Ị̀ Na-ekwe Ka Chineke Na-agwa Gị Okwu Kwa Ụbọchị?
Ị̀ Na-ekwe Ka Chineke Na-agwa Gị Okwu Kwa Ụbọchị?
UGBORO ole ka ị na-ele onwe gị n’enyo? Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-ele onwe anyị n’enyo kwa ụbọchị, ma eleghị anya, na-ele ya ugboro ugboro. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-achọ ịdị mma n’anya.
E nwere ike iji ịgụ Baịbụl tụnyere mmadụ ile onwe ya n’enyo. (Jems 1:23-25) Ihe e dere n’Okwu Chineke nwere ikike ime ka anyị hụ onwe anyị otú anyị dị n’ezie. “Ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ.” (Ndị Hibru 4:12) E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ na-eme ka anyị hụ ọdịiche dị n’otú anyị dị n’elu ahụ́ na otú anyị dị n’ime. Ọ na-egosi anyị ebe anyị kwesịrị imezi ihe, dị nnọọ ka enyo na-eme.
Ọ bụghị naanị na Baịbụl na-egosi anyị ebe ndị anyị kwesịrị imezi ihe, kama, ọ na-enyekwara anyị aka imezi ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16, 17) Ị ga-ahụ na n’ime uru anọ a e kwuru okwu ha, atọ n’ime ha, ya bụ, ịdọ mmadụ aka ná ntị, ime ka ihe guzozie, na inye ọzụzụ, chọchara anyị ịgbanwe otú anyị si ele ihe anya na omume anyị. Ọ bụrụ na ọ na-adị anyị mkpa ile anya n’enyo mgbe niile iji hụ na anyị dị mma n’anya, ọ dị anyị nnọọ mkpa karị ịgụ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, mgbe niile!
Mgbe Jehova Chineke họpụtara Jọshụa ka ọ bụrụ onye ndú mba Izrel, ọ gwara Jọshụa, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.” (Jọshụa 1:8) N’ezie, ọ bụrụ na Jọshụa chọrọ ka ihe gaara ya nke ọma, ọ ga na-agụ Okwu Chineke “ehihie na abalị,” ya bụ, na-agụchi ya anya.
Abụ Ọma nke 1 gosikwara uru ọ bara ịgụchi Baịbụl anya. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume, onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie, onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo. Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.” (Abụ Ọma 1:1-3) N’ezie, anyị ga-achọ ịdị ka onye a.
Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Mgbe a jụrụ otu Onye Kraịst ihe mere o ji agụ Baịbụl kwa ụbọchị, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na m na-ekpegara Chineke ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị ma tụọ anya ka ọ za m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghịkwa ige ya ntị site n’ịgụ Okwu ya kwa ụbọchị? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ezigbo enyi ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ọ na-agwa anyị okwu?” Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ịgụ Baịbụl dị nnọọ ka ige Chineke ntị n’ihi na anyị na-esi otú ahụ amata otú o si ele ihe anya.
Imeri Ihe Isi Ike Dị na Ya
Ikekwe, o nweela mgbe ị malitere ịgụ Baịbụl. Ị̀ gụchaala ya? Ime otú ahụ ga-enyere gị nnọọ aka ịmatakwu ihe ndị dị na ya. Ma, ụfọdụ anwaala ọtụtụ ugboro ịgụcha Baịbụl ma ha emelighị ya. Ì nwetụla ụdị nsogbu a? Olee ihe i nwere ike ime iji hụ na ị gụchara Baịbụl? Lee ma ị̀ ga-eme ihe abụọ na-esonụ anyị tụrụ aro ha.
Mee ka ọgụgụ Baịbụl soro n’ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị. Wepụta oge ga-akacha adabara gị iji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Nweekwa oge ọzọ i nwere ike ịgụ ya. Ọ bụrụ na e nwee ihe gbochiri gị ịgụ Baịbụl n’oge ahụ i ji agụ ya, họrọ oge ọzọ ka ị ghara ịnọcha otu ụbọchị n’agụghị Okwu Chineke. Ọ bụrụ na i mee otú a, ị na-eṅomi ndị Beria oge ochie. A gwara anyị banyere ha, sị: “Ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:11.
Kpebie mgbe ị chọrọ ịgụcha ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-agụ isi atọ ruo isi ise n’ụbọchị, i nwere ike ịgụcha Baịbụl naanị n’otu afọ. Chaatị dị na peeji ndị na-esonụ gosiri otú e nwere ike isi mee ya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gbalịa jiri chaatị a gụọ ya? N’okpuru ebe e dere “Ụbọchị,” dee ụbọchị ndị ị chọrọ ịgụ isi ole e dere na nke ọ bụla. N’igbe dị n’ebe ahụ, kanyezie akara n’ebe ndị ị gụcharala. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịmata otú i si na-eme.
Ozugbo ị gụchara Baịbụl, ọ́ gaghị adị mma ka ị gụọ ya ọzọ? I nwere ike isi otú a na-agụcha Baịbụl kwa afọ, ikekwe na-ebido n’ebe dị iche n’afọ nke ọ bụla. Ya bụrụkwanụ na ị chọrọ iji nwayọọ nwayọọ gụchaa Baịbụl, i nwere ike iji ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ gụọ isi ole e dere maka otu ụbọchị.
Mgbe ọ bụla ị gụrụ Baịbụl, ị ga-ahụ ihe ọhụrụ ndị ga-abara gị uru ná ndụ gị, bụ́ ndị ị na-ahụbeghị mbụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe,” ndụ anyị na ọnọdụ anyị na-agbanwekwa mgbe niile. (1 Ndị Kọrịnt 7:31) N’ihi ya, kpebisie ike ịna-ele anya kwa ụbọchị n’enyo, bụ́ Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl. Ọ bụrụ na ị na-eme nke a, ị na-ekwe ka Chineke na-agwa gị okwu kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 16:8.
[Chaati/Foto ndị dị na peeji nke 15-18]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
1
Usoro Ọgụgụ Baịbụl
NTỤZIAKA. Dee ụbọchị ndị ị chọrọ ịgụ isi ole e dere na nke ọ bụla. Kanye akara na nke ọ bụla ị gụchara. I nwere ike ịgụ Baịbụl malite n’isi ruo ná ngwụcha ma ọ bụkwanụ gị ahọrọ ịgụ ya n’isiokwu n’isiokwu otú e si depụta ha n’ebe a. Ọ bụrụ na ị gụchaa isi ole e dere maka ụbọchị nke ọ bụla, ị ga-agụcha Baịbụl n’otu afọ.
◆ Gụọ ụbọchị ndị nwere akara na-acha UHIE UHIE iji hụ otú Chineke si mesoo ndị Izrel ihe.
● Gụọ ụbọchị ndị nwere akara na-acha ANỤNỤ ANỤNỤ iji hụ otú ọgbakọ Ndị Kraịst si na-eto ka oge na-aga.
2
AKWỤKWỌ NDỊ MOZIS DERE
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ JENESIS 1-3 □
/ 4-7 □
/ 8-11 □
/ ◆ 12-15 □
/ ◆ 16-18 □
/ ◆ 19-22 □
/ ◆ 23-24 □
/ ◆ 25-27 □
/ ◆ 28-30 □
/ ◆ 31-32 □
/ ◆ 33-34 □
/ ◆ 35-37 □
/ ◆ 38-40 □
/ ◆ 41-42 □
/ ◆ 43-45 □
/ ◆ 46-48 □
/ ◆ 49-50 □
/ ỌPỤPỤ ◆ 1-4 □
/ ◆ 5-7 □
/ ◆ 8-10 □
/ ◆ 11-13 □
/ ◆ 14-15 □
/ ◆ 16-18 □
/ ◆ 19-21 □
/ 22-25 □
/ 26-28 □
/ 29-30 □
/ ◆ 31-33 □
/ ◆ 34-35 □
/ 36-38 □
/ 39-40 □
/ LEVITIKỌS 1-4 □
/ 5-7 □
/ 8-10 □
/ 11-13 □
/ 14-15 □
/ 16-18 □
/ 19-21 □
/ 22-23 □
/ 24-25 □
/ 26-27 □
/ ỌNỤ ỌGỤGỤ 1-3 □
/ 4-6 □
/ 7-9 □
/ ◆ 10-12 □
/ ◆ 13-15 □
/ ◆ 16-18 □
/ ◆ 19-21 □
/ ◆ 22-24 □
/ ◆ 25-27 □
/ 28-30 □
/ ◆ 31-32 □
/ ◆ 33-36 □
/ DIUTERỌNỌMI 1-2 □
/ ◆ 3-4 □
/ 5-7 □
/ 8-10 □
/ 11-13 □
3
/ 14-16 □
/ ◆ 17-19 □
/ 20-22 □
/ 23-26 □
/ 27-28 □
/ ◆ 29-31 □
/ ◆ 32 □
/ ◆ 33-34 □
NDỊ IZREL ABANYE N’ALA NKWA AHỤ
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ JỌSHỤA ◆ 1-4 □
/ ◆ 5-7 □
/ ◆ 8-9 □
/ ◆ 10-12 □
/ ◆ 13-15 □
/ ◆ 16-18 □
/ ◆ 19-21 □
/ ◆ 22-24 □
/ NDỊ IKPE ◆ 1-2 □
/ ◆ 3-5 □
/ ◆ 6-7 □
/ ◆ 8-9 □
/ ◆ 10-11 □
/ ◆ 12-13 □
/ ◆ 14-16 □
/ ◆ 17-19 □
/ ◆ 20-21 □
/ RUT ◆ 1-4 □
MGBE NDỊ EZE NA-ACHỊ IZREL
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ 1 SAMUEL ◆ 1-2 □
/ ◆ 3-6 □
/ ◆ 7-9 □
/ ◆ 10-12 □
/ ◆ 13-14 □
/ ◆ 15-16 □
/ ◆ 17-18 □
/ ◆ 19-21 □
/ ◆ 22-24 □
/ ◆ 25-27 □
/ ◆ 28-31 □
/ 2 SAMUEL ◆ 1-2 □
/ ◆ 3-5 □
/ ◆ 6-8 □
/ ◆ 9-12 □
/ ◆ 13-14 □
/ ◆ 15-16 □
/ ◆ 17-18 □
/ ◆ 19-20 □
/ ◆ 21-22 □
/ ◆ 23-24 □
/ 1 NDỊ EZE ◆ 1-2 □
/ ◆ 3-5 □
/ ◆ 6-7 □
/ ◆ 8 □
/ ◆ 9-10 □
/ ◆ 11-12 □
4
/ 1 NDỊ EZE (ụfọ) ◆ 13-14 □
/ ◆ 15-17 □
/ ◆ 18-19 □
/ ◆ 20-21 □
/ ◆ 22 □
/ 2 NDỊ EZE ◆ 1-3 □
/ ◆ 4-5 □
/ ◆ 6-8 □
/ ◆ 9-10 □
/ ◆ 11-13 □
/ ◆ 14-15 □
/ ◆ 16-17 □
/ ◆ 18-19 □
/ ◆ 20-22 □
/ ◆ 23-25 □
/ 1 IHE E MERE 1-2 □
/ 3-5 □
/ 6-7 □
/ 8-10 □
/ 11-12 □
/ 13-15 □
/ 16-17 □
/ 18-20 □
/ 21-23 □
/ 24-26 □
/ 27-29 □
/ 2 IHE E MERE 1-3 □
/ 4-6 □
/ 7-9 □
/ 10-14 □
/ 15-18 □
/ 19-22 □
/ 23-25 □
/ 26-28 □
/ 29-30 □
/ 31-33 □
/ 34-36 □
NDỊ JUU ESI NÁ NDỌRỌ N’AGHA LỌTA
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ EZRA ◆ 1-3 □
/ ◆ 4-7 □
/ ◆ 8-10 □
/ NEHEMAYA ◆ 1-3 □
/ ◆ 4-6 □
/ ◆ 7-8 □
/ ◆ 9-10 □
/ ◆ 11-13 □
/ ESTA ◆ 1-4 □
/ ◆ 5-10 □
AKWỤKWỌ NDỊ MOZIS DERE
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ JOB 1-5 □
/ 6-9 □
/ 10-14 □
/ 15-18 □
/ 19-20 □
5
/ 21-24 □
/ 25-29 □
/ 30-31 □
/ 32-34 □
/ 35-38 □
/ 39-42 □
AKWỤKWỌ ABỤ NA OKWU AMAMIHE
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ ABỤ ỌMA 1-8 □
/ 9-16 □
/ 17-19 □
/ 20-25 □
/ 26-31 □
/ 32-35 □
/ 36-38 □
/ 39-42 □
/ 43-47 □
/ 48-52 □
/ 53-58 □
/ 59-64 □
/ 65-68 □
/ 69-72 □
/ 73-77 □
/ 78-79 □
/ 80-86 □
/ 87-90 □
/ 91-96 □
/ 97-103 □
/ 104-105 □
/ 106-108 □
/ 109-115 □
/ 116-119:63 □
/ 119:64-176 □
/ 120-129 □
/ 130-138 □
/ 139-144 □
/ 145-150 □
/ ILU 1-4 □
/ 5-8 □
/ 9-12 □
/ 13-16 □
/ 17-19 □
/ 20-22 □
/ 23-27 □
/ 28-31 □
/ EKLIZIASTIS 1-4 □
/ 5-8 □
/ 9-12 □
/ ABỤ SỌLỌMỌN 1-8 □
NDỊ AMỤMA
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ AỊZAYA 1-4 □
/ 5-7 □
/ 8-10 □
6
/ AỊZAYA (ụfọ) 11-14 □
/ 15-19 □
/ 20-24 □
/ 25-28 □
/ 29-31 □
/ 32-35 □
/ 36-37 □
/ 38-40 □
/ 41-43 □
/ 44-47 □
/ 48-50 □
/ 51-55 □
/ 56-58 □
/ 59-62 □
/ 63-66 □
/ JEREMAYA 1-3 □
/ 4-5 □
/ 6-7 □
/ 8-10 □
/ 11-13 □
/ 14-16 □
/ 17-20 □
/ 21-23 □
/ 24-26 □
/ 27-29 □
/ 30-31 □
/ 32-33 □
/ 34-36 □
/ 37-39 □
/ 40-42 □
/ 43-44 □
/ 45-48 □
/ 49-50 □
/ 51-52 □
/ ABỤ ÁKWÁ 1-2 □
/ 3-5 □
/ EZIKIEL 1-3 □
/ 4-6 □
/ 7-9 □
/ 10-12 □
/ 13-15 □
/ 16 □
/ 17-18 □
/ 19-21 □
/ 22-23 □
/ 24-26 □
/ 27-28 □
/ 29-31 □
/ 32-33 □
/ 34-36 □
/ 37-38 □
/ 39-40 □
/ 41-43 □
/ 44-45 □
/ 46-48 □
/ DANIEL 1-2 □
/ 3-4 □
/ 5-7 □
/ 8-10 □
/ 11-12 □
7
/ HOSIA 1-7 □
/ 8-14 □
/ JOEL 1-3 □
/ EMỌS 1-5 □
/ 6-9 □
/ MAỊKA 1-7 □
/ ZEKARAYA 1-7 □
/ 8-11 □
/ 12-14 □
/ MALAKAỊ 1-4 □
AKỤKỌ NDỤ JIZỌS NA OZI YA
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ MATIU 1-4 □
/ 5-7 □
/ 8-10 □
/ 11-13 □
/ 14-17 □
/ 18-20 □
/ 21-23 □
/ 24-25 □
/ 26 □
/ 27-28 □
/ MAK ● 1-3 □
/ ● 4-5 □
/ ● 6-8 □
/ ● 9-10 □
/ ● 11-13 □
/ ● 14-16 □
/ LUK 1-2 □
/ 3-5 □
/ 6-7 □
/ 8-9 □
/ 10-11 □
/ 12-13 □
/ 14-17 □
/ 18-19 □
/ 20-22 □
/ 23-24 □
/ JỌN 1-3 □
/ 4-5 □
/ 6-7 □
/ 8-9 □
/ 10-12 □
/ 13-15 □
/ 16-18 □
/ 19-21 □
OTÚ ỌGBAKỌ NDỊ KRAỊST SI TOO
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ ỌRỤ ● 1-3 □
/ ● 4-6 □
/ ● 7-8 □
/ ● 9-11 □
8
/ ỌRỤ (ụfọ) ● 12-14 □
/ ● 15-16 □
/ ● 917-19 □
/ ● 20-21 □
/ ● 22-23 □
/ ● 24-26 □
/ ● 27-28 □
AKWỤKWỌ OZI NDỊ PỌL DERE
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ NDỊ ROM 1-3 □
/ 4-7 □
/ 8-11 □
/ 12-16 □
/ 1 NDỊ KỌRỊNT 1-6 □
/ 7-10 □
/ 11-14 □
/ 15-16 □
/ 2 NDỊ KỌRỊNT 1-6 □
/ 7-10 □
/ 11-13 □
/ NDỊ GALESHIA 1-6 □
/ NDỊ EFESỌS 1-6 □
/ NDỊ FILIPAI 1-4 □
/ NDỊ KỌLỌSI 1-4 □
/ 1 NDỊ TESALONAỊKA 1-5 □
/ 2 NDỊ TESALONAỊKA 1-3 □
/ 1 TIMOTI 1-6 □
/ 2 TIMOTI 1-4 □
/ NDỊ HIBRU 1-6 □
/ 7-10 □
/ 11-13 □
AKWỤKWỌ NDỊ ỌZỌ NDỊOZI NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ DERE
ỤBỌCHỊ ISI □✔
/ JEM S 1-5 □
/ 1 PITA 1-5 □
/ 2 PITA 1-3 □
/ 1 JỌN 1-5 □
/ MKPUGHE 1-4 □
/ 5-9 □
/ 10-14 □
/ 15-18 □
/ 19-22 □
Nke mbụ, si n’ebe a sụrụ kpọm kpọm chabie ya
Nke abụọ, jikọta peeji abụọ ọnụ pịajie
[Foto dị na peeji nke 14]
Ì nwere ike iwepụta oge iji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị?