Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Di Ha Nwụrụ na Ndị Nwunye Ha Nwụrụ—Olee Ihe Dị Ha Mkpa? Olee Otú I Nwere Ike Isi Nyere Ha Aka?

Ndị Di Ha Nwụrụ na Ndị Nwunye Ha Nwụrụ—Olee Ihe Dị Ha Mkpa? Olee Otú I Nwere Ike Isi Nyere Ha Aka?

Ndị Di Ha Nwụrụ na Ndị Nwunye Ha Nwụrụ—Olee Ihe Dị Ha Mkpa? Olee Otú I Nwere Ike Isi Nyere Ha Aka?

Jen nọ nnọọ n’ụlọ isi nri dị n’obere ụlọ ebe o bi, bụ́ nke ọkụ ya na-anaghị enwusi ike, na-edozi tebụl maka nri. A sị ka e kwuwe, ọ ga-erinụ nri. Na mberede, anya ya gara n’efere abụọ o dowere n’elu tebụl, . . . ya amalitekwa ibe ákwá. O chetaghị na ọ bụzi naanị ya nọ, ya ewepụta efere maka mmadụ abụọ! Di ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ kemgbe afọ abụọ.

NDỊ di ma ọ bụ nwunye ha na-anwụtụbeghị enweghị ike ịghọta otú ọ na-esi ewute mmadụ. N’ezie, naanị ihe mmadụ na-eme bụ iji nwayọọ nwayọọ die ihe ọjọọ ahụ merenụ. Mgbe di Beril nwụrụ na mberede, ọ dịghịrị Beril, bụ́ onye dị afọ iri asaa na abụọ, mfe ikweta na di ya anwụọla. O kwuru, sị: “Ọ dị m ka ihe na-emeghị eme. Ekwetalighị m na ọ gaghị esi n’ọnụ ụzọ ụlọ anyị bata ọzọ.”

Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ndị e gbupụrụ aka ka aka ahụ ọ̀ ka dị. N’otu aka ahụ, mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ka hà na-ahụ onye ahụ ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’etiti ìgwè mmadụ, ma ọ bụ chọpụta na mberede na ha na-ekwusara onye na-anọkwaghị ya okwu!

Mgbe mgbe, ndị ikwu na ibe anaghị ama ihe ha ga-emere onye nọ n’ụdị ahụhụ ahụ. Ọ̀ dị onye ị maara di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ? Ya bụrụ na ọ dị, olee otú i nwere ike isi nyere ya aka? Olee ihe ndị i kwesịrị ịmata iji nwee ike inyere ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ aka idi ihe ahụ mere ha? Olee otú i nwere ike isi nyere onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ aka iji nwayọọ nwayọọ nụwakwa ụtọ ndụ?

Ihe Ndị Ị Ga-ezere

Ahụhụ onye mmadụ nwụnahụrụ na-ata nwere ike na-ewute ndị ikwu na ibe ya, ha ana-anwakwa ịkwụsị uju ahụ ọ na-eru ngwa ngwa, chee na ha na-emere ya ihe ọma. Ma, otu onye na-eme nnyocha nke gbara narị mmadụ asaa di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ajụjụ ọnụ, dere, sị: “O nweghị oge mmadụ ‘kwesịrị’ iruru uju.” N’ihi ya, kama ịchọ ime ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ kwụsị ibe ákwá, nye ya ohere igosipụta mwute ya.—Jenesis 37:34, 35; Job 10:1.

Ọ bụ ezie na i nwere ike inyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka hazie ihe ụfọdụ banyere olili onye ahụ, echela na ị ga-eweghara ọrụ niile dị n’olili ahụ. Pọl, bụ́ onye dị iri afọ anọ na itoolu nke nwunye ya nwụrụ, kwuru, sị: “Echere m na ọ dị mma na ndị nyeere m aka n’olili nwunye m ka kwere ka m tụzie ihe e mere n’olili ahụ. Obi dị m nnọọ ụtọ na m hụrụ na ihe niile gara nke ọma n’olili nwunye m. Echere m na ọ bụ ihe ikpeazụ m nwere ike ime iji kwanyere ya ùgwù.”

Ma, o doro anya na obi na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ na e nyeere ha aka. Aịlin, onye dị afọ iri isii na asatọ di ya nwụrụ, kwuru, sị: “Ịkwadebe olili ya na ide ihe ndị a ga-ede ede siiri m ike ebe ọ bụ na echiche akpakọghị m ọnụ. Ihe ọma meere m bụ na nwa m nwoke na nwunye ya nyeere m ezigbo aka.”

Ọzọkwa, atụla ụjọ ịgwa onye mmadụ nwụnahụrụ okwu banyere onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Beril, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite, kwuru, sị: “Ndị enyi m nyeere m ezigbo aka. Ma, achọpụtara m na ọtụtụ ndị achọghị ikwu okwu banyere di m Jọn. Ọ dị ka à ga-asị na ọ dịtụbeghị ndụ, nke ahụ wutetụkwara m.” Ka oge na-aga, ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ nwere ike ịchọ ikwu okwu banyere di ma ọ bụ nwunye ha n’ihu ndị ọzọ. Ò nwere ihe ọma i chetara onye ahụ nwụrụ anwụ mere ma ọ bụ akụkọ na-atọ ọchị e ji mara ya? Ya bụrụ na ọ dị, gwa onye nke ahụ dị ndụ na ị chọrọ ịkọrọ ya ya; ekwela ka ụjọ gbochie gị ịkọ ya. Ọ bụrụ na i chee na ihe ị chọrọ ikwu ga-amasị ya, kọọrọ ya ihe di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ anwụ na-eme nke masịrị gị ma ọ bụ ihe na-ewute gị banyere ọnwụ ya. Nke a nwere ike inyere ndị na-eru uju aka ịmata na ndị ọzọ so ha na-eru uju.—Ndị Rom 12:15.

Mgbe ị na-enyere onye na-eru uju aka, enyekasịla ya ndụmọdụ ahụ́. Zere ịmanye ya ime mkpebi ọkụ ọkụ. * Kama nke ahụ, jiri amamihe jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe m nwere ike ime ga-enyere enyi m ma ọ bụ onye ikwu m aka isi n’ọnọdụ a kacha taa akpụ ná ndụ ya pụta?’

Ihe I Nwere Ike Ime

O nwere ike ịdị onye di ma ọ bụ nwunye ya ka nwụpụrụ anwụpụ mkpa ka e nyere ya aka mee ihe ụfọdụ. Ì nwere ike isiri ya nri, inye ndị ikwu ya bịara ileta ya ụlọ, ma ọ bụ ịnọnyere ya?

Ọ dịkwa mkpa ka ị ghọta na otú ụmụ nwoke si eru uju na otú owu si ama ha nwere ike ịdị iche na nke ụmụ nwaanyị. Dị ka ihe atụ, n’ebe ụfọdụ n’ụwa, ihe karịrị ọkara ụmụ nwoke ndị nwunye ha nwụrụ na-alụgharị nwaanyị n’ime otu afọ na ọkara nwunye ha nwụchara, bụ́ ihe ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na-anaghị emekarị. Olee ihe kpatara ọdịiche ahụ?

Ọtụtụ ndị na-eche na ihe mere ụmụ nwoke na-ejikarị alụgharị nwaanyị bụ iji gboo mkpa anụ ahụ́ na agụụ mmekọahụ, ma nke ahụ abụghị eziokwu. N’ezie, ihe nwere ike ime ka oké owu mawa nwoke nwunye ya nwụrụ bụ na ụmụ nwoke na-achọkarị inwe otu onye ha ga na-akọrọ ihe. Ma, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na-enwekarị ike inweta ndị ọzọ ha na-akọrọ ihe, n’agbanyeghị na ndị enyi di ha na-echefu ha mgbe ụfọdụ. Ọ bụ ọchịchọ ahụ ụmụ nwoke nwere so eme ka ọtụtụ n’ime ha chee na naanị otú ha ga-esi zere owu ọmụma bụ ịlụgharị nwaanyị—n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka ha lụgharịa nwaanyị ọkụ ọkụ. Ya mere, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na-edili owu ọmụma karịa ndị nke nwoke.

Ma enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị ahụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị, olee ihe i nwere ike ime iji nyere ya aka idi owu na-ama ya? Helin, bụ́ onye dị afọ iri anọ na itoolu nke di ya nwụrụ, kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị bu ezi ihe n’obi, ma ha anaghị eme ya eme. Ha na-ekwukarị, sị, ‘Ya nwee ihe ị chọrọ ka m meere gị, mee ka m mara.’ Ma, obi tọrọ m ụtọ mgbe ụfọdụ ndị gwara m, sị, ‘M na-aga ahịa. Ị̀ ga-achọ iso m?’” Pọl, bụ́ onye kansa gburu nwunye ya, kọwara ihe mere obi ji adị ya ụtọ mgbe ndị mmadụ kpọrọ ya ka ya na ha soro pụọ apụọ. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ị gaghị achọ ka gị na ndị mmadụ nọrịa ma ọ bụ kwurịta ọnọdụ gị. Ma, mgbe gị na ndị mmadụ nọrịchara ná mgbede, obi na-adị gị ụtọ karị; owu anaghị amachakwa gị. Ị na-ama na ndị mmadụ na-eche nnọọ banyere gị, nke ahụ na-emekwa ka owu na-ama gị belata.” *

Mgbe Ọmịiko Na-adị Ndị Mmadụ Nwụnahụrụ Ezigbo Mkpa

Helin chọpụtara na ọ bụ mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị ikwu na ibe ya laghachichara ka ọ chọrọ enyemaka ha karịsịa. O kwuru, sị: “Ndị ikwu na ibe gị na-anọnyere gị ozugbo ihe ahụ mere, nke ahụ gachaa, ha alaghachi n’ihe ndị ha na-emebu. Ma, ndụ gị anaghị adịghachi otú ọ dịbu.” Ezi ndị enyi na-ama nke ahụ ma nọgide na-ewepụta oge ịnọnyere ma na-enyere onye ahụ aka.

O nwere ike ịkacha dị onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ mkpa ka mmadụ nọnyere ya n’ụbọchị ndị pụrụ iche ná ndụ ha, dị ka n’ụbọchị ncheta agbamakwụkwọ ha ma ọ bụ n’ụbọchị ahụ di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ. Ailin, bụ́ onye a kpọrọ aha na mbụ, kwuru na nwa ya nwoke torola eto na-eme ka owu ghara ịma ya n’ụbọchị ncheta agbamakwụkwọ ya na di ya. O kwuru, sị: “Kwa afọ, nwa m nwoke bụ́ Kevin na-akpọ m apụ apụ, malite n’ụtụtụ ruo mgbede. Mụ na ya na-eri nri ehihie, ụbọchị ahụ na-abụkwa maka naanị mụ na ya.” Ọ́ gaghị adị mma ka i buru ụbọchị ma ọ bụ oge ndị owu na-akacha ama onye ikwu gị ma ọ bụ enyi gị di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ n’obi? I nweziri ike ime ndokwa ịnọnyere ya ma ọ bụ ka onye ọzọ nọnyere ya n’ụbọchị ndị ahụ.—Ilu 17:17.

Ụfọdụ achọpụtala na ndị ọzọ di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ nwere ike inyere ha aka. Anị, bụ́ onye di ya nwụrụ kemgbe afọ asatọ, kwuru banyere mkpakọrịta ya na nwaanyị ọzọ di ya nwụrụ, sị, “Otú o si kpebisie ike idi ọnwụ di ya masịrị m ma gbaa m ume idi nke m.”

N’ezie, mgbe ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ rutụchara uju, ha nwere ike ịkasi ndị ọzọ obi ma mee ka ha nwee olileanya. Ụmụ nwaanyị abụọ di ha nwụrụ e kwuru okwu ha na Baịbụl, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Rut na nne di ya bụ́ Neomi, gbara ibe ha ume. Akụkọ ahụ na-emetụ n’ahụ́ kọwara otú ịhụnanya ụmụ nwaanyị a nwere n’ebe ibe ha nọ si nyere ha aka idi ọnwụ di ha na imeri ọnọdụ siri ike bịaara ha.—Rut 1:15-17; 3:1; 4:14, 15.

Oge Ịgwọ Agwọ

Iji maliteghachi ime ọtụtụ n’ime ihe ndị ha na-emebu, ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ekwesịghị ikwe ka icheta onye ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ mee ka ha ghara ilebara mkpa ndị ha nwere ugbu a anya. Eze Sọlọmọn maara ihe kwetara na e nwere “oge ịkwa ákwá.” Ma, o kwukwara na e kwesịrị inwe “oge ịgwọ agwọ.”—Ekliziastis 3:3, 4.

Pọl, bụ́ onye e kwuru banyere ya n’elu, mere ihe atụ nke gosiri otú o si esi ike ịkwụsị iche ihe ndị gara aga. O kwuru, sị: “Mụ na nwunye m dị ka obere osisi abụọ tolitekọtara ọnụ ma hịkọọ ibe ha n’ahụ́. Ma, otu nwụziri, e wepụ ya, nke ọzọ ahụ eyizie osisi ahụ́ na-akpakọghị ọnụ. Ọ dịghị m ka m ga-anọli naanị m.” Ụfọdụ anaghị achọ ichefu ihe ndị gara aga n’ihi na ha chọrọ ịkwanyere di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ anwụ ùgwù. Ndị ọzọ na-eche na ọ bụrụ na ha ekporie ndụ, ha agbaala di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ anwụ mgba okpuru, n’ihi ya, ha anaghị ekwe apụ apụ ma ọ bụ emeta ndị enyi ọhụrụ. Olee otú e nwere ike isi nyere ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ aka iji nwayọọ nwayọọ gbakee—biri ndụ gawa?

Ihe mbụ e nwere ike ime bụ inyere onye ahụ aka ikwu otú obi dị ya. Habat, bụ́ onye nwunye ya nwụrụ kemgbe afọ isii, kwuru, sị: “Ihe kacha amasị m bụ mgbe ndị bịara ileta m nọdụrụ nwayọọ ma na-ege m ntị ka m na-eche ma ọ bụ na-ekwupụta ihe ndị gbatara m n’obi. O doro m anya na ọ bụghị mgbe niile ka obi na-eru ndị mụ na ha nọ ala, ma ọmịiko ha gosiri m mere m obi ụtọ.” Ihe kacha metụ Pọl n’ahụ́ bụ otú otu enyi ya torola eto si ajụ ya mgbe niile otú ọ na-eme. Pọl kwuru, sị, “Otú ahụ o si eji nnọọ obiọma ajụ m otú m mere masịrị m, ọtụtụ mgbe, m na-akọkwara ya otú obi dị m.”—Ilu 18:24.

Mgbe onye mmadụ nwụnahụrụ na-ekwupụta mwute ya, otú obi ya si na-ama ya ikpe, iwe ya, ma ọ bụ ihe ndị dị otú ahụ, ọ pụtara na o kwetawala na di ya ma ọ bụ nwunye ya anọghịzi. Ihe nyeere Eze Devid aka inweta ikike ‘ibili’ na ikweta na nwa ya nwoke nwụrụ anwụ anwụọla bụ ịkọrọ onye ọ kacha akọrọ izu nzuzo ya, bụ́ Jehova Chineke, otú obi dị ya.—2 Samuel 12:19-23.

Ka oge na-aga, ọ dị mkpa ka onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ maliteghachi ime ihe ndị ọ na-emebu kwa ụbọchị, ọ bụ ezie na nke a nwere ike isiri ya ike ná mmalite. Ì nwere ike ịkpọ ya ka o soro gị mee ihe ụfọdụ ị na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịga ahịa ma ọ bụ ịkpagharị ná mgbede? Ì nwere ike ịgwa enyi gị ahụ ka o nyere gị aka rụọ ọrụ ụfọdụ? Nke ahụ bụ ụzọ ọzọ isi mee ka mmadụ gharazie ịnọ naanị ya. Dị ka ihe atụ, ò nwere ike ilekọtara gị ụmụ gị ma ọ bụ kụziere gị otú e si esi nri ụfọdụ? Ò nwere ike inyere gị aka rụzie ihe ụfọdụ n’ụlọ gị? Ịrịọ onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ ụdị ihe ndị ahụ na-eme ka onye ahụ nwee ike ịrụ ọrụ ga-enye ya obi ụtọ, meekwa ka ọ mara na ọ ka bara uru ná ndụ.

Ọ bụrụ na onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ amaliteghachi ịkọrọ ndị ọzọ ihe dị ya n’obi, ndụ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ maliteghachi ịtọ ya ụtọ, o nwedịrị ike ime ka o nwee ihe ndị ọhụrụ ọ ga-agbawa mbọ ime ná ndụ. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Yonet, bụ́ nwaanyị dị afọ iri anọ na anọ di ya nwụrụ, nke nwekwara ụmụ. O kwuru, sị: “Ịmaliteghachi ime ihe ndị m na-eme mgbe niile siiri m ezigbo ike! Ịrụ ọrụ ndị m na-arụ kwa ụbọchị, ịhazi ego m, na ilekọta ụmụ m atọ siiri m nnọọ ike.” Ma, ka oge na-aga, Yonet mụtara ịkpakọ onwe ya ọnụ, mụtakwa ụzọ ka mma isi na-agwa ụmụ ya okwu. Ọ mụtakwara ịnabata enyemaka nke ezi ndị enyi ya.

“Ndụ Ka Bụ Onyinye Dị Oké Ọnụ Ahịa”

Ọ bụrụ na ndị ikwu na ibe nke onye mmadụ nwụnahụrụ chọrọ inyere ya aka, ha ekwesịghị ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ, onye ahụ nwere ike ya nwetụ obi ụtọ, ya enwetụ nkụda mmụọ. N’ezie, “ihe na-egbu ya mgbu n’obi” nwere ike ịdị oké njọ.—1 Ndị Eze 8:38, 39.

Ọ bụ n’oge dị otú ahụ tara akpụ ka o nwere ike ịdị mkpa ka e jiri obiọma gbaa onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ ume ka ọ ghara iche na ya abazighị uru, gharakwa ịnọ naanị ya. Ụdị enyemaka ahụ enyerela ọtụtụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ aka ịmaliteghachi inwe obi ụtọ ná ndụ. Klọd, onye dị afọ iri isii nwunye ya nwụrụ, nke na-ekwusakwa ozi ọma oge niile n’Afrịka ugbu a, kwuru, sị: “Ndụ ka bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa, n’agbanyeghị obi mgbawa mmadụ na-enwe mgbe di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ.”

Ndụ mmadụ na-agbanwe mgbe di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị maliteghachiri ibi ndụ otú ha na-ebibu mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụchara ka nwere ọtụtụ uru ha ga-abara ndị ọzọ.—Ekliziastis 11:7, 8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Iji nweta aro ndị ọzọ a tụrụ banyere otú e nwere ike isi nyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka, gụọ broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, peeji nke 20-25, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Ezi ndị enyi na-anọgide na-ewepụta oge ịnọnyere onye mmadụ nwụnahụrụ ma na-enyere ya aka

[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]

 Hà Na-enyere Mmadụ Aka Icheta Onye Ya Nwụrụ Anwụ Ka Hà Na-eme Ka Ọnwụ Onye ahụ Sie Ike Odidi?

Helin, bụ́ onye di ya nwụrụ naanị afọ ole na ole gara aga, kwuru, sị: “Edowere m ọtụtụ ngwongwo di m. Achọpụtawala m na ha na-echetara m ihe ndị na-emekwu m obi ụtọ ka oge na-aga. Achọghị m ịtụfu ihe ọ bụla ozugbo ọ nwụchara n’ihi na obi m nwere nnọọ ike ịgbanwe ka oge na-aga.”

N’aka nke ọzọ, Klọd, bụ́ onye nwunye ya nwụrụ afọ ise gara aga kwuru, sị: “Echeghị m na ọ bụ iji ngwongwo ya gbaa onwe m gburugburu ga-eme ka m nọgide na-echeta ya. Echere m na ịkwapụ ngwongwo ya nyeere m aka iwere ihe otú ọ dị ma mee ka ọnwụ ya kwe m odidi.”

Ihe ndị ahụ e kwuru n’elu gosiri ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si ele ngwongwo onye nwụrụ anwụ anya. N’ihi ya, ndị ikwu na ibe maara ihe kwesịrị izere ịmanye onye mmadụ nwụnahụrụ ime echiche nke ha n’okwu a.—Ndị Galeshia 6:2, 5.

[Foto dị na peeji nke 9]

È nwere ụbọchị ndị enyemaka gị ga-akacha abara ya uru?

[Foto dị na peeji nke 9]

Cheta ịkpọ ha ka ha soro gị pụọ apụọ

[Foto dị na peeji nke 10]

Na-akpọ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ka ha soro gị mee ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị ma ọ bụ soro gị tụrụ ndụ