ iji mee ka a mata na ihe ọ chọrọ ikwu bụ eziokwu doro anya. N’okwu ndị ahụ o kwuru, ihe a sụgharịrị okwu Grik bụ́ a·menʹ bụ “n’eziokwu” ma ọ bụ “n’ezie.” (Matiu 5:18; 6:2, 5; Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Ọ bụrụ na Jizọs ekwuo ya ugboro abụọ otú ahụ o si kwuo ya n’Oziọma Jọn, a na-asụgharị ya “n’ezie, n’ezie.” (Jọn 1:51) A sịrị na otú ahụ Jizọs si kwuo ya n’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn dere pụrụ iche n’otú e si kwuo ya n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ dị nsọ.

N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a kpọrọ Jizọs “Amen,” nke na-egosi na àmà ọ gbara bụ ‘ezi àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.’—Mkpughe 3:14.

Olee ihe bụ Yurim na Tọmịm?

N’oge ụmụ Izrel, o yiri ka è ji Yurim na Tọmịm amata ihe Jehova chọrọ ka mba ahụ ma ọ bụ ndị ndú ya mee. Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka e nyere Yurim na Tọmịm, ọ na-dịkwa ‘n’akpa obi e ji ekpe ikpe.’ (Ọpụpụ 28:15, 16, 30) Ọ bụ eziokwu na Akwụkwọ Nsọ akọwaghị otú Yurim na Tọmịm ahụ dị ma ọ bụ ihe a na-eji ha eme, otú amaokwu Baịbụl dị iche iche si kwuo okwu gbasara ya gosiri na o yiri ka a na-eji ha efe nza iji mata ihe Chineke ga-aza. Chineke nwere ike zaa “ee,” “ee e” ma ọ bụ gbachie nkịtị.

Otu ebe e ji Yurim na Tọmịm jụọ Chineke ajụjụ bụ mgbe Devid gwara Abayata ka o wetara ya ihe yiri efọd nnukwu onye nchụàjà, bụ́ ebe Yurim na Tọmịm ahụ dị. Devid jụrụ Jehova ajụjụ abụọ. Nke mbụ ọ jụrụ ya bụ: ‘Sọl ọ̀ ga-achọrọ m bịa?,’ nke abụọ abụrụ: ‘Ndị nwe ala Kaịla hà ga-enyefe m n’aka ya?’ N’ajụjụ ndị ahụ Devid jụrụ, Jehova zara ya ee, nke mere ka Devid kpebie ihe dị mma ọ ga-eme.—1 Samuel 23:6-12.

Tupu mgbe ahụ, Eze Sọl ji Yurim na Tọmịm chọpụta ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ ma nsogbu mba Izrel ò si mba ahụ n’aka ka ò si ya na nwa ya Jọnatan n’aka. Nke abụọ abụrụ ma ọ̀ bụ yanwa ka ọ̀ bụ nwa ya kpatara nsogbu ahụ. (1 Samuel 14:40-42) Mgbe ihe Sọl kwụsịrị ịtọ Chineke ụtọ, Chineke ekweghịzi agwa ya ihe ọ ga-eme “ma ọ̀ bụ ná nrọ ma ọ̀ bụ site na Yurim ma ọ̀ bụ site n’ọnụ ndị amụma.”—1 Samuel 28:6.

Ndị Juu kweere na a kwụsịrị iji Yurim na Tọmịm ajụ Chineke ajụjụ mgbe e bibiri ụlọ nsọ Jehova n’afọ 607 Tupu Oge Anyị.

[Foto dị na peeji nke 27]

“Amen,” Mkpughe 3:14. ihe odide Codex Alexandrinus, narị afọ nke ise oge anyị