Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Jizọs Ji Jụ Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Gịnị Mere Jizọs Ji Jụ Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

Gịnị Mere Jizọs Ji Jụ Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị?

JIRI anya nke uche gị kirie otu ihe mere n’afọ 32 Oge Anyị. Chi ejiwela. Jizọs, bụ́ Mesaya ahụ e buru n’amụma, ewuwelarị ewuwe maka ịgwọ ndị ọrịa na ịkpọlitedị ndị mmadụ n’ọnwụ. Taa, o meela ihe tụrụ ọtụtụ puku mmadụ n’anya site n’ime ihe àmà ndị dị ike na ịkụziri ndị mmadụ banyere Chineke. Ugbu a, o kewasịrị ìgwè mmadụ ahụ agụụ ji obere obere. O kpegaara Jehova ekpere ma jiri ọrụ ebube nye ha niile nri. Ọ chịkọtaziri nri ndị fọrọ afọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi. Olee ihe ìgwè mmadụ ahụ mere?—Jọn 6:1-13.

Mgbe ndị ahụ hụchara ọrụ ebube Jizọs rụrụ na otú o si jiri nkà chịkọta ìgwè mmadụ ma gbooro ha mkpa ha, ha kwubiri na Jizọs ga-abụ eze kacha mma. (Jọn 6:14) Nke ahụ ejughị anyị anya. Cheta na ọ na-agụsi ha agụụ ike inweta ezigbo onye ọchịchị ga na-egboro ha mkpa ha; ọ bụ ndị mba ọzọ dị aka ike na-achị obodo ha ha hụrụ n’anya. N’ihi ya, ha gbalịrị ịmanye Jizọs isonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Buru nke ahụ n’uche tụlee ihe Jizọs mere.

Jọn 6:15 kwuru, sị: “Ebe Jizọs maara na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri n’ugwu ahụ naanị ya.” Jizọs mere ka ebe ọ kwụ doo nnọọ anya. O kpebisiri ike ịghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo ya. Ọ dịghị mgbe o mechara gbanwee obi ya. O kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime otu ihe ahụ. (Jọn 17:16) Olee ihe mere o ji jụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

Olee Ihe Mere Jizọs Ji Họrọ Ịnọpụ Iche?

Nnọpụiche Jizọs na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a dabeere nnọọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị tụlee naanị abụọ n’ime ha.

“Mmadụ [achịwo] mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekliziastis 8:9) Nke ahụ bụ otú Baịbụl si kọwaa ọchịchị ụmụ mmadụ. Cheta na Jizọs bụbu mmụọ n’eluigwe ogologo oge tupu ya abịa n’ụwa dị ka mmadụ. (Jọn 17:5) N’ihi ya, ọ maara na mmadụ enweghị ike igbo mkpa nke ọtụtụ ijeri mmadụ nke ọma, n’agbanyeghị otú o si buru ezi ihe n’obi; Chineke ekekwanụghị ya ime otú ahụ. (Jeremaya 10:23) Jizọs maara na e nwere ihe ọzọ ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha—ọ bụghị ọchịchị ụmụ mmadụ.

“Ụwa dum dị n’ike aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Nke ahụ ò juru gị anya? Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya. Ha na-echeta ndị bu ezi ihe n’obi, bụ́ ndị banyere n’ọchịchị n’ihi na ha chọrọ ime ka ọnọdụ ụwa ka mma nakwa ka ahụ́ rukwuo ndị mmadụ ala na ya. Otú ọ sọkwara ha gbaruo mbọ, ọbụna ndị ọchịchị obi ha kacha zie ezie enweghị ike izere onye Jizọs kpọrọ “onyeisi ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Jizọs gaje ịbụ Eze nke ọchịchị eluigwe nke Chineke. A sị na Jizọs tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ gaara akwụsị ịkwado ọchịchị Nna ya.

Nke ahụ ọ̀ pụtara na Jizọs kụziri na ọ dịghị ụgwọ ndị na-eso ụzọ ya ji ndị ọchịchị ụwa? Kama ime otú ahụ, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi mee ihe Chineke chọrọ ha n’aka ma n’otu mgbe ahụ na-erubere ndị ọchịchị isi.

Jizọs Kwanyeere Ndị Ọchịchị Ùgwù

Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, ndị mmegide gbalịrị ime ka o kwuhie ọnụ site n’ịjụ ya ma ndị mmadụ hà kwesịrị ịtụ ụtụ isi. Ọ bụrụ na Jizọs ekwuo na ha ekwesịghị, a ga-ele azịza ya anya ka ịgba ọchịchị mgba okpuru, ọ ga-akpalikwa ndị e wedara n’ala na-achọ otú ha ga-esi nwere onwe ha ná mmekpọ ọnụ ọchịchị aka ike Rom na-emekpọ ha inupụrụ ọchịchị ahụ isi. Ọ bụrụkwanụ na Jizọs ekwuo na ha kwesịrị, ọtụtụ ndị ga-eche na ọ kwadoro mmegbu a na-emegbu ha. Ihe Jizọs zara gosiri nnọọ na ọ na-erubere ma Chineke ma ndị ọchịchị isi. O kwuru, sị: “Hụnụ na unu kwụrụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Luk 20:21-25) N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ya ji ma Chineke ma Siza—ya bụ, ndị ọchịchị—ụgwọ.

Ndị ọchịchị na-eme ka e nwetụ udo n’obodo. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na ha na-achọ ka ụmụ amaala ha na-akwụwa aka ọtọ, na-atụ ụtụ isi, ma na-erubere iwu obodo isi. Olee ihe nlereanya Jizọs hapụụrụ anyị ‘n’ịkwụ Siza ihe Siza’? Nne na nna Jizọs, bụ́ ndị zụlitere ya, na-erube isi n’iwu ọbụna mgbe ime otú ahụ na-adịghịrị ha mfe. Dị ka ihe atụ, Josef na nwunye ya dị ime, bụ́ Meri, mere njem otu narị kilomita na iri ise iji gaa Betlehem mgbe iwu ndị Rom nyere maka ịgụ ndị mmadụ ọnụ chọrọ ka ha mee otú ahụ. (Luk 2:1-5) Dị ka ha, Jizọs bụ nwa amaala na-erube isi n’iwu, tụọdị ụtụ isi iwu na-ejighị ya ịtụ. (Matiu 17:24-27) O jikwa nlezianya zere itinye aka n’ihe ndị dịịrị ndị ọchịchị. (Luk 12:13, 14) Anyị nwere ike ikwu na Jizọs kwanyeere ọchịchị ùgwù, ọ bụ ezie na ọ jụrụ itinye aka na ya. Ma, olee ihe Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru banyere ịkwụ “Chineke ihe Chineke”?

Otú Jizọs Si Nye “Chineke Ihe Chineke”

Ọ dị mgbe a jụrụ Jizọs iwu kachanụ n’iwu niile Chineke nyere mmadụ. Kraịst zara, sị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Matiu 22:37-39) Jizọs kụziri na mgbe a bịara n’ịkwụ “Chineke ihe Chineke,” ihe mbụ anyị ji Ya n’ụgwọ bụ ịhụnanya—nke gụnyere anyị iji obi anyị niile na-efe ya ofufe.

È nwere ike ike ịhụnanya ahụ eke? Ànyị nwere ike ike ikwesị ntụkwasị obi anyị eke, nye Jehova Chineke na ọchịchị eluigwe ya otu akụkụ ma nye ndị ọchịchị ụwa akụkụ nke ọzọ? Jizọs n’onwe ya kwuru ụkpụrụ anyị ga-eji zaa ajụjụ ahụ: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya.” (Matiu 6:24) N’ebe ahụ, Jizọs na-ekwu banyere mmadụ ikere Chineke na akụnụba ikwesị ntụkwasị obi ya, ma o doro anya na o chere na otu ụkpụrụ ahụ metụtara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị—dịkwa ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị ndụ na narị afọ mbụ chere.

Ihe odide ndị kasị ochie e nwere gosiri na ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge ochie etinyetụghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ebe ọ bụ na ha fere naanị Onye ahụ Kraịst fere, ha jụrụ ife Rom na eze ukwu ya, ije agha, na ịnara ọkwá ọchịchị. E busoro ha iro n’ụzọ dị iche iche n’ihi ya. Ndị iro ha boro ha ebubo mgbe ụfọdụ na ha kpọrọ ụmụ mmadụ asị. Ebubo ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ezi Ndị Kraịst Na-eche Banyere Ndị Ọzọ

Cheta ihe Jizọs kwuru bụ́ iwu nke abụọ kasịnụ Chineke nyere—“Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” O doro anya na o nweghị ezi onye na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịkpọ ụmụ mmadụ asị. Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya, jiri ike ya jeere ha ozi, gboodịrị ha mkpa ndị bụ́ isi ha na-enwe kwa ụbọchị.—Mak 5:25-34; Jọn 2:1-10.

Ma, olee ihe a kasị jiri mara Jizọs? A kpọghị Jizọs Ọgwọ Ọrịa, Onye Zụrụ Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri, ma ọ bụdị Onye Na-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ—ọ bụ ezie na ọ rụrụ ọrụ ahụ niile dị ịrịba ama. Ma, ndị mmadụ kpọrọ ya Onye Ozizi, bụ́kwanụ ihe ọ bụ. (Jọn 1:38; 13:13) Jizọs kọwara na isi ihe mere ya ji bịa n’ụwa bụ ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke.—Luk 4:43.

Ọ bụ ya mere ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst ji eji obi ha niile arụ ọrụ ahụ Nna ha ukwu rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa—izi ndị mmadụ ozi ọma nke Alaeze Chineke. Jizọs Kraịst nyere ezi Ndị Kraịst niile ọrụ ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ gburugburu ụwa. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Alaeze eluigwe ahụ a na-enweghị ike imerụ emerụ ga-eji iwu ịhụnanya chịa ihe niile Chineke kere eke. Ọ ga-emezu uche Chineke, wepụdị ahụhụ na ọnwụ. (Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kpọọ ozi ahụ Kraịst kwusara “ozi ọma”!—Luk 8:1.

Ya mere, ọ bụrụ na ị na-achọ ndị bụ́ ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’ụwa taa, olee otú ị ga-esi mata ha? Hà ga na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a? Ka isi ọrụ ha na-arụ ọ̀ bụ otu ọrụ ahụ Jizọs rụrụ—ikwusa na ịkụzi banyere Alaeze Chineke?

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na otú o nwere ike isi metụta ndụ gị ugbu a? Anyị na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ ka ị gaa n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.watchtower.org.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ndịàmà Jehova Hà Na-enyere Obodo Aka?

Ndịàmà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ha na-enyere nnọọ ndị agbụrụ niile na ndị nọ n’ọnọdụ ọ bụla bi n’obodo ha aka. Ka anyị tụlee ihe ole na ole gosiri nke a:

▪ Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị nde mmadụ asaa na-ewepụta ihe karịrị otu ijeri awa na ọkara kwa afọ iji kụziere ndị mmadụ ihe dị na Baịbụl na otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka imeri àgwà ọjọọ, inwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha, na imeziwanye ndụ ha n’ụzọ ndị ọzọ.

▪ Ha na-ebi ma na-ekesa akwụkwọ n’efu n’ihe karịrị narị asụsụ ise, ndị gụnyere ụfọdụ asụsụ ọ na-adịghị akwụkwọ ọzọ e birila na ha.

▪ Ha na-akụziri ndị mmadụ otú e si ekwu okwu n’ihu ọha, bụ́ nke merela ka ọtụtụ nde mmadụ mụta ikwu okwu a ga-aghọta nke ọma n’akpasughị ndị mmadụ iwe.

▪ Ha nwere ndokwa ịkụziri ndị mmadụ otú e si agụ na otú e si ede bụ́ nke merela ka ọtụtụ iri puku mmadụ n’ụwa niile mụta otú e si agụ na otú e si ede ihe.

▪ Ha ehiwela ihe karịrị Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè narị anọ na ihe karịrị narị Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ na iri ise gburugburu ụwa iji zụọ ndị wepụtara onwe ha n’otú e si ewu ihe owuwu ka ha wee na-ewu ebe ndị a na-anọ amụ Baịbụl. N’ime afọ iri gara aga, e wuola ihe karịrị ụlọ ofufe, ma ọ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, puku iri abụọ.

▪ Ha na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka gburugburu ụwa, na-enyere Ndịàmà Jehova na ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova aka. N’ime afọ abụọ ajọ ifufe dị iche iche kpachara Amerịka aka ọjọọ n’oge na-adịbeghị anya, Ndịàmà wepụtara onwe ha wughachi ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze iri itoolu na ụlọ ndị mmadụ karịrị puku ise na narị ise.

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbe ndị mmadụ na-achọ ịmanye Jizọs itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ gaghachiri “n’ugwu ahụ naanị ya”