Njem Mere Ka Anyị Hụ Ihe Ndị Mere n’Oge Ochie
Akwụkwọ Ozi Si United States
Njem Mere Ka Anyị Hụ Ihe Ndị Mere n’Oge Ochie
CHEGODỊ echiche otú ọ ga-esi atọ gị ụtọ ime njem gaa hụ otú nna nna gị hà si bie ndụ. Anyị nwere ike ịsị na anyị mere ụdị njem ahụ. Njem ahụ du anyị si na Switzerland gaa United States of America. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche na ebe niile na United States mepere emepe, ma njem ahụ mere ka anyị hụ ụdị ndụ ndị mmadụ biri na narị afọ abụọ gara aga. Ka anyị kọọrọ gị banyere ya.
Ebe ọ bụ na anyị na-asụ asụsụ German a na-asụ na Switzerland, a kpọrọ anyị òkù ịbịa nọọ ọnwa atọ na steeti Indiana. Ihe anyị bu n’uche gawa bụ izi ezinụlọ dị iche iche nke ndị Amman, bụ́ ndị ka na-asụ asụsụ ndị nna nna ha, ozi ọma Alaeze Chineke. Ọtụtụ narị ezinụlọ ndị Amman bi n’Indiana.
Ndị Amman bụ ụmụ ụmụ ìgwè ndị okpukpe Anabaptist nke narị afọ nke iri na asaa. Aha ha si n’aha onye ndú ha, bụ́ Jacob Amman, onye biri na Switzerland. N’ihi ihe ndị ha mụtara na Baịbụl n’oge ahụ, ndị a na-atụ egwu Chineke matara na ime ụmụaka baptizim na ịga agha adịghị mma. N’ihi ihe ndị ha kweere, gọọmenti kpagburu ha. E gbudịrị ụfọdụ n’ihi ihe ndị ha kweere. Mkpagbu a na-akpagbu ha nọgidere na-aka njọ, ụfọdụ n’ime ha wee gbaga n’ebe ndị ọzọ na Switzerland nakwa na France. Ka ọ na-erula ọkara narị afọ nke iri na itoolu, ọtụtụ puku n’ime ha agbagala United States. Ha ji omenala ha na asụsụ German a na-asụ na Switzerland gawa.
Mgbe anyị gara leta ndị a dị nwayọọ, o juru ha anya ịhụ ka anyị na-asụ asụsụ ha mgbe anyị bịara na nke ha! Weregodị ya na ị nọ mgbe anyị na ha na-ekwurịta ihe ndị a.
Ha jụrụ anyị n’asụsụ German a na-asụ na Switzerland, sị: “Olee otú unu si na-asụ ka anyị?”
Anyị zara, sị: “Ọ bụ n’ihi na anyị si Switzerland.”
O juru ha anya, ha ekwuo, sị: “Ma, unu abụghị ndị Amman!”
Ọtụtụ n’ime ha nabatara anyị, anyị hụkwara ụdị ndụ o yiri ka ndị nna nna ha ò biri n’oge ochie. Ha ji mpanaka mere bọlb eletrik; jiri ịnyịnya mere ụgbọala; jiri olulu mmiri nke e ji ikuku adọpụta mmiri ya mere mmiri pọmpụ; jiri abụ mere redio.
Ihe kacha masị anyị bụ ịdị umeala n’obi nke ndị ahụ anyị gara na nke ha. Ọtụtụ ndị Amman na-ahụ na ha gụrụ Baịbụl kwa ụbọchị, ha ejighịkwa ikwurịta banyere Baịbụl egwuri egwu. Nke a mere ka ọ dị mfe anyị na ha ikwurịta banyere ihe bụ́ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ na ụwa.
N’oge na-adịghị anya, mmadụ niile nụrụ na e nwere ndị si Switzerland bịa. Ọtụtụ n’ime ha rịọrọ anyị ka anyị leta ndị ikwu ha, anyị jikwa obi ụtọ gaa. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe a kpọrọ anyị òkù ịga n’otu ụlọ akwụkwọ ndị Amman. Olee ihe ga-eme n’ebe ahụ?
Anyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ akwụkwọ ahụ. Otu onye nkụzi mepere ụzọ ahụ ma gwa anyị ozugbo
ka anyị bata na klas, bụ́ ebe iri ụmụ akwụkwọ atọ na asatọ nọ na-eche ịma ihe anyị anọ ji bịa. A kpọkọtara ụmụ akwụkwọ nọ na klas asatọ n’otu klas, ụmụ akwụkwọ ahụ nọkwa n’agbata afọ asaa na afọ iri na ise. Ụmụ akwụkwọ ndị nwaanyị niile yi otu ụdị uwe na-acha anụnụ anụnụ ma kpuru okpu ọcha; ndị nwoke ha yi traụza ojii na uwe na-acha nnọọ anụnụ anụnụ. Uko ụlọ ahụ dị nnọọ elu. E tere akụkụ atọ nke klas ahụ ágbá na-acha anụnụ anụnụ, e nweekwa bọọdụ ide ihe n’ihu ya. Ihe dị ka bọl e sere map ụwa na ụfọdụ map a fụkọrọ afụkọ dịkwa n’akụkụ ebe ahụ. Otu nnukwu stovu ígwè e ji ekpo ụlọ ọkụ dị n’otu akụkụ klas ahụ.Ka anyị nọdụrụ ọdụ n’oche e debeere anyị n’ihu klas ahụ, ụmụaka ahụ legidere anyị nnọọ anya. A kpọrọ klas nke ọ bụla ka ha bịa n’ihu onye nkụzi ha, a jụọkwa ha ajụjụ banyere ihe omume a gwara ha mee n’ụlọ ụnyaahụ. Obi tọrọ anyị ụtọ, ya ejukwa anyị anya ịhụ ka onye nkụzi na-ajụ ụmụaka ahụ ajụjụ banyere Ugwu Alp nke Switzerland mgbe ọ na-akụziri ha ihe. Akwụkwọ ọgụgụ ndị e ji akụziri ha ihe emeela ochie, onye nkụzi ahụ jụkwara anyị ma otú ahụ akwụkwọ ndị ahụ si kọwaa Switzerland ọ̀ bụkwa otú ọ ka dị. Ọ jụrụ ma ehi ọ̀ ka na-aga ata ahịhịa n’elu ugwu n’oge okpomọkụ, ka snoo ọ̀ ka na-adị n’ugwu ndị ahụ? Ọ mụmụrụ nnọọ ọnụ ọchị mgbe anyị gosiri ya foto ndị nwere àgwà zuru ezu nke ebe snoo kpuchiri ugwu ndị ahụ bụ́ nke mere ka ọ ghọtakwuo foto ndị na-enweghị àgwà zuru ezu e sere n’akwụkwọ ya.
Nwunye onye nkụzi ahụ, bụ́ osote ya, jụrụ anyị ajụjụ a na-ajụkarị n’ebe a, nke bụ́, “Ùnu nwere ike ịgbanwe olu n’abụ?” * Anyị zara, sị, “Ee e.” Ma, ebe anyị maara na ndị Amman maara nnọọ otú e si abụ abụ na otú e si agbanwe olu n’abụ, anyị gwara ha ka ha bụọrọ anyị abụ. Ha bụụrụ anyị abụ, abụ ahụ mmadụ iri anọ bụrụ tọkwara anyị ezigbo ụtọ. Onye nkụzi ahụ gwaziri ụmụaka ahụ ka ha gaa gwurie egwu.
Nwunye onye nkụzi ahụ gwaziri anyị ka anyị bụọrọ ha abụ. Ebe ọ bụ na anyị ji akwụkwọ ebe e dere abụ ochie e dere n’asụsụ German a na-asụ na Switzerland, anyị kwetara. Akụkọ banyere abụ ahụ ruru ụmụaka ahụ nọ na-egwuri egwu ntị ngwa ngwa, ha ejiri ọsọ gbaghachi na klas ahụ. Ka anyị guzo n’ihu klas ahụ, anyị gbalịrị ike anyị niile ịbụrụ ha abụ.
Mgbe e mesịrị, a kpọrọ anyị òkù iso otu ezinụlọ ndị Amman dị mmadụ iri na abụọ rie nri ehihie. E bujuru nri ndị dị mma n’otu tebụl dị ogologo, dị ka poteto a sụrụ asụ, anụ, ọka, achịcha, mmiri ara ehi kpụkọrọ akpụkọ, akwụkwọ nri, keki, na ihe ndị ọzọ e ji atacha ọnụ. Tupu anyị amalite iri nri ahụ, onye ọ bụla kpere ekpere n’obi ya. Ka onye nke ọ bụla na-ekuru nri, anyị kwurịtara banyere Switzerland, bụ́ mba ndị nna nna ha, ha akọọkwara anyị banyere otú ndụ na-adịrị ha n’ubi. Ụmụaka nọ na-atakwunyere ibe ha ihe ma na-achị ọchị n’oge niile ahụ anyị na-eri nri. Mgbe mmadụ niile richara nri, e kpekwara ekpere ọzọ, bụ́kwa nke gosiri ụmụaka ahụ na ha nweziri ike ịpụwa, ma ọ bụghị ịga gwurie egwu. Onye nke ọ bụla nwere ọrụ e kenyere ya n’ibupụsị ihe dị na tebụl na ịsa efere, bụ́ nke pụtara ibu ụzọ dọpụta mmiri na isi ya n’ọkụ.
Ka ụmụaka ahụ nọ na-asa efere, ndị mụrụ ha kpọrọ anyị ka anyị soro ha nọrọ na palọ. Ha enweghị oche kushọn, ma anyị nọdụrụ ala, tụsara ahụ́ n’oche ndabere. Ha si na kọbọd wepụta Baịbụl German ochie, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị malitere ikwurịta ihe ime mmụọ, dị ka ezinụlọ ndị Amman na-emekarị. Gịnị bụ nzube Jehova Chineke banyere ụwa na ụmụ mmadụ? Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na ndị dị nwayọọ n’obi ga-eketa ụwa? Chineke ò zubere n’ezie ịta ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi? Ole ndị na-emezu iwu Jizọs nyere nke bụ́ ikwusa ozi ọma n’elu ụwa dum mmadụ bi? Anyị na ndị a ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ ndị ji Baịbụl ha n’aka, ịtụle ajụjụ niile a na ọtụtụ ndị ọzọ mere anyị obi ụtọ.
Obi na-atọ anyị ụtọ icheta njem ahụ mere ka anyị hụ ụdị ndụ ndị mmadụ biri n’oge ochie, bụ́ ebe anyị hụrụ ọtụtụ ihe magburu onwe ha. Anyị nwere olileanya ma na-ekpe ekpere ka njem ahụ anyị mere na okwu anyị na ndị mmadụ kwurịtara n’asụsụ German a na-asụ na Switzerland mee ka ọtụtụ ndị meghee, ọ bụghị naanị ọnụ ụzọ ha, kamakwa obi ha, iji nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Ihe ọ pụtara bụ ịgbanwe olu n’ike mgbe a na-abụ abụ, e welitụ olu elu, e wedatụ ya ala, bụ́ nke a na-emekarị na Switzerland na Austria.