Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Okwu Banyere Mmụọ Nsọ Ji Agbagwoju Ndị Mmadụ Anya?

Gịnị Mere Okwu Banyere Mmụọ Nsọ Ji Agbagwoju Ndị Mmadụ Anya?

Gịnị Mere Okwu Banyere Mmụọ Nsọ Ji Agbagwoju Ndị Mmadụ Anya?

GỊNỊ bụ mmụọ nsọ? Ajụjụ a yiri nnọọ ajụjụ dị mfe, ma o nwere ike isi ike ịchọta azịza ya. Poopu Benedict nke Iri na Isii gwara ìgwè mmadụ gbakọrọ n’Australia, sị: “O yiri ka anyị enweghị ike ịghọtacha ihe Mmụọ ahụ bụ.”

N’ezie, okwu banyere mmụọ nsọ na-agbagwoju ndị mmadụ anya, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-aza mgbe a jụrụ ha ajụjụ bụ́, Gịnị bụ mmụọ nsọ? Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-azakarị:

• Ọ bụ onye bi n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst.

• Ọ bụ iwu Chineke nke nọ n’ọrụ.

• Ọ bụ ihe na-egosi na Chineke nọ n’ọrụ n’ụwa.

• Ọ bụ onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu.

Gịnị mere e ji nwee azịza dị iche iche otú a? Mgbagwoju anya a malitere na narị afọ nke anọ Oge Anyị, mgbe ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe kwuru na mmụọ nsọ bụ onye ya na Chineke hatụ. Ma, Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst oge gboo akụzighị nke a. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “O doro anya na Agba Ochie akọwaghị mmụọ Chineke dị ka onye . . . Mmụọ Chineke bụ nnọọ ike Chineke.” Otu akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ihe e dere n’Agba Ọhụrụ gosiri na mmụọ Chineke bụ ihe, ọ bụghị onye; ihe kacha mee ka anyị mata nke a bụ na Agba Ọhụrụ gosiri na mmụọ nsọ na ike Chineke yiri.”

Ka a sịkwa ihe mere o ji esiri ndị mmadụ ike ikwere na ike nkịtị bụ onye. N’ihi ya, otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya na United States gosiri na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ekweghị na mmụọ nsọ bụ onye ma ọ bụ “ihe dị ndụ.” Echiche ha ò ziri ezi? Ka ànyị kwesịrị ikwere ihe ndị ọkà mmụta okpukpe kwuru, bụ́ ndị na-ekwusi ike na “Mmụọ Nsọ bụ Onye dị nnọọ iche ná Nna ahụ na Ọkpara ahụ”?

Iji nweta azịza ziri ezi, ọ dị mkpa ka anyị gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, bụ́ nke kọwara ihe mmụọ nsọ bụ nke ọma. Pọl onyeozi dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị.”—2 Timoti 3:16.

Gịnị mere i kwesịrị iji chọọ ịmata nke bụ́ eziokwu banyere mmụọ nsọ? Ọ bụ n’ihi na ịmata nke bụ́ eziokwu nwere ike ime ka i nweta enyemaka Chineke. Ò nwere mgbe ike ụwa na-agwụ gị? Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu . . . Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, . . . lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:9, 13.

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-atụle otú Akwụkwọ Nsọ si kọwaara anyị ihe mmụọ nsọ bụ. Anyị ga-ahụkwa otú ọ ga-esi baara anyị uru ná ndụ anyị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 3]

Akwụkwọ Nsọ kọwaara anyị ihe mmụọ nsọ bụ