Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee nnọọ ihe mere igbe ọgbụgba ndụ ahụ?
Ụmụ Izrel weere igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị ka ihe na-anọchi nnọọ anya ọnụnọ Chineke. (Ọpụpụ 25:22) Ọ bụ igbe dị nsọ e ji osisi rụọ ma jiri ọlaedo machie ya, bụ́ ebe Mozis tinyere mbadamba nkume abụọ e dere Iwu Chineke. Mgbe ụmụ Izrel bi n’ala ịkpa, e dewere Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu nzute. (Ọpụpụ 26:33) E mechara dewe Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru.—1 Ndị Eze 6:19.
Mgbe ikpeazụ e kwuru banyere Igbe ahụ bụ n’Ihe E Mere nke Abụọ 35:3, bụ́ mgbe Eze Josaya bughachiri ya n’ụlọ nsọ ahụ n’afọ 642 T.O.A. O nwere ike ịbụ na Manase, bụ́ onye si n’ezi ofufe dapụ nke chịrị tupu Josaya achịa, bupụrụ Igbe ahụ ma dewe arụsị n’ụlọ nsọ ahụ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e bupụrụ ya iji hụ na ọ dịghị ihe mere ya n’oge Josaya na-arụzi ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe E Mere 33:1, 2, 7; 34:1, 8-11) Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị amaghị ihe meziri Igbe ahụ, n’ihi na o soghị n’ihe ndị e depụtara e buuru n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ndị Babịlọn meriri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A.—2 Ndị Eze 25:13-17.
Akwụkwọ Nsọ ekwughị na e bughachiri Igbe ahụ n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ahụ Zerọbabel wugharịrị; o yikwanụghị ka ò nwere mgbe a rụghachịrị Igbe ahụ.—Ezra 1:7-11.
Olee ndị a kpọrọ Jems na Baịbụl?
Ha dị anọ, ọ dịkwa mfe ịghọtahie onye bụ́ onye. Otu n’ime ha bụ nna Judas onyeozi (ọ bụghị Judas Iskarịọt), o nweghịkwa ihe ọzọ anyị maara banyere ya.—Luk 6:16; Ọrụ 1:13.
E nwekwara nke bụ́ nwa Zebedi. Jems a bụ nwanne Jọn, ha abụọ bụkwa ndịozi Jizọs. (Matiu 10:2) Ọ ga-abụ na nne ya bụ Salomi, nwanne nne Jizọs. (Jiri Matiu 27:55, 56 tụnyere Mak 15:40, 41 na Jọn 19:25.) Ya bụrụ otú ahụ, Jems bụ nwa nwanne nne Jizọs. Ọ bụ onye ọkụ azụ̀, bụ́ onye ya na nwanne ya na Pita na Andru gbakọrọ aka na-akụ azụ̀.—Mak 1:16-19; Luk 5:7-10.
Onye nke atọ bụ Jems nwa Alfiọs, bụ́kwa otu n’ime ndịozi Jizọs. (Mak 3:16-18) A kpọrọ ya “Jems nke Nta” na Mak 15:40. O nwere ike ịbụ na a kpọrọ ya “nke Nta” n’ihi na Jems nwa Zebedi ka ya gbaa dimkpa ma ọ bụ tọọ ya.
Onye nke ikpeazụ bụ Josef nwa Meri, bụ́ nwanne Jud na Jizọs. (Mak 6:3; Ndị Galeshia 1:19) N’oge Jizọs na-eje ozi n’ụwa, Jems abụghị onye na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 12:46-50; Jọn 7:5) Ma, tupu Pentikọst 33 Oge Anyị, Jems na nne ya, ụmụnne ya ndị nwoke, na ndịozi nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem na-ekpe ekpere. (Ọrụ 1:13, 14) Jems mechara ghọọ onye a ma ama n’ọgbakọ Jeruselem ma dee akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jems.—Ọrụ 12:17; Jems 1:1.