Ihe Anyị Mụtara Banyere Ebere Chineke
Maka Ndị Na-eto Eto
Ihe Anyị Mụtara Banyere Ebere Chineke
JONA—AKỤKỤ NKE 2
Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.
1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JONA 3:1–4:11.
Olee otú i chere obi dị Jona mgbe ọ banyere n’obodo Ninive?
․․․․․
Olee otú i chere olu Jona dara mgbe ọ na-akpọsa ikpe ọmụma Jehova?
․․․․․
Olee ihe ga na-agbakasị Jona ahụ́ ka ọ nọ ọdụ ná mpụga obodo ahụ? (Gụọ Jona 4:5-8.)
․․․․․
2 LEBAKWUO YA ANYA.
Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere Jona ji chọọ ka Jehova bibie Ninive otú ahụ o buru n’amụma?
․․․․․
Jiri akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta (1) otú osisi ogiri ụgba na-adị na ihe ndị e ji mara ya, na (2) ihe ákwà iru uju ahụ eze Ninive yi na ọdụ ọ nọdụrụ ná ntụ pụtara.
․․․․․
N’agbanyeghị na Jona achọbughị ịga buo amụma na Ninive, olee ihe mere e nwere ike iji kpọọ ya onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee obi ike? (․․․․․
3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .
Otú ụmụ mmadụ nwere ike isi hapụ omume ọjọọ ha.
․․․․․
Ebere Jehova.
․․․․․
Mkpa ọ dị anyị ime ebere.
․․․․․
4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?
․․․․․
Ọ bụrụ na ị chọrọ imekwu nnyocha, gụọ Ụlọ Nche, April 1, 2009, peeji nke 14-18.
I NWERE IKE ỊMỤTAKWU BANYERE BAỊBỤL, NA www.watchtower.org NA www.dan124.com